Okwu Mmeghe
O nweghị onye nsogbu na-anaghị abịara. O nwere ike ịbụ ọrịa, ihe mberede, ọdachi ndị na-emere onwe ha, ma ọ bụ imeso mmadụ ihe ike.
Ọtụtụ ndị chọrọ ịmata ihe mere anyị ji ata ahụhụ.
Ụfọdụ ndị na-ekwu na ahụhụ anyị na-ata si n’akara aka nakwa na o nweghị ihe anyị ga-emeli maka ya.
Ndị ọzọ kweere na karma. Ha na-ekwu na ihe mere mmadụ ji ata ahụhụ bụ n’ihi ihe ọjọọ onye ahụ mere mgbe ọ na-etolite ma ọ bụkwanụ nke o mere n’ụwa ya mbụ.
Nsogbu na-emekarị ka ndị mmadụ na-ajụ ọtụtụ ajụjụ. Ma, ha anaghị enwetacha azịza ha.