Ọ́bá Akwụkwọ Anyị NKE DỊ N'ỊNTANET
Ọ́bá Akwụkwọ Anyị
NKE DỊ N'ỊNTANET
Igbo
Ọ
  • Á
  • á
  • À
  • à
  • É
  • é
  • È
  • è
  • Ì
  • ì
  • Í
  • í
  • Ị
  • ị
  • Ị̀
  • ị̀
  • Ị́
  • ị́
  • Ḿ
  • ḿ
  • M̀
  • m̀
  • Ṅ
  • ṅ
  • Ò
  • ò
  • Ó
  • ó
  • Ọ
  • ọ
  • Ọ̀
  • ọ̀
  • Ọ́
  • ọ́
  • Ù
  • ù
  • Ú
  • ú
  • Ụ
  • ụ
  • Ụ̀
  • ụ̀
  • Ụ́
  • ụ́
  • BAỊBỤL
  • AKWỤKWỌ NDỊ ANYỊ NWERE
  • ỌMỤMỤ IHE
  • gt isi 85
  • Ịchọ Ihe Furu Efu

O nweghị vidio dị maka ihe a ị họọrọ.

Ewela iwe, o nwetụrụ nsogbu gbochiri vidio a ịkpọ.

  • Ịchọ Ihe Furu Efu
  • Nwoke Kasị Ukwuu nke Dịworo Ndụ
  • Isiokwu Ndị Ọzọ Yiri Nke A
  • Ịṅụrị Ọṅụ n’Ihi Onye Mmehie Chegharịrịnụ
    Jizọs Bụ Ụzọ, Eziokwu, na Ndụ
  • Ị̀ Ga-eṅomi Obi Ebere Chineke?
    Ụlọ Nche Ikwupụta Alaeze Jehova—1991
  • ‘Mụtanụ Ihe n’Ọnụ M’
    Ụlọ Nche Ikwupụta Alaeze Jehova—2001
  • Ọkpụkpọ Òkù A Kpọrọ Matiu
    Nwoke Kasị Ukwuu nke Dịworo Ndụ
Lee Ihe Ndị Ọzọ
Nwoke Kasị Ukwuu nke Dịworo Ndụ
gt isi 85

Isi 85

Ịchọ Ihe Furu Efu

JISỌS nwere ọchịchọ siri ike nke ịchọta ndị ga-eji obi umeala jeere Chineke ozi. Ya mere ọ na-eme nchọpụta ma na-agwa onye ọ bụla okwu banyere Alaeze ahụ, tinyere ndị mmehie a ma ama. Ụdị ndị ahụ na-abịaru nso ugbu a ige ya ntị.

Mgbe ha hụrụ nke a, ndị Farisii na ndị odeakwụkwọ kọchara Jisọs n’ihi na ọ na-esonyere ndị ha lere anya na ha ekwesịghị ekwesị. Ha na-atamu, sị: “Nwoke a na-anara ndị mmehie nke ọma, na-esokwa ha eri ihe.” Lee otú nke a si bụrụ ihe dị ala nke ukwuu ma e jiri ya tụnyere ọnọdụ ha dị elu! Ndị Farisii na ndị odeakwụkwọ na-emeso ndị nkịtị dị ka unyi dị n’okpuru ụkwụ ha. N’ezie, ha na-eji okwu Hibru bụ ‛am ha·’aʹrets, nke bụ “ndị ala [ụwa]” eme ihe iji gosi otú ha si ledaa ụdị ndị ahụ anya.

N’aka nke ọzọ, Jisọs na-emeso onye ọ bụla n’ụzọ nsọpụrụ, obi ebere, na ọmịiko. N’ihi nke a, ọtụtụ n’ime ndị a e wedara n’ala, tinyere ndị a maara nke ọma na ha na-eme mmehie chọrọ ige ya ntị. Ma oleekwanụ banyere nkọcha ndị Farisii kọchara Jisọs n’ihi itinye mgbalị iji meere ndị ahụ ha lere anya na ha ekwesịghị ekwesị ihe?

Jisọs na-azaghachi ha site n’iji otu ilu mee ihe. O ji ụzọ echiche nke ndị Farisii kwuo okwu, dị ka a ga-asị na ha bụ ndị ezi omume ma bụrụkwa ndị nọ n’ìgwè nke ndị Chineke, ebe ndị ‛am ha·’aʹrets ahụ rụrụ arụ bụ ndị kpafuworo akpafu ma nọrọ n’ọnọdụ nke ndị furu efu. Gee ntị ka ọ na-ajụ, sị:

“Olee mmadụ di n’etiti unu, nke nwere [otu narị atụrụ], ma otu n’ime ha funahụrụ ya, nke na-ahapụghị [iri itoolu na itoolu] ahụ n’ọhịa, gaa soo nke furu efu, ruo mgbe ọ ga-achọpụta ya? Mgbe ọ chọpụtaworo ya, o wee tụkwasị ya n’ubu ya abụọ, na-aṅụrị. Mgbe ọ bịaworo n’ụlọ, o wee kpọkọta ndị enyi ya na ndị agbata obi ya, sị ha, Soonụ m ṅụrịa ọṅụ, n’ihi na achọpụtawo m atụrụ m furu efu.”

Mgbe ahụ Jisọs kọwara isi akụkọ ya, na-asị: “Asị m unu, na otú a ọṅụ ga-adị n’eluigwe n’isi otu onye mmehie nke na-echegharị, karịa n’isi [iri itoolu na itoolu] ndị ezi omume, ndị nchegharị na-adịghị mkpa.”

Ndị Farisii na-ele onwe ha anya dị ka ndị ezi omume, sikwa otú a bụrụ ndị ọ na-adịghị mkpa ichegharị. Mgbe ụfọdụ n’ime ha kọchara Jisọs afọ ole na ole tupu mgbe ahụ n’ihi isoro ndị na-ana ụtụ na ndị mmehie rie ihe, ọ gwara ha, sị: “Abịaghị m ịkpọ ndị ezi omume, kama ọ bụ ndị mmehie.” Ndị Farisii ahụ bụ ndị ezi omume n’anya nke onwe ha, ndị na-ahụghị mkpa ọ dị ha ichegharị, adịghị akpata ọṅụ ọ bụla n’eluigwe. Ma ndị mmehie chegharịrị n’ezie na-akpata ọṅụ.

Iji mesie okwu ahụ ike okpukpu abụọ na iweghachite ndị mmehie furu efu bụ ihe na-akpata oké ọṅụ, Jisọs tụrụ ilu ọzọ. Ọ na-asị: “Olee nwanyị nke nwere shilling iri, ọ bụrụ na otu shilling efunahụ ya, na-amụnyeghị oriọna, zaa ụlọ ya, chọsie ike ruo mgbe ọ ga-achọpụta ya? Mgbe ọ chọpụtaworo ya, o wee kpọkọta ndị enyi ya na ndị agbata obi ya, sị, Soonụ m ṅụrịa ọṅụ, n’ihi na achọpụtawo m shilling nke funahụworo m.”

Mgbe ahụ Jisọs jikwa nke a mee ihe n’otu aka ahụ. Ọ gara n’ihu ịsị: “Asị m unu, na otú a ọṅụ dị n’ihu ndị mmụọ ozi Chineke n’isi otu onye mmehie nke na-echegharị.”

Lee ihe kwesịrị ịrịba ama ọ bụ, bụ́ nchegbu ịhụnanya nke ndị mmụọ ozi Chineke na-enwe ná mweghachi nke ndị mmehie furu efu! Ọ dị otú ahụ karịsịa ebe ọ bụ na ndị a e wedara n’ala na mbụ, bụ́ ndị ‛am ha·’aʹrets a kpọrọ asị mesịrị n’ikpeazụ soro ná ndị ga-anọ n’Alaeze eluigwe nke Chineke. N’ihi nke a, ha na-enweta ọnọdụ karịrị nke ndị mmụọ ozi ahụ n’onwe ha n’eluigwe! Ma kama inwe mmetụta nke ekworo ma ọ bụ ịbụ ndị e ledara anya, ndị mmụọ ozi ahụ ji obi umeala na-aghọta na ụmụ mmadụ ndị a bụ ndị mmehie echewo ihu ma merie ọnọdụ dị iche iche ná ndụ, bụ́ nke ga-enyere ha aka ije ozi n’eluigwe dị ka ndị eze na ndị nchụàjà nwere ọmịiko ma dị obi ebere. Luk 15:​1-10; Matiu 9:13; 1 Ndị Kọrint 6:​2, 3; Mkpughe 20:⁠6.

▪ N’ihi gịnị ka Jisọs ji soro ndị mmehie a ma ama na-emekọ ihe, oleekwa nkọcha ọ na-anata site n’aka ndị Farisii?

▪ Olee otú ndị Farisii si ele ndị nkịtị anya?

▪ Ilu dị aṅaa ka Jisọs ji mee ihe, gịnịkwa ka anyị pụrụ ịmụta site na ha?

▪ N’ihi gịnị ka ọṅụ ndị mmụọ ozi ji kwesị ịrịba ama?

    Akwukwo Igbo (1984-2025)
    Pụọ
    Banye
    • Igbo
    • Ziga ya
    • Ịgbanwe Ihe
    • Copyright © 2025 Watch Tower Bible and Tract Society of Pennsylvania
    • Ihe Ị Ga-eme na Ihe Ị Na-agaghị Eme
    • Ihe Anyị Ji Ihe Ị Gwara Anyị Eme
    • Kpebie Ihe Ị Ga-agwa Anyị
    • JW.ORG
    • Banye
    Ziga ya