Isi 95
Ihe Mmụta Banyere Ịgba Alụkwaghịm na Ịhụ Ụmụntakịrị n’Anya
JISỌS na ndị na-eso ụzọ ya nọ n’ụzọ na-eje Jerusalem ịga mee Ememe Ngabiga nke afọ 33 O.A. Ha gafere Osimiri Jọdan wee soro ụzọ nke gabigara ógbè Perea. Jisọs nọ na Perea izu ole na ole tupu mgbe ahụ, ma a kpọrọ ya ịbịa Judia n’oge ahụ n’ihi na enyi ya nwoke bụ Lazarọs na-arịa ọrịa. Mgbe ọ nọ na Perea, Jisọs gwara ndị Farisii okwu banyere ịgba alụkwaghịm, ma ugbu a ha na-eweliteghachi okwu ahụ ọzọ.
N’etiti ndị Farisii, e nwere ụdị echiche dị iche iche banyere ịgba alụkwaghịm. Mosis kwuru na a pụrụ ịgba nwanyị alụkwaghịm n’ihi na a “hụwo ihe na-ekwesịghị ekwesị n’ahụ ya.” Ụfọdụ ndị na-eche na nke a na-ezo aka nanị n’ebe omume rụrụ arụ dị. Ma ndị ọzọ na-eche na “ihe na-ekwesịghị ekwesị” gụnyere ụmụ obere iwu ndị ọ pụrụ ịda. Ya mere, iji nwaa Jisọs, ndị Farisii ahụ na-ajụ, sị: “Ò ziri ezi n’iwu ka nwoke hapụ nwunye ya n’ihi ihe nile ọ bụla?” Ha ji n’aka na ihe ọ bụla Jisọs kwuru ga-etinye ya ná nsogbu n’ebe ndị Farisii nọ, bụ́ ndị nwere echiche dị iche.
Jisọs ji nkà lebara ajụjụ ahụ anya, n’enweghị echiche mmadụ nke ọ bụla ọ kwadoro, ma na-ezo aka laghachi ná ndokwa mbụ e mere maka alụmdi na nwunye. Ọ na-ajụ sị, “Ùnu agụghị na onye kere ha site ná mmalite mere ha nwoke na nwanyị, wee sị, N’ihi nke a ka nwoke ga-ahapụ nna ya na nne ya, rapara n’ahụ nwunye ya; ha abụọ ewee ghọọ otu anụ ahụ? Ya mere ha abụghịkwa mmadụ abụọ ọzọ, kama ọ bụ otu anụ ahụ. Ya mere, ihe Chineke kekọtara, mmadụ atọsala.”
Jisọs na-egosi na nzube mbụ nke Chineke bụ ka di na nwunye rapara n’otu, ka ha ghara ịgba alụkwaghịm. Ndị Farisii ahụ zaghachiri na ọ bụrụ otú ahụ, “gịnịkwa ka Mosis ji nye iwu inye akwụkwọ nkewa, na ịhapụ ya?”
Jisọs na-aza, sị: “Ọ bụ n’ihi obi etili unu ka Mosis kwere ka unu hapụ nwunye unu: ma site ná mmalite adịghị eme otú ahụ.” Ee, mgbe Chineke guzobere ụkpụrụ ziri ezi maka alụmdi na nwunye n’ogige Iden, o nyeghị ohere ọ bụla maka ịgba alụkwaghịm.
Jisọs gara n’ihu ịgwa ndị Farisii ahụ, sị: “Onye ọ bụla nke ga-ahapụ nwunye ya, ma ọ bụghị n’ihi ịkwa iko [site n’asụsụ Grik, bụ́ por·neiʹa], lụrụkwa nwunye ọzọ, ọ na-akwa iko.” O si otú a gosi na por·neiʹa, nke bụ omume mmekọahụ na-adịghị ọcha nke jọgburu onwe ya, bụ nanị ọnọdụ Chineke kwadoro maka ịgba alụkwaghịm.
N’ịghọta na alụmdi na nwunye kwesịrị ịbụ njikọ na-adịgide adịgide nke nwere nanị ọnọdụ nke a maka ịgba alụkwaghịm, a kpaliri ndị na-eso ụzọ ahụ ikwu, sị: “Ọ bụrụ na okwu dị otú a n’etiti nwoke na nwunye ya, ọ baghị uru ịlụ nwanyị.” Ajụjụ ọ bụla adịghị ya na onye ọ bụla nke na-eche echiche ịlụ di ma ọ bụ nwunye kwesịrị ịtụlesi ike ọnọdụ na-adịgide adịgide nke nkekọ alụmdi na nwunye!
Jisọs gara n’ihu ikwu okwu banyere mmadụ ịnọ n’alụghị di ma ọ bụ nwunye. Ọ kọwara na a na-amụ ụmụ okoro ụfọdụ dị ka ndị ọnozi, bụ́ ndị na-enweghị ike ịlụ nwunye n’ihi na akụkụ ahụ ha ji bụrụ nwoke etoliteghị nke ọma. Ndị ọzọ abụrụwo ndị mmadụ mere ọnozi, bụ́ ndị e ji obi ọjọọ bibie akụkụ ahụ ha ji bụrụ nwoke. N’ikpeazụ, ụfọdụ ndị na-abịada ọchịchọ ịlụ nwunye na inweta ọṅụ dị ná mmekọahụ ka ha wee nwee ike itinye onwe ha n’ụzọ zuru ezu karị n’ihe ndị metụtara Alaeze eluigwe. Jisọs kwuru ná mmechi sị, “Onye pụrụ ịnagide ya [ịnọ n’alụghị di ma ọ bụ nwunye], ya nagide.”
Ndị mmadụ na-amalite ịkpọtara Jisọs ụmụ ha ugbu a. Otú ọ dị, ndị na-eso ụzọ ya baara ụmụntakịrị ahụ mba wee nwaa ịchụpụsị ha, nke ihe ịrụ ụka na-adịghị ya na ọ bụ ka ha wee gbochie ha inye Jisọs nsogbu. Ma Jisọs na-asị: “Kweenụ ka ụmụntakịrị bịakwute m, unu egbochikwala ha: n’ihi na alaeze Chineke bụ nke ndị dị otú a. N’ezie asị m unu, Onye ọ bụla nke na-agaghị anara alaeze Chineke dị ka nwatakịrị, ọ gaghị aba n’ime ya ma ọlị.”
Lee nnọọ ezi ihe mmụta Jisọs na-enye n’ebe a! Iji nata Alaeze Chineke, anyị aghaghị iṅomi ịdị umeala n’obi na ịdị njikere ịmụta ihe nke ụmụntakịrị. Ma ihe nlereanya nke Jisọs na-egosikwa otú o si dị mkpa karịsịa nye ndị mụrụ ụmụ, iwepụta oge iji nọnyere ụmụ ha. Jisọs na-egosi ịhụnanya o nwere n’ebe ụmụntakịrị nọ ugbu a site n’ikuru ha n’aka ya ma na-agọzi ha. Matiu 19:1-15; Deuterọnọmi 24:1; Luk 16:18; Mak 10:1-16; Luk 18:15-17.
▪ Echiche dịgasị aṅaa ka ndị Farisii nwere banyere ịgba alụkwaghịm, n’ihi ya kwa, olee ụzọ ha si na-anwa Jisọs?
▪ Olee ụzọ Jisọs si mee ihe banyere mgbalị ndị Farisii mere ịnwa ya, gịnịkwa ka ọ kọwara dị ka nanị ihe mgbakwasị ụkwụ e nwere maka ịgba alụkwaghịm?
▪ N’ihi gịnị ka ndị na-eso ụzọ Jisọs ji kwuo na ọ baghị uru ịlụ nwanyị, oleekwa aro Jisọs tụrụ?
▪ Gịnị ka Jisọs kụziiri anyị site n’ụzọ o si mesoo ụmụntakịrị?