Ịnọ N’okpuru N’ụzọ Nke Chineke—N’ihi Gịnị na n’Aka Onye?
“Jehova, amawo m na ọ bụghị n’aka ya onwe ya ka ụzọ mmadụ dị: ọ bụghị onye ọ bụla nke na-eje ije nwe ime ka nzọụkwụ ya guzosie ike.”—JEREMAỊA 10:23.
1. Ụdị dị iche iche dị aṅaa nke ịdabere n’onwe onye ka e wereworo n’ihe bara uru n’ebe nile?
AKWỤKWỌ Mkpọsa Ịdabere n’Onwe Onye nke 13 mba dị iche iche nke mba Britain na-achị n’ebe Ugwu nke America na narị afọ nke 18 ji kpọsaa nnwere onwe ha pụọ n’aka mba na-achị ha bụ́ Britain, so n’ihe ndekọ a kasị mara amara nke mmadụ. Ha chọrọ nnwere onwe, adabereghịkwa n’ọchịchị ndị mba ọzọ na nnwere onwe gara ụkwụ n’ụkwụ. Ịdabere n’onwe onye n’ụzọ ndọrọ ndọrọ ọchịchị na nke akụ na ụba pụrụ ịbụ ihe bara uru nke ukwuu. N’oge ndị na-adịbeghị anya ụfọdụ mba n’ebe Ọwụwa Anyanwụ Europe agawo n’ihu ịbụ ndị dabeere n’onwe ha n’ụzọ ndọrọ ndọrọ ọchịchị. Otú ọ dị, a ghaghị ikweta na ná mba ndị ahụ ọnọdụ dị otú ahụ nke ịdabere n’onwe onye n’ebe onye ọzọ nọ ejiriwo ọtụtụ nsogbu ndị siri ike bịa.
2, 3. (a) Ụdị ịdabere n’onwe onye dị aṅaa bụ nke na-adịghị mma? (b) Olee ụzọ e si mee ka eziokwu nke a doo anya n’ụzọ siri ike ná mbụ?
2 N’agbanyeghị otú ụdị dị iche iche nke ịdabere n’onwe onye pụrụ ịbụ ihe a na-achọsi ike, ọ dị otu ụdị nke ịdabere n’onwe onye nke na-adịghị mma. Gịnị ka nke ahụ bụ? Adabereghị n’Onye Mere mmadụ, Jehova Chineke. Nke ahụ abụghị ngọzi kama nkọcha. N’ihi gịnị? N’ihi na ọ dịghị mgbe e mere mmadụ ime ihe n’adabereghị n’Onye Mere ya, dị ka okwu ndị ahụ nke Jeremaịa onye amụma e hotara n’elu na-egosi n’ụzọ pụtara ìhè. N’ikwu ya n’ụzọ ọzọ, e mere mmadụ ịnọ n’okpuru Onye Mere ya. Ịnọ n’okpuru Onye Okike anyị pụtara irubere ya isi.
3 E mere ka eziokwu ahụ doo anya n’ụzọ siri ike nye di na nwunye mbụ ahụ bụ mmadụ site n’iwu ahụ Jehova nyere ha dị ka e dekọrọ ya na Jenesis 2:16, 17: “Mkpụrụ nke sitere n’osisi nile ọ bụla nke ubi a a gbara ogige ka ị ga na-eri eri: ma mkpụrụ nke sitere n’osisi ịma ezi ihe na ihe ọjọọ, gị erila mkpụrụ sitere na ya: n’ihi na n’ụbọchị i ga-eri mkpụrụ sitere na ya ị ghaghị ịnwụ anwụ.” Ịjụ ịnọ n’okpuru Onye Mere ya wetaara Adam na ụmụ ya nile mmehie, ahụhụ, na ọnwụ.—Jenesis 3:19; Ndị Rom 5:12.
4, 5. (a) Gịnị siworo n’ọjụjụ ụmụ mmadụ jụrụ ịnọ n’okpuru Chineke pụta? (b) Iwu omume ọma dị aṅaa ka a na-apụghị ịgbanahụ agbanahụ?
4 Ụmụ mmadụ ịjụ ịnọ n’okpuru Chineke bụ ihe amamihe na-adịghị na ya na nke dị njọ n’ụzọ omume. N’ime ụwa ọ rụpụtawo n’ụzọ zuru ebe nile mmebi iwu, mpụ, ime ihe ike, na omume rụrụ arụ nke mmekọahụ ya na mkpụrụ ya nke ọrịa ndị a na-ebufe site ná mmekọahụ. E wepụkwa nke ahụ, ihe otiti e nwere taa nke mpụ ụmụaka ọ́ bụghị n’ụzọ dị ukwuu ihe ọjụjụ ndị ntorobia jụrụ ịnọ n’okpuru Jehova kpatara, tinyere ndị mụrụ ha na iwu dị iche iche nke obodo? A na-ahụ mmụọ a nke idabere n’onwe onye n’ụzọ na-adịghị ụtọ n’anya na nke ruru unyi ọtụtụ mmadụ si eji ejiji na n’asụsụ rụrụ arụ ha ji eme ihe.
5 Ma a pụghị ịgbanahụ mmetụta nke iwu omume ọma nke Onye Okike agbanahụ: “Unu ekwela ka e duhie unu; Chineke abụghị onye a na-elelị: n’ihi na mkpụrụ ọ bụla mmadụ na-agha, nke ahụ ka ọ ga-ewetakwa n’ubi. N’ihi na onye na-agha mkpụrụ nye anụ ahụ onwe ya ga-esite n’anụ ahụ weta mmebi dị ka ihe ubi.”—Galetia 6:7, 8.
6, 7. Gịnị bụ isi ihe kpatara ọjụjụ a na-ajụ ịnọ n’okpuru, dị ka a pụrụ ịhụ site n’ihe atụ ndị dị aṅaa?
6 Gịnị bụ isi ihe na-akpata ọjụjụ nile a a na-ajụ ịnọ n’okpuru? N’ikwu ya n’ụzọ dị mfe, ọ bụ ọchịchọ onwe onye nanị na mpako. Ọ bụ n’ihi ya ka Iv, nwanyị mbụ, ji kwere ka agwọ ahụ rafuo ya ma rie mkpụrụ ahụ a machibidoro n’iwu. A sị na ọ maara ebe ike ya jedebere ma dịrị ume ala n’obi, ọnwụnwa nke ịdị ka Chineke—ikpebiri onwe ya ihe bụ ezi ihe na ihe ọjọọ—agaraghị adọrọ mmasị ya. A sị na ọ bụghị onye na-achọ ọdịmma onwe ya nanị, ọ garaghị achọ ihe Onye Mere ya, bụ́ Jehova Chineke machibidoro iwu n’ụzọ pụtara ìhè.—Jenesis 2:16, 17.
7 N’oge na-adịghị anya mgbe Adam na Iv dasịrị, mpako na ọchịchọ onwe onye nanị kpatara Ken ji gbuo nwanne ya nwoke bụ Ebel. Ọzọkwa, ọchịchọ onwe onye nanị mere ụfọdụ ndị mmụọ ozi ji mee omume n’ụzọ nke ịdabere n’onwe ha, ịhapụ ọnọdụ mbụ ha ma nwoghara ahụ nke mmadụ iji nwee ihe ụtọ nke anụ ahụ. Mpako na ọchịchọ nke onwe onye nanị kpaliri Nimrọd, ọ bụrụwokwa ihe e jiri mara ihe ka ukwuu ná ndị ọchịchị ụwa kemgbe oge ya.—Jenesis 3:6, 7; 4:6-8; 1 Jọn 3:12; Jud 6.
Ihe Mere Anyị Ji Jiri Jehova Chineke Ụgwọ nke Ịnọ n’Okpuru
8-11. Gịnị bụ ihe anọ dị ike mere anyị ga-eji nọrọ n’okpuru n’ụzọ nke Chineke?
8 N’ihi gịnị ka anyị ji jiri Onye Mere anyị, bụ́ Jehova Chineke, ụgwọ ịnọ n’okpuru ya? Ná nke mbụ n’ihi na ọ bụ Ọkaaka nke Eluigwe na ala. Ike nile dị n’aka ya dị ka onye o ruuru. Ọ bụ Onye Ikpe anyị, Onye Na-enye anyị iwu, na Eze anyị. (Aịsaịa 33:22) N’ụzọ ziri ezi e dere banyere ya, sị: “Ihe nile gba ọtọ bụrụkwa ihe e megheworo n’anya ya, bụ́ onye anyị ga-akọrọ akụkọ banyere omume anyị.”—Ndị Hibru 4:13.
9 Ọzọkwa, ebe Onye Mere anyị bụ onye pụrụ ime ihe nile, ọ dịghị onye ga-enwe ihe ịga nke ọma n’imegide ya; ọ dịghị onye ọ bụla pụrụ ileghara ibu ọrụ ya nke ịnọ n’okpuru Ya anya. N’oge na-adịghị anya, ndị ahụ jụrụ ajụ ga-abụ ndị e bibiri dị ka e bibiri Fero nke oge ochie na dị ka a ga-ebibi Setan bụ Ekwensu mgbe oge nke Chineke ruru.—Abụ Ọma 136:1, 11-15; Mkpughe 11:17; 20:10, 14.
10 Ịnọ n’okpuru bụ ibu ọrụ nke ihe nile e kere eke nwere ọgụgụ isi n’ihi na ha dị adị n’ihi nzube nke ijere Onye Mere ha ozi. Mkpughe 4:11 na-akpọsa, sị: “Gị, Onyenwe anyị na Chineke anyị, i kwesịrị ịnara otuto nile na nsọpụrụ nile na ike nile: n’ihi na gị onwe gị kere ihe nile, ọ bụkwa n’ihi ọchịchọ gị ka ha dịrị, ka e kekwara ha eke.” Ọ bụ Ọkpụ Ite Ukwu ahụ, ọ na-emekwa ite ụrọ ndị bụ mmadụ imezu nzube ya.—Aịsaịa 29:16; 64:8.
11 Anyị ekwesịghị ileghara eziokwu ahụ anya, nke bụ na Onye Mere anyị nwezuru amamihe nile, n’ihi ya ọ maara ihe kasị mma maka anyị. (Ndị Rom 11:33) Iwu ya nile bụ ‘maka ọdịmma anyị.’ (Deuterọnọmi 10:12, 13) Karịsịa ihe nile, “Chineke bụ ịhụnanya,” n’ihi ya ọ chọrọ nanị ihe kasị mma maka anyị. Lee ọtụtụ ihe ndị na-arụgide arụgide anyị nwere dị ka ihe mere anyị ga-eji doo onwe anyị n’okpuru Onye Mere anyị, Jehova Chineke!—1 Jọn 4:8.
Jisọs Kraịst, Ihe Nlereanya Zuru Òkè nke Ịnọ n’Okpuru Chineke
12, 13. (a) Olee otú Jisọs Kraịst si gosipụta ịnọ n’okpuru n’ụzọ nke Chineke? (b) Okwu ndị dị aṅaa nke Jisọs na-egosi àgwà ya nke ịnọ n’okpuru?
12 N’ezie, Ọkpara Jehova mụrụ nanị ya, bụ́ Jisọs Kraịst, na-enye anyị ihe nlereanya zuru òkè nke ịnọ n’okpuru n’ụzọ nke Chineke. Pọl onyeozi na-eme ka nke a pụta ìhè na Ndị Filipaị 2:6-8: “[Jisọs], ọ bụ ezie na ọ dịrị n’ụdị nke Chineke na mbụ, ma ọ gụghị ya n’ihe ọ ga-ejidesi ike, bụ́ ịha ka Chineke, kama o mere onwe ya ihe efu, n’ịnara ụdị nke ohu, e wee mee ya n’oyiyi nke mmadụ; ebe a hụrụ ya ka ọ dị ka mmadụ n’oyiyi ya, o wedakwara onwe ya [gaa n’ihu], wee bụrụ onye na-aṅa ntị ruo ọnwụ, bụ́ ọnwụ nke [osisi ịta ahụhụ, NW].” Mgbe ọ nọ n’elu ala, Jisọs kwughachiri ọtụtụ mgbe na ọ dịghị ihe ọ bụla ọ na-eme site n’uche nke aka ya; ọ dịghị mgbe o mere omume ná ndabere nke onwe ya, kama mgbe nile o doro onwe ya n’okpuru Nna ya nke eluigwe.
13 Anyị na-agụ na Jọn 5:19, 30: “Jisọs zara, sị ha, N’ezie, n’ezie, asị m unu, Ọkpara apụghị ime ihe ọ bụla n’onwe ya, ma ọ̀ bụghị ihe ọ hụrụ na Nna ya na-eme: n’ihi na ihe ọ bụla ya onwe ya na-eme, ndị a ka Ọkpara ya na-emekwa otú ahụ. Mụ onwe m apụghị ime ihe ọ bụla n’onwe m: dị ka m na-anụ m na-ekpe: ikpe m zikwara ezi; n’ihi na etughị m ihe mụ onwe m na-achọ, kama ihe onye zitere m na-achọ.” N’otu aka ahụ, n’abalị ahụ a raara ya nye o kpeghachiri ekpere ọtụtụ ugbo, sị: “Ọ bụghị dị ka mụ onwe m na-achọ, kama dị ka gị onwe gị na-achọ.”—Matiu 26:39, 42, 44; leekwa Jọn 7:28; 8:28, 42.
Ihe Nlereanya Oge Ochie nke Ịnọ n’Okpuru n’Ụzọ nke Chineke
14. N’ụzọ ndị aṅaa ka Noa si gosi ịnọ n’okpuru n’ụzọ nke Chineke?
14 Noa so n’ihe nlereanya oge ochie nke ụmụ mmadụ ndị doro onwe ha n’okpuru Chineke. O gosiri ịnọ n’okpuru ya n’ụzọ atọ dị iche iche. Nke mbụ, site n’ịbụ onye ezi omume, onye a na-apụghị ịta ụta n’etiti ndị dịrị ndụ n’oge ya, na-esoro ezi Chineke ahụ na-eje ije. (Jenesis 6:9) Nke abụọ, site n’iwu ụgbọ ahụ. O “wee mee ya; dị ka iwu nile si dị nke Chineke nyere ya, otú a ka o mere.” (Jenesis 6:22) Nke atọ, site n’ịdọ aka ná ntị banyere Iju Mmiri ahụ nke na-abịa dị ka “onye na-ekwusa ezi omume.”—2 Pita 2:5.
15, 16. (a) Ihe nlereanya ọma dị aṅaa ka Abraham setipụrụ n’ịnọ n’okpuru n’ụzọ nke Chineke? (b) Olee otú Sera si gosi ịnọ n’okpuru?
15 Abraham bụ ihe nlereanya ọzọ pụtara ìhè nke ịnọ n’okpuru n’ụzọ nke Chineke. O gosipụtara ịnọ n’okpuru site n’irubere iwu Chineke isi: “Si n’ala gị . . . jee nke gị [pụọ].” (Jenesis 12:1) Nke ahụ pụtara ịhapụ gburugburu ebe o bi na Ụa (Ụa abụghị ntakịrị obodo, dị ka nchọpụta ndị ọkà n’ihe ndị e gwupụtara n’ala gosiri) nke jupụtara n’ihe ndị na-eweta ntụsara ahụ ije na-awagharị dị ka onye na-enweghị ebe obibi n’ala na-abụghị nke aka ya ruo otu narị afọ. Abraham gosiri ịnọ n’okpuru n’ụzọ nke Chineke karịsịa site n’ịnagide oké ule nke ịdị njikere iji ọkpara ya bụ Aịsak chụọ àjà.—Jenesis 22:1-12.
16 Nwunye Abraham, bụ́ Sera na-enye anyị ihe nlereanya ọma ọzọ nke ịnọ n’okpuru n’ụzọ nke Chineke. Ijegharị n’ala a na-amaghị ama wetara n’ezie ihe isi ike dị iche iche, ma ọ dịghị n’ebe ọ bụla anyị na-agụta na o mere mkpesa. O setịpụrụ ezi ihe nlereanya nke ịnọ n’okpuru n’ụzọ nke Chineke n’ọnọdụ abụọ ahụ mgbe Abraham gosiri ya dị ka nwanne ya nwanyị n’ihu ndị ọchịchị na-ekpere arụsị. N’ugbo abụọ ahụ ọ kwadoro ya, ọ bụ ezie na ọ fọrọ nke nta ka ọ bụrụ onye òtù nke ìgwè ndị inyom e ji mere ndị iko nwanyị, dị ka ihe si na ya pụta. Ihe àmà nke ịnọ n’okpuru ya n’ụzọ nke Chineke bụ ụzọ o si akpọ di ya bụ Abraham “onyenwe m” n’ime obi ya, na-egosi na ịnọ n’okpuru n’ụzọ nke Chineke bụ ezi àgwà nke obi ya.—Jenesis 12:11-20; 18:12; 20:2-18; 1 Pita 3:6.
17. N’ihi gịnị ka a pụrụ iji kwuo na Aịsak gosiri ịnọ n’okpuru n’ụzọ nke Chineke?
17 Ka anyị ghara ilefuru ihe nlereanya nke ịnọ n’okpuru n’ụzọ nke Chineke nke ọkpara Abraham bụ́ Aịsak gosiri. Akụkọ omenala ndị Juu na-egosi na Aịsak gbara ihe dị ka afọ 25 mgbe Jehova nyere nna ya bụ́ Abraham iwu iji ya chụọ àjà. Asị na Aịsak chọrọ, ọ pụrụ ịdịrị ya mfe iguzogide nna ya, bụ́ onye ji otu narị afọ bụrụ okenye karịa ya. Ma ee e. Ọ bụ ezie na Aịsak nwere ihe iju anya n’ihi na ọ dịghị anụmanụ dịnụ maka ịchụ àjà ahụ, o jiri obi umeala kwere ka nna ya tụkwasị ya n’elu ebe ịchụ àjà ahụ ma mgbe ahụ kechie aka ya na ụkwụ ya iji gbochie ma ọ bụ kwụsị mmeghachi omume mberede ọ bụla nke pụrụ iwereworị ọnọdụ ma ọ bụrụ na e jiri mma ahụ e ji egbu ya mee ihe.—Jenesis 22:7-9.
18. Olee otú Mosis si gosi ihe nlereanya nke ịnọ n’okpuru n’ụzọ nke Chineke?
18 Ọtụtụ afọ n’ikpeazụ, Mosis setipụụrụ anyị ihe nlereanya ọma n’ịnọ n’okpuru n’ụzọ nke Chineke. E gosiri nke ahụ n’ezie site na ya ịbụ onye a kọwara dị ka onye “dị umeala n’obi nke ukwuu, karịa mmadụ nile ndị nọ n’elu ala.” (Ọnụ Ọgụgụ 12:3) Ya iji nrubeisi mezuo iwu nile nke Jehova n’ime ọzara ruo afọ 40, ọbụna ọ bụ ezie na ọ na-elekọta ndị nnupụisi ọnụ ọgụgụ ha ruru nde abụọ ma ọ bụ atọ, bụ ihe àmà ọzọ nke ịnọ n’okpuru ya n’ụzọ nke Chineke. Otú a ihe ndekọ ahụ na-ekwu na “Mosis wee mee ya: dị ka ihe nile si dị nke Jehova nyere ya n’iwu, otú a ka o mere.”—Ọpụpụ 40:16.
19. Okwu ndị dị aṅaa ka Job ji gosi ọnụnọ ọ nọ n’okpuru Jehova?
19 Job bụ onye ọzọ pụtara ìhè nke setịpụụrụ anyị ihe nlereanya magburu onwe ya n’ịnọ n’okpuru n’ụzọ nke Chineke. Mgbe Jehova nyesịworo Setan oghere ikpochapụ ihe nile Job nwere, igbu ụmụ ya, na itikwa ya “ihe ofifi ọjọọ . . . site n’ọbụ ụkwụ ya ruo opu n’isi ya,” nwunye Job gwara ya, sị: “Ị̀ nọ na-ejide izu okè gị? Gbakụta Chineke azụ, nwụọ.” Otú o sina dị, Job gosiri ịnọ n’okpuru ya n’ụzọ nke Chineke site n’ịgwa ya, sị: “Dị ka otu n’ime ndị inyom nzuzu si ekwu, otú a ka ị na-ekwu. Ànyị ga-anarakwa ezi ihe n’aka Chineke, ghara ịnara ihe ọjọọ?” (Job 2:7-10) Ihe na-egosikwa otu ọnọdụ uche ahụ bụ okwu ya ndị ahụ e dekọrọ na Job 13:15: “Ọbụna ma ọ bụrụ na ọ ga-egbu m, m̀ gaghị echere?” (NW) Ọ bụ ezie na Job nwere nchegbu dị ukwuu banyere izi ezi nke onwe ya, anyị ekwesịghị ichefu na n’ikpeazụ Jehova gwara otu n’ime ndị a sị na ha bụ ndị nkasi obi ya: “Iwe m dị ọkụ megide gị, megidekwa ndị enyị gị abụọ: n’ihi na unu ekwughị ihe ziri ezi banyere m, dị ka ohu m, bụ Job, kwuworo.” Ihe ịrụ ụka adịghị ya na Job bụụrụ anyị ezi ihe nlereanya nke ịnọ n’okpuru n’ụzọ nke Chineke.—Job 42:7.
20. N’ụzọ ndị dị aṅaa ka Devid si gosi ịnọ n’okpuru n’ụzọ nke Chineke?
20 Iji kpọtụ aha n’otu ihe atụ ọzọ sitere n’Akwụkwọ Nsọ Hibru, e nwere Devid. Mgbe Eze Sọl chụgharịrị Devid dị ka à ga-asị na ọ bụ anụmanụ, Devid nwere ohere abụọ nke iweta nsogbu ya ná njedebe site n’igbu Sọl. N’agbanyeghị nke ahụ, ịnọ n’okpuru nke Devid n’ụzọ nke Chineke gbochiri ya ime otú ahụ. E dekọrọ okwu ya na 1 Samuel 24:6: “Ya bụrụ m ihe arụ site na Jehova; m gaghị eme onyenwe m, bụ́ onye Jehova e tere mmanụ, ihe a ma ọlị, bụ́ iseti aka m megide ya, n’ihi na onye Jehova e tere mmanụ ka ọ bụ.” (Leekwa 1 Samuel 26:9-11.) N’otu aka ahụ o gosiri ịnọ n’okpuru ya n’ụzọ nke Chineke site n’ịnakwere ịdọ aka ná ntị mgbe o mehiere ihe ma ọ bụ mee mmehie.—2 Samuel 12:13; 24:17; 1 Ihe Emere 15:13.
Ihe Nlereanya Pọl nke Ịnọ n’Okpuru
21-23. N’oge dị iche iche dị aṅaa ka Pọl onyeozi gosiri ịnọ n’okpuru n’ụzọ nke Chineke?
21 N’Akwụkwọ Nsọ Grik nke Ndị Kraịst, anyị nwere ihe nlereanya pụtara ìhè nke ịnọ n’okpuru n’ụzọ nke Chineke n’ebe Pọl onyeozi nọ. O ṅomiri Nna ya Ukwu, bụ́ Jisọs Kraịst, na nke a dị ka o mere n’akụkụ ndị ọzọ nke ije ozi ya dị ka onyeozi. (1 Ndị Kọrint 11:1) Ọ bụ ezie na Jehova Chineke jiri ya mee ihe n’ụzọ dị ukwuu karịa onye ọ bụla ọzọ ná ndị ozi ahụ, ọ dịghị mgbe Pọl mere ihe na-adabere n’onwe ya. Luk na-agwa anyị na mgbe ajụjụ ahụ bilitere ma ọ̀ dị ndị Jentaịl a tọghatara atọghata mkpa ịbụ ndị e biri úgwù, “ndị Kraịst [ụmụnna n’Antiọk] wee dozie ka Pọl na Banabas, na ụfọdụ ndị ọzọ n’etiti ha, rigoro Jerusalem jekwuru ndị ozi na ndị okenye banyere ajụjụ a.”—Ọrụ 15:2.
22 Banyere ọrụ ozi ala ọzọ nke Pọl, a gwara anyị na Ndị Galetịa 2:9, sị: “Mgbe ha hụkwara amara e nyere m, Jemes na Kifas na Jọn, bụ́ ndị a kpọrọ idé, nara mụ na Banabas aka nri nke nnwekọ, ka anyị onwe anyị wee jekwuru ndị mba ọzọ, ka ha onwe ha wee jekwurukwa ndị obibi úgwù.” Kama ime ihe ná ndabere nke onwe ya, Pọl chọrọ nduzi.
23 N’otu aka ahụ, n’oge ikpeazụ Pọl gara Jerusalem, ọ naara ndụmọdụ nke ndị okenye nọ n’ebe ahụ nyere n’ihe banyere ịga n’ụlọ nsọ na ịgbaso usoro nke Iwu ahụ ka mmadụ nile wee nwee ike ịhụ na ọ bụghị onye dapụrụ n’ezi ofufe ruo otú o metụtara Iwu Mosis. Ebe ya ime otú ahụ yiri ka ò jedebere n’ụzọ dị njọ, na-enwe ìgwè ndị na-eme ihe ike ndị a kpaliri megide ya, ya ịnọ n’okpuru ndị okenye ahụ ọ̀ bụ imehie ihe? Ọ dịghị otú ahụ ma ọlị, dị ka ọ pụtara ìhè site n’ihe anyị na-agụ n’Ọrụ 23:11: “N’abalị sonu Onyenwe anyị guzoro n’akukụ ya, sị, Nwee obi ike: n’ihi na dị ka i kwuru okwu banyere m sie ike na Jerusalem, ị ghaghị ịgbakwa àmà otú a na Rom.”
24. Akụkụ ndị ọzọ dị aṅaa nke ịnọ n’okpuru ka a ga-atụle n’isiokwu na-esonu?
24 N’eziokwu, Akwụkwọ Nsọ na-enye anyị ihe ndị dị ike mere anyị ga-eji bụrụ ndị na-edo onwe anyị n’okpuru na ihe atụ ndị na-akpali akpali nke ndị ahụ gosipụtara ụdị ịnọ n’okpuru dị otú ahụ. N’isiokwu na-esonu, anyị ga-atụle akụkụ dị iche iche ebe anyị pụrụ ịnọ n’okpuru Jehova Chineke, ihe ndị ga-enyere anyị aka ime otú ahụ, na nkwụghachi ụgwọ ndị na-esi na ya apụta.
Olee Otú Ị Ga-esi Zaa?
◻ Ụdị ịdabere n’onwe onye dị aṅaa dị njọ?
◻ Gịnị bụ isi ihe kpatara ọjụjụ a na-ajụ ịnọ n’okpuru?
◻ Olee ihe ndị mere anyị ji jiri Jehova ụgwọ ịnọ n’okpuru ya?
◻ Ihe nlereanya ọma ndị dị aṅaa nke ịnọ n’okpuru n’ụzọ nke Chineke ka Akwụkwọ Nsọ na-enye?
[Foto dị na peeji nke 10]
Nimrọd, onye ọchịchị mbụ mgbe iju mmiri gasịrị nke nupụrụ isi ịnọ n’okpuru n’ụzọ nke Chineke
[Foto dị na peeji nke 13]
Noa, ihe nlereanya a na-apụghị ịta ụta nke ịnọ n’okpuru n’ụzọ nke Chineke.—Jenesis 6:14, 22