Satọdee
“Jirinụ aha nsọ ya na-anya isi. Ka obi ndị na-achọ Jehova ṅụrịa ọṅụ”—Abụ Ọma 105:3
ỤTỤTỤ
9:20 Vidio Abụ Olu Ụtọ
9:30 Abụ nke 53 na Ekpere
9:40 OKWU MMADỤ ISII GA-EKWU: Na-enwe Ọṅụ A Na-enwe n’Ihi Ime Ndị Na-eso Ụzọ—Na-eme Ka Otú I Si Ezi Ozi Ọma Ka Mma
• Na-ajụ Ajụjụ (Jems 1:19)
• Na-eme Ka Okwu Chineke Na-akpa Ike n’Ahụ́ Ndị Ị Na-ezi Ozi Ọma (Ndị Hibru 4:12)
• Na-eji Ihe Atụ Eme Ka Ihe Ndị Bụ́ Isi Doo Anya (Matiu 13:34, 35)
• Na-eji Ịnụ Ọkụ n’Obi Akụzi Ihe (Ndị Rom 12:11)
• Na-emetere Ndị Ị Na-amụrụ Ihe Ebere (1 Ndị Tesalonaịka 2:7, 8)
• Na-akụzi Ihe Otú Ọ Ga-eru n’Obi (Ilu 3:1)
10:50 Abụ nke 58 na Ịma Ọkwa
11:00 OKWU MMADỤ ATỌ GA-EKWU: Na-enwe Ọṅụ A Na-enwe n’Ihi Ime Ndị Na-eso Ụzọ—Nabata Aka Jehova Na-enyere Anyị
• Ihe Ndị Anyị Ji Eme Nchọnchọ (1 Ndị Kọrịnt 3:9; 2 Timoti 3:16, 17)
• Ụmụnna Anyị (Ndị Rom 16:3, 4; 1 Pita 5:9)
• Ekpere (Abụ Ọma 127:1)
11:45 OKWU BAPTIZIM: Otú Ime Baptizim Ga-esi Eme Ka Ị Na-enwekwu Obi Ụtọ (Ilu 11:24; Mkpughe 4:11)
12:15 Abụ nke 79 na Nkwụsịtụ
EHIHIE
1:35 Vidio Abụ Olu Ụtọ
1:45 Abụ nke 76
1:50 Otú Ụmụnna Anyị Si Aṅụrị Ọṅụ Maka na Ha Na-eme Ka Ndị Mmadụ Bụrụ Ndị Na-eso Ụzọ Jizọs . . .
• n’Afrịka
• n’Eshia
• na Yurop
• n’Ebe Ugwu Amerịka
• ná Mba Ndị Dị n’Oké Osimiri Pasifik
• n’Ebe Ndịda Amerịka
2:35 OKWU MMADỤ ISE GA-EKWU: Nyere Ndị Ị Na-amụrụ Baịbụl Aka . . .
• Ịna-amụkwa Ihe n’Onwe Ha na Ịna-ele Vidio Anyị (Matiu 5:3; Jọn 13:17)
• Ịna-abịa Ọmụmụ Ihe (Abụ Ọma 65:4)
• Izere Mkpakọrịta Ọjọọ (Ilu 13:20)
• Ịkwụsị Ịna-eme Omume Na-adịghị Mma (Ndị Efesọs 4:22-24)
• Ịbụ Ndị Enyi Jehova (1 Jọn 4:8, 19)
3:30 Abụ nke 110 na Ịma Ọkwa
3:40 FIM SI NA BAỊBỤL: Nehemaya: “Ọṅụ Jehova Bụ Ebe Unu E Wusiri Ike”—Agba nke Mbụ (Nehemaya 1:1–6:19)
4:15 Inyere Ndị Mmadụ Aka Ịna-efe Chineke Ugbu A Na-akwadebe Anyị Maka Inyere Ndị Mmadụ Aka Ịna-efe Chineke n’Ụwa Ọhụrụ (Aịzaya 11:9; Ọrụ Ndịozi 24:15)
4:50 Abụ nke 140 na Ekpere Mmechi