Ọ́bá Akwụkwọ Anyị NKE DỊ N'ỊNTANET
Ọ́bá Akwụkwọ Anyị
NKE DỊ N'ỊNTANET
Igbo
Ọ
  • Á
  • á
  • À
  • à
  • É
  • é
  • È
  • è
  • Ì
  • ì
  • Í
  • í
  • Ị
  • ị
  • Ị̀
  • ị̀
  • Ị́
  • ị́
  • Ḿ
  • ḿ
  • M̀
  • m̀
  • Ṅ
  • ṅ
  • Ò
  • ò
  • Ó
  • ó
  • Ọ
  • ọ
  • Ọ̀
  • ọ̀
  • Ọ́
  • ọ́
  • Ù
  • ù
  • Ú
  • ú
  • Ụ
  • ụ
  • Ụ̀
  • ụ̀
  • Ụ́
  • ụ́
  • BAỊBỤL
  • AKWỤKWỌ NDỊ ANYỊ NWERE
  • ỌMỤMỤ IHE
  • g18 nke 2 p. 5
  • 2 Na-emekọnụ Ihe Ọnụ

O nweghị vidio dị maka ihe a ị họọrọ.

Ewela iwe, o nwetụrụ nsogbu gbochiri vidio a ịkpọ.

  • 2 Na-emekọnụ Ihe Ọnụ
  • Teta!—2018
  • Isiokwu Nta
  • Isiokwu Ndị Ọzọ Yiri Nke A
  • IHE Ọ PỤTARA
  • IHE MERE O JI DỊ MKPA
  • IHE I NWERE IKE IME
  • Ihe nke Atọ: Imekọ Ihe Ọnụ
    Teta!—2010
  • Otú Unu Ga-esi Na-ekpebi Ihe Ga-adị Unu Abụọ Mma
    Teta!—2015
  • “Ka Alụmdi na Nwunye Bụrụ Ihe Kwesịrị Nsọpụrụ”
    “Nọrọnụ n’Ịhụnanya Chineke”
  • Ihe Unu Ga-eme Ka Unu Ghara Ịgba Alụkwaghịm n’Agadi
    Ihe Ndị Ga-enyere Ezinụlọ Aka
Lee Ihe Ndị Ọzọ
Teta!—2018
g18 nke 2 p. 5
Ebe di na nwunye gbakọrọ aka na-anya ụgbọ elu

Imekọ ihe ọnụ ga-eme ka unu dịrị ka mmadụ abụọ gbakọrọ aka nyara ụgbọelu na-aga otu ebe

MAKA NDỊ DI NA NWUNYE

2 Na-emekọnụ Ihe Ọnụ

IHE Ọ PỤTARA

Ọ bụrụ na di na nwunye ana-emekọ ihe ọnụ, ha ga-adị ka mmadụ abụọ gbakọrọ aka nyara ụgbọelu na-aga otu ebe. Nsogbu dapụta, ha na-ejikọ aka dozie ya, onye nke ọ bụla anaghị emere otú dị ya mma.

IHE BAỊBỤL KWURU: “Ha abụkwaghị anụ ahụ́ abụọ, kama ha bụ otu anụ ahụ́.”—Matiu 19:6.

Otu nwoke aha ya bụ Christopher kwuru, sị: “Di na nwunye kwesịrị ịna-emekọ ihe ọnụ. Ha kwesịrị ịgbakọ aka na-eme ka alụmdi na nwunye ha sie ike.”

IHE MERE O JI DỊ MKPA

Ọ bụrụ na nsogbu adapụta n’ezinụlọ, ihe di na nwunye na-anaghị emekọ ihe ọnụ na-emekarị bụ ịta ibe ha ụta, kama ịchọwa otú a ga-esi dozie ya. Obere ihe na-aghọrọ ha nnukwu nsogbu.

Otu nwaanyị aha ya bụ Alexandra kwuru, sị: “Imekọ ihe ọnụ dị ezigbo mkpa n’alụmdi na nwunye. Ọ bụrụ na mụ na di m anaghị emekọ ihe ọnụ, anyị ga-adị ka mmadụ abụọ bi n’otu ọnụ ụlọ, ma onye nke ọ bụla ana-eme otú masịrị ya.”

IHE I NWERE IKE IME

CHEBARA IHE NDỊ A ECHICHE

  • M̀ na-ewere ego m na-akpata ka nke “naanị m”?

  • Ọ̀ bụ naanị mgbe di m ma ọ bụ nwunye m na-anọghị ya ka m na-atụsara ahụ́?

  • M̀ na-agbara ụmụnne di m ma ọ bụ ụmụnne nwunye m ọsọ n’agbanyeghị na ya na ha dị ná mma?

GỊ NA DI GỊ MA Ọ BỤ NWUNYE GỊ ZAA AJỤJỤ NDỊ A

  • Olee ihe ndị ọ na-abụ anyị mewe, anyị ejikọọ aka mee ha ka di na nwunye?

  • Olee ebe ndị anyị kwesịrị imezikwu ihe?

  • Olee ihe ndị anyị nwere ike ime ka anyị na-emekọkwu ihe ọnụ?

IHE NDỊ GA-ENYERE GỊ AKA

  • Weregodị ya na gị na di gị ma ọ bụ nwunye gị na-akụ tenis, onye nke ọ  bụla ana-achọ imeri ibe ya. Olee ihe ndị i nwere ike ime ka unu abụọ nọrọ n’otu akụkụ na-akụ?

  • Kama ị na-eche, sị, ‘Olee otú m ga-esi emeri?’ ọ ka mma ịna-eche, sị, ‘Olee otú anyị ga-esi emeri?’

Otu nwoke aha ya bụ Ethan kwuru, sị: “Unu nwee nghọtahie, kama ịchọwa onye ikpe mara na onye ikpe na-amaghị, ihe kacha mkpa bụ ịchọ otú unu ga-esi mee ka udo dịrị n’etiti unu.”

IHE BAỊBỤL KWURU: “Unu achọla ihe ga-adị naanị onwe unu mma, kama na-achọkwanụ ihe ga-adị ndị ọzọ mma.”—Ndị Filipaị 2:3, 4.

    Akwukwo Igbo (1984-2025)
    Pụọ
    Banye
    • Igbo
    • Ziga ya
    • Ịgbanwe Ihe
    • Copyright © 2025 Watch Tower Bible and Tract Society of Pennsylvania
    • Ihe Ị Ga-eme na Ihe Ị Na-agaghị Eme
    • Ihe Anyị Ji Ihe Ị Gwara Anyị Eme
    • Kpebie Ihe Ị Ga-agwa Anyị
    • JW.ORG
    • Banye
    Ziga ya