Ilu
14 Nwaanyị ma ihe na-eme ka ihe na-aga nke ọma n’ezinụlọ ya,+
Ma nwaanyị nzuzu na-eji aka ya aghasa ezinụlọ ya.
3 Okwu ọjọọ onye nzuzu na-ekwu dị ka ụtarị,
Ma ihe ndị ma ihe na-ekwu ga-echebe ha.
4 N’ebe a na-enweghị ehi, ihe e ji etinyere ehi nri na-adị ọcha,
Ma otú oké ehi si arụsi ọrụ ike na-eme ka ihe a na-eweta n’ubi buo ibu.
6 Onye na-akwa emo na-achọ ka ọ mara ihe, ma ọ naghị ama ihe.
Ma ọ na-adịrị onye na-aghọta ihe mfe ịmụta ihe.+
10 Ọ bụ onye ihe na-ewute ma ihe na-ewute ya n’obi,
Onye ọzọ enweghịkwa ike ịghọta obi ụtọ mmadụ na-enwe.
13 Mmadụ nwere ike na-achị ọchị mgbe obi na-adịghị ya mma,
Onye na-aṅụrị ọṅụ nwekwara ike ruwezie uju.
14 Onye obi ya na-adịghị n’ime ihe dị mma ga-ata ahụhụ ihe ndị ọ na-eme,+
Ma ezigbo mmadụ ga-eri uru ihe ndị ọ na-eme.+
15 Onye na-amaghị ihe na-ekweta ihe niile e kwuru,
Ma onye ma ihe na-echebara ihe ọ bụla ọ chọrọ ime echiche.+
16 Onye ma ihe na-akpachapụ anya, ọ naghịkwa etinye aka n’ihe ọjọọ.
Ma onye nzuzu anaghị akpachapụ anya,* ọ tụkwasịkwara onwe ya obi.
19 Ndị ọjọọ ga-akpọrọ ndị ezigbo mmadụ isiala,
Ndị ajọ omume ga-akpọkwa isiala n’ọnụ ụzọ ámá ndị ezi omume.
20 Ndị mmadụ na-akpọ ogbenye asị, ndị agbata obi ya na-akpọdị ya asị.+
Ma ọgaranya na-enwe ọtụtụ ndị enyi.+
21 Onye na-eleda onye agbata obi ya anya na-eme mmehie,
Ma onye na-emetere ndị ọ na-enweghị ka ọ hà ha ebere na-enwe obi ụtọ.+
22 Ọ̀ bụ na ndị na-akpa nkata ọjọọ agaghị akpafu?
Ma a ga-ahụ ndị na-agbalị ka ha mee ihe dị mma n’anya, tụkwasịkwa ha obi.+
23 Mmadụ na-erite uru ma ọ bụrụ na ọ na-arụsi ọrụ ike,
Ma mmadụ ịna-ekwu naanị okwu ga-eme ka ọ daa ogbenye.+
25 Onye akaebe nke na-ekwu eziokwu na-azọ mmadụ ndụ,
Ma ihe juru onye na-aghọ aghụghọ ọnụ bụ ụgha.
27 Ịtụ egwu Jehova na-eme ka mmadụ dị ndụ,
Ọ na-emekwa ka mmadụ ghara ịba ná nsogbu ga-ata isi ya.
29 Onye na-anaghị ewe iwe ọsọ ọsọ na-aghọta ihe nke ọma,+
Ma onye na-anaghị enwe ndidi na-egosi na ọ dị nzuzu.+
30 Ahụ́ na-adị mmadụ mma ma obi ruo ya ala,
Ma anyaụfụ dị ka ọrịa nke na-eme ka ọkpụkpụ mmadụ na-ere ure.+
31 Onye na-erigbu onye ọ na-enweghị ka ọ hà ya na-akparị Onye kere ya,+
Ma onye na-emetere ogbenye ebere na-eto Onye kere ya.+