Ọ́bá Akwụkwọ Anyị NKE DỊ N'ỊNTANET
Ọ́bá Akwụkwọ Anyị
NKE DỊ N'ỊNTANET
Igbo
Ọ
  • Á
  • á
  • À
  • à
  • É
  • é
  • È
  • è
  • Ì
  • ì
  • Í
  • í
  • Ị
  • ị
  • Ị̀
  • ị̀
  • Ị́
  • ị́
  • Ḿ
  • ḿ
  • M̀
  • m̀
  • Ṅ
  • ṅ
  • Ò
  • ò
  • Ó
  • ó
  • Ọ
  • ọ
  • Ọ̀
  • ọ̀
  • Ọ́
  • ọ́
  • Ù
  • ù
  • Ú
  • ú
  • Ụ
  • ụ
  • Ụ̀
  • ụ̀
  • Ụ́
  • ụ́
  • BAỊBỤL
  • AKWỤKWỌ NDỊ ANYỊ NWERE
  • ỌMỤMỤ IHE
  • jr isi 8 p. 92-102
  • Ị̀ “Ga-adịrị Ndụ,” Dị Ka Jeremaya?

O nweghị vidio dị maka ihe a ị họọrọ.

Ewela iwe, o nwetụrụ nsogbu gbochiri vidio a ịkpọ.

  • Ị̀ “Ga-adịrị Ndụ,” Dị Ka Jeremaya?
  • Ihe Chineke Si n’Ọnụ Jeremaya Na-agwa Anyị
  • Isiokwu Nta
  • Isiokwu Ndị Ọzọ Yiri Nke A
  • IWU PỤRỤ ICHE
  • MỤTA IHE N’OTÚ AHỤ JEREMAYA NA-ALỤGHỊ NWAANYỊ
  • GBAA NDỊ ỌZỌ UME, KA HA GBAAKWA GỊ UME
  • Ndị Na-alụghị Di Ma Ọ Bụ Nwunye Ma Nwee Afọ Ojuju n’Ozi Jehova
    Ụlọ Nche Ikwupụta Alaeze Jehova—2005
  • Ezigbo Ndụmọdụ Maka Ndị Na-alụbeghị Di Ma Ọ bụ Nwunye Na Ndị Lụrụla
    Ụlọ Nche Ikwupụta Alaeze Jehova—2011
  • Abanyeghị n’Ọlụlụ—Ụzọ Ọrụ Uche Mgbasasị Na-adịghị Ya
    Ụlọ Nche Ikwupụta Alaeze Jehova—1996
  • “Etinyewo M Okwu M n’Ọnụ Gị”
    Ihe Chineke Si n’Ọnụ Jeremaya Na-agwa Anyị
Lee Ihe Ndị Ọzọ
Ihe Chineke Si n’Ọnụ Jeremaya Na-agwa Anyị
jr isi 8 p. 92-102

ISI NKE ASATỌ

Ị̀ “Ga-adịrị Ndụ,” Dị Ka Jeremaya?

1, 2. Gịnị mere o ji kwesị ekwesị ka e lebara ezinụlọ anya, lebakwara onye ọ bụla nọ n’ime ya?

MGBE Jọshụa gwachara ndị Izrel ka ha họrọ onye ha ga-efe, ọ gwara ha, sị: “Mụ onwe m na ezinụlọ m, anyị ga-efe Jehova.” (Jọsh. 24:15) Jọshụa kpebisiri ike irubere Chineke isi, obi sikwara ya ike na ezinụlọ ya ga-eme otú ahụ. Mgbe ọtụtụ afọ gachara, ka mbibi Jeruselem na-eru nso, Jeremaya gwara Eze Zedekaya na ọ bụrụ na ọ chịliere ndị Babịlọn aka elu, na ‘ya onwe ya na ezinụlọ ya ga-adịrị ndụ.’ (Jere. 38:17) Ihe ọjọọ eze ahụ kpebiri ime kpataara ya na ndị nwunye ya na ụmụ ya nsogbu. O ji anya ya hụ mgbe a na-egbu ụmụ ya; a rụkpọsịkwara ya anya ma dọrọ ya n’agha laa Babịlọn.—Jere. 38:18-23; 39:6, 7.

2 N’okwu ahụ Jọshụa kwuru na nke ahụ Jeremaya gwara Zedekaya, ọ bụ onyeisi ezinụlọ ka e bu n’obi. Ma, e kwukwara banyere ndị ezinụlọ ya. Otú ahụ e si kwuo banyere ha dabara adaba n’ihi na onye ọ bụla torola eto ga-aza Chineke ajụjụ. Ma, n’oge ahụ, ọtụtụ ndị Izrel na ezinụlọ ha ka bi. Ezinụlọ dịkwa Ndị Kraịst mkpa, dị ka anyị na-achọpụta n’ihe anyị na-agụta na Baịbụl nakwa n’ihe ndị anyị na-amụta n’ọmụmụ ihe Ndị Kraịst banyere alụmdi na nwunye, ịzụ ụmụ na ịkwanyere onye ọ bụla nọ n’ezinụlọ ùgwù.—1 Kọr. 7:36-39; 1 Tim. 5:8.

IWU PỤRỤ ICHE

3, 4. Olee otú ọnọdụ Jeremaya si dị iche na nke ọtụtụ ndị n’oge ya, oleekwa otú o si baara ya uru?

3 Mgbe e bibichara Jeruselem, Jeremaya so ná ndị ‘dịrị ndụ.’ Ọ lanahụrụ mbibi obodo ahụ n’agbanyeghị na ọnọdụ ya dị iche na nke ọtụtụ ndị ọzọ. (Jere. 21:9; 40:1-4) Chineke gwara ya ka ọ ghara ịlụ nwaanyị ma ọ bụ ịmụ nwa ma ọ bụkwanụ ime ihe ndị ọzọ ọtụtụ ndị Juu na-emekarị n’oge ahụ.—Gụọ Jeremaya 16:1-4.

4 N’oge Jeremaya nakwa n’omenala ndị obodo ha, ndị mmadụ na-alụ nwaanyị ma mụta ụmụ. Ọtụtụ ụmụ nwoke bụ́ ndị Juu mere otú ahụ, si otú ahụ mee ka ala nna nna ha dịgide n’ebo ha nakwa n’ezinụlọ ha.a (Diut. 7:14) Gịnị mere Jeremaya emeghị otú ahụ? N’ihi ihe ga-eme n’ọdịnihu, Chineke gwara ya ka ọ ghara ịga ebe a na-eru uju ma ọ bụ ebe a na-aṅụrị ọṅụ. Ọ gwara ya ka ọ ghara ịkasi ndị na-eru uju obi ma ọ bụkwanụ soro ha rie nri mgbe e lichara ozu. Ọ gaghịkwa eso na-eme ihe ndị na-atọ ọchị ndị Juu na-eme n’agbamakwụkwọ ha. Oriri na ịṅụrị ọṅụ niile ahụ ga-akwụsị n’oge na-adịghị anya. (Jere. 7:33; 16:5-9) Ihe a Jeremaya mere ga-eme ka o doo ndị mmadụ anya na ihe ọ na-ekwu bụ eziokwu, meekwa ka ha ghọta na ikpe na-abịanụ agaghị abụ obere ihe. Ọdachi ahụ mechakwara bịa. Chetụgodị otú obi dị ndị ahụ nọ na-eri anụ mmadụ ma ọ bụ ndị hụrụ ka ozu ndị ha hụrụ n’anya na-erekasị. (Gụọ Jeremaya 14:16; Ákwá 2:20.) N’ihi ya, a gaghị emetere Jeremaya ebere ebe ọ bụ na ọ lụghị nwaanyị. N’agbanyeghị na a ga-anọchibido Jeruselem ọnwa iri na asatọ ma mechaa gbukpọọ ọtụtụ ezinụlọ, Jeremaya enweghị nwunye ma ọ bụ ụmụ ọ ga-eruru uju.

5. Olee ihe Ndị Kraịst kwesịrị ịmụta n’ihe ahụ e kwuru na Jeremaya 16:5-9?

5 Ma, è nwere ike ikwu na ihe ahụ e kwuru na Jeremaya 16:5-9 gbasara anyị? Mbanụ. A gbara Ndị Kraịst ume ka ha ‘na-akasi ndị nọ n’ụdị mkpagbu ọ bụla obi’ nakwa ka ha ‘soro ndị na-aṅụrị ọṅụ ṅụrịa ọṅụ.’ (2 Kọr. 1:4; Rom 12:15) Jizọs gara agbamakwụkwọ ma soro mee ka obi dị ndị bịaranụ ụtọ. N’agbanyeghị nke ahụ, ihe ga-eme ụwa ajọ omume a abụghị obere ihe. Ihe nwere ike isiri Ndị Kraịst ike. E nwekwara ike ịnapụ ha ihe ndị ha nwere. Jizọs kwusiri ike na anyị kwesịrị ime ihe ọ bụla ga-eme ka anyị tachie obi ma kwesị ntụkwasị obi otú ahụ ụmụnna anyị na narị afọ mbụ mere mgbe ha si na Judia gbapụ. N’ihi ya, tupu anyị ekpebie ma ànyị ga-alụ di ma ọ bụ nwunye ma ọ bụ na anyị agaghị alụ, nakwa ma ànyị ga-amụ ụmụ ma ọ bụ na anyị agaghị amụ, anyị kwesịrị ibu ụzọ chee echiche nke ọma.—Gụọ Matiu 24:17, 18.

Foto dị na peeji nke 94

6. Olee ndị ga-erite uru ma ha tụlee iwu ahụ Chineke nyere Jeremaya?

6 Gịnị ka anyị nwere ike ịmụta n’iwu ahụ Chineke nyere Jeremaya ka ọ ghara ịlụ nwaanyị ma ọ bụ ịmụ ụmụ? Taa, e nwere ụfọdụ Ndị Kraịst na-erubere Chineke isi, ma ha alụghị di ma ọ bụ nwunye, ha amụtaghịkwa ụmụ. Gịnị ka ha nwere ike ịmụta n’aka Jeremaya? Oleekwa ihe mere Ndị Kraịst lụrụla di ma ọ bụ nwunye ma mụta ụmụ ji kwesị ịtụle ihe ahụ Jeremaya mere?

7. Olee ihe mere anyị ji kwesị ichebara iwu ahụ e nyere Jeremaya ka ọ ghara ịmụ nwa echiche?

7 Ka anyị buru ụzọ tụlee iwu e nyere Jeremaya ka ọ ghara ịmụ nwa. Jizọs enyeghị ndị na-eso ụzọ ya iwu ka ha ghara ịmụ ụmụ. Ma anyị kwesịrị icheta na o kwuru na “ahụhụ” ga-adịrị ụmụ nwaanyị dị ime na ndị na-enye nwa ara mgbe mkpagbu ga-abịakwasị Jeruselem n’afọ 66 ruo na 70 O.A. Oge ahụ ga-esiri ha ezigbo ike n’ihi ọnọdụ ha. (Mat. 24:19) Anyị ga-ahụ mkpagbu ka nke ahụ n’ọdịnihu. O so n’ihe Ndị Kraịst lụrụ di na nwunye kwesịrị ichebara echiche nke ọma mgbe ha na-atụle ma hà ga-amụ ụmụ ma ọ bụ na ha agaghị amụ. Ọ̀ bụ na i kwetaghị na ihe na-esikwu ike n’oge a dị oké egwu? Ndị lụrụ di na nwunye ekwetala na ọ dịghị mfe ịzụ ụmụ “ga-adịrị ndụ” mgbe a ga-ebibi ụwa a. Ọ bụ eziokwu na ọ bụ di na nwunye ọ bụla ga-ekpebi ma hà ga-amụ ụmụ ma ọ bụ na ha agaghị amụ, ha kwesịrị ichebara ihe Jeremaya mere echiche. Oleekwanụ banyere iwu ahụ Chineke nyere ya ka ọ gharadị ịlụ nwaanyị?

Olee iwu pụrụ iche e nyere Jeremaya, oleekwa ihe o kwesịrị ime ka anyị chebara echiche?

MỤTA IHE N’OTÚ AHỤ JEREMAYA NA-ALỤGHỊ NWAANYỊ

8. Olee ihe mere anyị nwere ike iji kwuo na ọ bụghị iwu na mmadụ ga-alụ di ma ọ bụ nwunye iji mee Chineke obi ụtọ?

8 Ihe ahụ Chineke gwara Jeremaya ka ọ ghara ịlụ nwaanyị abụghị iwu ndị ohu ya niile kwesịrị idebe. Ịlụ di ma ọ bụ nwunye dị mma. Ọ bụ Jehova malitere alụmdi na nwunye, ka e si otú ahụ mụjuo ụwa nakwa ka di na nwunye si na ya nweta obi ụtọ na ọṅụ dị ukwuu. (Ilu 5:18) Ma ọ bụghị mmadụ niile lụrụ di ma ọ bụ nwunye n’oge Jeremaya. O nwere ike ịbụ na e nwere ndị ọnaozi n’etiti ndị Chineke mgbe Jeremaya na-ebu amụma.b Ma eleghị anya, e nwekwara ndị di ha nwụrụ na ndị nwunye ha nwụrụ. N’ihi ya, ọ bụghị naanị Jeremaya bụ onye na-efe ezi ofufe nke na-alụghị di ma ọ bụ nwunye. N’eziokwu, e nwere ihe mere na ọ lụghị nwaanyị, otú ahụkwa ka ọ dị ụfọdụ Ndị Kraịst taa.

9. Olee ndụmọdụ e si n’ike mmụọ nsọ nye banyere alụmdi na nwunye nke anyị kwesịrị ichebara ezigbo echiche?

9 Ọtụtụ Ndị Kraịst na-alụ di ma ọ bụ nwunye ma ọ bụghị ha niile. Ị ma na Jizọs alụghị nwaanyị. O kwuru na ọ bụ ụfọdụ ndị na-eso ụzọ ya, bụ́ ndị nwere onyinye ahụ, “ga-emeli” ya, ya bụ, iji obi ha niile kpebie na ha agaghị alụ di ma ọ bụ nwunye. Ọ gbara ndị ga-emeli ya ume ka ha mee otú ahụ. (Gụọ Matiu 19:11, 12.) N’ihi ya, kama ịkparị onye kpebiri na ya agaghị alụ di ma ọ bụ nwunye n’ihi na ọ chọrọ ijekwuru Chineke ozi, e kwesịrị ịna-aja ya mma. N’eziokwu, ụfọdụ Ndị Kraịst kpebiri na ha agaghị alụ di ma ọ bụ nwunye ruo oge ụfọdụ n’ihi ọnọdụ ha. Dị ka ihe atụ, o nwere ike ịbụ na ha achọtabeghị Onye Kraịst kwesịrị ekwesị ha ga-alụ, ma ha kpebisiri ike ime ihe Chineke kwuru, nke bụ́ ịlụ “naanị n’ime Onyenwe anyị.” E kwesịrị ịna-aja ha mma. (1 Kọr. 7:39) N’eziokwu, ụfọdụ ndị ohu Chineke enweghị di ma ọ bụ nwunye n’ihi na di ha ma ọ bụ nwunye ha anwụọla.c Ha ekwesịghị ichefu mgbe ọ bụla na kemgbe ụwa, Chineke (na Jizọs) egosila na ihe banyere ndị dị otú a na-emetụ ha n’obi.—Jere. 22:3; gụọ 1 Ndị Kọrịnt 7:8, 9.

10, 11. (a) Olee ihe nyeere Jeremaya aka ịnọ n’alụghị nwaanyị? (b) Olee otú ihe ọtụtụ ụmụnna anyị merela n’oge a si gosi na ndị na-alụghị di ma ọ bụ nwunye nwere ike inwe obi ụtọ ná ndụ?

10 N’ihi ya, Chineke nyeere Jeremaya aka ịnọ n’alụghị nwaanyị. Olee otú o si nyere ya aka? Cheta na okwu Jehova tọrọ Jeremaya ụtọ. Ọ ga-abụrịrị okwu Jehova gbara ya ume ma mee ka obi sie ya ike n’ọtụtụ afọ ndị ahụ o lekwasịrị anya n’ozi Chineke dunyere ya. Ihe ọzọ bụ na ọ kpachaara anya zere ndị nwere ike ịkwa ya emo na ọ lụghị nwaanyị. Ọ kaara ya mma ‘ịnọ naanị ya’ kama iso ụdị ndị ahụ nọrọ.—Gụọ Jeremaya 15:17.

11 Ọtụtụ Ndị Kraịst na-alụghị di ma ọ bụ nwunye, ma ndị na-akatabeghị ahụ́ ma ndị merela agadi, na-eṅomi àgwà ọma Jeremaya. Ihe ọtụtụ ụmụnna anyị merela gosiri na ọ bara ezigbo ijesi ozi Chineke ike, ya bụ, iwepụta oge dị ukwuu na-eje ya. Dị ka ihe atụ, otu Onyeàmà nọ n’ọgbakọ na-asụ Chaịniiz kwuru, sị: “Ozi ịsụ ụzọ na-eme ka ndụ m nwee isi. Anaghị m anọ nkịtị, bụ́ ihe na-eme ka owu ghara ịma m n’agbanyeghị na alụbeghị m di. Obi na-adị m ụtọ kwa ụbọchị n’ihi na ozi m na-eje na-enyere ndị mmadụ aka. Ọ na-eme ka m nwee ọṅụ dị ukwuu.” Otu ọsụ ụzọ dị afọ iri atọ na asatọ kwukwara, sị: “M chere na ihe na-eme ka mmadụ nwee obi ụtọ bụ mmadụ ịchọpụta uru dị n’ọnọdụ ọ bụla ọ hụrụ onwe ya.” Otu Onye Kraịst na-alụghị di, nke bi na ndịda Yurop, kwuru hoo haa, sị: “E nwere ike ihe agaghị adị otú m si tụọ anya ya, ma enwere m obi ụtọ. M ga-anọgidekwa na-enwe obi ụtọ.”

Foto dị na peeji nke 97

12, 13. (a) Olee otú e kwesịrị isi lee ịlụ di na nwunye na alụghị di ma ọ bụ nwunye anya? (b) Olee ihe otú Pọl si bie ndụ na ndụmọdụ o nyere na-egosi banyere alụghị di ma ọ bụ nwunye?

12 Ọ̀ ga-abụ na Jeremaya chọpụtara na otú o bu n’obi mgbe ọ na-eto eto na ndụ ya ga-adị abụghị otú o mechara dị? Ma o nwere ike ịbụ na ọ ghọtara na ọ bụkwa otú ahụ ka ọ dị ọtụtụ ndị lụrụ di ma ọ bụ nwunye ma mụta ụmụ. Otu ọsụ ụzọ bi na Spen kwuru ihe ọ chọpụtara, sị: “Ahụla m ndị lụrụ di na nwunye na-enwe obi ụtọ, hụkwa ndị nke na-anaghị enwe. Ọ bụ ya mere obi ji sie m ike na ihe ga-eme ka m nwee obi ụtọ abụghị ma m̀ ga-alụ di n’ọdịnihu ma ọ bụ na m gaghị alụ.” O doro anya na ihe Jeremaya na ọtụtụ puku ndị ọzọ mere gosiri na onye na-alụghị di ma ọ bụ nwunye nwere ike ibi ezigbo ndụ ma nwee obi ụtọ na ọṅụ. Ihe ọzọ gosiri na ọ bụ eziokwu bụ ihe Pọl onyeozi kwuru na ihe o mere. O dere, sị: “M na-agwa ndị na-alụghị di ma ọ bụ nwunye na ụmụ nwaanyị di ha nwụrụ, na ọ dịrị ha mma ịnọ otú a m nọ.” (1 Kọr. 7:8) O nwere ike ịbụ na nwunye Pọl nwụrụ anwụ. Otú o sina dị, ọ lụghị nwaanyị n’oge niile o jere ozi ala ọzọ ma rụpụta ọtụtụ ihe. (1 Kọr. 9:5) Í cheghị na o ziri ezi ikwu na otú ahụ ọ na-alụghị nwaanyị bara uru? O mere ka o ‘jeere Onyenwe anyị ozi mgbe niile n’enweghị ndọpụ uche,’ si otú ahụ rụpụta ọtụtụ ihe ọma.—1 Kọr. 7:35.

Otu nwanna nwaanyị aha ya bụ Babet kwuru, sị: “Oge na-akacha abara m uru bụ oge m na-anọ naanị m. M na-eji oge ndị ahụ ekpeku Jehova ekpere. M na-ejikwa ya atụgharị uche ma mụọ ihe n’enweghị ihe ga-emegharị m anya . . . Ịnọ n’alụghị di enyerela m aka dị ukwuu inwe ọṅụ.”

13 Pọl si n’ike mmụọ nsọ dee ihe ọzọ, sị: “Ndị lụrụ [di na nwunye] ga-enwe mkpagbu n’anụ ahụ́ ha.” Chineke mekwara ka Pọl dee otu eziokwu gbara ọkpụrụkpụ, nke bụ́: “Ọ bụrụ na onye ọ bụla ekpebie n’obi ya . . . na ya ga-anọgide n’amaghị nwoke ma ọ bụ nwaanyị, ọ ga-eme nke ọma. N’ihi ya, onye lụrụ di ma ọ bụ nwunye wee ghara ịbụkwa onye na-amaghị nwoke ma ọ bụ nwaanyị mere nke ọma, ma onye nọgidere otú ọ nọ wee ghara ịlụ di ma ọ bụ nwunye ga-eme nke ọma karị.” (1 Kọr. 7:28, 37, 38) Ọ dịghị mgbe Jeremaya gụrụ ihe ahụ Pọl mechara dee. Ma, ozi o jere ọtụtụ afọ gosiri na mmadụ nwere ike inwe obi ụtọ n’ozi Chineke n’agbanyeghị na ọ lụghị di ma ọ bụ nwunye. N’eziokwu, o nwere ike ime ka mmadụ bie ndụ bara ezigbo uru ma lekwasị anya n’ezi ofufe. N’agbanyeghị na Eze Zedekaya lụrụ nwaanyị, o meghị ihe Jeremaya dụrụ ya ọdụ ka o mee ma ‘dịrị ndụ’; ma otú onye amụma ahụ na-alụghị nwaanyị si bie ndụ nyeere ya aka ime otú ahụ.

Gịnị ka i nwere ike ịmụta n’otú Jeremaya si jee ozi ọtụtụ afọ n’alụghị nwaanyị?

GBAA NDỊ ỌZỌ UME, KA HA GBAAKWA GỊ UME

14. Olee ihe otú Pọl na ezinụlọ Akwịla si nọrịa na-egosi?

14 Dị ka anyị kwuru na mbụ, ọtụtụ ndị ikom na ndị inyom n’oge Jeremaya lụrụ di ma ọ bụ nwunye. Ọtụtụ n’ime ha na ezinụlọ ha bikwa n’oge ahụ. Otú ahụ ka ọ dị n’oge Pọl. N’oge ahụ, o doro anya na ọtụtụ Ndị Kraịst, bụ́ ndị nwere ezinụlọ, enweghị ike ịga ikwusa ozi ọma n’ala ọzọ dị ka Pọl mere, ma ha rụrụ ọtụtụ ọrụ n’ebe ha bi. Otu n’ime ọrụ ha rụrụ bụ inyere ụmụnna ha na-alụghị di ma ọ bụ nwunye aka. Cheta na mgbe Pọl gara Kọrịnt, Akwịla na Prisila nabatara ya n’ụlọ ha, ha na ya ana-arụkọ ọrụ n’aka ọrụ ha. Ma ọ bụghị naanị ya bụ uru Pọl ritere. Ọ ga-abụrịrị na otú ezinụlọ Akwịla si mee ka Pọl bụrụ enyi ha gbara ya ume. Chetụgodị banyere mgbe ha rikọrọ nri dị ụtọ na oge ndị ọzọ ha ji nọrịa. Ụdị mkpakọrịta ahụ ọ̀ baara Jeremaya uru? O ji oge ahụ ọ na-alụghị nwaanyị jeere Chineke ozi. Ma, anyị ekwesịghị iche na ọ na-agbara ndị ọzọ ọsọ. O nwekwara ike ịbụ na ya na ezinụlọ ndị ji ofufe Chineke kpọrọ ihe na-anọrị, dị ka ezinụlọ Barọk, ezinụlọ Ibed-melek ma ọ bụ ezinụlọ ndị ọzọ.—Rom 16:3; gụọ Ọrụ Ndịozi 18:1-3.

15. Olee otú ezinụlọ ndị e nwere n’ọgbakọ nwere ike isi baara Ndị Kraịst na-alụghị di ma ọ bụ nwunye ezigbo uru?

15 Taa, Ndị Kraịst na-alụghị di ma ọ bụ nwunye na-erite uru n’otú ha na ezi Ndị Kraịst ibe ha si anọrị otú ahụ Pọl si rite uru mgbe ya na ezinụlọ Akwịla nọrịrị. Ọ bụrụ na i nwere ezinụlọ, ùnu na-ewepụta oge ka unu na ndị na-alụghị di ma ọ bụ nwunye nọrịa? Otu nwanna nwaanyị kwuru otú ọ dị ya n’obi, sị: “Ahapụla m ụwa, achọghịkwa m ịlaghachi na ya. Ma, m ka chọkwara ka a na-eche banyere m ma hụ m n’anya. Ekpere m bụ ka Jehova na-enyekwu anyị bụ́ Ndị Kraịst na-alụghị di ma ọ bụ nwunye nri ime mmụọ na agbamume. Anyị achọghị ka e leghara anyị anya, ọ bụghịkwa anyị niile ka ọ na-agụsi agụụ ike ịlụ di ma ọ bụ nwunye. Ma o yiri ka ọ dịghị onye na-enyere anyị aka. N’ezie, anyị nwere ike ikpegara Jehova ekpere mgbe niile. Ma, mgbe anyị chọrọ ndị anyị na ha ga-anọrị, ọ́ gaghị adị mma ka anyị gwa ụmụnna anyị?” Ọtụtụ puku ụmụnna na-alụghị di ma ọ bụ nwunye ga-eji obi ha dum kwuo na anyị kwesịrị ime otú ahụ. Ha na ụmụnna nọ n’ọgbakọ ha na-anọrị. Ọ bụghị naanị ụmụnna ndị ha na ha bụ́ ọgbọ ka ha na-emeta enyi. Ebe ọ bụ na ha chọrọ ka ha na ndị mmadụ na-anọ, ha na-emeta Ndị Kraịst dị iche iche enyi, ma ndị tọrọ ha ma ndị na-eto eto nọ n’ezinụlọ ndị e nwere n’ọgbakọ ha.

Foto dị na peeji nke 100

16. Olee obere ihe i nwere ike ime iji gbaa Ndị Kraịst na-alụghị di ma ọ bụ nwunye nọ n’ọgbakọ unu ume?

16 Ọ bụrụ na i buru ụzọ chee echiche, i nwere ike ịchọpụta otú ị ga-esi gbaa ndị na-alụghị di ma ọ bụ nwunye ume. I nwere ike ịkpọ ha ka ha soro unu n’ihe ụfọdụ ezinụlọ unu na-eme, dị ka Ofufe Ezinụlọ unu na-enwe ná mgbede. Ọ bụrụ na ị kpọọ nwanna na-alụghị di ma ọ bụ nwunye ka o soro ezinụlọ unu rie nri, o nwere ike ịtọ ya ụtọ karịa naanị ibunye ya efere nri e siri nke ọma. Ì nwere ike ịgwa ya ka gị na ya rụọ n’ozi ọma? Ọ́ gaghị adị mma ka ị kpọọ nwanna na-alụghị di ma ọ bụ nwunye ka o soro ezinụlọ unu rụkọọ ọrụ mgbe a na-arụzi Ụlọ Nzukọ Alaeze ma ọ bụkwanụ ka o soro unu mgbe unu na-aga ịzụ ihe? Ụfọdụ ezinụlọ na-akpọkwa nwanna nwaanyị di ya nwụrụ, nwanna nwoke nwunye ya nwụrụ ma ọ bụ ọsụ ụzọ na-alụghị di ma ọ bụ nwunye ka o soro ha gaa mgbakọ ma ọ bụ gaa n’ebe a na-atụrụ ndụ. Mkpakọrịta dị otú ahụ na-agba ma nwanna ahụ ma ezinụlọ ahụ ume.

17-19. (a) Mgbe nne na nna mere agadi ma ọ bụ na-arịa ọrịa, gịnị mere ụmụ ha niile ji kwesị iji ịhụnanya hazie otú a ga-esi na-elekọta ha? (b) Olee ihe bara uru anyị kwesịrị ịmụta n’ihe ahụ Jizọs mere iji hụ na e lekọtara nne ya?

17 Ihe ọzọ anyị kwesịrị ilebara anya n’okwu banyere ụmụnna na-alụghị di ma ọ bụ nwunye gbasara ilekọta ndị nne na nna merela agadi. N’oge Jizọs, ụfọdụ ndị Juu a ma ama ji aghụghọ jụ ilekọta nne ha na nna ha. Ha kwuru na idebe iwu ndị ha ji aka ha mee n’okpukpe ha dị mkpa karịa ime ihe Chineke gwara ha ka ha na-emere nne na nna ha. (Mak 7:9-13) E kwesịghị ime otú ahụ n’ezinụlọ Ndị Kraịst.—1 Tim. 5:3-8.

18 Gịnịkwanụ ka e kwesịrị ime ma ọ bụrụ na ndị nne na nna merela agadi nwere ọtụtụ ụmụ bụ́ Ndị Kraịst? Ọ bụrụ na e nwere nwa ha na-alụghị di ma ọ bụ nwunye, ọ̀ pụtara na ọ bụzi naanị ya ga na-elekọta nne ya na nna ya merela agadi? Otu nwanna nwaanyị bi na Japan dere, sị: “Achọrọ m ịlụ di, ma enweghị m ike ịlụ di n’ihi na ọ bụ naanị m na-elekọta ndị mụrụ m. Obi siri m ike na Jehova ghọtara na mmadụ ilekọta ndị mụrụ ya adịghị mfe, ghọtakwa ihe na-ewute ndị na-alụghị di ma ọ bụ nwunye.” Ọ̀ ga-abụ na o nwere ụmụnne lụrụla di ma ọ bụ nwunye bụ́ ndị kpebiri n’ajụghị ya ajụ na ọ ga-abụrịrị ya ga na-elekọta ndị mụrụ ha merela agadi? E mee gị ụdị ihe ahụ, cheta na e nwere mgbe ụmụnne Jeremaya mere ya ihe na-adịghị mma.—Gụọ Jeremaya 12:6.

19 Jehova ghọtara otú obi na-adị ndị na-alụghị di ma ọ bụ nwunye. Ihe banyere ndị ihe na-esiri ike na-emetụkwa ya n’obi. (Ọma 103:11-14) Ma, ọ bụrụ na ndị nne na nna emee agadi ma ọ bụ na-arịa ọrịa, ụmụ ha niile ka bụkwa ụmụ ha, ọ bụghị naanị ndị nke na-alụghị di ma ọ bụ nwunye. N’eziokwu, o nwere ike ịbụ na ụfọdụ ụmụ ha alụọla di ma ọ bụ nwunye, mụtakwa ụmụ nke ha. Ma o kwesịghị ime ka ha ghara ịhụ ndị mụrụ ha n’anya, ma ọ bụkwanụ mee ka ha kwụsị ịrụ ọrụ Onye Kraịst kwesịrị ịrụrụ ndị mụrụ ya, nke bụ́ ilekọta ha mgbe ha kwesịrị ime otú ahụ. Cheta na mgbe Jizọs nọ n’ọnụ ọnwụ n’elu osisi ịta ahụhụ, ọ ghọtara ọrụ o kwesịrị ịrụ. N’ihi ya, o nyefere nne ya n’aka onye ga na-elekọta ya. (Jọn 19:25-27) Baịbụl ekwughị ihe niile e kwesịrị ime iji lekọta ndị nne na nna merela agadi ma ọ bụ ndị nke na-arịa ọrịa, ma ọ bụkwanụ kwuo na ọ bụ naanị ụmụ ha ndị na-alụghị di ma ọ bụ nwunye kwesịrị ilekọta ha. N’okwu a nwere ike ịkpata esemokwu, mmadụ niile ọ gbasara kwesịrị iji ezi uche kwurịta otú ha ga-esi elekọta nne na nna ha ma chebara ibe ha echiche. Ha kwesịrị iṅomi ihe Jizọs mere iji hụ na e lekọtara nne ya.

20. Olee otú obi na-adị gị mgbe gị na ndị na-alụghị di ma ọ bụ nwunye nọ n’ọgbakọ unu na-anọrị?

20 Jeremaya si n’ike mmụọ nsọ buo amụma, sị: “Onye ọ bụla n’ime ha agakwaghị akụziri enyi ya na nwanne ya, sị, ‘Maranụ Jehova!’ n’ihi na ha niile ga-amara m.” (Jere. 31:34) E nwere ike ikwu na amụma ahụ na-emezu ugbu a n’ọgbakọ Ndị Kraịst, n’ihi na anyị na ụmụnna anyị niile na-anọrị, tinyere ndị nke na-alụghị di ma ọ bụ nwunye. O doro anya na anyị niile chọrọ ka anyị na ụmụnna ndị a na-alụghị di ma ọ bụ nwunye na-agbarịta ibe anyị ume. Anyị chọkwara ka ha ‘dịrị ndụ.’

Olee ihe ndị ọzọ i nwere ike ime iji gbaa ụfọdụ ụmụnna na-alụghị di ma ọ bụ nwunye ume nakwa iji mee ka ha gbaa gị ume?

a N’Akwụkwọ Nsọ Hibru, e nweghị okwu ọ bụla e ji akọwa “okokporo.”

b Aịzaya buru amụma banyere ndị bụ́ ọnaozi n’oge ya, bụ́ ndị na-anaghị eso eme ihe ụfọdụ ndị Izrel ndị ọzọ na-eme n’ofufe Chineke. O buru amụma na ọ bụrụ na ndị ọnaozi erube isi, ha ga-enweta “ihe ka ụmụ ndị ikom na ụmụ ndị inyom mma,” nwetakwa “aha ga-adịru mgbe ebighị ebi” n’ụlọ Chineke.—Aịza. 56:4, 5.

c Ma eleghị anya, ndị ọzọ bi naanị ha n’ihi na di ha ma ọ bụ nwunye ha, nke nwere ike ịbụ onye na-ekweghị ekwe, hapụrụ ha ma ọ bụkwanụ gbaa ha alụkwaghịm n’ụlọikpe.

    Akwukwo Igbo (1984-2025)
    Pụọ
    Banye
    • Igbo
    • Ziga ya
    • Ịgbanwe Ihe
    • Copyright © 2025 Watch Tower Bible and Tract Society of Pennsylvania
    • Ihe Ị Ga-eme na Ihe Ị Na-agaghị Eme
    • Ihe Anyị Ji Ihe Ị Gwara Anyị Eme
    • Kpebie Ihe Ị Ga-agwa Anyị
    • JW.ORG
    • Banye
    Ziga ya