Ihe nke Atọ: Imekọ Ihe Ọnụ
“Abụọ dị mma karịa otu . . . Ọ bụrụ na otu n’ime ha adaa, onye nke ọzọ pụrụ ikulite ibe ya.”—Ekliziastis 4:9, 10.
Gịnị ka ọ pụtara? Di na nwunye ndị na-enwe obi ụtọ na-erube isi n’iwu Chineke nyere na Baịbụl banyere onye kwesịrị ịbụ onyeisi n’ezinụlọ. (Ndị Efesọs 5:22-24) Ha ma na imekọ ihe ọnụ ga-eme ka alụmdi na nwunye ha ka mma, ọ bụghị onye nke ọ bụla ime otú o si masị ya n’achọghị ịma banyere ibe ya. Ọ bụrụ na di na nwunye ana-emekọ ihe ọnụ, ha agaghị na-eme ka ndị na-alụbeghị di ma ọ bụ nwunye. Baịbụl kwuru na ha bụ “otu anụ ahụ́,” nke gosiri na di na nwunye ekwesịghị ịgbasa mgbe ọ bụla kama ha kwesịrị ịna-emekọ ihe ọnụ.—Jenesis 2:24.
Gịnị mere o ji dị mkpa? Ọ bụrụ na gị na di gị ma ọ bụ nwunye gị anaghị emekọ ihe ọnụ, obere ihe nwere ike ghọọrọ unu nnukwu nsogbu nke na kama ịchọwa otú unu ga-esi dozie nsogbu ahụ, unu esisawara ibe unu ọnwụ. Ma, ọ bụrụ na unu na-emekọ ihe ọnụ, unu ga-adị ka ọkwọ ụgbọelu abụọ na-agbakọ aka akwọ otu ụgbọelu, kama ịdị ka ọkwọ ụgbọelu abụọ nọ n’ụgbọelu dị iche ma na-achọ ịsọkọta isi. Unu nwee nghọtahie, chọọnụ ụzọ dozie ya kama ịnọ na-esegharị okwu.
Megodị ihe a. Jụọ onwe gị ajụjụ ndị a iji mara otú i si ele imekọ ihe ọnụ anya.
◼ Àna m ewere ego m na-akpata ka ego “naanị m” n’ihi na ọ bụ mụnwa kpatara ya?
◼ Àna m agbara ndị ọgọ m ma ọ bụ ụmụnne di m ọsọ, n’agbanyeghị na ha na di m ma ọ bụ nwunye m na-adị nnọọ ná mma?
◼ Ọ̀ na-abụ m chọọ izuru ezigbo ike, mụ agawa ebe di m ma ọ bụ nwunye m na-agaghị anọ ya?
Kpebie ihe ị ga-eme. Chegodị otu ụzọ ma ọ bụ ụzọ abụọ i nwere ike isi gosi na ị chọrọ ka gị na di gị ma ọ bụ nwunye gị na-emekọkwu ihe ọnụ.
Ọ́ gaghị adị mma ma ị jụọ di gị ma ọ bụ nwunye gị ihe ndị o chere unu nwere ike imekọ ọnụ?
[Foto dị na peeji nke 5]
Unu abụọ imekọ ihe ọnụ pụtara na unu ga-abụ ọkwọ ụgbọelu abụọ na-agbakọ aka akwọ otu ụgbọelu