Ọ́bá Akwụkwọ Anyị NKE DỊ N'ỊNTANET
Ọ́bá Akwụkwọ Anyị
NKE DỊ N'ỊNTANET
Igbo
Ọ
  • Á
  • á
  • À
  • à
  • É
  • é
  • È
  • è
  • Ì
  • ì
  • Í
  • í
  • Ị
  • ị
  • Ị̀
  • ị̀
  • Ị́
  • ị́
  • Ḿ
  • ḿ
  • M̀
  • m̀
  • Ṅ
  • ṅ
  • Ò
  • ò
  • Ó
  • ó
  • Ọ
  • ọ
  • Ọ̀
  • ọ̀
  • Ọ́
  • ọ́
  • Ù
  • ù
  • Ú
  • ú
  • Ụ
  • ụ
  • Ụ̀
  • ụ̀
  • Ụ́
  • ụ́
  • BAỊBỤL
  • AKWỤKWỌ NDỊ ANYỊ NWERE
  • ỌMỤMỤ IHE
  • w91 7/1 p. 28-30
  • Ịrụsi Ọrụ Ike n’Ozi Ọma Ahụ

O nweghị vidio dị maka ihe a ị họọrọ.

Ewela iwe, o nwetụrụ nsogbu gbochiri vidio a ịkpọ.

  • Ịrụsi Ọrụ Ike n’Ozi Ọma Ahụ
  • Ụlọ Nche Ikwupụta Alaeze Jehova—1991
  • Isiokwu Nta
  • Isiokwu Ndị Ọzọ Yiri Nke A
  • Ụkpụrụ nke Dịịrị Anyị Ịgbaso Taa
  • Ị̀ Na-arụzu Òkè nke Gị?
  • Ụgwọ Ọrụ nke Ije Ozi A Haziri Nke Ọma
  • Wepụta Onwe Gị!
  • ‘Na-ejesi Ozi Gị Ike’
    Ozi Alaeze Anyi—2001
  • “Na-ekwusa Ozi Ọma, Adala Mbà”
    ‘Ịgba Àmà nke Ọma Banyere Alaeze Chineke’
  • Ọ̀ Bụ Ije Ozi nke Dịịrị Gị?
    Ụlọ Nche Ikwupụta Alaeze Jehova—1991
  • Ị̀ Na-ejezu Ozi Gị?
    Ụlọ Nche Nke Na-ekwusa Alaeze Jehova (Nke A Na-amụ Amụ)—2019
Lee Ihe Ndị Ọzọ
Ụlọ Nche Ikwupụta Alaeze Jehova—1991
w91 7/1 p. 28-30

Ịrụsi Ọrụ Ike n’Ozi Ọma Ahụ

PỌL onyeozi nọ n’ọnọdụ ọjọọ nke Ndịàmà Jehova bụ ndị ozi oge nile maara nke ọma—ego o nwere pere mpe. Ya mere na Kọrint, ọ malitere ịrụ ọrụ ahụ dị ala nke ịkpa ákwà ụlọ ntu nke ọ mụtaworo n’oge ọ ka na-eto eto. Ọrụ ahụ siri ike, mgbe ụfọdụkwa aka ya gbara ọbara site n’ákwà ụlọ ntu ahụ nke na-akawasị aka. Ego ọ na-enweta kwadoro ya nanị iji nweta ihe ọ na-eri na uwe oyiyi, ma nke ahụ zuuru ya, n’ihi na mgbe ọ rụsịrị ọrụ ya kwa ụbọchị, ọ na-achịsa ngwá ọrụ nke ọrụ ya wee malite ime ihe o ji n’ihi ya wee bịa na Kọrint—o kwusara ozi ọma ahụ!—Ndị Filipaị 4:11, 12.

N’Ụbọchị Izu Ike, Pọl na-aga n’ụlọ nzukọ dị n’ebe ahụ. N’eziokwu, ná mmalite, Pọl na-agwa ndị Kọrint na-ege ya ntị okwu “n’adịghị ike, na n’egwu, na n’oké ịma jijiji.” (1 Ndị Kọrint 2:1, 3) Ma, n’ịbụ onye a kpaliri n’ihi otú ụfọdụ ndị si nakwere ozi ya, Pọl gara n’ihu ‘ịdị na-ekwu okwu n’ụlọ nzukọ ụbọchị izu ike nile, wee na-eme ka ndị Juu na ndị Grik kwenye.’—Ọrụ 18:1-4.

Ma, ruo ogologo oge ụfọdụ, Pọl enweghị ike ime ihe karịrị ikwusa ozi ọma nwa oge. Mgbe ahụ, Saịlas na Timoti si Masedonia bịa, na-ewetara ya onyinye afọ ofufo nke ‘mezuru n’ụba ihe fọdụụrụ ya inwe.’ (2 Ndị Kọrint 11:9; Ndị Filipaị 4:15) Ihe ọzọ mesikwara ya obi ike bụ akụkọ ahụ ọ nụrụ nke bụ na ụmụnna ndị bi na Tesalọnaịka na-eguzosi ike n’agbanyeghị mkpagbu.—1 Ndị Tesalọnaịka 3:6.

Mmetụta dị aṅaa ka nke a nwere n’ahụ Pọl? ‘Pọl wee malite ịrụsi ọrụ ike banyere okwu ahụ [“tinye oge ya nile n’ọrụ nkwusa,” The Jerusalem Bible; Today’s English Version] na-agbara ndị Juu àmà igosipụta na Jisọs bụ Kraịst ahụ.’ (Ọrụ 18:5) N’ịbụ onye a napụtara ná mkpa ego ruo nwa oge, Pọl enweghị ike izu ike ruo mgbe ọ banyeghachiri n’ọrụ nkwusa oge nile. O ji oké ịnụ ọkụ n’obi banyeghachi n’ọrụ nke a, ọ bụghị nanị ikwusara ndị Juu ozi ọma, kama iwepụta ohere iji dee akwụkwọ ozi mbụ ya nke sitere n’ike mmụọ nsọ—akwụkwọ ozi ahụ o degaara ndị Tesalọnaịka!

Ụkpụrụ nke Dịịrị Anyị Ịgbaso Taa

Ihe ndekọ nke ọrụ Pọl rụsiri ike na Kọrint abụwo nke e chebere iji gbaa ndị Kraịst nile ume ịbụ ndị na-arụsi ọrụ ike n’ozi ọma ahụ. Pọl ghọtara na Onyenwe anyị Jisọs n’onwe ya enyefewo ndị na-eso ụzọ ya nsọpụrụ ahụ dị elu nke ịbụ “ìhè nke ụwa.” Ha agajeghị izochi ìhè nke a ezochi. Jisọs gwara ha, sị: “Meenụ ka ìhè unu na-enwu n’ihu mmadụ, ka ha wee hụ ọrụ ọma nile unu, wee too Nna unu nke bi n’eluigwe.” (Matiu 5:14-16) Nke a pụtara ikere òkè zuru ezu n’ọrụ nkwusa ahụ nke Jisọs buru amụma ya. (Matiu 24:14; 28:19, 20; Ọrụ 1:6-8) Nkwusa nke ozi ọma nke a nke Alaeze bụ isi ihe kpatara ọgbakọ ndị Kraịst ji dịrị.

Ndị Kraịst oge gboo, dị ka Pọl, ji ọrụ nkwusa nke a kpọrọ ihe. Otú a, mgbe ndị iro nke Chineke chere na ha emenyụwo ezi ìhè ahụ site n’iji obi ọjọọ gbuo “onye ahụ nke na-eduba mmadụ ná ndụ,” ndị na-eso ụzọ ya nọgidere na-aga n’ihu dị ka ìhè nke ụwa, na-arụsi ọrụ ike n’ime nkwusa ahụ. (Ọrụ 3:15) Ọbụna mkpagbu emeghị ka ha kwụsị ime mgbalị. Ihe ndekọ Bible na-asị: “Ma kwa ụbọchị, n’ụlọ ukwu Chineke na n’ụlọ nke aka ha [“site n’ụlọ ruo n’ụlọ,” NW], ha adịghị ahapụ izi ihe na izisa ozi ọma Jisọs, na ọ bụ Kraịst.” (Ọrụ 5:42) Ọ dịghị ihe pụrụ igbochi ha!

N’oge ndị a, ndị Kraịst anọwokwa n’otu aka ahụ na-arụsi ọrụ ike n’ọrụ ịgba àmà ahụ. N’akụkụ ikpeazụ nke narị afọ nke 19, ndị na-amụsi Okwu Chineke ike malitere ịhụ mkpa nke iso ndị ọzọ kerịta eziokwu Bible. Òtù Zion’s Watch Tower Tract Society—bụ́ òtù nke gbasazuworo mba nile—bụ nke e guzobere, denyekwa aha ha n’akwụkwọ iwu na 1884. Ndị Mmụta Bible ndị a bụ́ ndị a maara kemgbe 1931 dị ka Ndịàmà Jehova ejiriwo Okwu Chineke mejupụta ụwa n’ụzọ nkịtị. Ịrụsi ọrụ ike ha arụpụtawo oké ìgwè nke ihe karịrị nde mmadụ anọ! Ihe ịrụ ụka adịghị ya na ọnụ ọgụgụ ha ga-anọgide na-agbasawanye n’okpuru nduzi Jehova.—Aịsaịa 60:22.

Ị̀ Na-arụzu Òkè nke Gị?

Jisọs sịrị: “Owuwe ihe ubi hiri nne n’ezie, ma ndị ọrụ dị ole na ole.” (Matiu 9:37, 38) Na 1990, ihe fọrọ nke nta ka ọ bụrụ nde mmadụ iri bịara Ememe Ncheta nke ọnwụ Kraịst. Lee nnọọ ohere dị ebube e nwere maka owuwe ihe ubi dị ukwuu gburugburu ụwa! Ma, ka anyị nọ na-aṅụrị ọṅụ ná mgbasawanye nke a nọgidere na-abịa, onye ọ bụla n’ime anyị aghaghị ịjụ onwe ya, sị, ‘Ruo ókè ha aṅaa ka m na-ekere òkè n’oké ọrụ nke a? M̀ na-eme nke a n’ụzọ chiri anya—ya kwe omume, kwa izu?’

Ndị okenye aghaghị ibute ụzọ n’ọrụ nke a dị ka ‘ihe atụ ìgwè atụrụ ahụ ga-eṅomi.’ (1 Pita 5:3) N’eziokwu, ihe ka ọtụtụ ná ndị okenye nwere ọrụ ego ha na-arụ. Otú ahụkwa ka Pọl onyeozi nwere mgbe ọ nọ na Kọrint. Ma n’agbanyeghị nke ahụ, o wepụtara oge maka ọrụ nkwusa ọ na-arụ mgbe nile. Taa, ọtụtụ ndị okenye na-arụsikwa ọrụ ike otú ahụ n’ọrụ ime mmụọ n’oge ọgwụgwụ izu. Nke a pụrụ inwe mmetụta siri ike, na-agbakwa ume n’ebe mmadụ nile nọ n’ọgbakọ nọ. N’ọnwa ụfọdụ, mgbe a na-etinye mgbalị pụrụ iche, ọtụtụ ọgbakọ na-enwe ihe ka ọtụtụ ná ndị nkwusa ha n’ozi ọsụ ụzọ. Gịnị bụ ihe na-akpata nke a? Ndị okenye na-ebute ụzọ ma n’ọrụ nkwusa ma n’ịhazi ndokwa ije ozi ubi.

Ndị ohu na-eje ozi pụrụ inwekwa ezi mmetụta n’ahụ ọgbakọ ma ọ bụrụ na ha na-ekere òkè mgbe nile n’ije ozi ubi. Cheta na Akwụkwọ nsọ chọrọ ha n’aka ịbụ “ndị kwesịrị nsọpụrụ, . . . ndị [na-eje] ozi nke ọma.” (1 Timoti 3:8, 13) Ikwesị ntụkwasị obi n’ije ozi ubi dị mkpa ka nwanna wee ruo eru dị ka onye okenye ma ọ bụ ohu na-eje ozi.—Taịtọs 1:8, 9.

Dị ka Pọl, ụfọdụ ndị na-enwe ike ibelata ọrụ ego ha na-arụ iji wee banye n’ọrụ ọsụ ụzọ. Ọnụ ọgụgụ ndị ọsụ ụzọ oge nile, ndị nke inyeaka, na ndị ọsụ ụzọ pụrụ iche mụbara site na 137,861 nanị n’afọ iri gara aga ruo 536,508 na 1990. N’ezie, ọ bụ nanị ngọzi na nkwado nke Jehova pụrụ iwetaworịị nke a. Ma, ndị ọsụ ụzọ aghaghị ilezi anya iji oge ha mee ihe n’ụzọ amamihe, ọ bụghị nanị ịgụkọ ọtụtụ hour ha tinyere. Ndi ọsụ ụzọ, ùnu na-akwadebe nke ọma, na-adịkwa irè n’ije ozi unu? Ùnu na-agbalịsi ike ịnọgide na-enwe ọganihu ka ije ozi unu wee bụrụ nke na-amịpụta mkpụrụ n’ezie?

Ụgwọ Ọrụ nke Ije Ozi A Haziri Nke Ọma

Ì nwere ekele maka ihe ọmụma na-akwado ndụ a na-ewepụta kwa ọnwa n’ime Ụlọ Nche na magazin ibe ya bụ Teta!? Ihe ịrụ ụka adịghị ya na ị na-eme otú ahụ. Obi ekele gị ọ̀ kpaliwo gị ikere òkè n’ikesa akwụkwọ ndị a? Otu nwanna nwanyị na Botswana mere nke ahụ. Ọ na-emegidebu eziokwu ahụ! Ma di ya na-agụrụ ya ihe sitere na magazin ndị ahụ. Mgbe oge na-aga, ọ gbanwere obi ya wee ghọọ Onyeàmà. Ọ bụ ezie na ọ maghị agụ akwụkwọ, ọ na-enwe ihe ịga nke ọma nke ukwuu n’itinye magazin, na-asị, “Amaghị m otú e si agụ ihe, ma di m na-agụpụtara m magazin ndị a. Ha na-amasị m, ejikwa m n’aka na ha ga-amasị gị.”

Gịnị mere ị gaghị ekere òkè kwa izu n’ọrụ nke a na-azọpụta ndụ? Ozugbo i nwere iru eru ime mmụọ ndị a chọrọ, ọgbakọ ndị Kraịst ga-enwe obi ụtọ inyere gị aka ịmalite. Otú ọ dị, itinye magazin bụ nanị otu akụkụ nke ije ozi. Onye ọ bụla nke na-arụsi ọrụ ike n’ozi ọma ahụ na-agbalị ije ozi n’ụzọ a haziri nke ọma. Dị ka ihe atụ, Watch Tower Society na-ebipụta ọtụtụ nde akwụkwọ ukwu, a na-enyekwa ọha mmadụ akwụkwọ ndị a dị ka ebe na-adịgide adịgide e si enweta ezi nri ime mmụọ. Ị̀ bụwo onye dị irè n’ije ozi gị ruo n’ókè itinye akwụkwọ, ndị dị ka Ị Pụrụ Ịdị Ndụ Ebighị Ebi n’ime Paradaịs n’Elu Ala?

Gịnịkwanụ banyere ndị gosiri mmasị? Ị̀ na-enwe ezi ihe ndekọ ka i wee jee nletaghachi na nke ha? Nleta ndị dị otú ahụ pụrụ iduje n’akụkụ ije ozi ahụ nke na-eweta ọṅụ kasị ukwuu—ọrụ ọmụmụ Bible ebe obibi. Cheta na Jisọs nyere anyị iwu na Matiu 28:19, 20 ‘ime ndị na-eso ụzọ, na-eme ha baptism.’ Nke ahụ pụtara iso ha mụọ Bible. N’ezie, ịmalite ọmụmụ ihe na-achọkarị ịnọgidesi ike n’ihe a na-eme. Otu Onyeàmà zutere otu di na nwunye meworo agadi, ndị ji obi ha nakwere ọmụmụ Bible ebe obibi. Ma ha nọgidere na-eyigharị ọmụmụ ihe ahụ ruo ogologo izu atọ. E mesịrị malite ọmụmụ ihe ahụ. E mesịa, ruo ogologo oge ụfọdụ, di na nwunye ahụ kagburu ọmụmụ ihe ha ihe fọrọ nke nta ka ọ bụrụ n’izu abụọ ọ bụla. Ma n’ikpeazụ, nke nwanyị nwere ọganihu ruo n’ime baptism. “Mgbe o mesịrị baptism,” ka nwanna nwoke ahụ na-echetaghachi, “anya ya jupụtara n’anya mmiri nke obi ụtọ, bụ́ nke wetaara mụ na nwunye m anya mmiri nke obi ụtọ.” Ee, ịrụsi ọrụ ike n’ozi ọma ahụ na-eweta ọṅụ a na-apụghị ịkọwa akọwa!

Wepụta Onwe Gị!

Jisọs Kraịst na Pọl onyeozi esetịpụwo ụkpụrụ ndị mara mma nke ịrara onwe ha nye, ndị anyị ga-eṅomi. Anyị nwekwara ọtụtụ ihe atụ ọma n’etiti Ndịàmà Jehova nke oge a. Oge eruwo ka mmadụ nile ndị maara ozi ọma ahụ malite ịrụsi ọrụ ike ime ka ndị ọzọ mara ya. Bible na-emesi anyị obi ike na ọrụ nile dị otú ahụ “abụghị ihe efu.”—1 Ndị Kọrint 15:58.

Dị ka Pọl, ihe ka ọtụtụ n’ụmụ mmadụ nwere ibu ọrụ nke ego ndị ha na-aghaghị ịrụzu. N’ihi nke a, ọ pụrụ ịbụ na ọtụtụ ndị agaghị enwe ike ịrụ ọrụ ọsụ ụzọ. Ma site n’enyemaka Jehova, mmadụ nile pụrụ ịgbaso ezi ndụmọdụ ahụ e nyere ná Ndị Rom 12:11, sị: “N’akụkụ ịnụ ọkụ nke obi unu, gharanụ ịdị ọ̀bọ̀; n’akụkụ mmụọ unu, na-adịnụ ọkụ; n’akụkụ Onyenwe anyị [“Jehova,” NW], na-abụnụ ohu.” Ọ bụrụkwa na ọnọdụ agbanwee iji nyekwuo ohere nke a pụrụ itinye n’ijere Jehova ozi, onye ọ bụla nke hụrụ Jehova n’anya n’ezie dị ka Pọl, ga-ewere ohere ahụ mee ihe, na-arụsi ọrụ ike n’ozi ọma ahụ! Ime otú ahụ abụghị nanị na ọ ga-eweta ọtụtụ ngọzi ugbu a, kama n’ọdịnihu, ọ ga-arụpụta ndụ ebighị ebi, na-enwe ọṅụ na obi ụtọ ebighị ebi!—Matiu 19:28, 29.

    Akwukwo Igbo (1984-2025)
    Pụọ
    Banye
    • Igbo
    • Ziga ya
    • Ịgbanwe Ihe
    • Copyright © 2025 Watch Tower Bible and Tract Society of Pennsylvania
    • Ihe Ị Ga-eme na Ihe Ị Na-agaghị Eme
    • Ihe Anyị Ji Ihe Ị Gwara Anyị Eme
    • Kpebie Ihe Ị Ga-agwa Anyị
    • JW.ORG
    • Banye
    Ziga ya