Ọ́bá Akwụkwọ Anyị NKE DỊ N'ỊNTANET
Ọ́bá Akwụkwọ Anyị
NKE DỊ N'ỊNTANET
Igbo
Ọ
  • Á
  • á
  • À
  • à
  • É
  • é
  • È
  • è
  • Ì
  • ì
  • Í
  • í
  • Ị
  • ị
  • Ị̀
  • ị̀
  • Ị́
  • ị́
  • Ḿ
  • ḿ
  • M̀
  • m̀
  • Ṅ
  • ṅ
  • Ò
  • ò
  • Ó
  • ó
  • Ọ
  • ọ
  • Ọ̀
  • ọ̀
  • Ọ́
  • ọ́
  • Ù
  • ù
  • Ú
  • ú
  • Ụ
  • ụ
  • Ụ̀
  • ụ̀
  • Ụ́
  • ụ́
  • BAỊBỤL
  • AKWỤKWỌ NDỊ ANYỊ NWERE
  • ỌMỤMỤ IHE
  • g20 nke 2 p. 14-15
  • 5. Ò Nwere Mgbe Ahụhụ Ga-akwụsị?

O nweghị vidio dị maka ihe a ị họọrọ.

Ewela iwe, o nwetụrụ nsogbu gbochiri vidio a ịkpọ.

  • 5. Ò Nwere Mgbe Ahụhụ Ga-akwụsị?
  • Teta!—2020
  • Isiokwu Nta
  • Isiokwu Ndị Ọzọ Yiri Nke A
  • Ihe Mere O Ji Dị Mkpa Ịmata Azịza Ya
  • Ihe Ị Ga-echebara Echiche
  • Ihe Baịbụl Kwuru
  • Gịnị Ka Baịbụl Kwuru?
    Ụlọ Nche Nke Na-ekwusa Alaeze Jehova (Nke Ọhaneze)—2017
  • Ahụhụ Ụmụ Mmadụ Na-ata
    Teta!—2015
  • Ajụjụ nke Atọ: Gịnị Mere I Ji Hapụ M Ka M Na-ata Ahụhụ?
    Ụlọ Nche Ikwupụta Alaeze Jehova—2012
  • Nsogbu Zuru Ụwa Ọnụ, Ngwọta Zuru Ụwa Ọnụ
    Ụlọ Nche Ikwupụta Alaeze Jehova—2009
Lee Ihe Ndị Ọzọ
Teta!—2020
g20 nke 2 p. 14-15
Ebe otu ezinụlọ nọ n’akụkụ mmiri na-ekpori ndụ. Ha na ibe ha na-achị ọchị ma na-ezuru ike.

5. Ò Nwere Mgbe Ahụhụ Ga-akwụsị?

Ihe Mere O Ji Dị Mkpa Ịmata Azịza Ya

Ọ bụrụ na o nwere ihe gosiri na ahụhụ ga-emecha kwụsị, o nwere ike ime ka otú anyị si ele ihe anya kakwuo mma, anyị agaghịkwa na-ata Chineke ụta.

Ihe Ị Ga-echebara Echiche

Ọtụtụ ndị ga-achọ ime ka ahụhụ ụwa a bie, mana ha agaghị emeli ya. Chegodị banyere ihe ndị a:

N’agbanyeghị ọganihu ụmụ mmadụ nwerela n’ihe gbasara ọgwụ . . .

  • Ọrịa obi ka bụ ihe kacha akpata ọnwụ ụmụ mmadụ.

  • Ọrịa kansa na-egbu ọtụtụ nde mmadụ kwa afọ.

  • N’akwụkwọ bụ́ Frontiers in Immunology, otu nwoke aha ya bụ Dr. David Bloom kwuru, sị: “Ọrịa ndị dị kemgbe ụwa, ndị nke ọhụrụ, na ndị nke na-eme ha nọtụ ha alọghachi, ka na eyi ụmụ mmadụ egwu.”

N’agbanyeghị na mba ụfọdụ bara ezigbo ọgaranya . . .

  • Kwa afọ, ọtụtụ nde ụmụaka na-anwụ, karịchaa, ụmụaka ndị bi ná mba ndị dara ogbenye.

  • Ọtụtụ ijeri mmadụ enweghị ebe dị mma a na-aga mposi ma ọ bụ ebe a na-ekpofu unyi.

  • Ọtụtụ narị nde mmadụ enweghị ebe ha ga-enweta ezigbo mmiri dị ọcha.

N’agbanyeghị na ọtụtụ ndị amatala gbasara ihe ndị ruuru mmadụ . . .

  • Otu akụkọ sị n’aka Òtù Mba Ụwa kwuru na a ka na-atụ mgbere mmadụ n’ọtụtụ obodo. Ọ ga-abụ na mba ndị hapụrụ ndị na-akpa arụ a amaghị na ụdị ihe ahụ na-eme n’obodo ha, ma ọ bụkwanụ ya abụrụ na ha enweghị ihe ndị ga-enyere ha aka ịkpara ndị a aka.

    MỤTAKWUO IHE NDỊ ỌZỌ

    Lee vidio bụ́ Gịnị Bụ Alaeze Chineke? Ọ dị na jw.org.

Ihe Baịbụl Kwuru

Ihe banyere anyị na-emetụ Chineke n’obi.

Ahụhụ anyị na-ata na nsogbu anyị nọ na ya na-ewute ya.

‘Chineke adịghị eleda mmekpa ahụ́ nke onye nọ n’ahụhụ anya, ọ dịghịkwa eleghara ya anya; o wepụghịkwa ihu ya n’ebe ọ nọ, mgbe o tikuru ya maka enyemaka, ọ nụrụ.’​—ABỤ ỌMA 22:24.

“Na-atụkwasịnụ ya nchegbu unu niile, n’ihi na ihe banyere unu na-emetụ ya n’obi.”​—1 PITA 5:7.

Ahụhụ agaghị adịgide ruo ebighị ebi.

Baịbụl kwere anyị nkwa na Chineke ga-emecha mezuo ihe o bu n’obi kee anyị.

“Chineke . . . ga-ehichapụkwa anya mmiri niile n’anya ha, ọnwụ agaghị adị ọzọ, iru uju ma ọ bụ mkpu ákwá ma ọ bụ ihe mgbu agaghịkwa adị ọzọ.”​—MKPUGHE 21:​3, 4.

Chineke ga-ewepụ ihe niile na-akpatara ụmụ mmadụ ahụhụ.

Ọ ga-eji Alaeze ya mee ya. Baịbụl gosiri na Alaeze Chineke bụ ọchịchị dị adị.

“Chineke nke eluigwe ga-eme ka otu alaeze nke a na-agaghị ebibi ebibi malite ịchị. A gaghịkwa enyefe ndị ọ bụla ọzọ alaeze ahụ. . . . Ma ya onwe ya ga-adịru mgbe ebighị ebi.”​—DANIEL 2:44.

Ò Nwere Mgbe Ahụhụ Ga-akwụsị?

Ee, mana ọ bụghị ụmụ mmadụ ga-eme ya. Naanị ihe ọchịchị ụmụ mmadụ ga-emeli bụ ibelata nsogbu ụfọdụ a na-enwe. Ọ bụ naanị Chineke ga-eme ka ihe niile na-akpata nsogbu kwụsị. Ọ bụkwa Alaeze ya ka ọ ga-eji eme ya.

    Akwukwo Igbo (1984-2025)
    Pụọ
    Banye
    • Igbo
    • Ziga ya
    • Ịgbanwe Ihe
    • Copyright © 2025 Watch Tower Bible and Tract Society of Pennsylvania
    • Ihe Ị Ga-eme na Ihe Ị Na-agaghị Eme
    • Ihe Anyị Ji Ihe Ị Gwara Anyị Eme
    • Kpebie Ihe Ị Ga-agwa Anyị
    • JW.ORG
    • Banye
    Ziga ya