‘Na-ejesi Ozi Gị Ike’
1 Mgbe anyị gụrụ na Pọl onyeozi rụrụ ọrụ ịkpa ákwà ụlọikwuu na Kọrint, anyị pụrụ ikwubi na nke a belatara ohere o nwere ime nkwusa. Otú ọ dị, Ọrụ 18:5 na-akọ, sị: “[Pọl malitere ikwusasi okwu ahụ ike, NW], ọ na-agwasi ndị Juu ike na Jisọs bụ Kraịst ha.” N’ihi gịnị ka Pọl ji na-arụsi ọrụ nkwusa ahụ ike? Ọ bụ ezie na ọtụtụ ndị nọ na Kọrint aghọworị ndị kwere ekwe, Onyenwe anyị mere ka o doo anya na a ka nwere ọtụtụ ndị a ga-eme ndị na-eso ụzọ n’obodo ahụ. (Ọrụ 18:8-11) Ànyị nwere ihe yiri nke ahụ mere anyị ga-eji na-ejesi ozi anyị ike? Ee. A pụrụ ịchọta ọtụtụ ndị ọzọ ma kụziere ha eziokwu ahụ.
2 Tinyekwuo Oge n’Ozi n’April: Ma eleghị anya, ọ bụ ihe mgbaru ọsọ gị ịnọgide na-arụ ọrụ ikwusa ozi ọma ahụ kwa ọnwa. Ma ọnwa ụfọdụ karịsịa na-enyekwu anyị ohere nke ‘ịrụsi ọrụ a ike.’ Nke a na-agụnye ọnwa April, bụ́ oge okwu a kpụ n’ọnụ na-abụ Ememe Ncheta. Ọnọdụ gị ò nyewo gị ohere ịrụ ọrụ ọsụ ụzọ inyeaka ma ọ bụ itinyekwu mgbalị n’ozi n’oge a? A gọziwo ọtụtụ ndị nkwusa na-eme otú ahụ n’ụba. (2 Kọr. 9:6) Ọ bụrụ na ị na-eme ihe nile ị pụrụ ime, cheta na ozi gị nke sitere n’obi na-atọ Jehova ụtọ. (Luk 21:2-4) N’agbanyeghị ihe bụ ọnọdụ gị, mee ka ọ bụrụ ihe mgbaru ọsọ gị ‘ijesi ozi gị ike’ n’April. Echefukwala inye akụkọ ozi ubi gị n’ọgwụgwụ ọnwa ahụ ka e wee gụnyekọta mgbalị gị na nke ndị Jehova ndị ọzọ.
3 Jee Leta Ndị Ọhụrụ Bịara Ememe Ncheta: N’afọ gara aga na Nigeria, ọnụ ọgụgụ ndị bịara Ememe Ncheta bụ 575,530. A mabeghị ngụkọta nke ọnụ ọgụgụ ndị ga-abịa n’afọ a. Ma, akụkọ na-egosi na e nwere ohere magburu onwe ya maka inwe “owuwe ihe ubi” ka ukwuu. (Mat. 9:37, 38) Ya mere, mee ndokwa ngwa ngwa o kwere mee ije leta ndị nwere mmasị bịara Ememe Ncheta iji nyere ha aka n’ụzọ ime mmụọ. Iyigharị nleta dị otú ahụ pụrụ inye ohere ka ‘ajọ onye ahụ pụnara okwu alaeze ahụ a ghaworo n’obi ha.’ (Mat. 13:19) Nleta e mere ozugbo ga-egosi na ị ‘na-ejesi ozi gị ike’ n’ezie.
4 Nọgide Na-enyere Ndị Na-adịghị Ejekwa Ozi Aka: Na February, a malitere ime mgbalị pụrụ iche iji nyere ndị na-adịghị ejekwa ozi aka. Ọ bụrụ na e nwere ụfọdụ ndị a na-emebereghị nleta ọzụzụ atụrụ, ndị okenye kwesịrị ime ndokwa ije leta ha tupu April agwụ. Ndị okenye ga-agbalịsi ike ịchọpụta ihe bụ́ isi kpatara nsogbu onye ahụ nakwa ụzọ kasị mma isi nyere ya aka ka ọ maliteghachi iji ịrụsi ọrụ ike na-ejere Jehova ozi. Enyemaka a nke ịhụnanya na-egosi na ndị okenye na-eji ibu ọrụ ha dị ka ndị ọzụzụ atụrụ nke ‘ìgwè atụrụ Chineke’ akpọrọ ihe. (1 Pita 5:2; Ọrụ 20:28) Mbipụta Ụlọ Nche nke September 15, 1993, peeji nke 22-23, na-atụ aro ndị magburu onwe ha ndị okenye pụrụ iji mee ihe mgbe ha na-eleba anya na nke ọ bụla n’ime nsogbu ise ndị yikarịrị ka hà na-emetụta ndị na-adịghị ejekwa ozi. A na-atụ anya na a ka pụrụ ime ka ụfọdụ maliteghachi ije ozi ubi n’ọnwa April.
5 Nyekwuoro Ndị Mmadụ Aka Ịghọ Ndị Nkwusa A Na-emebeghị Baptism: Ụmụ gị hà eruwo eru dị ka ndị nkwusa ọhụrụ nke ozi ọma ahụ? Gịnị banyere ndị ọzọ ị na-eduziri ọmụmụ Bible? Ọ bụrụ na ndị okenye anwapụtawo ndị dị otú ahụ, April ọ́ gaghị abụ oge kwesịrị ekwesị ka ha malite ịbụ ndị nkwusa? Ọ bụrụ na mmadụ na-enwe ọganihu, ọ bụrụkwa na ọ mụwo broshuọ Na-achọ na akwụkwọ Ihe Ọmụma, a pụrụ ịga n’ihu n’ọmụmụ Bible ahụ n’akwụkwọ nke abụọ—akwụkwọ Ezi Udo, ma ọ bụ akwụkwọ Ịdị n’Otu n’Ofufe. Ihe mgbaru ọsọ gị bụ inyere onye ahụ ị na-eduziri ọmụmụ ihe aka ịghọta eziokwu ahụ n’ụzọ ka ukwuu, ruo eruo dị ka onye nkwusa a na-emebeghị baptism, ghọọkwa Onyeàmà Jehova raara onwe ya nye, e mekwara baptism.—Efe. 3:17-19; 1 Tim. 1:12; 1 Pita 3:21.
6 Ezi mmasị ị nọgidere na-egosi n’ebe ndị ị na-amụrụ Bible nọ pụrụ imesị nyere ha aka ime ka eziokwu ahụ bụrụ nke ha. Otu Onyeàmà zutere di na nwunye meworo agadi bụ́ ndị ji obi ha nakwere ọmụmụ Bible. Ma ha nọgidere na-eyigharị ọmụmụ ihe ahụ ruo izu atọ n’esepụghị aka. E mesịrị malite ọmụmụ ihe ahụ. Ka nke ahụ gasịrị, di na nwunye ahụ kagburu ọmụmụ ihe ha ihe fọrọ nke nta ka ọ bụrụ n’izu abụọ ọ bụla. Ma n’ikpeazụ, nke nwanyị nwere ọganihu ruo n’ime baptism. “Mgbe e mesịrị ya baptism,” ka nwanna nwoke ahụ na-echeta, “anya mmiri obi ụtọ juru ya anya, bụ́ nke wetaara mụ na nwunye m anya mmiri obi ụtọ.” Ee, ‘ikwusasi ozi ọma ike’ na-eweta ọṅụ dị ukwuu!
7 Amụma Bible na ihe ndị na-eme n’ụwa na-egosi na anyị na-ebi n’ime ime oge ọgwụgwụ. Ugbu a bụ mgbe ọ dị ndị Chineke nile mkpa ‘ikwusasiri ndị ọzọ ozi ọma ahụ ike.’ Pọl onyeozi nyere ihe mmesi obi ike bụ́ na ndọgbu n’ọrụ dị otú ahụ kpọmkwem “abụghị ihe efu n’ime Onyenwe anyị.”—1 Kọr. 15:58.