Udo Ụwa—Gịnị Ka Ọ Ga-apụta n’Ezie?
UDO ụwa nke Chineke bu n’uche ga-emetụta ihe dị ukwuu karịa ịkwụsị ibu agha n’ụwa nile ma ọ bụkwanụ ọnọdụ agaghị ihu agaghị azụ n’ihe banyere ngwá agha nuklia. Nke a pụtara ìhè site n’ụzọ Bible si jiri okwu ahụ bụ “udo” mee ihe.
Dị ka ihe atụ, n’Akwụkwọ nsọ Hibru (bụ́ “Agba Ochie”) okwu dị maka udo bụ Sha·lohmʹ. E ji otu ụdị nke okwu a mee ihe na Jenesis 37:14, ebe nna ochie ahụ bụ Jekọb gwara nwa ya bụ Josef, sị: “Lee ma ụmụnne gị nọ n’udo, ma ìgwè ewu na atụrụ dịkwa n’udo; weghachikwara m okwu.”a E jikwa Sha·lohmʹ mee ihe ọzọ na Jenesis 41:16, ebe a sụgharịkwara ya ịbụ “udo.”
Ya mere, n’echiche nke Bible, ezi udo gụnyere, ọ bụghị nanị nkwụsị nke mburịta agha, kama ọ gụnyekwara ahụ ike, ịnọ ná nchebe, na ọdịmma. Mbipụta anyị bu nke a ụzọ gosiri na ụmụ mmadụ apụghi ịchọta ụzọ a ga-esi nweta udo. Ọ bụ nanị Jisọs Kraịst, bụ́ “Onyeisi Udo” ahụ, ga-edozi ihe nile dị mkpa wee weta ezi udo n’elu ala. (Aịsaịa 9:6, 7) Dị ka ihe atụ, tụlee ihe Bible buru n’amụma n’Abụ Ọma 72:7, 8 banyere ọchịchị nke onye ahụ: “Onye ezi omume ga-ama akwụkwọ n’ụbọchị nile ya dị ka osisi ndụ; ọtụtụ udo ga-adịkwa ruo mgbe ọnwa na-agaghị adị. Ya nweekwa ike n’ahụ mmadụ site n’otu oké osimiri ruo oké osimiri ọzọ, sitekwa n’Osimiri ruo nsọtụ nile nke ụwa.” Cheedị ihe ọ ga-abụ—ahụ ike, ịnọ ná nchebe, na inwe ọdịmma n’ọ̀tụ̀tụ̀ zuru ụwa ọnụ! Ọ dịghị nkwekọrịta ndọrọ ndọrọ ọchịchị nke pụrụ imezu ya. Ọ̀ bụ nanị Alaeze Chineke pụrụ ime ya, ọ ga-emezukwa ihe dị ukwuu karị. Bible na-enye anyị ọtụtụ amụma ndị na-akpali akpali, ndị na-enyere anyị aka ileba anya n’udo ụwa nke a nke ga-abịa n’ọdịnihu. Ka anyị tụlee ụfọdụ n’ime ha.
Ịchịsa Ngwá Agha n’Ụwa Dum—Ụzọ nke Chineke!
Abụ Ọma 46:8, 9 na-asị: “Jeenụ, hụ ọrụ nile nke Jehova, onye doworo ihe ijuanya dị iche iche n’ụwa, na-eme ka agha nile kwụsị ruo nsọtụ ụwa; ọ na-agbaji ụta, gbupịakwa ube; ọ na-esure ụgbọ ala nile n’ọkụ.” Okwu ndị ahụ bụ “ụta,” “ube,” na “ụgbọ ala,” bụcha ihe nnọchianya nke ụdị ihe agha ma ọ bụ ngwá agha ọ bụla. Otú a, Jehova na-eme ihe karịrị ibelata ngwá agha ma ọ bụ ọbụna ịchịsa ngwá agha kpam kpam. Ọ ga-ewepụchasị ngwá agha nuklia kpam kpam, égbè ukwu, ụgbọ agha ọwụ mgbọ, ihe ndị e ji agbapụ mgbọ ogbunigwe, bọmbụ ogbunigwe grenade, bọmbụ ndị e ji plastik mee, égbè ogologo, égbè mkpirisi—ihe ọ bụla nke pụrụ iyi udo ụwa dum egwu!
Otú ọ dị, ọ bụghị nanị ngwá agha na-akpata agha. Ọ na-abụkarị na agha gbanyere mkpọrọgwụ n’àgwà ịkpọasị, anyaukwu, ma ọ bụ nke
ime ihe ike nke mmadụ na-ezughị okè. (Tụlee Jemes 4:1-3.) Ya mere, Alaeze Chineke ga-alụso isi ihe nke a na-akpata agha ọgụ site n’iwepụchasị àgwà ọjọọ dị otú ahụ n’ime mmadụ.
N’ụzọ dị aṅaa? Site n’usoro inye ọzụzụ nke zuru ụwa ọnụ. “Ihe ọmụma Jehova ga-ejupụta ụwa, dị ka mmiri si ekpuchi oké osimiri.”—Aịsaịa 11:9.
Ebe ha bụ ‘ndị Jehova zịworo ihe,’ ihe a kpọrọ mmadụ agaghị elekwa ọdịiche nke agbụrụ anya dị ka ihe na-akpata mburịta agha, ịkpọasị, ma ọ bụ nleda anya. (Jọn 6:45) “Chineke abụghị onye na-ele mmadụ anya n’ihu,” ndị bi n’ụwa ga-egosipụtakwa àgwà ya nke eleghị mmadụ anya n’ihu. (Ọrụ 10:34) Alaeze ahụ ga-ewepụkwa ihe ọ bụla nke pụrụ ịkpata mburịta agha n’ọdịnihu site n’iwepụchasị ókèala nile nke mba dị iche iche. ‘Site n’otu osimiri ruo n’osimiri ọzọ, ruokwa ná nsọtụ nile nke ụwa,’ mmadụ nile ga-ekwe nkwa iji afọ ofufo na-erube isi nye ọchịchị nke Kraịst.—Abụ Ọma 72:8.
Ka udo dị otú ahụ wee dịtee anya, Alaeze ahụ ga-ewepụkwa ihe ahụ kasị na-akpata nkewa n’akụkọ ihe mere eme nke mmadụ: okpukpe ụgha. (Zefanaịa 2:11) Ihe a kpọrọ mmadụ ga-adị n’otu n’ife nanị ezi Chineke ahụ. (Aịsaịa 2:2, 3) Òtù ụmụnna zuru ụwa ọnụ ga-adị!
Udo n’Ime Ezinụlọ
Otú ọ dị, uru dị aṅaa ka udo ụwa ga-aba ma ọ bụrụ na ezinụlọ dị iche iche bụ ọgbọ agha ebe a na-edurịta ikwu, na-ekwurịta okwu ndị na-emerụ ahụ, na-abarịtakwa mba mgbe nile. Otú ahụ ka ọ dị n’ihe banyere ọtụtụ ezinụlọ taa. Ezinụlọ ndị ọzọ na-ezochi ịkpọasị ndị dị omimi n’azụ ihe mkpuchi nke onye ọ bụla ịgbachi ibe ya nkịtị.
Ya mere, ezi udo aghaghị ịgụnye ịdị n’otu nke ezinụlọ. N’okpuru usoro inye ọzụzụ nke Alaeze ahụ, a ga-akụziri ndị bụ di na ndị bụ nwunye ka ha na-emesorịta ibe ha site n’ịhụnanya na nsọpụrụ. (Ndị Kọlọsi 3:18, 19) A ga-ezi ụmụntakịrị ihe ka ha ‘na-erubere ndị mụrụ ha isi n’ihe nile. (Ndị Kọlọsi 3:20) A gaghị enwe ndị na-eto eto bụ́ ndị nnupụisi, ndị ga na-ewetara ndị mụrụ ha nchegbu na ahụ mgbakasị. Nrubeisi ga-abụ ihe e ji mara mmadụ nile, imekọ ihe n’otu ga-abụkwa ụkpụrụ na-achị mmadụ nile. Ụmụntakịrị ga-abụ ihe mara mma ịhụ, bụrụkwa ndị ọnụnọ ha na-eweta ọṅụ.
Taa, nrụgide nke ọnọdụ akụ na ụba na-emekarị ka ihe isi ike na-adịkwasị ezinụlọ bawanye ụba, ebe ọ bụ na nne na nna na-abụkarị ndị a manyere ịbanye n’ọrụ ego ruo n’ọ̀tụ̀tụ̀ dị ukwuu. Ma n’okpuru ọchịchị Kraịst, a ga-anapụ ezinụlọ nile ibu arọ ahụ na-anyịgbu ha nke metụtara ego—ụgwọ ụlọ ndị rịworo elu, nnukwute ego a gbazitere agbazite ndị a na-akwụghachi, taks nke na-arị elu, enweghị ọrụ. Ọrụ na-akpali akpali nke na-enyekwa afọ ojuju ga-ejupụta n’ebe nile. Ọ dịghịkwa onye ọ ga-adị mkpa ka ọ nọrọ n’enweghị ebe obibi. Rịba ama otú amụma ahụ dị n’Aịsaịa 65:21-23 si mee ka eziokwu ndị a pụta ìhè: “Ha ga-ewukwa ụlọ, biri n’ime ha; . . . ha agaghị ewu ụlọ, onye ọzọ ebichie; ha agaghị akụ, onye ọzọ erie: . . . ndị m họpụtaworo ga-enwekwa ihe aka ha rụtara mgbe dị anya nke ukwuu. Ha agaghị adọgbu onwe ha n’ọrụ n’efu, ha agaghị amụ ụmụ nye obi ọlụlọ mmiri: n’ihi na mkpụrụ nke ndị Jehova gọziworo ka ha bụ, ha na ụmụ ga-esi n’ahụ ha pụta.”
Cheedị echiche ihe ọ ga-abụ ibi na gburugburu ebe ị na-agaghị ahụ, na-anụ ụda, ma ọ bụ na-anụ ísìsì ihe na-asọ oyi nke nretọsị obodo ukwu! Cheedị echiche ihe ọ ga-abụ ibi n’ala jupụtara n’akwukwọ ndụ—ala nke aka gị—nke e lekọtaworo anya nke ọma, dozie ya, sụchasịakwa nke ọma. Cheedị echiche ihe ọ ga-abụ ikuru ikuku dị ọcha, nke na-erughịkwa unyi ọ bụla n’ụzọ na-akpali akpali; ịnụ, ọ bụghị ụda na-agbakasị ntị nke mmepeanya ọgbara ọhụrụ, kama ụda na-adajụ ahụ nke ihe ndị e kere eke. N’eziokwu, ụfọdụ ndị nwere ihe ndabara ọma na-enweta ụfọdụ n’ime ihe ndị ahụ ugbu a ruo n’ọ̀tụ̀tụ̀ ụfọdụ. Ma n’okpuru Alaeze Chineke, mmadụ nile ga-ebi n’ọnọdụ nke udo. A gaghị enwe ndị ogbenye, ndị nọ n’agụụ, ma ọ bụ ndị ụwa na-atụ n’ọnụ.—Abụ Ọma 72:13, 14, 16.
Bible gara n’ihu ikwe nkwa na ‘a ga-ebipụ ndị na-emebi iwu n’ụwa.’ (Ilu 2:22) Nke ahụ pụtara mkpochapụ nke imempụ. Ọ bụrụ na nwa gị kasị dị nta apụọ ịgwuri egwu, ọ gaghị adị mkpa ka ị chegbuo onwe gị banyere ndị na-emetọ ụmụntakịrị ma ọ bụ ndị na-atọrọ mmadụ ndị na-ezogharị n’ebe gbara ọchịchịrị, ụgbọ ala ndị mmanya na-egbu na-akwọ site n’otu akụkụ okporo ụzọ gaa na nke ọzọ, ma ọ bụ ìgwè ndị na-eto eto ndị na-aṅụ ọgwụ ọjọọ bụ́ ndị na-akpagharị n’okporo ụzọ. Ụmụntakịrị gị ga-egwuri egwu n’enweghị ihe ize ndụ ọ bụla.
Udo na Ọdịmma nke Onwe Gị
Nke ikpeazụ bụ ihe banyere ọdịmma onwe onye. Ọbụna ọnọdụ paradaịs adịghị ekpochapụ ihe ụfụ nke ọrịa cancer ma ọ bụ ihe mgbu nke ọrịa nkwonkwo bụ arthritis. Ya mere, ezi udo aghaghị ịgụnye mkpochapụ nke ọrịa, nrịanrịa, na ọnwụ. Ihe dị otú ahụ ọ̀ pụrụ ikwe omume? Mgbe ọ nọ n’elu ala, Jisọs mere ihe ọtụtụ ugbo iji gosipụta ike o nwere n’ebe ahụ esighị ike nke ụmụ mmadụ dị. (Matiu 8:14-17) Site n’ọnọdụ ya dị mma n’eluigwe, Kraịst ga-enwe ike ịrụ ọrụ ebube n’elu ala dum! Bible kwere nkwa, sị, “Mgbe ahụ ka a ga-emeghe anya ndị ìsì, ọ bụkwa ntị nke ndị ntị chiri ka a ga-emeghe. Mgbe ahụ ka onye ngwọrọ ga-amali dị ka ele, ire onye ogbi ga-etikwa mkpu ọṅụ.”—Aịsaịa 33:24; 35:5, 6.
Otú ọ dị, agha Kraịst na-ebu megịde ịta ahụhụ nke ụmụ mmadụ agaghị akwụsị n’ebe ahụ. Pọl onyeozi kọwara banyere ọbụbụeze Kraịst, sị: “N’ihi na ọ ghaghị ịbụ eze, ruo mgbe [Chineke, NW] ga-edebeworị ndị iro ya nile n’okpuru ụkwụ ya. Dị ka onyeiro ikpeazụ, a gaje ime ka ọnwụ ghara ịdị irè.” (1 Ndị Kọrint 15:25, 26) Nke a pụtara imeghasị oké ọdachi nile ọnwụ wetaworo n’isi ihe a kpọrọ mmadụ site nnọọ ná mmalite. Dị ka Jisọs Kraịst n’onwe ya kọwara: “Oge awa na-abịa mgbe ndị nile nọ [n’ime ili ncheta, NW] ga-anụ olu [Kraịst], ha ga-apụtakwa.” (Jọn 5:28, 29) Otú a, ọtụtụ nde mmadụ ndị dịworo ndụ, nwụọkwa n’ịta ahụhụ ga-enwe ohere ikere òkè n’udo ụwa ahụ nke na-abịanụ.
Ị ga-ekere òkè na ya? Ndịàmà Jehova na-agba gị ume ka ị mụtakwuo ihe Bible na-akụzi banyere nke a.b Olileanya nke udo ụwa bụ ihe na-akpali akpali nke ukwuu, ihe bụ eziokwu, nke na e kwesịghị ilefuru ya anya. Jide n’aka na ọ bụrụ na i mee mgbalị ịmụta ma tinyekwa Okwu Chineke n’ọrụ, ‘Chineke nke udo ga-anọnyere gị’—ruo mgbe ebighị ebi!—Ndị Filipaị 4:9.
[Ihe e dere n’ala ala peeji]
a N’ụzọ nkịtị, “Jee ka ị hụ udo nke ụmụnne gị na nke ìgwè ewu na atụrụ ahụ.”
b Site n’idegara ndị bipụtara magazin nke a akwụkwọ, a pụrụ ime ndokwa maka ọmụmụ Bible ebe obibi nke na-agaghị efu gị ego ọ bụla.
[Foto dị na peeji nke 5]
Jehova ga-eme ka agha nile kwụsị “ruo nsọtụ ụwa
[Ebe E Si Nweta Foto]
USAF Official Photo
[Foto dị na peeji nke 6]
A ga-akụziri ndị bụ di na nwunye imesorịta ibe ha n’ụzọ udo