IHE ỌMỤMỤ NKE 35
Nkwughachi Iji Mesie Okwu Ike
IZI ihe n’ụzọ dị irè na-agụnye ikwughachi ihe. Mgbe e kwughachiri otu ihe dị mkpa ihe karịrị otu ugboro, o yikarịrị ka ndị na-ege ntị ha ga-echeta ya. Ọ bụrụ na e kwughachi ihe ahụ n’ụzọ dịtụ iche, ha pụrụ ọbụna ịghọta ya nke ọma karị.
Ọ bụrụ na ndị na-ege gị ntị echetaghị ihe i kwuru, okwu gị agaghị enwe mmetụta n’ihe ha kwenyere ma ọ bụ n’otú ha si adị ndụ. Ma eleghị anya ha ga-anọgide na-eche echiche banyere isi ihe ndị i mesiri ike karịsịa.
Jehova, bụ́ Onye Nkụzi Ukwu anyị, na-esetịpụrụ anyị ihe nlereanya n’otú o si ekwughachi ihe o kwuru. O nyere mba Izrel Iwu Iri ahụ. Site n’ọnụ mmụọ ozi bụ́ ọnụ na-ekwuru ya, o mere ka mba ahụ nụ iwu ndị ahụ n’elu Ugwu Saịnaị. Ka e mesịrị, o dere ya ede nye Mozis. (Ọpụ. 20:1-17; 31:18; Deut. 5:22) Dị ka Jehova tụziri, Mozis gụpụtaghachiiri mba ahụ iwu ndị ahụ tupu ha abanye n’Ala Nkwa ahụ, sitekwa n’ike mmụọ nsọ, Mozis deturu ya, dị ka ọ dị na Deuterọnọmi 5:6-21. Otu n’ime iwu e nyere ụmụ Izrel bụ ka ha jiri obi ha, mkpụrụ obi ha, na ike ha dum hụ Jehova n’anya ma jeere ya ozi. E kwughachikwara nke a ugboro ugboro. (Deut. 6:5; 10:12; 11:13; 30:6) N’ihi gịnị? N’ihi na, dị ka Jizọs kwuru, ọ bụ “ihe e nyere n’iwu nke kasịnụ, bụrụkwa nke mbụ.” (Mat. 22:34-38) Site n’ọnụ Jeremaịa onye amụma, Jehova chetaara ndị Juda, ihe karịrị ugboro 20, otú irubere ya isi n’ihe nile o nyere ha n’iwu dịruru ná mkpa. (Jer. 7:23; 11:4; 12:17; 19:15) Sitekwa n’ọnụ Izikiel, Chineke kwuru, ihe karịrị ugboro 60, na mba dị iche iche “[ga-amara] na Mụ onwe m bụ Jehova.”—Ezik. 6:10; 38:23.
N’ihe ndekọ banyere ije ozi Jizọs, anyị na-ahụkwa otú o si jiri ikwughachi ihe mee ihe n’ụzọ dị irè. Dị ka ihe atụ, e nwere Oziọma anọ ahụ—nke ọ bụla na-ekwu banyere ihe ndị dị mkpa merenụ, bụ́ ndị a kọrọ n’otu n’ime Oziọma ndị nke ọzọ ma ọ bụ karịa, ma na-akọ ihe ndị a site n’akụkụ dịgasịtụ iche. N’izi ihe ya, Jizọs kwughachiri otu ihe mmụta bụ́ isi ihe karịrị otu ugboro ma o kwuru ya n’ụzọ dịgasị iche iche. (Mak 9:34-37; 10:35-45; Jọn 13:2-17) Mgbe ọ nọkwa n’Ugwu Oliv, ụbọchị ole na ole tupu ọ nwụọ, Jizọs ji ikwughachi ihe mesie ndụmọdụ a dị mkpa ike: “Nọrọnụ na nche, n’ihi na unu amaghị ụbọchị Onyenwe unu ga-abịa.”—Mat. 24:42; 25:13.
N’ozi Ubi. Mgbe ị na-agbara ndị mmadụ àmà, ị na-enwe olileanya na ha ga-echeta ihe ị na-ekwu. Ikwughachi ihe n’ụzọ dị irè pụrụ inye aka n’imezu ebumnobi ahụ.
Ọtụtụ mgbe, ikwughachi ihe n’oge a na-atụle otu okwu ga-enye aka imesi ya ike n’uche mmadụ. Ya mere, mgbe ị gụsịrị otu akụkụ Akwụkwọ Nsọ, ị pụrụ imesi ya ike site n’izo aka n’otu akụkụ ya bụ́ isi ma jụọ, sị, “Ị̀ hụrụ otú e si kwuo okwu n’amaokwu ahụ?”
A pụkwara iji ahịrịokwu ndị ikpeazụ ná mkparịta ụka mee ihe n’ụzọ dị irè. Dị ka ihe atụ, ị pụrụ ikwu, sị: “Isi ihe m na-enwe olileanya na ị ga-echeta ná mkparịta ụka anyị bụ . . . ” Mgbe ahụ kwughachi ya n’ụzọ dị mfe. Ọ pụrụ ịbụ ihe dị ka: “Nzube Chineke bụ ka e mee ụwa ka ọ ghọọ paradaịs. Nzube ahụ aghaghị imezu.” Ma ọ bụkwanụ: “Bible na-egosi n’ụzọ doro anya na anyị na-ebi na mgbe ikpeazụ nke usoro ihe a. Ọ bụrụ na anyị ga-alanarị ọgwụgwụ ya, ọ dị anyị mkpa ịmụta ihe Chineke chọrọ n’aka anyị.” Ma ọ bụ ọ pụrụ ịbụ: “Dị ka anyị hụworo, Bible na-enye ndụmọdụ dị irè n’ụzọ isi nagide nsogbu ndị a na-enwe ná ndụ ezinụlọ.” N’ọnọdụ ụfọdụ, ị pụrụ nanị ikwughachi ihe e kwuru na Bible dị ka isi ihe a ga-echeta. N’ezie, ime nke a n’ụzọ dị irè na-achọ ibu ụzọ chebara ya echiche.
Ná nletaghachi, tinyere n’ọmụmụ Bible, gị ikwughachi ihe pụrụ ịgụnye ajụjụ ntụleghachi.
Mgbe ọ na-esiri mmadụ ike ịghọta ma ọ bụ itinye ndụmọdụ Bible n’ọrụ, ọ pụrụ ịdị gị mkpa iwelite isiokwu ahụ ihe karịrị otu ugboro. Gbalịa ileba ya anya site n’akụkụ dị iche iche. Ọ bụghị iwu na mkparịta ụka ndị ahụ ga-eto ogologo kama ha kwesịrị ịgba onye a na-amụrụ ihe ume ịnọgide na-echebara okwu ahụ echiche. Cheta, Jizọs ji ụdị ikwughachi ihe a mee ihe n’inyere ndị na-eso ụzọ ya aka imeri ọchịchọ nke ịnọ n’ọkwá mbụ.—Mat. 18:1-6; 20:20-28; Luk 22:24-27.
Mgbe A Na-ekwu Okwu. Ọ bụrụ na ị nọ n’elu ikpo okwu na-ekwu okwu, ebumnobi gị abụghị nanị inye ihe ọmụma. Ị chọrọ ka ndị na-ege ntị ghọta ya, cheta ya, ma jiri ya mee ihe. Iji mezuo nke ahụ, jiri ikwughachi ihe mee ihe n’ụzọ dị irè.
Otú ọ dị, ọ bụrụ na i kwughachi ihe ndị bụ́ isi ihe ọtụtụ ugboro karị, ndị na-ege gị ntị pụrụ ịkwụsị ige gị ntị. Jiri nlezianya họrọ isi ihe ndị kwesịrị ka e mesie ha nnọọ ike. Ndị a na-abụkarị isi ihe ndị okwu gị hiwere isi na ha, ma ha pụkwara ịgụnye ihe ndị ọzọ pụrụ ịbara ndị na-ege gị ntị uru karịsịa.
Iji jiri ikwughachi ihe mee ihe, ị pụrụ ibu ụzọ kwuo n’okwu mmeghe gị isi ihe ndị dị n’okwu gị. Mee ya site n’ikwu okwu ndị dị nkenke nke ga-abụ nchịkọta nke ihe ndị ị gaje ikwuzu n’ozuzu ya, site n’ịjụ ajụjụ ma ọ bụ ime ihe atụ ndị dị mkpirikpi, ndị ga-ewepụta nsogbu ndị ị gaje ịtụle. Ị pụrụ ikwu isi ihe ole dị na ya ma kpọpụta ha site n’inye ha nọmba. Mgbe ahụ kọwapụta nke ọ bụla n’ime isi ihe ndị dị n’ụmị okwu gị. A pụrụ imesikwu ihe ike n’ụmị okwu gị site n’ikwughachi isi ihe nke ọ bụla tupu ị gafere n’ọzọ. Ma ọ bụ a pụrụ imezu ya site n’inye ihe atụ nke ga-agụnye itinye isi ihe ahụ n’ọrụ. Ị pụrụ imesikwu ihe ndị bụ́ isi n’okwu gị ike site n’iji okwu mmechi nke ga-ekwughachi ha mee ihe, nke ga-eme ka ha pụta ìhè site n’iji ha tụnyere ihe ndị ọzọ, nke ga-aza ajụjụ ndị e welitere, ma ọ bụ kwuo n’ụzọ dị mkpirikpi ngwọta nke nsogbu ndị e welitere.
Tụkwasị n’ihe ndị e kwuru n’elu, ọkà okwu nwere ahụmahụ na-eleru ndị na-ege ya ntị anya nke ọma. Ọ bụrụ na otu echiche esiere ụfọdụ n’ime ha ike ịghọta, ọkà okwu na-ama. Ọ bụrụ na isi ihe ahụ dị mkpa, ọ na-ekwughachi ya. Otú ọ dị, ikwughachi otu mkpụrụ okwu ndị ahụ nwere ike ọ gaghị emezu ebumnobi ya. Izi ihe gụnyere ihe karịrị nke ahụ. Ọ ghaghị ịdị na-agbanwe ihe. Ọ pụrụ ịdị mkpa ka ọ gbakwụnye ihe ụfọdụ na mberede n’okwu. Gị ịmụta isi otú a mee ihe banyere mkpa nke ndị na-ege gị ntị ga-ekpebi ruo n’ókè dị ukwuu otú ị ga-adịru irè dị ka onye ozizi.