Ọ́bá Akwụkwọ Anyị NKE DỊ N'ỊNTANET
Ọ́bá Akwụkwọ Anyị
NKE DỊ N'ỊNTANET
Igbo
Ọ
  • Á
  • á
  • À
  • à
  • É
  • é
  • È
  • è
  • Ì
  • ì
  • Í
  • í
  • Ị
  • ị
  • Ị̀
  • ị̀
  • Ị́
  • ị́
  • Ḿ
  • ḿ
  • M̀
  • m̀
  • Ṅ
  • ṅ
  • Ò
  • ò
  • Ó
  • ó
  • Ọ
  • ọ
  • Ọ̀
  • ọ̀
  • Ọ́
  • ọ́
  • Ù
  • ù
  • Ú
  • ú
  • Ụ
  • ụ
  • Ụ̀
  • ụ̀
  • Ụ́
  • ụ́
  • BAỊBỤL
  • AKWỤKWỌ NDỊ ANYỊ NWERE
  • ỌMỤMỤ IHE
  • g99 11/8 p. 20-21
  • Gịnị Na-akpata Ịta Amoosu?

O nweghị vidio dị maka ihe a ị họọrọ.

Ewela iwe, o nwetụrụ nsogbu gbochiri vidio a ịkpọ.

  • Gịnị Na-akpata Ịta Amoosu?
  • Teta!—1999
  • Isiokwu Nta
  • Isiokwu Ndị Ọzọ Yiri Nke A
  • Mkpa Ndị A Na-egboghị
  • Ezi Ọnọdụ Ime Mmụọ—Site n’Ole Ebe?
  • Gịnị Ka Ị Maara Banyere Amoosu?
    Ụlọ Nche Ikwupụta Alaeze Jehova—2000
  • Ihe I Kwesịrị Ịmara Banyere Amoosu
    Ụlọ Nche Ikwupụta Alaeze Jehova—2000
  • Eziokwu Banyere Ime Anwansi, Ịgba Afa, na Ịta Amoosu
    Ụzọ Na-eduba ná Ndụ Ebighị Ebi—Ị̀ Chọtawo Ya?
  • Ndị Mmụọ Ọjọọ Hà Dị Adị n’Ezie?
    Teta!—1998
Lee Ihe Ndị Ọzọ
Teta!—1999
g99 11/8 p. 20-21

Echiche nke Bible

Gịnị Na-akpata Ịta Amoosu?

“NDỊ amoosu.” Gịnị ka okwu ahụ na-eme ka i jiri anya nke uche gị hụ? Ọ̀ bụ onyinyo nkịrịka ụmụ agadi nwanyị na-akọ ajọ ọgwụ ka ọ bụ nke ụmụ nwanyị rụrụ arụ na-eso Setan emekọ ihe? N’abụghị ndị dị ka ihe ndị ahụ e bu n’uche, ọtụtụ ndị na-akpọ onwe ha ndị amoosu nke oge a na-eyi ndị nkịtị. Ụfọdụ bụ ndị ọkachamara a na-akwanyere ùgwù, dị ka ndị ọkàiwu, ndị nkụzi, ndị edemede, na ndị nọọsụ. E nwewo mpụtaghachi nke òtù okpukpe ndị yitetụrụ òtù nzuzo n’ụwa nile, dị ka okpukpe ihe okike na ịgọ mmụọ nke ọgbara ọhụrụ.a “Ebe ọ bụla ọ masịrị gị gaa na Russia n’oge a, amoosu bụ ihe a na-ahụ kwa ụbọchị ná ndụ,” ka otu ọfịsa ndị uwe ojii ná mba ahụ kwuru. Na United States, e nwere ihe e mere atụmatụ ya ịbụ ndị amoosu 50,000 ruo 300,000, ma ọ bụ “ndị Wicca,”b dị ka ụfọdụ na-akpọ onwe ha.

Taa a na-ejikarị okwu ahụ bụ́ “amoosu” eme ihe n’ụzọ nwere ọtụtụ nkọwa, ọ pụkwara ịpụta ihe dịgasị iche nye ndị dịgasị iche. Mmụba nke amoosu na-amụba n’oge a yikarịsịrị ka ọ bụ omenala nke ife chi nwanyị ofufe, bụ́ okpukpe ihe okike nke kwenyesiri ike n’ikike ime anwansi, kpatara ya. Ndị amoosu ụfọdụ na-emere ihe nke ha—ha na-eme ememe okpukpe ha nanị ha, na-arịba ama mgbanwe nke oge, ọdịdị ọnwa, na ihe ndị ọzọ na-emere onwe ha. Ndị ọzọ na-efe ofufe ma na-akọ ọgwụ dị ka òtù ndị amoosu, bụ́ ìgwè na-adịkarị ndị amoosu 13.

Ọ bụ ezie na n’Ebe Ọdịda Anyanwụ Ụwa, otú ọha na eze si ele amoosu anya taa dị nnọọ iche n’omume ndị kwalitere ịkpọ ndị amoosu ọkụ Mgbe Ụwa Na-emepechabeghị Anya. Otú ọ dị, mgbe ụfọdụ a ka na-enwe ntiwapụ nke oké ime ihe ike megide ndị amoosu. Dị ka ihe atụ, ná mmalite ọnwa October 1998 n’Indonesia, òtù ndị ji mma ogè gburu ihe karịrị mmadụ 150 e chere na ha bụ ndị amoosu. Na South Africa, a kọrọ na e mesoro ihe karịrị ndị amoosu 2,000 ihe ike, gbuokwa 577 n’ime ha n’agbata afọ 1990 and 1998. N’iche ụzọ abụọ a gabigara ókè ihu—malite n’inwe mmasị n’amoosu ruo n’ịkpọ ndị amoosu asị—olee otú ndị Kraịst kwesịrị isi lee ya anya?

Mkpa Ndị A Na-egboghị

Gịnị na-akpali ndị mmadụ itinye aka n’amoosu nke oge a? Ha na-azọrọ na otu ihe na-akpata ya bụ ịsọpụrụ ihe okike na ndụ. N’ezie, ụfọdụ na-enwe ịnụ ọkụ n’obi ịkọwa na ofufe ha agụnyeghị iji ụmụ anụmanụ achụ àjà n’ememe okpukpe ha. Ndị ọzọ na-ekwu na ha na-emikpu onwe ha n’amoosu dị ka ụzọ isi chọọ ndị ha na ha pụrụ imekọ ihe n’eziokwu, ịtụkwasịrịta obi, nwekọọkwa mmasị ime mmụọ. “Ndị nile m maara n’òtù ndị na-ekpere arụsị ahụ nwere nnọọ omume enyi ma na-eme ihe n’eziokwu . . . Ha bụ nnọọ ndị ezigbo mmadụ,” ka otu onye amoosu nke oge a na-ekwu. Ọtụtụ ndị na-agọ agọ ha na Setan imekọ ihe, na-ekwusi ike na ọ dịghị ajọ chi dị n’ụdị okpukpe ha.

Nye ọtụtụ n’ime ha, ihe bụ́ isi mere ha ji ghọọ ndị amoosu bụ mmetụta nke ịtọgbọ chakoo n’ụzọ ime mmụọ na ndakpọ olileanya n’ebe okpukpe ndị bụ́ isi dị. N’ikwu banyere òtù amoosu ha, Phyllis Curott, bụ́ onye nchụàjà nwanyị ndị Wicca, na-ekwu, sị: “Anyị nile enwekwaghị afọ ojuju n’ozizi na omume okpukpe ndị a zụlitere anyị na ha.” Ndị amoosu nke oge a, ka Curott na-akọ, na-anwa ịza ajụjụ ndị dị ka, ‘Olee otú anyị pụrụ isi chọtaghachi ihe dị nsọ?’ Ma amoosu ọ̀ bụ ụzọ na-eduga n’ezi ọnọdụ ime mmụọ?

Ezi Ọnọdụ Ime Mmụọ—Site n’Ole Ebe?

Bible na-egosi n’ụzọ doro anya na Jehova bụ nanị ezi Chineke ahụ na Eze Eluigwe na Ala. (Abụ Ọma 73:28; 1 Pita 1:15, 16; Mkpughe 4:11) Ọ na-akpọ ndị nile òkù ka ha chọọ ya “wee chọta Ya.” (Ọrụ 17:27) N’ihi ya, a pụrụ inweta ezi ọnọdụ ime mmụọ nanị site n’inweta ezi ihe ọmụma banyere ezi Chineke ahụ, bụ́ Jehova. A pụrụ imezu nke a site n’ịmụ Okwu ya, bụ́ Bible Nsọ. “Bịaruonụ Chineke nso, Ọ ga-abịarukwa unu nso,” ka Jemes so dee Bible na-emesi anyị obi ike.—Jemes 4:8.

Otú ọ dị, Okwu Chineke na-adọ aka ná ntị megide ndị ọjọọ na-enye ọnọdụ ime mmọọ ọjọọ. (1 Jọn 4:1) Ọ na-eme ka a mata Setan bụ́ Ekwensu, bụ́ onye iro bụ́ isi nke Jehova, na ndị mmụọ ọjọọ ya dị ka ndị na-enye ihe ka ukwuu n’ọnọdụ ime mmụọ hiere ụzọ bụ́ nke jupụtara n’ụwa taa.c Dị ka Bible si kwuo, Setan ‘emewo ka anya nke uche nke ọtụtụ ndị mmadụ kpuo ìsì.’ N’ezie, ọ “na-eduhie ụwa nile mmadụ bi,” gụnyere ndị tinyere aka n’amoosu—ma hà na-ekwu na ha na-efe Ekwensu ma ọ bụ na ha adịghị ekwu. N’ihi gịnị ka nke a ji dị otú a?—2 Ndị Kọrint 4:4; Mkpughe 12:9.

Ọtụtụ n’ime omume na ememe okpukpe e jikọtara ha na amoosu nke oge a na ajọ ihe ndị e ji mara ofufe Setan bụ nnọọ otu ihe. N’ihi ya, ọbụna ihe a sị na ọ bụ ọchịchọ nkịtị nke ịmata ihe pụrụ n’ụzọ dị mfe iduga n’anwansi. N’ezie, ọtụtụ ndị esiwo n’ụzọ dị otú a daba n’ajọ mmetụta nke Setan.

Ihe a na-agaghị eleghara anya bụ eziokwu ahụ bụ́ na mgbe ụfọdụ a na-arabanye ndị tinyere aka n’amoosu nke oge a na ya n’ihi na ha nwere ọchịchọ inweta ike ma ọ bụ ịbọ ọ́bọ̀. “E nwere ndị pụrụ ịkpọ onwe ha ndị amoosu ma jiri ya na-emezu nzube ọjọọ,” ka Jennifer, bụ́ onye amoosu nke oge a na-ekwu. Ka o sina dị, ma ndị amoosu na-adịghị ize ndụ ma ndị na-abọ ọ́bọ̀ nọ n’ihe ize ndụ nke ịbụ ndị Setan na ndị mmụọ ọjọọ na-achịkwa n’ụzọ nile. Ndị amoosu ụfọdụ pụrụ ikwu na ajọ mmụọ ndị dị otú ahụ adịghị adị, ma nke a na-eme ka ha bụrụ ndị ha pụrụ ịghọgbu karị.—Tụlee 1 Ndị Kọrint 10:20, 21.

Bible na-akatọ ịjụ ndị mmụọ ase, ịgba afa, ime majik, ịkọ ọgwụ, na ịnwa isoro ndị nwụrụ anwụ kwurịta okwu. Ọ na-ekwu n’ụzọ doro anya, sị: “Ihe arụ nke Jehova ka onye ọ bụla nke na-eme ihe ndị a bụ.” (Deuterọnọmi 18:10-12) Otú ọ dị, ndị Kraịst ekpebisiwo ike ‘ịrụ ezi ihe n’ebe mmadụ nile nọ,’ n’ozi ha kwa ha enyeworo ọtụtụ ndị aka inwere onwe ha pụọ n’ụdị nile nke mgbaasị. (Ndị Galetia 6:10; Ọrụ 16:14-18) Ka o sina dị, ezi ndị Kraịst na-ezere isi n’ụzọ ọ bụla tinye aka n’ofufe ụgha, gụnyere ụdị ọ bụla nke amoosu.—2 Ndị Kọrint 6:15-17.

[Ihe ndị e dere n’ala ala peeji]

a Okwu bụ́ “okpukpe ihe okike” na-ezo aka na nkwenkwe bụ́ na ụwa na ihe nile dị ndụ bụ akụkụ nke Chineke ma nwee otu ụdị ike ndụ; “ịgọ mmụọ nke ọgbara ọhụrụ” na-ezo aka n’ofufe nke chi ndị dị tupu oge ndị Kraịst.

b Ndị Wicca bụ ndị na-ekpe okpukpe Wicca, nke bụ́ “okpukpe ihe okike nke ọgọ mmụọ malitere n’ebe ọdịda anyanwụ Europe tupu oge ndị Kraịst,” dị ka akwụkwọ bụ́ The American Heritage College Dictionary si kwuo.

c Usoro isiokwu bụ́ “Echiche nke Bible” na-adị na Teta! azawo ajụjụ ndị dị ka “Ekwensu Ọ̀ Dị Adị n’Ezie?” (June 8, 1991, peji nke 24-25) na “Ndị Mmụọ Ọjọọ Hà Dị Adị n’Ezie?” (May 8, 1998 peji nke 12-13).

[Ebe E Si Nweta Foto Dị na peeji 20]

Picture Book of Devils, Demons and Witchcraft/Ernst na Johanna Lehner/Dover

    Akwukwo Igbo (1984-2025)
    Pụọ
    Banye
    • Igbo
    • Ziga ya
    • Ịgbanwe Ihe
    • Copyright © 2025 Watch Tower Bible and Tract Society of Pennsylvania
    • Ihe Ị Ga-eme na Ihe Ị Na-agaghị Eme
    • Ihe Anyị Ji Ihe Ị Gwara Anyị Eme
    • Kpebie Ihe Ị Ga-agwa Anyị
    • JW.ORG
    • Banye
    Ziga ya