Ihe Ịnọ N’okpuru N’ụzọ Nke Chineke Chọrọ Anyị N’aka
“Ya mere doonụ onwe unu n’okpuru Chineke.”—JEMES 4:7.
1. Gịnị ka a pụrụ ikwu banyere ụdị Chineke anyị na-efe ofufe?
LEE Chineke dị ebube nke Jehova bụ! O nweghị onye ya na ya hà, o nweghị ọgbọ, o nweghị atụ, ọ pụrụ iche n’ọtụtụ ụzọ! Ọ bụ Onye Kasị Elu, Ọkaaka Eluigwe na Ala, onye ezi ike nile dị n’aka ya. Ọ dị site na mgbe ebighị ebi ruo ná mgbe ebighị ebi, ọ dịkwa ebube nke ukwuu nke na ọ dịghị onye pụrụ ịhụ ya ma dị ndụ. (Ọpụpụ 33:20; Ndị Rom 16:26) Amamihe na ike ya enweghị njedebe, o zuru okè kpam kpam n’ikpe ziri ezi, ọ bụkwa ịhụnanya n’onwe ya. Ọ bụ Onye Okike anyị, Onye Ikpe anyị, Onye Na-enye anyị Iwu, na Eze anyị. Ezi onyinye ọ bụla na ihe ọ bụla zuru okè sitere n’aka ya.—Abụ Ọma 100:3; Aịsaịa 33:22; Jemes 1:17.
2. Ihe ndị dị aṅaa ka ịnọ n’okpuru n’ụzọ nke Chineke gụnyere?
2 N’ihi eziokwu ndị a nile, a pụghị inwe ajụjụ ọ bụla banyere ibu ọrụ dịịrị anyị ịnọ n’okpuru ya. Ma nye anyị gịnị ka nke a gụnyere? Ọtụtụ ihe. Ebe ọ bụ na anyị apụghị ịhụ Jehova Chineke anya n’onwe anyị, ịnọ n’okpuru ya gụnyere ige ntị n’olu akọ na uche a zụrụ azụ, ikwado nzukọ elu ala nke Chineke, irubere ndị ọchịchị ụwa isi, na ịkwanyere ụkpụrụ nke ịbụ isi n’ime ezinụlọ ùgwù.
Inwe Akọ na Uche Dị Mma
3. Iji nọgide na-enwe akọ na uche dị mma, anyị aghaghị irube isi n’ihe mmachibido ndị dị aṅaa?
3 Iji nọgide na-enwe akọ na uche dị mma, anyị aghaghị irubere iwu ndị a na-adịghị amanye amanye isi—ya bụ, iwu ma ọ bụ ụkpụrụ dị iche iche ndị ụmụ mmadụ na-apụghị ịmanye ndị mmadụ idebe. Dị ka ihe atụ, iwu nke iri nke Iwu Iri ahụ, bụ́ nke e nyere megide inwe anya ukwu n’ihe onye ọzọ, bụ nke ndị ọchịchị bụ́ mmadụ na-apụghị ịmanye ndị mmadụ idebe. Ọzọkwa, nke a bụ ihe àmà nke na-egosi na Iwu Iri ahụ si n’aka Chineke, n’ihi na ọ dịghị òtù ndị ome iwu ọ bụla nke ụmụ mmadụ nke ga-emeworị iwu nke a na-apụghị ịmanye ndị mmadụ idebe ya site n’ime iwu ndị na-arụgide arụgide ma ọ bụrụ na e mebie ya. Site n’iwu nke a, Jehova Chineke nyere onye Israel ọ bụla ibu ọrụ nke ịbụ onye uwe ojii nke aka ya—ma ọ bụrụ na ọ ga-achọ ịbụ onye nwere akọ na uche dị mma. (Ọpụpụ 20:17) N’otu aka ahụ, n’ọrụ dị iche iche nke anụ ahụ nke ga-egbochi mmadụ iketa Alaeze Chineke, e nwere “ekworo” na “ịkpọasị”—mmeghachi omume nke ndị ọkà ikpe bụ mmadụ na-apụghị ime iwu na-arụgide arụgide ndị ga-amanye ndị mmadụ ime ihe megidere ha. (Galetia 5:19-21) Ma iji nwee akọ na uche dị mma, anyị aghaghị izere ihe ndị a.
4. Iji nọgide na-enwe akọ na uche dị mma, ụkpụrụ dị iche iche dị aṅaa nke Bible ka anyị na-aghaghị iji na-ebi ndụ?
4 Ee, anyị aghaghị ibi ndụ kwekọrọ n’ụkpụrụ dị iche iche nke Bible. A pụrụ ịchịkọta ụkpụrụ ndị a ọnụ n’iwu abụọ ahụ Jisọs Kraịst kwupụtara n’ụzọ pụtara ìhè ná nzaghachi nke ajụjụ ahụ banyere nke kasị ukwuu n’iwu nke usoro iwu Mosis. “Ị ga-ewere obi gị dum, werekwa mkpụrụ obi gị dum, werekwa uche gị dum, hụ Onyenwe anyị Chineke gị n’anya. . . . Ị ga-ahụ onye agbata obi gị n’anya dị ka onwe gị.” (Matiu 22:36-40) Ihe na-eme ka ihe nke abụọ n’iwu ndị a gụnyere pụta ìhè bụ okwu ndị ahụ nke Jisọs bụ́ nke e dekọrọ na Matiu 7:12: “Ya mere ihe nile, ka ha hà, bụ́ nke unu na-achọ ka mmadụ na-eme unu, na-emekwanụ mmadụ otú a, unu onwe unu: n’ihi na nke a bụ iwu na ndị amụma Chineke.”
5. Olee otú anyị pụrụ isi nọgide na-enwe mmekọrịta dị mma nke anyị na Jehova Chineke?
5 Anya aghaghị ime ihe anyị maara na o ziri ezi ma ghara ime ihe anyị maara na ọ dị njọ, ma ndị ọzọ hà na-ahụ ya ma ọ bụ na ha adịghị ahụ ya. Nke a dị otú a ọbụna ma ọ bụrụ na anyị pụrụ ịlafere n’enweghị ihe mere anyị n’ihi emeghị ihe anyị kwesịrị ime ma ọ bụ ime ihe anyị na-ekwesighị ime. Ọ pụtara anyị na Nna anyị nke eluigwe inwe mmekọrịta dị mma, na-eburu n’uche ịdọ aka ná ntị ahụ nke Pọl onyeozi kwupụtara na Ndị Hibru 4:13: “Ọ dịghịkwa ihe e kere eke nke na-apụtaghị ìhè n’ihu ya: kama ihe nile gba ọtọ bụrụkwa ihe e megheworo n’anya ya, bụ́ onye anyị ga-akọrọ akụkọ banyere omume anyị.” Ịnọgidesi ike na-eme ihe dị mma ga-enyere anyị aka ịlụ ọgụ megide nchepụta aghụghọ nile nke Ekwensu, iguzogide ihe nrụgide dị iche iche nke ụwa, na ịlụso àgwà e ketara eketa nke ịchọ ọdịmma onwe onye ọgụ.—Tụlee Ndị Efesọs 6:11.
Ịnọ n’Okpuru Nzukọ Chineke
6. Olee ụzọ nkwurịta okwu ndị Jehova jiri mee ihe n’oge ndị bu oge ndị Kraịst ụzọ?
6 Jehova Chineke emebeghị ka ọ bụrụ ihe ruuru anyị ikpebi n’onwe anyị ụzọ anyị pụrụ isi tinye ụkpụrụ dị iche iche nke Bible n’ọrụ ná ndụ anyị. Site ná mmalite nke akụkọ ihe mere eme nke mmadụ, Chineke ejiwo ụmụ mmadụ mee ihe dị ka ụzọ nkwurịta okwu. Otú a, Adam bụ ọnụ na-ekwuchitere Chineke nye Iv. E nyere Adam iwu banyere mkpụrụ osisi ahụ a machibidoro iwu tupu e kee Iv, ya mere ọ ghaghị ịbụ na Adam emewo ka Iv mara ihe bụ uche Chineke maka ya. (Jenesis 2:16-23) Noa bụ onye amụma nke Chineke nye ezinụlọ ya na nye ụwa ahụ nke dị tupu iju mmiri ahụ. (Jenesis 6:13; 2 Pita 2:5) Abraham bụ ọnụ na-ekwuchitere Chineke nye ezinụlọ ya. (Jenesis 18:19) Mosis bụ onye amụma Chineke na ụzọ nkwurita okwu ya nye mba Israel. (Ọpụpụ 3:15, 16; 19:3, 7) Mgbe oge nke ya gasịrị, ruo n’oge Jọn Onye Na-eme Baptism, Chineke jiri ọtụtụ ndị amụma, ndị nchụàjà, na ndị eze mee ihe ime ka ndị ya nụrụ ihe bụ uche ya.
7, 8. (a) Site n’ọbịbịa nke Mesaịa ahụ, olee ndị ka e jiworo mee ihe dị ka ọnụ ndị na-ekwuchitere Chineke? (b) Gịnị ka ịnọ n’okpuru n’ụzọ nke Chineke chọrọ n’aka Ndịàmà Jehova taa?
7 Mgbe Mesaịa ahụ, bụ́ Jisọs Kraịst bịara, Chineke jiri ya na ndị ozi na ndị na-eso ụzọ ya ha na ya nọrọ nso karịsịa mee ihe dị ka ndị na-ekwuchitere Ya ọnụ ya. Mgbe oge na-aga, ndị na-eso ụzọ kwesịrị ntụkwasị obi nke Jisọs Kraịst gaje ije ozi dị ka “ohu ahụ kwesịrị ka a tụkwasị ya obi, nke nwekwara uche” n’ime ka ndị Jehova mara otú e si etinye ụkpụrụ dị iche iche nke Bible n’ọrụ ná ndụ ha. Ịnọ n’okpuru n’ụzọ nke Chineke pụtara ịnakwere ihe ọrụ nke Jehova Chineke ji na-eme ihe.—Matiu 24:45-47; Ndị Efesọs 4:11-14.
8 Ihe mere eme na-egosi na taa, “ohu ahụ kwesịrị ka a tụkwasị ya obi, nke nwekwara uche” bụ nke e jikọtara ya na Ndịàmà Jehova, bụrụkwa nke Òtù Na-achị Isi nke Ndịàmà ndị a na-anọchite anya ya. Òtù ahụ, n’aka nke ya, na-ahọpụta ndị nlekọta n’ọkwá dị iche iche—dị ka ndị okenye na ndị nnọchianya na-ejegharị ejegharị—iduzi ọrụ ahụ n’ebe ndị ha na-elekọta. Ịnọ n’okpuru n’ụzọ nke Chineke na-achọ n’aka Onyeàmà ọ bụla raara onwe ya nye ịnọ n’okpuru ndị nlekọta ndị a n’ụzọ kwekọrọ n’ihe dị na Ndị Hibru 13:17: “Na-ekwenyenụ ndị [na-edu ndú n’etiti unu, NW], na-edokwanụ onwe unu n’okpuru ha: n’ihi na ndị ahụ na-amụ anya n’ihi mkpụrụ obi unu, ndị ka ndị ga-aza ajụjụ banyere unu; ka ha wee were ọṅụ mee nke a, ghara ịsụ ude: n’ihi na nke a ga-abụ ihe na-abaghịrị unu uru.”
Ịnakwere Ịdọ Aka ná Ntị
9. Ịnọ n’okpuru n’ụzọ nke Chineke na-agụnyekarị gịnị?
9 Ịnọ n’okpuru n’ụzọ nke Chineke na-abụkarị okwu metụtara ịnakwere ịdọ aka ná ntị site n’aka ndị ahụ na-eje ozi dị ka ndị nlekọta. Ọ bụrụ na anyị adịghị enye onwe anyị ịdọ aka ná ntị dị mkpa, ọ pụrụ ịdị mkpa na e nyere anyị ndụmọdụ na ịdọ aka ná ntị site n’aka ndị ahụ nwere ahụmahụ na ikike ime otú a, dị ka ndị okenye nke ọgbakọ anyị. Ịnakwere ịdọ aka ná ntị dị otú ahụ bụ ụzọ nke amamihe.—Ilu 12:15; 19:20.
10. Ibu ọrụ dị aṅaa ka ndị ahụ na-enye ịdọ aka ná ntị nwere?
10 N’ụzọ doro anya, ndị okenye na-enye ịdọ aka ná ntị aghaghị n’onwe ha ịbụ ihe nlereanya nke ịnọ n’okpuru n’ụzọ nke Chineke. N’ụzọ dị aṅaa? Dị ka ihe dị na Ndị Galetia 6:1 si dị, ọ bụghị nanị na ha kwesịrị inwe àgwà dị mma nke inye ndụmọdụ kama ha kwesịrị ịbụ ihe nlereanya: “Ụmụnna m, a sị na ọ bụ ezie na a nwụde mmadụ mgbe ọ nọ ná ndahie ọ bụla, unu onwe unu, bụ́ ndị mmụọ nsọ na-achị, meenụ ka mmadụ dị otú a guzozie n’ime mmụọ nke ịdị nwayọọ; na-elezi onwe gị anya, ka a ghara ịnwakwa gị onwe gị.” N’ikwu ya n’ụzọ ọzọ, ndụmọdụ onye okenye ahụ aghaghị ikwekọ n’ihe nlereanya ya. Ihe dị otú ahụ kwekọrọ ná ndụmọdụ ahụ e nyere na 2 Timoti 2:24, 25 na na Taịtọs 1:9. Ee, ndị ahụ na-adọ aka ná ntị ma ọ bụ na-agbazi olu aghaghị ilezi anya nke ọma ịghara inwe aka ike. Ha kwesịrị ịdị nwayọọ n’obi, nwee obi ọma, ma guzosie ike n’ịkwado ụkpụrụ nile dị n’Okwu Chineke. Ha kwesịrị ịbụ ndị na-ege ntị na-adịghị ele mmadụ anya n’ihu, ndị na-enye ndị ahụ na-adọgbu onwe ha n’ọrụ na ndị e bowokwara ibu dị arọ ume ọhụrụ.—Tụlee Matiu 11:28-30.
Ịnọ n’Okpuru Ndị Na-achị Isi Dị Elu
11. Gịnị ka a chọrọ n’aka ndị Kraịst ná mmekọrịta nke ha na ndị ọchịchị ụwa?
11 Ịnọ n’okpuru n’ụzọ nke Chineke na-achọkwa n’aka anyị irubere ndị ọchịchị ụwa isi. A dụrụ anyị ọdụ na Ndị Rom 13:1: “Ka mkpụrụ obi ọ bụla doo onwe ya n’okpuru ndị na-achị isi n’elu ya: n’ihi na ọ dịghị onye ọ bụla na-achị isi ma ọ bụrụ na Chineke edoghị ya; ndị na-achị isi bụkwa ndị Chineke doworo.” Okwu ndị a na-achọ n’aka anyị, irubere iwu dị iche iche na-achị okporo ụzọ isi na iji n’ihi akọ na uche na-atụ ụtụ isi na ụtụ dị iche iche, tinyere ihe ndị ọzọ, dị ka Pọl onyeozi kwuru na Ndị Rom 13:7.
12. N’echiche dị aṅaa ka ịnọ n’okpuru nye Siza bụ nke a kpaara ókè?
12 Otú ọ dị, n’ụzọ pụtara ìhè, ịnọ n’okpuru nile dị otú ahụ nye Siza aghaghị ịbụ nke a kpaara ókè. Anyị ga-eburu n’uche mgbe nile ụkpụrụ ahụ nke Jisọs Kraịst kwupụtara, dị ka e dekọrọ na Matiu 22:21: “Ya mere, nyeghachinụ Siza ihe nke Siza, nyeghachikwanụ Chineke ihe nke Chineke.” Okwu nkọwa dị n’ala peji nke Ndị Rom 13:1 n’akwụkwọ bụ́ Oxford NIV [New International Version] Scofield Study Bible na-ekwu, sị: “Nke a apụtaghị na ọ gaje irubere iwu nduzi dị iche iche rụrụ arụ ma ọ bụ ndị megidere ụzọ ndị Kraịst isi. N’ọnọdụ ndị dị otú ahụ ọ bụ ibu ọrụ ya irubere Chineke isi karịa mmadụ (Ọrụ 5:29; cp. Dan. 3:16-18; 6:10ff).”
Ịnọ n’Okpuru n’Ụzọ nke Chineke n’Ime Ezinụlọ
13. Ịnọ n’okpuru n’ụzọ nke Chineke n’ime ezinụlọ na-achọ gịnị n’aka ndị òtù ya?
13 N’ime ezinụlọ, di na nna na-eje ozi dị ka isi. Nke a na-achọ n’aka ndị nwunye ige ntị ná ndụmọdụ ahụ e nyere ná ndị Efesọs 5:22, 23: “Ndị bụ nwunye, na-edonụ onwe unu n’okpuru di nke aka unu, dị ka n’okpuru Onyenwe anyị. N’ihi na di bụ isi nke nwunye, dị ka Kraịst anyị bụkwa isi nzukọ ya.”a Banyere ụmụaka, ha adịghị eme iwu nke aka ha kama ha ji ma nna ha ma nne ha ụgwọ nke ịnọ n’okpuru n’ụzọ nke Chineke, dị ka Pọl na-akọwa ná Ndị Efesọs 6:1-3: “Ụmụ, na-aṅanụ ntị okwu ndị mụrụ unu n’ime Onyenwe anyị: n’ihi na nke a bụ ihe ziri ezi. Sọpụrụ nna gị na nne gị (nke bụ ihe mbụ e nyere n’iwu nke nkwa dịrị ya), ka ihe wee na-agara gị nke ọma, ka i wee dịkwa ogologo ndụ n’elu ụwa.”
14. Gịnị ka ịnọ n’okpuru n’ụzọ nke Chineke na-achọ n’aka ndị isi ezinụlọ?
14 Otú ọ dị, ọ na-eme ka ọ dịrị ndị nwunye na ụmụaka mfe karị ịnọ n’okpuru dị otú ahụ n’ụzọ nke Chineke mgbe ndị di na nna n’onwe ha na-egosipụta ịnọ n’okpuru n’ụzọ nke Chineke. Ha na-eme nke a site n’ịdị na-abụ isi ha n’ụzọ kwekọrọ n’ụkpụrụ dị iche iche nke Bible, dị ka ndị ahụ a na-achọta na Ndị Efesọs 5:28, 29 na 6:4: “Otú a, ndị bụ di jikwa ụgwọ ịhụ nwunye nke aka ha n’anya dị ka ha hụrụ ahụ nke onwe ha n’anya. Onye na-ahụ nwunye nke aka ya n’anya na-ahụ onwe ya n’anya: n’ihi na ọ dịghị onye ọ bụla kpọrọ ahụ onwe ya asị mgbe ọ bụla; kama ọ na-azụ ya na-elezikwa ya anya nke ọma, dị ka Kraịst na-emekwa nzukọ ya.” “Ndị bụ nna, akpasukwala ụmụ unu iwe: kama na-azụpụta ha n’ọzụzụ na ịdụ ọdụ nke Onyenwe anyị.”
Ihe Ndị Na-enye Aka Igosipụta Ịnọ n’Okpuru n’Ụzọ nke Chineke
15. Mkpụrụ dị aṅaa nke mmụọ nsọ ga-enyere anyị aka igosipụta n’ịnọ n’okpuru n’ụzọ nke Chineke?
15 Gịnị ga-enyere anyị aka igosipụta ịnọ n’okpuru n’ụzọ nke Chineke n’ọtụtụ akụkụ ndị a? Nke mbụ, e nwere ịhụnanya nke na-adịghị achọ ọdịmma onwe ya nanị—ịhụnanya maka Jehova Chineke na maka ndị ahụ o debere ilekọta anyị. A na-agwa anyị na 1 Jọn 5:3: “Nke a bụ ịhụnanya Chineke, ka anyị debe ihe nile o nyere n’iwu: ihe o nyere n’iwu adịghịkwa arọ.” Otu isi ihe ahụ ka Jisọs kwupụtara na Jọn 14:15: “Ọ bụrụ na unu na-ahụ m n’anya, unu ga-edebe ihe nile m nyere n’iwu.” N’eziokwu, ịhụnanya—mkpụrụ mbụ nke mmụọ nsọ—ga-enyere anyị aka inwe ekele maka ihe nile Jehova mewooro anyị, ọ ga-esikwa otú a nyere anyị aka ịnọ n’okpuru n’ụzọ nke Chineke.—Ndị Galetia 5:22
16. Olee otú egwu Chineke si bụrụ ihe enyemaka n’igosi ịnọ n’okpuru n’ụzọ nke Chineke?
16 Nke abụọ, e nwere egwu nke Chineke. Ịtụ egwu nke ime ihe na-adịghị atọ Jehova Chineke ụtọ ga-enyere anyị aka n’ihi na ọ “bụ ịkpọ ihe ọjọọ asị.” (Ilu 8:13) N’ụzọ ajụjụ na-adịghị na ya, ịtụ egwu ime ihe na-adịghị atọ Jehova ụtọ ga-egbochi anyị imebi okwukwe anyị n’ihi egwu nke mmadụ. Ọ ga-enyekwara anyị aka irube isi ná ntụziaka Chineke n’agbanyeghị ihe isi ike ndị a ga-emeri. Ọzọkwa, ọ ga-egbochi anyị ịdaba n’ọnwụnwa ma ọ bụ nchepụta dị iche iche nke ime ihe ọjọọ. Akwụkwọ Nsọ na-egosi na ọ bụ egwu nke Jehova mere Abraham ji nwee ike ịnwa ịchụ ọkpara ya ọ hụrụ n’anya bụ́ Aịsak n’àjà, ọ bụkwa egwu nke ime ihe na-adịghị atọ Jehova ụtọ nyeere Josef aka inwe ihe ịga nke ọma n’iguzogide omume rụrụ arụ nke ịdọta mmasị nke nwunye Pọtifa mere.—Jenesis 22:12; 39:9.
17. Ọrụ dị aṅaa ka okwukwe na-arụ n’anyị ịnọ n’okpuru n’ụzọ nke Chineke?
17 Ihe inye aka nke atọ bụ okwukwe n’ime Jehova Chineke. Okwukwe ga-enyere anyị aka ịṅa ntị ná ndụmọdụ e nyere n’Ilu 3:5, 6: “Tụkwasị Jehova obi gị nile, adaberekwala [na] nghọta gị: n’ụzọ gị nile mara ya, ya onwe ya ga-emekwa ka okporo ụzọ gị nile zie ezie.” Okwukwe ga-enyere anyị aka karịsịa mgbe o yiri ka anyị na-ata ahụhụ n’ihi ikpe na-ezighị ezi ma ọ bụ mgbe anyị na-eche na a na-akpa ókè megide anyị n’ihi agbụrụ ma ọ bụ mba ma ọ bụ n’ihi nsogbu nke ọdịiche akparamagwa mmadụ. Ụfọdụ pụkwara iche na e legharawo ha anya n’ụzọ na-adịghị mma mgbe a na-ewepụtaghị aha ha maka ịhọpụta ha ije ozi dị ka onye okenye ma ọ bụ ohu na-eje ozi. Ọ bụrụ na anyị nwere okwukwe, anyị ga-echere Jehova ka o dozie ihe nile n’oge nke aka ya. Ka ọ dị ugbu a ọ pụrụ ịdị anyị mkpa ịzụlite ntachi obi nke e ji ndidi na-enwe.—Abụ Ákwá 3:26.
18. Gịnị bụ ihe enyemaka nke anọ n’anyị igosipụta ịnọ n’okpuru n’ụzọ nke Chineke?
18 Ihe enyemaka nke anọ bụ ịdị umeala n’obi. Onye dị umeala n’obi enweghị ihe isi ike ọ bụla n’igosipụta ịnọ n’okpuru n’ụzọ nke Chineke n’ihi na ‘n’umeala n’obi ọ na-agụ ndị ọzọ dị ka ndị ka ya onwe ya mma.’ Onye dị umeala n’obi dị njikere iduzi onwe ya dị ka “onye dịkarị nta.” (Ndị Filipaị 2:2-4; Luk 9:48) Ma onye dị mpako na-akpọ ịnọ n’okpuru asị, na-abụkwa onye ọ na-akpasu iwe. E kwuwo na ọ ga-akara onye ahụ mma ịbụ onye e ji otuto bibie karịa ịbụ onye e ji nkatọ nyere aka izere mmerụ ahụ.
19. Ihe nlereanya ọma dị aṅaa nke ịdị umeala n’obi ka onye bụbu onyeisi oche nke Watch Tower Society nyere?
19 Ezi ihe nlereanya nke umeala n’obi na ịnọ n’okpuru n’ụzọ nke Chineke ka e gosiri n’otu mgbe site n’aka Joseph Rutherford, onyeisi oche nke abụọ nke Watch Tower Bible and Tract Society. Mgbe Hitler machibidoro ọrụ Ndịàmà Jehova iwu na Germany, ụmụnna nọ n’ebe ahụ degaara ya akwụkwọ na-ajụ banyere ihe ha ga-eme n’ihi mmachibido a machibidoro nzụkọ ha dị iche iche na ọrụ nkwusa ha. O mere ka ezinụlọ Betel mara maka nke a ma kwuo n’eziokwu na ya amaghị ihe ọ ga-agwa ụmụnna nọ na Germany, karịsịa n’ihi ntaramahụhụ dị oké ike a na-enye ụmụnna ahụ. O kwuru na ọ bụrụ na onye ọ bụla maara ihe a ga-agwa ha, na ya ga-enwe obi ụtọ ịnụ ya. Lee ụdị mmụọ nke ịdị umeala n’obi nke a bụ!b
Abamuru Ndị Na-esite n’Igosipụta Ịnọ n’Okpuru n’Ụzọ nke Chineke
20. Ngọzi ndị dị aṅaa ka igosipụta ịnọ n’okpuru n’ụzọ nke Chineke na-arụpụta?
20 A pụrụ ịjụ n’ụzọ dị mma sị, Gịnị bụ abamuru nke igosipụta ịnọ n’okpuru n’ụzọ nke Chineke? N’ezie, ọ dị ọtụtụ. Anyị na-agbanahụ nchegbu dị iche iche na ntụfu olileanya dị iche iche nke ndị ahụ na-eme ihe ná ndabere nke onwe ha. Anyị na-ama ụtọ nke mmekọrịta nke anyị na Jehova Chineke. Anyị na-enwe mkpakọrịta kasị mma nke anyị na ụmụnna anyị bụ́ ndị Kraịst. Ọzọkwa, site na anyị ịkpa àgwà n’ụzọ iwu kwadoro, anyị na-ezere nsogbu ndị ọchịchị ụwa nke ọ na-adịghị mkpa ka anyị nwee. Anyị na-enwekwa ndụ ezinụlọ nke obi ụtọ dị ka ndị bụ di na nwunye, dị ka ndị mụrụ ụmụ na ụmụaka. Ọzọkwa, site n’ịnọgide na-anọ n’okpuru n’ụzọ nke Chineke, anyị na-eme ihe n’ụzọ kwekọrọ ná ndụmọdụ ahụ e nyere n’Ilu 27:11: “Mara ihe, nwa m, wee mme ka obi m ṅụrịa, ka m wee zaghachi onye na-ata m ụta okwu.”
[Ihe ndị e dere n’ala ala peeji]
a Otu onye na-eje ozi nke bụ onye ọsụ ụzọ jara nkwanye ùgwù na nkwado ịhụnanya nke nwunye ya mma n’ihu otu onye ọsụ ụzọ nke na-alụbeghị nwunye. Onye ọsụ ụzọ ahụ nke na-alụbeghị nwunye chere na enyi ya gaara ekwu okwu banyere àgwà ndị ọzọ nke nwunye ya. Ma ọtụtụ afọ mgbe nke a gasịrị, mgbe onye ọsụ ụzọ ahụ na-alụbeghị nwunye n’onwe ya lụrụ nwunye, ọ ghọtara ụzọ nkwado ịhụnanya si bụrụ ihe dị mkpa n’akụkụ nke nwunye nye obi ụtọ nke alụmdi na nwunye.
b Mgbe o kpesịrị ọtụtụ ekpere ma mụọ Okwu Chineke n’ụzọ dị ukwuu, Joseph Rutherford hụrụ n’ụzọ doro anya nzaghachi o kwesịrị inye ụmụnna ahụ na Germany. Ọ bụghị ihe dịịrị ya ịgwa ha ihe ha kwesịrị ime ma ọ bụ ihe ha na-ekwesịghị ime. Ha nwere Okwu Chineke nke gwara ha n’ụzọ doro anya ihe ha kwesịrị ime banyere izukọta ọnụ na ịgba àmà. Ya mere ụmụnna ahụ nọ na Germany rụrụ ọrụ ha ná nzuzo ma nọgide na-erubere iwu dị iche iche nke Jehova isi nke izukọta ọnụ na ịgba àmà banyere aha na Alaeze ya.
Ajụjụ Ntụleghachi
◻ Olee ndị ikom Chineke jiworo mee ihe dị ka ụzọ nkwurịta okwu, gịnịkwa ka ndị ohu ya ji ha ụgwọ ya?
◻ Mmekọrịta dị iche iche dị aṅaa ka ịnọ n’okpuru n’ụzọ nke Chineke metụtara?
◻ Àgwà ndị dị aṅaa ga-enyere anyị aka igosi ịnọ n’okpuru n’ụzọ nke Chineke?
◻ Ịnọ n’okpuru n’ụzọ nke Chineke na-arụpụta ngọzi ndị dị aṅaa?
[Foto dị na peeji nke 16]
Chineke jiri nhazi ụlọ nsọ nke Jerusalem mee ihe n’ime ka ndị ya mara ihe bụ uche ya
[Foto ndị dị na peeji nke 18]
Ebe ndị anyị pụrụ igosipụta ịnọ n’okpuru n’ụzọ nke Chineke