ISI NKE 15
Otú Anyị Ga-esi Rite Uru ma Anyị Nọrọ n’Okpuru Chineke na Ndị Ọzọ
ANYỊ kwesịrị ịnọ n’okpuru Chineke, bụ́ Ọkaakaa Eluigwe na Ala, ma ọ bụrụ na anyị chọrọ ịbụ ndị a haziri ime uche Jehova. Anyị ghọtara na Ọkpara ya bụ onyeisi nke ọgbakọ Ndị Kraịst. Anyị na-anọkwa n’okpuru ndị ọzọ Chineke chọrọ ka anyị na-anọ n’okpuru ha. Ime otú a ga-abara onye ukwu na onye nta uru.
2 Ebe mbụ a nọ mee ka ụmụ mmadụ mara na ihe niile Chineke kere kwesịrị inwe onye ha ga-anọ n’okpuru ya bụ n’ogige Iden. Ihe Chineke kwuru na Jenesis 1:28 na 2:16, 17 gosiri na ọ bụ eziokwu. Ụmụ anụmanụ ga-anọ n’okpuru mmadụ, Adam na Iv anọrọ n’okpuru Chineke, na-eme uche ya. Ime ihe a Chineke kwuru ga-eme ka udo dị, meekwa ka ihe na-aga nke ọma. E mechakwara kwuo gbasara ndị onye ọ bụla n’ime anyị nọ n’okpuru ha ná 1 Ndị Kọrịnt 11:3. Pọl onyeozi dere, sị: “Achọrọ m ka unu mara na Kraịst bụ isi nke nwoke ọ bụla; nwoke bụkwa isi nke nwaanyị; Chineke bụkwa isi nke Kraịst.” Ihe a Pọl kwuru gosiri na e wezụga Jehova, onye ọ bụla nwere onye ọ nọ n’okpuru ya.
3 Taa, ọtụtụ ndị achọghị ịma na e nwere ndị ha kwesịrị ịnọ n’okpuru ha. N’ihi gịnị? Ọ bụ n’ihi na nne na nna anyị mbụ kpachaara anya nupụrụ Chineke isi n’ogige Iden ma kwụsị ịnọ n’okpuru ya. (Jen. 3:4, 5) Ma, isi ha nupụụrụ Chineke emeghị ka ha nwerekwuo onwe ha. Kama, o mere ka ha nọrọzie n’okpuru ajọ mmụọ a na-akpọ Setan bụ́ Ekwensu, meekwa ka ụmụ mmadụ na Chineke gharazie ịdị ná mma. (Kọl. 1:21) Ọ bụ ya mere Setan ji na-achị ọtụtụ ndị taa.—1 Jọn 5:19.
4 Ma, anyị anọghị n’okpuru Setan n’ihi na anyị amụtala eziokwu dị na Baịbụl, na-emekwa ya eme. Ebe anyị nyeferela Chineke onwe anyị, e meekwa anyị baptizim, anyị weere Jehova ka Ọkaakaa anyị. Anyị kwetara n’ihe Eze Devid kwuru. Ọ sịrị na Jehova bụ “onyeisi nke mmadụ niile.” (1 Ihe 29:11) N’eziokwu, anyị ji obi anyị niile na-ekwu, sị: “Maranụ na Jehova bụ Chineke. Ọ bụ ya kere anyị, ọ bụghị anyị kere onwe anyị. Anyị bụ ndị ya, bụrụkwa atụrụ ndị ọ na-azụ n’ebe ịta nri ya.” (Ọma 100:3) Anyị ghọtara na Jehova dị ukwuu, ghọtakwa na anyị kwesịrị irubere ya isi n’ihe niile n’ihi na ọ bụ ya kere ihe niile. (Mkpu. 4:11) Ebe anyị na-ejere ezi Chineke ozi, anyị na-erubere ya isi otú ahụ Jizọs Kraịst mere.
5 Gịnị ka Jizọs mụtara n’ahụhụ ndị ọ tara mgbe ọ nọ n’ụwa? Ndị Hibru 5:8 kwuru, sị: “Ọ bụ ezie na ọ bụ Ọkpara, ọ mụtara nrubeisi site n’ahụhụ ndị ọ tara.” O doro anya na Jizọs akwụsịghị irubere Nna ya nke eluigwe isi, ma mgbe a na-ata ya ahụhụ. Ihe ọzọ bụ na Jizọs emeghị otu mkpụrụ ihe n’uche nke aka ya. O kwughịkwa echiche nke onwe ya, ma ọ bụ chọọ ka e too ya. (Jọn 5:19, 30; 6:38; 7:16-18) Mgbe ọ na-eje ozi ya n’ụwa, ime uche Nna ya na-atọ ya ụtọ, n’agbanyeghị na o mere ka ndị mmadụ megide ya. (Jọn 15:20) Ma o meghị ka ọ gharazie irubere Chineke isi. O ‘wedara onwe ya ala ruo n’ịnwụ n’osisi ịta ahụhụ.’ Otú a Jizọs si rubere Chineke isi mere ka ụmụ mmadụ nwee olileanya ịdị ndụ ebighị ebi. O mekwara ka Jehova bulie ya elu, meekwa ka e too Jehova.—Fil. 2:5-11; Hib. 5:9.
NDỊ CHINEKE CHỌRỌ KA ANYỊ NA-ERUBERE ISI
6 Ọ bụrụ na anyị ana-erubere Chineke isi, anyị agaghị enwe ọtụtụ nsogbu na obi mgbawa ndị jụrụ irubere ya isi na-enwe. Onye iro anyị, bụ́ Ekwensu, na-achọ mgbe niile ka o ripịa anyị. Ma, Jehova ga-anapụta anyị n’aka ya ma ọ bụrụ na anyị eguzogide ya ma jiri obi anyị niile na-erubere Chineke isi.—Mat. 6:10, 13; 1 Pita 5:6-9.
7 A bịa n’ọgbakọ, anyị ghọtara na Kraịst bụ isi nke ọgbakọ, ghọtakwa na o nyere “ohu ahụ kwesịrị ntụkwasị obi, onye nwekwara uche” ikike ịna-elekọta ọgbakọ. Ihe a anyị ghọtara ga-emetụta otú anyị si akpaso ibe anyị àgwà. Ọ bụrụ na anyị na-erubere Chineke isi n’ọgbakọ, anyị ga na-eme ihe niile Okwu ya gwara anyị gbasara otú anyị ga-esi na-efe ya. Ụfọdụ n’ime ha bụ ịga ozi ọma, ịga ọmụmụ ihe, ịza ajụjụ n’ọmụmụ ihe, ịkwado ndị okenye, na ime ihe nzukọ Jehova gwara anyị na-eme.—Mat. 24:45-47; 28:19, 20; Hib. 10:24, 25; 13:7, 17.
8 Ọ bụrụ na anyị ana-erubere Chineke isi, udo ga-adị n’ọgbakọ, ahụ́ ga-eru anyị ala, ihe ga na-agakwa n’usoro. Ndị na-efe Chineke na-akpa àgwà ka ya. (1 Kọr. 14:33, 40) Ihe ndị anyị hụrụla mere ná nzukọ Jehova na-eme ka anyị kwuo ụdị ihe Eze Devid kwuru. Mgbe ọ hụchara ihe dị iche ná ndị na-efe Jehova na ndị na-anaghị efe ya, ọ sịrị: “Obi ụtọ na-adịrị ndị Chineke ha bụ Jehova!”—Ọma 144:15.
9 A bịa n’ezinụlọ, Baịbụl kwuru na ‘nwoke bụ isi nke nwaanyị.’ O kwukwara na Kraịst bụ isi nke nwoke, ebe Chineke bụ isi nke Kraịst. (1 Kọr. 11:3) Ndị nwunye ga na-anọ n’okpuru ndị di ha, ụmụ ana-anọ n’okpuru ndị mụrụ ha. (Efe. 5:22-24; 6:1) Udo ga-adị n’ezinụlọ ma onye ọ bụla nọ n’ezinụlọ na-eme ihe a Baịbụl kwuru.
10 Ndị bụ́ di ga-ahụ ndị ezinụlọ ha n’anya ma na-elekọta ha, otú ahụ Kraịst si eme. (Efe. 5:25-29) Ọ bụrụ na di adịghị aka ike, na-emekwa ihe ndị o kwesịrị ime n’ezinụlọ, obi ga na-atọ nwunye ya na ụmụ ya ụtọ, ha ga na-erubekwara ya isi. Baịbụl kwuru na nwaanyị bụ onye inyeaka di ya. (Jen. 2:18) Ọ bụrụ na nwaanyị ana-akwado di ya ma na-akwanyere ya ùgwù, ọ ga-eme ka di ya hụ ya n’anya, meekwa ka e too Chineke. (1 Pita 3:1-4) Ọ bụrụkwa na di na nwunye ana-eme ihe Baịbụl gwara ha ka ha na-eme n’ezinụlọ, ọ ga-eme ka ụmụ ha mụta ịna-erubere Chineke isi.
Anyị kwesịrị irubere Chineke isi n’ihe niile anyị na-eme ná ndụ
11 Ọ bụrụ na anyị na-erubere Chineke isi, anyị ga na-erubekwara “ndị ọchịchị” isi. “Ọ bụ Chineke debere ọchịchị ndị dị adị n’ọnọdụ ha nọ n’okpuru ya.” (Rom 13:1-7) Ebe Ndị Kraịst bụ ụmụ amaala na-erube isi, ha na-atụ ụtụ isi, si otú ahụ na-akwụ ‘Siza ihe Siza, na-akwụkwa Chineke ihe Chineke.’ (Mat. 22:21) Ihe ọzọ bụ na otú ọ bụla a haziri isi zie ozi ọma nke ọma n’ebe ọgbakọ na-ezi ozi ọma kwesịrị ịdaba n’ihe iwu obodo unu kwuru gbasara ichebe ihe mmadụ gwara gị banyere onwe ya, ma ọ bụrụ na unu nwere ụdị iwu ahụ. Mgbe anyị na-erubere ndị ọchịchị isi n’ihe niile na-emegideghị iwu Jehova, ọ ga-eme ka ha ghara ịna-enye anyị nsogbu, anyị ejirizie ike anyị na ume anyị na-ekwusa ozi ọma.—Mak 13:10; Ọrụ 5:29.
12 Anyị kwesịrị irubere Chineke isi n’ihe niile anyị na-eme ná ndụ. Anyị nwere okwukwe na oge na-abịa mgbe mmadụ niile nọ n’ụwa ga na-erubere Jehova Chineke isi. (1 Kọr. 15:27, 28) Jehova ga-agọzi ndị niile kwetara na ọ bụ ya kwesịrị ịchị ma na-erubere ya isi ruo mgbe ebighị ebi.