Ọ́bá Akwụkwọ Anyị NKE DỊ N'ỊNTANET
Ọ́bá Akwụkwọ Anyị
NKE DỊ N'ỊNTANET
Igbo
Ọ
  • Á
  • á
  • À
  • à
  • É
  • é
  • È
  • è
  • Ì
  • ì
  • Í
  • í
  • Ị
  • ị
  • Ị̀
  • ị̀
  • Ị́
  • ị́
  • Ḿ
  • ḿ
  • M̀
  • m̀
  • Ṅ
  • ṅ
  • Ò
  • ò
  • Ó
  • ó
  • Ọ
  • ọ
  • Ọ̀
  • ọ̀
  • Ọ́
  • ọ́
  • Ù
  • ù
  • Ú
  • ú
  • Ụ
  • ụ
  • Ụ̀
  • ụ̀
  • Ụ́
  • ụ́
  • BAỊBỤL
  • AKWỤKWỌ NDỊ ANYỊ NWERE
  • ỌMỤMỤ IHE
  • g99 3/8 p. 20-23
  • Ịba Uru ma Nwee Obi Ụtọ n’Agbanyeghị Ikpu Ìsì M

O nweghị vidio dị maka ihe a ị họọrọ.

Ewela iwe, o nwetụrụ nsogbu gbochiri vidio a ịkpọ.

  • Ịba Uru ma Nwee Obi Ụtọ n’Agbanyeghị Ikpu Ìsì M
  • Teta!—1999
  • Isiokwu Nta
  • Isiokwu Ndị Ọzọ Yiri Nke A
  • A Kụziiri M Ịkpọ Chineke Asị
  • Dị Ka Anụ Ọhịa A Gbachibidoro Ogige
  • Papa M Enyere M Aka
  • Ịhụ Ụzọ n’Ụzọ Ime Mmụọ
  • Ntisa Alụmdi na Nwunye
  • Ndụ Obi Ụtọ nke Na-arụpụta Ihe
  • Chineke M Kwagidere M
  • Ama M Ugbu A na M Ga-enyeliri Ndị Ọzọ Aka
    Ụlọ Nche Ikwupụta Alaeze Jehova—2015
  • Kụziere Ndị Ìsì Okwu Jehova
    Ozi Alaeze Anyi—2015
  • Imeghe Anya Nye Ozi Ọma Ahụ
    Ụlọ Nche Ikwupụta Alaeze Jehova—1994
  • Jehova Emegheela Anya m
    Ụlọ Nche Ikwupụta Alaeze Jehova—2012
Lee Ihe Ndị Ọzọ
Teta!—1999
g99 3/8 p. 20-23

Ịba Uru ma Nwee Obi Ụtọ n’Agbanyeghị Ikpu Ìsì M

Dị ka Polytimi Venetsianos si kọọ

Mụ na ụmụnne m atọ na nwa nwanne papa m nọ na-egwuri egwu mgbe otu obere ihe si na windo dabata n’ụlọ anyị. Ọ bụ bọmbụ, mgbe ọ gbawakwara, ụmụnne m nile atọ ahụ nwụrụ, ekpukwara m ìsì kpam kpam.

ỤBỌCHỊ ahụ bụ July 16, 1942, mgbe m bụ obere nwa agbọghọ dị nanị afọ ise. Amaghị m onwe m mgbe ụfọdụ ruo ọtụtụ ụbọchị. Mgbe m mataghachiri onwe m, achọrọ m ụmụnne m ndị nwoke na nwanne m nwanyị. Mgbe m nụrụ na ha anwụọla, ọ dị m ka ya bụrụ na m anwụwokwa.

Mgbe a mụrụ m, ezinụlọ anyị bi n’àgwàetiti Gris bụ́ Salamis, dị nso na Piraiévs, bụ́ ọdụ ugbọ mmiri Atens. N’agbanyeghị ịda ogbenye anyị, anyị biri ndụ udo. Mmalite nke Agha Ụwa nke Abụọ na 1939 tisasịrị ha nile. Papa m bụ onye ọrụ ụgbọ mmiri n’osimiri Mediterranean. Mgbe mgbe ọ ghaghị izere ụgbọ agha okpuru mmiri, obere ụgbọ agha mmiri, bọmbụ torpedo, na ma bọmbụ ndị Germany na Mba Ndị Òtù Ya ma nke ndị Agha Jikọrọ Aka na-atụ. Gris nọ n’okpuru Ọchịchị Aka Ike Fascist na Ọchịchị ndị Nazi.

A Kụziiri M Ịkpọ Chineke Asị

N’ihi ọnọdụ dị oké njọ dị n’oge agha ahụ, nwa mama m ọzọ nwụrụ, nke mere ka ha dị anọ nwụrụnụ. Ọ dara mbà n’obi nke ukwuu, malite ịrịa ụkwara nta, mgbe ọ mụsịkwara nwa nke isii ya, o mesịrị nwụọ n’August 1945. Ndị agbata obi anyị bụ́ ndị okpukpe malitere ikwu na Chineke na-enye anyị ntaramahụhụ. N’ịgbalị ịgba anyị ume, ma na-eme nanị ka ihe kawanye njọ, ụfọdụ ndị ụkọchukwu chọọchị Ọtọdọks nke Gris kwuru na Chineke akpọrọwo ụmụnne m ndị nwoke na ndị nwanyị gaa n’eluigwe ịbụ obere ndị mmụọ ozi.

Iwe were papa m. N’ihi gịnị ka Chineke ga-eji pụnara ezinụlọ dara ogbenye ụmụntakịrị anọ ebe o nwere ọtụtụ nde ndị mmụọ ozi ya na ha nọ? Nkwenkwe ndị a nke Chọọchị Ọtọdọks kpaliri ya inwe echiche ndị siri ike megide Chineke na ndị megidere okpukpe. Mgbe nke ahụ mesịrị, ọ chọghị ka ihe ọ bụla jikọta ya na okpukpe. Ọ kụziiri m ịkpọ Chineke asị na ilelị ya, na-emesi ya ike na ọ bụ Chineke kpatara ihe mgbu na nhụsianya anyị.

Dị Ka Anụ Ọhịa A Gbachibidoro Ogige

N’oge na-adịghị anya ka mama m nwụsịrị na 1945, papa m malitekwara ịrịa ụkwara nta, a kpọjere ya n’ebe a na-elekọta ndị ọrịa ha siri ike. A kpọjere nwanne m nwanyị a mụrụ ọhụrụ n’ebe a na-elekọta ụmụaka nke gọọmenti. Mgbe papa m mesịrị si n’ebe ahụ a na-elekọta ndị ọrịa ha siri ike pụta ma jee n’ebe ahụ a na-elekọta ụmụaka ịkpọta ya, a gwara ya na ọ nwụọla. E tinyere m n’ụlọ akwụkwọ ndị ìsì, bụ́ ebe m nọrọ ruo afọ asatọ ọzọ nke ndụ m. Obi gbawara m na mbụ. Ana m enwe oké nkụda obi karịsịa n’ụbọchị nleta. Ihe ka ọtụtụ n’ime ụmụ akwụkwọ ibe m bụ́ ndị ìsì nwere onye na-eleta ha, ma ọ dịghị onye m nwere.

Akpara m àgwà dị ka anụ ọhịa a gbachibidoro ogige. A na-akpọ m onye na-eyi ụlọ akwụkwọ ahụ egwu. N’ihi ya, e tiri m ihe, aghaghịkwa m ịnọdụ ala ‘n’oche ndị nnupụisi.’ Mgbe mgbe m chere echiche igbu onwe m. Ma, ka oge na-aga, o doro m anya na aghaghị m ịmụta ikwe ka ihe m nwere zuoro m. M bịara nwee afọ ojuju n’inyere ụmụ akwụkwọ ibe m bụ́ ndị ìsì aka, na-enyere ha aka mgbe mgbe iyiri uwe ma ọ bụ idozi àkwà ha.

Ndị ụkọchukwu gwara anyị na Chineke emewo ka anyị kpuo ìsì n’ihi mmehie ndị jọgburu onwe ha nke nne na nna anyị mere. Nke a mere nanị ka m kpọtụkwuo Chineke asị, bụ́ onye yiri ka o nwere aka ike ma nwee obi ọjọọ. Echiche okpukpe nke mere ka m tụọ egwu ma wee iwe bụ na mmụọ nke ndị nwụrụ anwụ na-awagharị na-esogbu ndị dị ndụ. Ya mere, n’agbanyeghị ịhụnanya m nwere n’ebe ụmụnne m na mama m nwụrụ anwụ nọ, atụrụ m “mmụọ” ha egwu.

Papa M Enyere M Aka

Ka oge na-aga, papa m zutere Ndịàmà Jehova. O juru ya anya ịmụta na Bible na ọ bụ Setan, ọ bụghịkwa Jehova, na-akpata ihe mgbu na ọnwụ. (Abụ Ọma 100:3; Jemes 1:13, 17; Mkpughe 12:9, 12) N’oge na-adịghị anya papa m nke nweworo nghọta malitere ije nzukọ Ndịàmà Jehova, nwee ọganihu ime mmụọ, e meekwa ya baptism na 1947. Ọnwa ole na ole tupu nke ahụ, ọ lụgharịwo nwanyị ma mụta otu nwa nwoke mgbe ahụ. Ka oge na-aga nwunye ọhụrụ ya sonyeere ya n’ife Jehova ofufe.

Ahapụrụ m ụlọ akwụkwọ ndị ìsì ahụ mgbe m dị afọ 16. Lee ihe na-akasi obi ọ bụ ịlọtaghachi n’ezinụlọ ndị Kraịst na-egosi ịhụnanya! Ha nwere ihe ha kpọrọ ọmụmụ Bible ezinụlọ, nke a kpọrọ m òkù isonye na ya. Esonyere m iji gosi nkwanye ùgwù na àgwà ọma, ọ bụ ezie na adịghị m etinye uche m na ya ma ọlị. Mmetụta siri ike m nwere megide Chineke na okpukpe ka dị ukwuu.

Ezinụlọ anyị na-amụ akwụkwọ nta bụ́ God’s Way Is Love. Na mbụ, enweghị m mmasị na ya, ma anụrụ m ka papa m na-ekwu banyere ọnọdụ ndị nwụrụ anwụ. Nke a dọọrọ uche m. A gụpụtara Eklisiastis 9:5, 10 na Bible: “Ndị nwụrụ anwụ adịghị ama ihe ọ bụla . . . Ọ dịghị ọrụ, ma ọ bụ iche echiche, ma ọ bụ ihe ọmụma, ma ọ bụ amamihe, dị [na sheol, NW], ebe gị onwe gị na-ala.”

Amalitere m ịchọpụta na ụjọ m enweghị isi. Nne m, ụmụnne m ndị nwoke, na ụmụnne m ndị nwanyị nwụrụ anwụ apụghị imerụ m ahụ. Nkwurịta okwu ahụ baziri n’isiokwu mbilite n’ọnwụ. Amalitere m itinye uche n’ihe nke ọma. Obi m jupụtara n’aṅụrị mgbe m nụrụ nkwa Bible na n’okpuru ịchịisi Kraịst ndị nwụrụ anwụ ga-adịghachi ndụ! (Jọn 5:28, 29; Mkpughe 20:12, 13) Ugbu a ọmụmụ ihe ahụ na-atọ m nnọọ ụtọ. Ana m atụsi anya ụbọchị nkwurịta okwu ezinụlọ a ike, n’agbanyeghịkwa ikpu ìsì m, m ga-akwadebe nke ọma.

Ịhụ Ụzọ n’Ụzọ Ime Mmụọ

Ka m na-enwe ọganihu n’ihe ọmụma Akwụkwọ Nsọ, enwekwaghị m echiche na-ezighị ezi banyere Chineke na ụzọ o si eme ihe. Amụtara m na ọ bụghị Chineke mere ka mụ ma ọ bụ onye ọ bụla ọzọ kpuo ìsì kama na onye na-akpata ihe ọjọọ nile bụ Onye Iro ya, Setan bụ́ Ekwensu. Lee otú o siworo wute m na n’ihi amaghị ihe m, atawo m Chineke ụta! Ejiri m ịnụ ọkụ n’obi mụbaa ezi ihe ọmụma Bible m. Ejere m ma kere òkè ná nzukọ nile nke ndị Kraịst, ọ bụ ezie na anyị bi ọtụtụ kilomita site n’ebe Ụlọ Nzukọ Alaeze dị. Ekerekwaara òkè n’ọrụ ime nkwusa n’ụzọ chiri anya, n’ekweghị ka ikpu ìsì m gbochie m.

Lee obi ụtọ m nwere mgbe e mere m baptism na July 27, 1958, ihe ji nke nta karịa afọ 16 ka ọdachi ahụ mere ka m kpuo ìsì gasịrị! Amalitere m ndụ ọhụrụ ma jupụta n’olileanya na nchekwube. Ugbu a ndụ m nwere nzube—ijere Nna m nke eluigwe na-ahụ n’anya ozi. Ihe ọmụma banyere ya atọhapụwo m n’ozizi ụgha, o nyewokwa m obi ike iji mkpebisi ike na olileanya chee ikpu ìsì m na ihe isi ike ndị so ya ihu. M na-etinye awa 75 ma ọ bụ karịa n’otu ọnwa n’ikwusara ndị ọzọ ozi ọma ahụ dị ebube mgbe nile.

Ntisa Alụmdi na Nwunye

Alụrụ m otu nwoke nke mụ na ya nwere otu ihe mgbaru ọsọ ná ndụ na 1966. O yiri ka anyị ga-enwe alụmdi na nwunye obi ụtọ ka anyị abụọ rụrụ ọrụ ịmụbawanye ọrụ anyị n’ọrụ nkwusa. N’ọnwa ụfọdụ anyị ga-etinye ọtụtụ awa n’ọrụ ahụ na-azọpụta ndụ. Anyị kwagara n’otu ebe dịpụrụ adịpụ na nso Livadiá, n’ebe etiti Gris. N’afọ ndị ahụ anyị bi n’ebe ahụ, malite na 1970 ruo 1972, anyị nwere ike inyere ọtụtụ ndị aka ịmụta eziokwu Bible ma ghọọ ndị Kraịst e mere baptism, n’agbanyeghị ndị agha ọchịchị aka ike na-achị na Gris mgbe ahụ. Anyị nwekwara obi ụtọ inyere obere ọgbakọ Ndịàmà Jehova dị n’ógbè ahụ aka.

Otú ọ dị, ka oge na-aga di m malitere ileghara ọmụmụ Bible na ije nzukọ ndị Kraịst anyị anya, n’ikpeazụ ọ gbahapụkwara ozizi Bible kpam kpam. Nke a kpatara esemokwu dị ukwuu n’alụmdi na nwunye anyị, nke jedebere n’ịgba alụkwaghịm na 1977. Obi gbawara m nke ukwuu.

Ndụ Obi Ụtọ nke Na-arụpụta Ihe

N’oge a m dara nnọọ mbà n’obi ná ndụ m, Jehova na nzukọ ya nyeere m aka. Otu nwanna nwoke onye Kraịst kọwaara m na ọ bụrụ na m ekwe ka ọnọdụ ahụ nke onye bụbu di m kpataara m mebie ọṅụ m, ọ pụtara na m ga-abụzi ohu ya. Ọ bụ n’ebe ọ nọ ka obi ụtọ m ga-adabere. N’ihe dị ka oge a, otu onye metụworo okenye nọ n’ọgbakọ ndị Kraịst gwara m ka m nyere ya aka imeziwanye otú o si eme nkwusa. N’oge na-adịghị anya etinyere m onwe m kpam kpam n’ihe wetaara m ọṅụ kasị ukwuu—ikere òkè n’ozi!

Onye Kraịst ọzọ tụziri aro a: “Ị pụrụ ịga n’ihu na-enye aka n’ebe ndị a kasị chọọ gị. Ị pụrụ ịbụ ụlọ na-enye ìhè nke Jehova Chineke ji eme ihe.” Lee echiche na-akpali akpali ọ bụ! Onye ìsì ịbụ “ụlọ na-enye ìhè nke Jehova Chineke ji eme ihe”! (Ndị Filipaị 2:15) N’egbughị oge ahapụrụ m Atens ma jee biri n’obodo nta bụ́ Amárinthos, dị n’ebe ndịda Évvoia, bụ́ ebe e nwere nnọọ ndị nkụzi Bible ole na ole. Site n’enyemaka nke ụmụnna ndị bi n’ebe ahụ, enwere m ike iwu ụlọ na ilekọta ihe ndị na-akpa m nke ọma.

Ya mere ruo ihe karịrị afọ 20 ugbu a, enwewo m ike itinye ọtụtụ ọnwa kwa afọ n’ụdị ụfọdụ nke ọrụ nkwusa ka ukwuu. Site n’ume nke Jehova nyere m, ana m ejisi ike ekere òkè n’ụdị nile nke ozi ahụ, gụnyere ịkpọtụrụ ndị mmadụ n’ebe obibi ha, iduziri ndị nwere mmasị ọmụmụ Bible, na isoro ndị mmadụ na-ekwurịta okwu n’okporo ámá. Ugbu a, enwere m ihe ùgwù nke iduziri mmadụ anọ nwere mmasị n’ebe Onye Okike anyị nọ ọmụmụ Bible. Lee obi ụtọ m nwere ịhụ ka e hiwere ọgbakọ atọ n’ógbè a site nanị n’ụmụnna ole na ole n’afọ 20 gara aga!

Ugboro abụọ n’izu, ana m aga ihe karịrị kilomita 30 iji jee nzukọ ndị Kraịst na kilomita 30 ọzọ iji lọta, na-ekpebisi ike ijezu ha nile. Mgbe m chọpụtara na uche m adịghị n’ihe a na-ekwu ná nzukọ—n’ihi ahụghị ọkà okwu—ana m edetụ obere ihe n’akwụkwọ m pụrụ iche e ji ede mkpụrụ akwụkwọ ndị ìsì. Ana m esi n’ụzọ dị otú a amanye ntị m na uche m ịdị n’ihe a na-ekwu. Ọzọkwa, enwere m ihe ùgwù nke ịbụ onye a na-anọ n’ebe obibi ya eduzi otu n’ime nzukọ ọgbakọ. Ndị mmadụ na-esite n’obodo nta ndị dị nso abịa ihe a na-akpọ Ọmụmụ Akwụkwọ Ọgbakọ. Kama ịtụ anya mgbe nile ka ndị ọzọ bịa leta m n’ebe obibi m, m na-ebu ọzọ jee leta ha, nke na-eme ka anyị na-agbarịta onwe anyị ume.—Ndị Rom 1:12.

Mgbe mụ na papa m bi dị ka onye nọ n’afọ iri na ụma, ọ dịtụghị mgbe o mesoro m omume dị ka nwa kpuru ìsì. O jiri ndịdị na nnọgidesi ike tinye ọtụtụ oge n’ịkụziri m iji aka m na-eme ihe. Ọzụzụ a dị irè emewo ka m nwee ike ilekọta ubi m na obere ìgwè anụ ụlọ m nke ọma. Ana m arụsi ọrụ ike n’ebe obibi m, na-edebe ụlọ m ọcha ma na-esi nri. Amụtawo m na anyị pụrụ inweta ọṅụ na obi ụtọ site n’ihe ndị dị nta ná ndụ, n’ihe anyị nwere. Enwewo m ike iji ikike anọ ndị m ji amata ihe fọdụrụnụ mezuo ọtụtụ ihe—ịnụ ihe, ịnụ ísìsì, ịmata ụtọ ihe, na imetụ ihe aka—nke a na-enyekwa m afọ ojuju na-enweghị atụ. Nke a abụrụwokwa àmà magburu onwe ya nye ndị nọ n’èzí.

Chineke M Kwagidere M

Ọ na-eju ọtụtụ ndị anya otú m siworo nwee ezi nchekwube ma kwagide onwe m n’agbanyeghị na m kpuru ìsì. Nke ka nke, a ghaghị inye Jehova, “Chineke nke nkasi obi nile” otuto. (2 Ndị Kọrint 1:3) Mgbe m kpusịrị ìsì, echere m echiche igbu onwe m ọtụtụ mgbe. Ya mere, echeghị m na m ga-adị ndụ taa ma ọ bụghị Jehova na eziokwu Bible. Achọpụtawo m na Onye Okike anyị enyewo anyị ọtụtụ onyinye—ọ bụghị nanị ịhụ ụzọ—nakwa na ọ bụrụ na anyị ejiri ha mee ihe, anyị pụrụ inwe obi ụtọ. Mgbe Ndịàmà mere nkwusa n’obodo nta anyị n’otu oge, otu nwanyị gwara ha banyere m sị: “Ọ bụ Chineke ọ na-efe na-enyere ya aka imezu ihe ndị a nile!”

Ọnwụnwa m nile emewo ka m bịarukwuo Chineke nso. Nke a ewusiwo nnọọ okwukwe m ike. E chetaara m na Pọl onyeozi nwere ihe ọ kpọrọ “ogwu n’anụ ahụ,” ikekwe nsogbu anya ya. (2 Ndị Kọrint 12:7; Ndị Galetia 4:13) Nke a egbochighị ya ịbụ onye ọ ‘na-egbu mgbu n’obi’ izisa ozi ọma ahụ. Dị ka ya, apụrụ m ikwu, sị: “Ya mere kama ihe ọzọ m ga-ewere obi ụtọ nile nyaa isi n’adịghị ike m nile . . . N’ihi na mgbe ọ bụla m na-adịghị ike, mgbe ahụ ka m na-adị ike”.—Ọrụ 18:5; 2 Ndị Kọrint 12:9, 10.

Nke ka nke, olileanya m nke dabeere na Bible na m pụrụ iji anya m hụ ezi nne m, ụmụnne m ndị nwanyị, na ụmụnne m ndị nwoke ná mbilite n’ọnwụ nwere n’ezie mmetụta ziri ezi na nke bara uru n’ahụ m. Bible na-ekwe nkwa na “a ga-emeghe anya ndị ìsì” nakwa na “mbilite n’ọnwụ nke ndị ezi omume na nke ndị ajọ omume kwa gaje ịdị.” (Aịsaịa 35:5; Ọrụ 24:15) Atụmanya dị otú ahụ na-eme ka m nwee nnọọ nchekwube, jiri ịnụ ọkụ n’obi na-atụ anya ọdịnihu dị ebube n’okpuru Alaeze Chineke!

[Foto dị na peeji nke 23]

Papa m, onye mụụrụ m Bible

[Foto dị na peeji nke 23]

Na kitchin mụ

[Foto dị na peeji nke 23]

Mụ na enyi m n’ozi

    Akwukwo Igbo (1984-2025)
    Pụọ
    Banye
    • Igbo
    • Ziga ya
    • Ịgbanwe Ihe
    • Copyright © 2025 Watch Tower Bible and Tract Society of Pennsylvania
    • Ihe Ị Ga-eme na Ihe Ị Na-agaghị Eme
    • Ihe Anyị Ji Ihe Ị Gwara Anyị Eme
    • Kpebie Ihe Ị Ga-agwa Anyị
    • JW.ORG
    • Banye
    Ziga ya