Ọ Bụghị Ndị Ji Okwu Chineke Atụ Mgbere
“ANYỊ na-ere okwuchukwu anyị iji nweta ego.” Nke ahụ bụ okwu nke onye bụbu “ụkọchukwu ekpere telifon,” bụ́ onye a gbara ajụjụ ọnụ n’otu nnyocha e mere n’ebe ndị okwuchukwu telivishọn America nọ ná ngwụsị afọ 1991.
Ihe omume a lekwasịrị anya n’okwuchukwu telivishọn atọ na United States. O kpughere na a na-anapụta ndị mmadụ ọtụtụ iri nde dollar kwa afọ site n’aka nanị òtù atọ ndị a. A kọwara otu “okwuchukwu” dị ka “ụlọ ọrụ nwere nkà ọgbara ọhụrụ maka ịnata onyinye.” E kpughere na aka ha nile dị n’ọtụtụ aghụghọ. Nke a ọ̀ na-awụ gị ibubo n’ahụ?
Okpukpe Nọ n’Okpuru Nnyocha
Ọ bụghị nanị okwuchukwu telivishọn kama ọbụna okpukpe ọdịnala, ndị a na-amaghị ebe ha kwụ, bụ ndị a na-enyocha site n’aka ndị gọọmentị, ụlọ ọrụ na-eme nnyocha, na ndị mmadụ n’ozuzu ha. N’ọnọdụ ụfọdụ, uru ahịa chọọchị na-eketa, ọdịmma ndọrọ ndọrọ ọchịchị nke okpukpe na-eji ego akwado, na ibi ndụ okomoko nke ndị ụkọchukwu a na-akwụ oké ụgwọ na-ewelite ajụjụ nke izi ezi.
Olee otú ụfọdụ ndị ndú okpukpe si eru ihe ọ̀tụ̀tụ̀ nke nkọwa mara mma Pọl onyeozi nyere banyere ozi ndị Kraịst n’ihe fọrọ nke nta ka ọ bụrụ 2,000 afọ gara aga? O dere, sị: “Anyị abụghị ndị ji okwu Chineke atụ mgbere dị ka ọtụtụ ndị na-eme, kama site n’ezi obi, ee, dị ka ndị Chineke zitere, n’ụzọ Chineke si ele ihe anya, ná mkpakọrịta Kraịst, ka anyị na-ekwu.” (2 Ndị Kọrint 2:17, NW) Olee ndị kwekọrọ ná nkọwa ahụ n’oge a?
Iji nyere gị aka ịtụle okwu ahụ, ka anyị lebakwuo anya n’ụzọ e si jiri ego kwadoo ije ozi ndị Kraịst nke PọI na ndị ibe ya. N’ụzọ ndị dị aṅaa ka o si dịrị iche pụọ ná ndị ọzọ nke oge ya?
Ndị Nkwusa Na-ejegharị Ejegharị nke Narị Afọ Mbụ
Dị ka onye nkwusa jegharịrị ejegharị, PọI abụghị onye dị iche. N’oge ahụ, ọtụtụ ndị jegharịrị iji kwalite echiche ha n’okpukpe na nkà ihe ọmụma. Onye ahụ so dee Bible bụ́ Luk kwuru okwu banyere “ụfọdụ n’ime ndị Juu ndị na-ejegharị, bụ́ ndị sịrị na ha na-achụpụ ndị ajọ mmụọ.” (Ọrụ 19:13) Mgbe Jisọs Kraịst mara ndị Farisii ikpe, o kwukwara, sị: “Unu na-ejegharị n’oké osimiri na ala kpọrọ nku gburugburu ka unu mee otu onye ka o so ụzọ unu.” (Matiu 23:15) Jisọs n’onwe ya bụ onye ozi jegharịrị ejegharị. O nyere ndị ozi ya na ndị na-eso ụzọ ya ọzụzụ iṅomi ya site n’ime nkwusa Ọ bụghị nanị na Judia na Sameria kama “ruokwa ebe ụwa sọtụrụ.”—Ọrụ 1:8.
N’oge njegharị ha, ndị na-eso ụZỌ JISỌS zutere ndị nkwusa na-abụghị ndị Juu. N’Atens, PỌI na ndị ọkà ihe ọmụma Epikurean na Stoik chịpụrụ ya. (Ọrụ 17:18) Gburugburu Alaeze Ukwu Rom, ndị ọkà ihe ọmụma Cynic mere nrụgide site n’ikwu okwu ara ara. Ndi na-efe Isis na Serapis mere ka ikike ha n’ebe ụmụ nwanyị na ndị ohu nọ saa mbara site ná nkwa nke ịha nhata nke okpukpe na nke mmekọrita mmadụ na ibe ya n’ebe ụmụ nwoke nweere onwe ha nọ. Ịrọ òtù ịmụta nwa ndị Ebe Ọwụwa Anyanwụ Ụwa wepụtara ihe mgbakwasị ụkwụ maka ọtụtụ ihe omimi okpukpe nke akụkụ ụwa Grik na Rom. Nkwa nke ịsachapụ mmehie na ọchịchọ nke ikere òkè n’ihe nzuzo Chineke dọtara ndị mgbaso nye chi ụgha ndị bụ Demeter, Dionysus, na Cybele.
Olee Ụzọ E Si Kwụọ Ụgwọ Ihe Ndị E Mefuru?
Otú Ọ dị, ime njem dị oké ọnụ. N’agbanyeghị ụgwọ ibu, ụgwọ ngafe, na ụgwọ ụgbọ mmiri, ndi njegharị na-enwe mkpa nri, ebe obibi, nkụ, uwe, na nlekọta ahụ ike. Ndị nkwusa, ndị nkụzi, ndị ọkà ihe ọmụma, ndị ọkà ihe omimi gboro mkpa ndị a n’ụzọ ise ndị bụ isi. Ha (1) kụziri ihe maka ego; (2) nwetara ọrụ site n’ịrụ ụmụ obere ọrụ na ịzụ obere ahịa; (3) nakweere ile ọbịa na onyinye afọ ofufo; (4) rapaara onwe ha n’ahụ ndị nkwado bara ọgaranya, ọtụtụ mgbe dị ka ndị na-akpọga ụmụaka n’ụlọ akwụkwọ; na (5) rịọrọ arịrịọ. Iji kwadebe onwe ya maka nkatọ, onye ọkà ihe ọmụma ahụ a ma ama bụ́ Cynic Diogenes rịọrọ ọbụna ihe a kpụrụ akpụ na-adịghị ndụ arịrịọ maka enyemaka.
Pọl maara banyere ụfọdụ ndị nkwusa na-azọrọ na ha bụ ndị ozi ndị Kraịst ma, dị ka ụfọdụ ndị ọkà ihe ọmụma Grik, mee enyi ndị ọgaranya, zuokwa ndị ogbenye ohi. Ọ baara ọgbakọ dị na Kọrint mba, na-asị: “Unu na-anagide ya, ma ọ bụrụ na . . . onye ọ bụla eripịa unu, ọ bụrụ na onye ọ bụla ejide unu.” (2 Ndị Kọrint 11:20) Ọ dịghị mgbe Jisọs Kraịst pụnara ihe, ọ dịghịkwa mgbe PọI na ndị ọrụ ibe ya mere otú ahụ. Ma ndị okwuchukwu Kọrint nwere anyaukwu bụ “ndị ozi ụgha, ndi ọrụ na-atụ ntụ,” na ndị ozi Setan.—2 Ndị Kọrint 11:13-15.
Ntụziaka Jisọs nye ndị na-eso ụzọ ya gbochiri izi ihe maka ego. “N’efu ka unu natara, nyenụ n’efu,” ka o nyere na ndụmọdụ. (Matiu 10:8) Ọ bụ ezie na irịọ arịrịọ zuru ebe nile, e ledara ya anya n’ụbọchị ndi ahụ. N’otu n’ime ihe atụ ya, Jisọs gosipụtara otu onye na-elekọta ezinụlọ ka ọ na-asị, “ihere ịrịọ arịrịọ na-eme m.” (Luk 16:3) N’ihi ya, ọ dịghị mgbe ọ bụla n’akụkọ Bible ka anyị hụrụ ndị na-eso ụzọ Jisọs na-ekwesị ntụkwasị obi ka ha na-arịọ ego ma ọ bụ ngwá ahịa. Ha biri ndụ site n’ụkpụrụ ahụ bụ: “Ọ bụrụ na onye ọ bụla achọghị ịrụ ọrụ, ya gharakwa iri ihe.”—2 Ndị Tesalọnaịka 3:10.
Jisọs gbara ndị na-eso ụzọ ya ume ilekọta mkpa ha n’ụzọ abụọ. Na nke mbụ, ha pụrụ, dị ka PọI si kwuo ya, ‘isi n’ozi ọma ahụ dị ndụ.’ N’ụzọ dị aṅaa? Site n’ịnakwere ile ọbịa nke e mere n’afọ ofufo. (1 Ndị Kọrint 9:14; Luk 10:7) Nke abụọ, ha pụrụ inwetara onwe ha ihe n’ụzọ ihe onwunwe.—Luk 22:36.
Ụkpụrụ Ndị Pọl Ji Mee Ihe
Olee ụzọ Pọl si jiri ụkpụrụ ndị dị n’elu mee ihe? Banyere njem ozi ala ọzọ nke abụọ nke onyeozi ahụ, Luk dere, sị: “Anyị siri na Troas nupụ ụgbọ, wee gaa otu ihu ruo Samọtresi, n’echi ya anyị wee ruo Neapọlis; anyị wee site n’ebe ahụ gaa ruo Filipaị, nke bụ otu obodo nke Masedọnia, obodo mbụ nke akụkụ ahụ, bụrụkwa colony nke Rom: anyị wee na-anọgide n’obodo ahụ ụbọchị ụfọdụ.” N’oge njem ahụ nile, ihe oriri na ebe obibi bụ nke ha hụrụ n’onwe ha.—Ọrụ 16:11, 12.
Mgbe e mesịrị, otu nwanyị aha ya bụ Lidia ṅara ntị “n’ihe nile PọI na-ekwu. Mgbe e mere ya na ezinụlọ ya baptism, ọ rịọrọ anyị, sị, Ọ bụrụ na unu atụlewo na abụ m onye kwere n’Onyenwe anyị, batanụ n’ụlọ m, nọgidenụ n’ebe ahụ. O wee rụgide anyị.” (Ọrụ 16:13-15) Ma eleghị anya, ma ọ dịghị ihe ọzọ n’ihi ile ọbịa nke Lidia, PọI pụrụ idegara ndị kwere ekwe ibe ya na Filipaị, sị: “Ana m ekele Chineke m ná ncheta nile m na-echeta unu, mgbe nile n’arịrịọ nile m na-arịọrọ unu nile na-arịọ arịrịọ ahụ n’ime ọṅụ, n’ihi nnwekọ unu nwekọrọ n’izisa ozi ọma site n’ụbọchị mbụ ruo ugbu a.”—Ndi Filipaị 1:3-5.
Luk kpọtụrụ aha ọtụtụ ihe atụ nke ndị na-anabata ndị ọrụ njegharị ndị Kraịst ndị a. (Ọrụ 16:33, 34; 17:7; 21:7, 8, 16; 28:2, 7, 10, 14) N’akwụkwọ ozi ya e dere n’ike mmụọ nsọ, PọI nabatara ma nye ekele maka ile ọbịa na onyinye ndị ọ nataworo. (Ndị Rom 16:23; 2 Ndị Kọrint 11:9; Ndị Galetia 4:13, 14; Ndị Filipaị 4:15-18) Ma, ma ya ma ndị ibe ya adịghị nke gosipụtara na e kwesịrị inye ha onyinye ma ọ bụ nkwado ego. Ndịàmà Jehova pụrụ ikwu na a ka na-ahụ àgwà ọma nke a n’etiti ndị nlekọta ha na-ejegharị ejegharị.
Ndị Na-adabereghị n’Ile Ọbịa
PọI adabereghị n’ile ọbịa. Ọ mụtawo ọrụ nke chọrọ ịrụsi ọrụ ike na ọtụtụ hour ma na-eweta ụgwọ ọrụ dị ala. Mgbe onyeozi ahụ rutere na Kọrint dị ka onye ozi ala ỌZỌ, “o wee hụ otu onye Juu, aha ya bụ Akwila . . . na nwunye ya Prisila. . . . O wee bịakwute ha; n’ihi na ya na ha na-arụ otu ọrụ nkà ahụ, ya na ha wee nọgide, na-arụkwa ọrụ; n’ihi na ọrụ nkà ha bụ ịkpa ákwà ụlọ ikwuu.”—Ọrụ 18:1-3.
E mesịa, n’Efesọs, PọI ka na-arụsi ọrụ ike. (Tụlee Ọrụ Ndị Ozi 20:34; 1 Ndị Kọrint 4: 11, 12.) Ọ pụrụ ịbụ na o doro ya anya nke ọma iji cilicium na-arụ ọrụ, bụ́ ajị ewu siri ike e ji akpa ákwà ụlọ ikwuu nke sitere n’obodo ya. Anyi pụrụ iche echiche ebe PọI nọ n’oche, hụlata ala n’ogologo oche ya, na-acha ma na-akwachi ruo n’etiti abalị. Ebe mkpọtụ a na-eme n’ụlọ ọrụ yiri nke dị ntakịrị, na-eme ka ọ dị mfe ikwu okwu mgbe a na-arụ ọrụ, ọ pụrụ ịbụ na PọI nwererị ohere ịgba àmà nye onye ahụ nwe ụlọ ọrụ, ndị o were n’ọrụ, ndị ohu, ndi na-azụ ya ahịa, na ndị enyi.—Tụlee 1 Ndị Tesalọnaika 2:9.
Onye ozi ala ọzọ ahụ bụ́ PọI jụrụ iji ozi ya tụọ mgbere ma Ọ bụ site n’ụzọ ọ bụla mee ka a ghọta na ya ji Okwu Chineke na-enweta ihe e ji adị ndụ. Ọ gwara ndị Tesalọnaịka, sị: “Unu onwe unu matara otú unu na-aghaghị iṅomi anyị: n’ihi na anyị abụghị ndị na-adịghị agazi ije n’etiti unu; anyị erighịkwa nri n’aka onye ọ bụla n’efu, kama n’ịdọgbu onwe anyi n’ọrụ na ịhụju anya, na-arụ ọrụ abalị na ehihie, ka anyị wee ghara ịdọgbu onye ọ bụla n’ime unu: ọ bụghị na anyị enweghị ike, ma ọ bụ ka anyị wee were onwe anyị meere unu ihe atụ, ka unu wee ṅomie anyị.”—2 Ndị Tesalọnaịka 3:7-9.
Ndị Nṅomi nke Narị Afọ nke Iri Abụọ
Ruo taa, Ndịàmà Jehova na-agbaso ezi ihe nlereanya nke PọI. Ndị okenye na ndị ohu na-eje ozi adịghị anata ụgwọ ọnwa ma ọ bụ ọbụna ego mmachi akpa site n’ọgbakọ ndị ha na-ejere ozi. Kama nke ahụ ha na-egbo mkpa ezinụlọ ha dị ka onye ọ bụla ọzọ na-eme, ihe ka ọtụtụ n’ime ha site n’inweta ọrụ ego. Ndị ọsụ ụzọ oge nile na-egbokwa mkpa ha n’onwe ha, ọtụtụ na-arụ ọrụ inweta nanị ihe ga-ezu iji gboo mkpa ndị bụ isi. Kwa afọ Ndịàmà ụfọdụ na-eme njem site n’ịkwụrụ onwe ha ụgwọ ije mee nkwusa n’ókèala dị anya ebe ozi ọma ahụ na-adịghị erutekarị. Ọ bụrụ na ezinụlọ ndị nọ n’ógbè ahụ akpọ ha òkù iso ha rikọọ nri ma ọ bụ bikọọ, ha na-enwe ekele na nke a ma ha adịghị emebi ile ọbịa dị otú ahụ.
Nkwusa na nkụzi nile nke Ndịàmà Jehova na-eme bụ n’afọ ofufo, ha adịghịkwa ana ego maka ije ozi ha. Otú ọ di, a na-anabata onyinye e ji imeru ihe n’ókè nye maka ọrụ ha zuru ụwa ọnụ ma na-ezipụrụ ya Watch Tower Society maka nzube ahụ. (Matiu 24:14) Ije ozi nke Ndịàmà abụghị maka iji kpata ego n’ụzọ ọ bụla. Dị ka PọI, onye ọ bụla n’ime anyị pụrụ ikwu eziokwu, sị: “Eziri m unu ozi ọma nke Chineke n’onyinye efu.” (2 Ndị Kọrint 11:7) Ndịàmà Jehova abụghị “ndị ji okwu Chineke atụ mgbere.”
[Igbe dị na peeji nke 27]
ỤZỌ ỤFỌDỤ NDỊ SI ENYE ONYINYE N’ỌRỤ NKWUSA ALAEZE AHỤ
◻ ỤTỤ A NA-ATỤNYE MAKA ỌRỤ ZURU ỤWA ỌNỤ: Ọtụtụ ndị na-ewepụta ma ọ bụ mawapụta ego iche nke ha na-etinye n’igbe onyinye ndị ahụ a mapawara akwụkwọ bụ: “Onyinye Maka Ọrụ Zuru Ụwa Ọnụ nke Society—Matiu 24:14.” Kwa ọnwa, ọgbakọ dị iche iche na-ezije ego ndị a n’isi ụlọ ọrụ ụwa dum nke dị na Brooklyn, New York, ma ọ bụ n’alaka ụlọ ọrụ nke kasị dịrị ha nso.
◻ ONYINYE: A pụrụ iziga onyinye ego afọ ofufo gaa kpọmkwem n’ụlọ ọrụ Watch Tower Bible and Tract Society of Pennsylvania, 25 Columbia Heights, Brooklyn, New York 11201, ma ọ bụ gaa n’alaka ulọ ọrụ Society dị ná mba ọ bụla. A pụkwara ịtụnye ọla ma ọ bụ ihe ndị ọzọ bara uru. E kwesịrị izitekọ onyinye ndị a na akwụkwọ ozi dị mkpirikpi nke na-akọwa na ha bụ onyinye.
◻ ONYINYE NKE A PỤRỤ ỊNARAGHACHI: A pụrụ inye Watch Tower Society ego ka ha jidere mmadụ ná ntụkwasị obi ruo mgbe onye ahụ nwụrụ, n’ọnọdụ nke bụ na a ga-enyeghachi ya onye ahụ nyere ya ma ọ bụrụ na o nwee mkpa.
◻ ỊNSHỌRANSỊ: A pụrụ idenye aha Watch Tower Society dị ka ndị a ga-akwụ ụgwọ ma ọ bụrụ na onye dejupụtara akwụkwọ ịnshọransị ahụ anwụọ ma ọ bụ n’atụmatụ ego a na-erite ma a laa ezumike nká. E kwesịrị ime ka society mara banyere ndokwa ọ bụla dị otú ahụ.
◻ IHE NDEKỌ EGO ỤLỌ AKỤ: A pụrụ ime ndokwa ka ihe ndekọ ego ụlọ akụ, satifiketi ndebe ego, ma ọ bụ ihe ndekọ ego ezumike nká nke ndị mmadụ n’otu n’otu dịrị ná ntụkwasị obi n’aha ma ọ bụ nke a ga-akwụnye mgbe onye debere ya nwụrụ n’aka Watch Tower Society n’ụzọ kwekọrọ n’ụkpụrụ ndị ụlọ akụ dị ná mba ahụ na-agbaso. E kwesịrị ime ka Society mara banyere ndokwa ọ bụla dị otú a.
◻ IHE NDỊ NỌCHIRI ANYA EGO: A pụrụ inye Watch Tower Society ihe ndị nọchiri anya ego dị ka onyinye kpam kpam ma ọ bụ ná ndokwa nke bụ na onye nyere ha ga-anọgide na-enweta ego a na-akwụ maka ha.
◻ ALA NA ỤLỌ: A pụrụ inye Watch Tower Society ala ma ọ bụ ụlọ nke a pụrụ ire ere site n’inye ya dị ka onyinye kpam kpam ma ọ bụ site n’inye onye ahụ nyere ya ohere nke inọgide na-ebi n’ebe ahụ n’oge nile ọ dị ndụ. Mmadụ kwesịrị ime ka Society mara tupu o denyere Society ụlọ ma ọ bụ ala ọ bụla.
◻ IKE EKPE NA IHE NTỤKWASỊ OBI: A pụrụ idenyere Watch Tower Bible and Tract Society of Pennsylvania ihe onwunwe ma ọ bụ ego n’akwụkwọ ike ekpe nke e deziri nke ọma n’ụzọ iwu kwadoro, ma ọ bụ a pụrụ ịkpọ Society aha dị ka ndị ga-erite uru ná ndokwa atụmatụ ego. Atụmatụ ego ndị e mere ka ha baara òtù okpukpe uru pụrụ ime ka e sepụtụrụ mmadụ ego ụtụ isi ọ ga-akwụ. E kwesịrị izijere Society otu n’ime akwụkwọ ike ekpe ma ọ bụ nke ndokwa atụmatụ ego dị otú ahụ.
Iji nwetakwuo ihe ọmụma banyere okwu ndị a, dega akwụkwọ na Treasurer’s Office, Watch Tower Bible and Tract Society, P.M.B. 1090, Benin City, Edo State, ma ọ bụ n’alaka ụlọ ọrụ Society kasị dịrị gị nso
[Igbe dị na peeji nke 29]
Ọ CHỌRỌ INYE AKA
TIFFANY dị afọ 11 bụ nwa nwanyị na-aga akwụkwọ na Baton Rouge, Louisiana, U.S.A. N’oge na-adịbeghị anya gara aga, Onyeàmà Jehova nke a na-eto eto kwadebere otu edemede n’isiokwu bụ “Agụmakwụkwọ n’America.” Dị ka ihe si na ya pụta, Ndiàmà mụrụ ya natara akwụkwọ ozi nke a site n’aka onye isi ụlọ akwụkwọ ya:
“N’izu Agụmakwụkwọ America, a gụrụ otu edemede pụrụ iche maka ụmụ akwụkwọ praịmarị n’usoro nzirịta ozi anyị. Enwere m obi ụtọ iji edemede Tiffany mee ihe n’ụtụtụ a. N’ezie ọ bụ nwa agbọghọ pụrụ iche. O guzosiri ike, nwee obi ike onwe onye, nwee nkà, na-emekwa amara. Adighị m ahụkarị onye nọ na praịmarị nke isii ka o nwere ọtụtụ n’ime àgwà ndị a. Tiffany bụ onye e ji eme ọnụ n’ụlọ akwụkwọ anyị.”
Tiffany gbara onye nke mbụ n’ịsọ mpi edemede ahụ. O mesịrị degara Watch Tower Society akwụkwọ wee si: “Ma eleghị anya emeriri m n’ịsọ mpi ahụ nanị n’ihi akwụkwọ ahụ bụ́ Questions Young People Ask—Answers That Work. . . . Eji m isiakwụkwọ kwuru banyere agụmakwụkwọ mee ihe. . . . Ekele dịrị unu maka ibipụta akwụkwọ nke a bara uru ma na-akpali akpali. N’ihi imeri n’edemede ahụ, enwetara m dollar asaa. Ana m etinye 7 dollar a nakwa 13 ọzọ, ná ngukọta nke 20 dollar n’ọrụ nkwusa zuru ụwa ọnụ. . . . Mgbe m tolitere, ana m enwekwa olileanya inye onwe m n’afọ ofufo maka ozi Betel.”
[Picture on page 26]
Mgbe ụfọdụ, Pọl kpatara ihe o ji adị ndụ site n’ime ákwà ụlọ ikwuu