Ọ́bá Akwụkwọ Anyị NKE DỊ N'ỊNTANET
Ọ́bá Akwụkwọ Anyị
NKE DỊ N'ỊNTANET
Igbo
Ọ
  • Á
  • á
  • À
  • à
  • É
  • é
  • È
  • è
  • Ì
  • ì
  • Í
  • í
  • Ị
  • ị
  • Ị̀
  • ị̀
  • Ị́
  • ị́
  • Ḿ
  • ḿ
  • M̀
  • m̀
  • Ṅ
  • ṅ
  • Ò
  • ò
  • Ó
  • ó
  • Ọ
  • ọ
  • Ọ̀
  • ọ̀
  • Ọ́
  • ọ́
  • Ù
  • ù
  • Ú
  • ú
  • Ụ
  • ụ
  • Ụ̀
  • ụ̀
  • Ụ́
  • ụ́
  • BAỊBỤL
  • AKWỤKWỌ NDỊ ANYỊ NWERE
  • ỌMỤMỤ IHE
  • g22 nke 1 p. 7-9
  • 2 | Ghara Ịna-emefusị Ego Gị

O nweghị vidio dị maka ihe a ị họọrọ.

Ewela iwe, o nwetụrụ nsogbu gbochiri vidio a ịkpọ.

  • 2 | Ghara Ịna-emefusị Ego Gị
  • Teta!—2022
  • Isiokwu Nta
  • Isiokwu Ndị Ọzọ Yiri Nke A
  • IHE MERE O JI DỊ MKPA
  • Ihe I Kwesịrị Ịma
  • Ihe Ndị I Nwere Ike Ime Ugbu A
  • Ijizi Ego Ejizi
    Ụlọ Nche Ikwupụta Alaeze Jehova—2009
  • Otú Unu Ga-esi Kwụọ Ụgwọ Unu Ji
    Ụlọ Nche Ikwupụta Alaeze Jehova—2012
  • Otú Unu Ga-esi Hazie Ihe Unu Na-eji Ego Unu Eme
    Unu Ga-enweli Obi Ụtọ n’Ezinụlọ Unu
  • Otú Ị ga-esi Jiri Ego Gị Na-eme Ihe Bara Uru
    Teta!—2012
Lee Ihe Ndị Ọzọ
Teta!—2022
g22 nke 1 p. 7-9
Ebe kapịnta na-akụba ntu n’osisi.

N’ỤWA A NSOGBU JURU

2 | Ghara Ịna-emefusị Ego Gị

IHE MERE O JI DỊ MKPA

Ọtụtụ ndị na-arụsi ọrụ ike kwa ụbọchị iji nweta naanị ihe ndị dị ha oké mkpa. Ma, ọ dị mwute na ụwa a nsogbu juru na-eme ka ịkpata ihe afọ ga-eri na-esikwu ike. Gịnị mere o ji dị otú ahụ?

  • E nwee ọgba aghara n’obodo, ihe niile na-arị elu ọjị, ma ihe oriri ma ụgwọ ụlọ.

  • Nsogbu nwere ike ime ka o sikwuo ike inweta ọrụ ma ọ bụ ka ụgwọ a na-akwụ ndị ọrụ belata.

  • Ọdachi nwere ike imebi ma ọ bụ laa ahịa, ụlọ ọrụ, ụlọ, ma ọ bụ ihe ndị ọzọ ndị mmadụ nwere n’iyi, mezie ka ọtụtụ ndị daa ogbenye.

Ihe I Kwesịrị Ịma

  • Ọ bụrụ na ị naghị emefusị ego gị, ọ ga-adịrị gị mfe ịma ihe i kwesịrị iji ego nke i nwere enwe na-eme n’oge nsogbu.

  • Na mmadụ nwere ego taa apụtaghị na ọ ga-enwe echi. E nwere ike ego mmadụ na-akpata na nke o nwere n’ụlọ akụ̀ agaghịzi azụtali ezigbo ihe. E nwekwara ike akụ̀ ndị o nwere agaghịzi adata ezigbo ego.

  • E nwekwara ihe ndị mmadụ na-agaghị ejili ego zụta, dị ka obi ụtọ na ịdị n’otu n’ezinụlọ.

Ihe Ndị I Nwere Ike Ime Ugbu A

Baịbụl sịrị: “Ihe oriri na uwe anyị nwere kwesịrị iju anyị afọ.”​—1 Timoti 6:8.

Ihe anyị nwere iju anyị afọ pụtara na ọ bụghị ihe ọ bụla gụrụ anyị ka anyị ga-achọwa. Obi ga-adịkwa anyị ụtọ ma anyị nwetahaala ihe ndị dị anyị mkpa n’ụbọchị, karịchaa, n’oge anyị na-enwechaghị ego na-ezuru anyị.

Onye ihe o nwere juru afọ kwesịrị ịmụta iselata aka n’otú o si azụ ihe. Ọ bụrụ na ị na-emefu ego karịrị ego ole ị na-akpata, nsogbu gị ga-aka njọ.

OTÚ Ị GA-ESI DIE NSOGBU​—Ihe Ndị Ga-enyere Gị Aka

N’oge nsogbu, na-eme ihe ndị a ka ị ghara imefusị ego gị

SELATA AKA N’OTÚ I SI AZỤ IHE

  • Ebe otu nwaanyị katarala ahụ́ na-ewere ihe ọ kụrụ n’ubi akwụkwọ nri ya.

    Selata aka n’ihe ndị ị na-azụ

    Azụla uwe ọhụrụ ma ọ bụ gbanwee ihe ndị i nwebu enwe. Jụọ onwe gị, sị: ‘M̀ nwere ike ịhapụgodị ịkwọ ụgbọala? M̀ nwere ike inwe ubi ebe m ga na-akọ akwụkwọ nri?’

  • Tupu gị azụọ ihe, jụọ onwe gị, sị: ‘Ihe a ọ̀ dị m ezigbo mkpa? M̀ ga-azụli ya?’

  • Tinye akwụkwọ ka ndị gọọmenti ma ọ bụ ndị na-agbatara ndị mmadụ ọsọ enyemaka nyere gị aka, ma ọ bụrụ na a na-eme ụdị ihe a n’obodo unu.

“Ezinụlọ anyị nọ ọdụ leba anya n’otú anyị si emefu ego. Anyị selatara aka n’ihe ndị anyị ji atụrụ ndụ na-efu anyị ego ma ọ bụ kwụsịchaa ha. Anyị malitekwara isi nri ndị na-agaghị efu anyị oké ego.”​—Gift.

KPEBIE EGO OLE Ị GA-EMEFU

Ebe otu nwaanyị na-edenye ego ole o mefuru n’akwụkwọ. Ihe o ji agbakọ ego dị na tebụl ya.

Kpebie ego ole ị ga-emefu

Baịbụl sịrị: “Atụmatụ onye na-arụsi ọrụ ike ga-eme ka ihe gaziere ya. Ma ndị niile ọ na-adị ngwa ngwa na-ada ogbenye.” (Ilu 21:5) Ikpebi ego ole ị ga-emefu ga-enyere gị aka ka ị ghara ịna-emefu ego karịrị ego ole ị na-enweta.

  • Ihe mbụ ị ga-eme bụ idepụta ego ole i chere ị na-enweta n’ọnwa.

  • Ihe nke abụọ ị ga-eme bụ idepụta ego ole ị na-emefu ugbu a n’ọnwa na ileru ihe ndị na-eri gị ego anya.

  • Ihe ọzọ ị ga-eme bụ ile ego ole ị na-enweta na ego ole ị na-emefu. Ọ bụrụ na ọ dị mkpa, chọpụta ihe ndị na-eri gị ego i nwere ike ịkwụsị ma ọ bụ belata.

“Kwa ọnwa, anyị na-edepụta ego ole anyị na-atụ anya inweta na ego ole anyị na-atụ anya imefu. Anyị na-agbalị ka anyị na-ewepụtatụ ego maka ihe gbata gbata nakwa maka ihe ndị anyị ga-azụ n’ọdịnihu. Ime ihe a na-eme ka anyị ghara ịna-echegbukarị onwe anyị n’ihi na anyị eburula ụzọ mara ihe ndị ga-eri anyị ego.”​—Carlos.

EJILA ỤGWỌ / NA-ECHEKWA EGO GỊ

  • Ebe otu nwaanyị na-enyere nwa ya nwaanyị aka ka o tinye ego n’ololo ha ji echekwa ego.

    Ejila ụgwọ / na-echekwa ego gị

    Mara ihe ndị i kwesịrị ime ka ị ghara ịna-eji ụgwọ. Ọ bụrụ na ọ ga-ekwe gị, agbazila ego. Kama, jiri nwayọọ chekwawa ego gị ruo mgbe o zuru ihe ị chọrọ ịzụ.

  • Na-edowe obere oge kwa ọnwa maka ihe ndị ga-eri gị ego n’ọdịnihu, ma ihe ndị ị na-atụ anya ha ma ndị ị na-anaghị atụ anya ha.

NA-ARỤSI ỌRỤ IKE / EJILA ỌRỤ GỊ EGWU EGWU

Baịbụl sịrị: “Mmadụ na-erite uru ma ọ bụrụ na ọ na-arụsi ọrụ ike.”​—Ilu 14:23.

  • Ebe kapịnta na-akụba ntu n’osisi.

    Na-arụsi ọrụ ike / ejila ọrụ gị egwu egwu

    Jiri ọrụ gị kpọrọ ihe. Ọ bụrụgodị na ọrụ ị na-arụ ugbu a abụghị ụdị ọrụ ị chọrọ ịrụ, cheta na ọ bụ ya ka i ji akpa afọ gị.

  • Na-arụsi ọrụ ike, na-arụkwa ya otú ga-eme ka ndị ọzọ tụkwasị gị obi. O nwere ike ime ka a ghara ịchụ gị n’ọrụ. Ma é nweghị ihe ọzọ, a chụgodị gị, o nwere ike ime ka i nweta ọrụ ọzọ ngwa ngwa.

“M na-arụ ọrụ ọ bụla m nwetara, ọ bụrụgodị na ọrụ ahụ amasịghị m ma ọ bụkwanụ na ego a na-akwụ m erughị ihe m tụrụ anya ya. M na-eji ọrụ m akpọrọ ihe mgbe niile ma na-arụ ya nke ọma ka à ga-asị na ọ bụ ọrụ nke m ka m na-arụ.”​—Dmitriy.

Ọ bụrụ na ị na-achọ ọrụ . . .

  • Jiri aka gị chọwa ndị chọrọ onye ga-arụrụ ha ọrụ. Kpọtụrụ ụlọ ọrụ ebe a na-arụ ọrụ ị ga-arụli, ọ bụrụgodị na ha ekwughị na ha chọrọ ndị ọrụ. Gwa ndị ikwu na ibe gị na ị na-achọ ọrụ.

  • Dị njikere ịrụ ọrụ dapụtaranụ. I nwere ike ị gaghị enweta ụdị ọrụ ị chọrọ.

Ebe di na nwunye na-akparịta otú ha si emefu ego ka ụmụ ha nọ n’azụ ụlọ na-egwu egwu.

MỤTAKWUO IHE NDỊ ỌZỌ. Gụọkwa isiokwu bụ́ “Ihe Ga-enyere Gị Aka ma Ego Na-abata Gị Aka Dịzie Obere.”

    Akwukwo Igbo (1984-2025)
    Pụọ
    Banye
    • Igbo
    • Ziga ya
    • Ịgbanwe Ihe
    • Copyright © 2025 Watch Tower Bible and Tract Society of Pennsylvania
    • Ihe Ị Ga-eme na Ihe Ị Na-agaghị Eme
    • Ihe Anyị Ji Ihe Ị Gwara Anyị Eme
    • Kpebie Ihe Ị Ga-agwa Anyị
    • JW.ORG
    • Banye
    Ziga ya