Ọ́bá Akwụkwọ Anyị NKE DỊ N'ỊNTANET
Ọ́bá Akwụkwọ Anyị
NKE DỊ N'ỊNTANET
Igbo
Ọ
  • Á
  • á
  • À
  • à
  • É
  • é
  • È
  • è
  • Ì
  • ì
  • Í
  • í
  • Ị
  • ị
  • Ị̀
  • ị̀
  • Ị́
  • ị́
  • Ḿ
  • ḿ
  • M̀
  • m̀
  • Ṅ
  • ṅ
  • Ò
  • ò
  • Ó
  • ó
  • Ọ
  • ọ
  • Ọ̀
  • ọ̀
  • Ọ́
  • ọ́
  • Ù
  • ù
  • Ú
  • ú
  • Ụ
  • ụ
  • Ụ̀
  • ụ̀
  • Ụ́
  • ụ́
  • BAỊBỤL
  • AKWỤKWỌ NDỊ ANYỊ NWERE
  • ỌMỤMỤ IHE
  • w95 6/15 p. 5-8
  • Nkwụsị nke Ịkpọasị n’Ụwa Nile

O nweghị vidio dị maka ihe a ị họọrọ.

Ewela iwe, o nwetụrụ nsogbu gbochiri vidio a ịkpọ.

  • Nkwụsị nke Ịkpọasị n’Ụwa Nile
  • Ụlọ Nche Ikwupụta Alaeze Jehova—1995
  • Isiokwu Nta
  • Isiokwu Ndị Ọzọ Yiri Nke A
  • Imeri Ịkpọasị n’Ogige Ịta Ahụhụ
  • Mgbe Ịkpọ Asị
  • Ụwa nke Ịkpọasị Na-adịghị na Ya
  • Ọ̀ Dị Mgbe Ịkpọasị Ga-akwụsị?
    Ụlọ Nche Ikwupụta Alaeze Jehova—1995
  • Gịnị Mere Ọtụtụ Ndị Ji Akpọ Ibe Ha Asị?
    Ụlọ Nche Nke Na-ekwusa Alaeze Jehova (Nke Ọhaneze)—2022
  • Mgbe Ịkpọasị Ga-akwụsị Kpamkpam
    Ụlọ Nche Nke Na-ekwusa Alaeze Jehova (Nke Ọhaneze)—2022
  • Anyị Ga-akwụsịli Ịkpọ Ndị Ọzọ Asị
    Ụlọ Nche Nke Na-ekwusa Alaeze Jehova (Nke Ọhaneze)—2022
Lee Ihe Ndị Ọzọ
Ụlọ Nche Ikwupụta Alaeze Jehova—1995
w95 6/15 p. 5-8

Nkwụsị nke Ịkpọasị n’Ụwa Nile

IHE dị ka puku afọ abụọ gara aga, a kpọrọ otu ìgwè dị ntakịrị karị asị. Tertullian na-akọwa àgwà ndị Rom n’ebe ndị Kraịst oge mbụ nọ: “Ọ bụrụ na eluigwe ezoghị mmiri, ọ bụrụ na e nwere ala ọma jijiji, ọ bụrụ na e nwere ụnwụ nri ma ọ bụ ọrịa na-efe efe, ozugbo ahụ mkpu a na-eti bụ, ‘Kpọgara ọdụm ndị Kraịst ahụ!’”

N’agbanyeghị ịbụ ndị a kpọrọ asị, ndị Kraịst oge mbụ guzogidere ọnwụnwa nke ịbọ ọ́bọ̀ maka ikpe na-ezighị ezi ahụ. N’Ozizi Elu Ugwu ya a ma ama, Jisọs Kraịst kwuru, sị: “Unu nụrụ na e kwuru, sị, Hụ mmadụ ibe gị n’anya, kpọọkwa onye iro gị asị: ma Mụ onwe m sị unu, Na-ahụnụ ndị iro unu n’anya, na-ekpekwa ekpere nye ndị na-esogbu unu.”—Matiu 5:43, 44.

Ọ bụ ọdịnala a na-edeghị ede nke ndị Juu kwuru na ‘ịkpọ onye iro asị’ bụ ihe ziri ezi ime. Otú ọ dị, Jisọs sịrị na anyị aghaghị ịhụ onye iro anyị n’anya, ọ bụghị nanị enyi anyị. Nke a siri ike kama ọ bụghị ihe na-agaghị ekwe omume. Ịhụ onye iro n’anya apụtaghị inwe mmasị n’ụzọ ma ọ bụ omume ya nile. Okwu Grik ahụ a hụrụ n’ihe ndekọ Matiu bụ nke sitere n’a·gaʹpe, nke na-akọwa ịhụnanya nke na-eme ihe kwekọrọ n’ụkpụrụ. Onye na-egosipụta a·gaʹpe, bụ́ ịhụnanya dabeere n’ụkpụrụ, na-eme ihe ọma ọbụna nye onye iro nke na-akpọ ya asị ma na-emejọ ya. N’ihi gịnị? N’ihi na ọ bụ ụzọ isi ṅomie Kraịst, ọ bụkwa ụzọ isi merie ịkpọasị. Otu onye ọkà mmụta Grik rịbara ama: “[A·gaʹpe] na-enyere anyị aka imeri ọchịchọ ebumpụta ụwa nke iwe na inwe obi ilu.” Ma nke a ọ̀ ga-adị irè n’ụwa taa nke ịkpọasị jupụtara?

N’ezie, ọ bụghị mmadụ nile kpọrọ onwe ha ndị Kraịst kpebiworo ịgbaso ihe nlereanya Kraịst. Arụrụala ndị a rụrụ na Rwanda ná nso nso a bụ nke ebo dị iche iche, nke ọtụtụ n’ime ndị òtù ha kpọrọ onwe ha ndị Kraịst rụrụ. Pilar Díez Espelosín, onye nọn Roman Katọlik nke rụworo ọrụ na Rwanda ruo 20 afọ, kọrọ otu ihe merenụ nke na-emetụ n’ahụ. Otu nwoke bịarutere na chọọchị nwanyị a na-eburu ube nke doro anya na o jiworị ya na-eme ihe. Onye nọn ahụ jụrụ ya, sị: “Gịnị ka ị nọ na-agagharị na-egbu ndị mmadụ? Ị́ dịghị eche banyere Kraịst?” Ọ zọọrọ na ya mere otú ahụ ma gaa n’ihu banye na chọọchị ahụ, gbunye ikpere n’ala, gụọkwa Ekele Marịa n’ụzọ siri ike. Ma mgbe o mesịrị, ọ pụrụ gaa n’ihu igbu ndị mmadụ. Onye nọn ahụ kwenyere, sị: “O gosiri na anyị adịghị akụzi oziọma ahụ n’ụzọ kwesịrị ekwesị.” Otú ọ dị, ụdị akụzighị ihe dị otú ahụ adịghị apụta na ihe kọrọ ozi Jisọs. A pụrụ imeri ịkpọasị site n’ịgbaso ezi Iso Ụzọ Kraịst.

Imeri Ịkpọasị n’Ogige Ịta Ahụhụ

Max Liebster bụ onye Juu anụ ahụ nke biri ndụ gabiga Oké Mgbukpọ ahụ. Ọ bụ ezie na aha nna ya pụtara “onye a hụrụ n’anya,” o nwetawo ókè dị nnọọ ukwuu nke ịkpọasị. Ọ na-akọwa ihe ọ mụtara na Nazi Germany banyere ịhụnanya na ịkpọasị.

“A zụlitere m ná nso Mannheim, Germany, n’afọ ndị 1930. Hitler zọọrọ na ndị Juu nile bụ ndị aka ji akụ̀ na-erigbu ndị Germany. Ma nke bụ eziokwu bụ na nna m bụ nanị onye na-arụ akpụkpọ ụkwụ. N’agbanyeghị nke ahụ, n’ihi mmetụta nke mkpọsa aghụghọ ndị Nazi, ndị agbata obi malitere imegide anyị. Mgbe m nọ n’agbata afọ iri na atọ na iri na itoolu, otu onye bi n’ime ime obodo jiri ike tee m ọbara ézì n’egedege ihu. Oké mkparị a bụ nanị ntakịrị nke ihe ga-abịanụ. Na 1939 ndị Gestapo jidere m ma jichie ihe nile m nwere.

“Site na January 1940 ruo May 1945, m gbalịsiri ike ịlanarị n’ime ogige ịta ahụhụ ise dị iche iche: Sachsenhausen, Neuengamme, Auschwitz, Buna, na Buchenwald. Nna m, bụ́ onye a kpọgakwara Sachsenhausen, nwụrụ n’oge oyi dị oké njọ nke 1940. M ji aka m buru ozu ya gaa ebe a na-akpọ ozu ọkụ, bụ ebe ozu mmadụ dọjuru na-echere ịkpọ ọkụ. Ná ngụkọta, asatọ n’ime ndị ezinụlọ m nwụrụ n’ogige ndị ahụ.

“A kpọrọ ndị kapos asị n’etiti ndị mkpọrọ ahụ ọbụna karịa ndị nche SS. Ndị kapos bụ ndị mkpọrọ na-akwado ndị SS wee si otú ahụ na-enweta ụfọdụ ihe ọma. E nyere ha ọrụ ilekọta nkesa nri, ha tikasịkwara ndị mkpọrọ ndị ọzọ ahụ. Mgbe mgbe ha na-emeso mmadụ omume ọjọọ na nke aka ike. Echere m na m nwere ihe dị ukwuu mere m ga-eji akpọ ma ndị SS ma ndị kapos asị, ma n’oge a tụrụ m mkpọrọ, amụtara m na ịhụnanya ka ịkpọasị ike.

“Obi ike nke ndị mkpọrọ bụ́ Ndịàmà Jehova mere ka m kweta na okwukwe ha dabeere n’Akwụkwọ Nsọ—m ghọkwara Onyeàmà n’onwe m. Ernst Wauer, bụ́ Onyeàmà m zutere n’ogige ịta ahụhụ nke Neuengamme gbara m ume ịzụlite echiche uche nke Kraịst. Bible sịrị na ‘mgbe a na-ekwutọ Ya, Ọ dịghị ekwutọghachi ọzọ; mgbe Ọ na-ahụ ahụhụ, Ọ dighị aba mba; kama Ọ raara Onwe ya nye n’aka Onye ahụ Nke na-ekpe ikpe ziri ezi.’ (1 Pita 2:23) M gbalịrị ime otu ihe ahụ, ịhapụ ịbọ ọ́bọ̀ n’aka Chineke, bụ́ Onye Ikpe nke mmadụ nile.

“Afọ ndị m nọrọ n’ogige ndị ahụ kụziiri m na ndị mmadụ na-emekarị ihe ọjọọ n’ihi amaghị nke a na-akọ. Ọ bụghịdị ndị nche SS nile dịcha njọ—e nwere otu nke zọpụtara ndụ m. M rịara oké ọrịa otoro n’otu oge, enweghịkwa m ume ma ọlị ịga site n’ọrụ gaa n’ogige ahụ. A gaara akpọga m n’ovun gas nke Auschwitz n’ụtụtụ echi ya, ma otu onye nche SS, bụ́ onye sitere n’ógbè Germany ahụ m sitere, gbachiteere m. O dokwara ka m gaa rụọ ọrụ na kafiteria nke ndị SS, bụ́ ebe m zutụrụ ike ruo mgbe m gbakere. Otu ụbọchị ọ gwara m obi ya, sị: ‘Max, ọ na-adị m ka m nọ n’ụgbọ okporo ígwè nke na-efe ọsọ, nke na-enweghịkwa nchịkwa. Ọ bụrụ na m mapụ, m ga-anwụ. Ọ bụrụ na m nọgide, m ga-akpọkasị!’

“Ndị a chọrọ ịhụnanya dị ka m chọrọ. N’ezie, ọ bụ ịhụnanya na ọmịiko, tinyere okwukwe m nwere na Chineke, nyeere m aka ịnagide ọnọdụ jọrọ njọ ndị ahụ na iyi egwu ogbugbu kwa ụbọchị. Agaghị m asị na m lanarịrị n’enweghị mmerụ ahụ ọ bụla, ma apa mmetụta uche m dị nta.”

Ikpo ọkụ na obi ọma nke Max ka na-egbukepụ 50 afọ mgbe nke ahụ gasịrị bụ akaebe doro anya nye ịbụ eziokwu nke okwu ya. Ọnọdụ nke Max apụghị iche. O nwere ihe siri ike mere ọ ga-eji emeri ịkpọasị—ọ chọrọ iṅomi Kraịst. Ndị ọzọ bụ́ ndị Akwụkwọ Nsọ duziworo ndụ ha emewokwa ihe n’otu ụzọ ahụ. Simone, otu n’ime Ndịàmà Jehova sitere France, kọwara otú o si mụta ihe ịhụnanya na-adịghi achọ ọdịmma onwe onye nanị pụtara n’ezie.

“Nne m, Emma, bụ́ onye ghọrọ Onyeàmà nwa oge nta tupu Agha Ụwa nke Abụọ, kụziiri m na ndị mmadụ ọtụtụ mgbe na-eme ihe ọjọọ n’ihi na ha amaghị ihe ka mma. Ọ kọwara na ọ bụrụ na anyị akpọgwara ha asị, anyị abụghị ezi ndị Kraịst, ebe ọ bụ na Jisọs sịrị na anyị kwesịrị ịhụ ndị iro anyị n’anya ma na-ekpere ndị na-akpagbu anyị ekpere.—Matiu 5:44.

“M chetara otu ọnọdụ siri oké ike nke tinyere ihe a m kwenyere na ya n’ule. Oge ndị Nazi weghaara France, nne m tara ahụhụ nke ukwuu n’aka otu onye agbata obi bi n’èzí anyị. Ọ kọọrọ ndị Gestapo banyere nne m, n’ihi nke a kwa, nne m nọrọ afọ abụọ n’ogige ịta ahụhụ ndị Germany, bụ́ ebe ọ fọrọ nke nta ka ọ nwụọ. Mgbe agha ahụ gasịrị, ndị uwe ojii France chọrọ ka nne m bịanye aka n’akwụkwọ nke ga-eme ka nwanyị a baa ná nsogbu dị ka onye na-arụrụ ndị Germany ọrụ. Ma nne m jụrụ ajụ, na-asị na ‘Chineke bụ Onye Ikpe na Onye Nkwụghachi Ụgwọ nke ezi ihe na ihe ọjọọ.’ Afọ ole na ole mgbe nke a gasịrị, onye agbata obi a dara ọrịa cancer na-akpata ọnwụ. Kama ịṅụrị ọṅụ n’ihe ọjọọ dabaara ya, nne m jiri ọtụtụ hour na-eme ka ọnwa ikpeazụ nke ndụ ya dị ntụsara ahụ ruo ókè o kwere mee. Agaghị m echezọ ma ọlị mmeri a ịhụnanya meriri ịkpọasị.”

Ihe atụ abụọ a na-egosi ike nke ịhụnanya dabeere n’ụkpụrụ nwere mgbe ikpe na-ezighị ezi chere ya ihu. Otú ọ dị, Bible n’onwe ya sịrị na e nwere “mgbe ịhụ n’anya, na mgbe ịkpọ asị.” (Eklisiastis 3:1, 8) Olee otú nke ahụ pụrụ isi mee?

Mgbe Ịkpọ Asị

Chineke adịghị akatọ ịkpọasị nile. Banyere Jisọs Kraịst, Bible sịrị: “Ị hụrụ ezi omume n’anya, wee kpọọ mmebi iwu asị.” (Ndị Hibru 1:9) Otú ọ dị, e nwere ọdịiche dị n’etiti ịkpọ ihe ọjọọ ahụ asị na ịkpọ onye ahụ na-eme ihe ọjọọ asị.

Jisọs mere ihe atụ banyere ezi nguzo n’etiti ịhụnanya na ịkpọasị. Ọ kpọrọ ihu abụọ asị, ma ọ gbalịrị inyere ndị ihu abụọ aka ịgbanwe ụzọ ha si eche echiche. (Matiu 23:27, 28; Luk 7:36-50) Ọ katọrọ ime ihe ike, ma o kpere ekpere maka ndị gburu ya. (Matiu 26:52; Luk 23:34) Ọ bụkwa ezie na ụwa kpọrọ ya asị n’enweghị ihe o mere, ọ tọgbọrọ ndụ nke ya iji nye ụwa ndụ. (Jọn 6:33, 51; 15:18, 25) Ọ hapụụrụ anyị ihe nlereanya zuru okè nke ịhụnanya dabeere n’ụkpụrụ na ịkpọasị n’ụzọ Chineke.

Ikpe na-ezighị ezi pụrụ ịkpali ọnụma ziri ezi n’ime anyị, dị ka o mere n’ebe Jisọs nọ. (Luk 19:45, 46) Otú ọ dị, e nyeghị ndị Kraịst ikike iji aka ha bọọ ọ́bọ̀. “Unu enyeghachila onye ọ bụla ihe ọjọọ n’ọnọdụ ihe ọjọọ,” ka Pọl dụrụ ndị Kraịst nọ na Rom n’ọdụ. “A sị na ọ bụ ihe ga-ekwe unu, ka ihe nke dịịrị unu onwe unu hà, unu na mmadụ nile na-adị n’udo. Ndị m hụrụ n’anya, unu abọlara onwe unu ọ́bọ̀ . . . Ekwela ihe ọjọọ merie gị, kama were ezi ihe merie ihe ọjọọ.” (Ndị Rom 12:17-21) Mgbe anyi jụrụ ibu ịkpọasị n’obi ma ọ bụ ịbọ ọ́bọ̀ n’ihi ihe e mejọrọ anyị, ịhụnanya na-enwe mmeri.

Ụwa nke Ịkpọasị Na-adịghị na Ya

Ka ịkpọasị wee pụọ n’ọ̀tụ̀tụ̀ zuru ụwa ọnụ, omume gbamiworo mkpọrọgwụ nke ọtụtụ nde ndị mmadụ aghaghị ịgbanwe. Olee otú a pụrụ isi mezuo nke a? Professor Ervin Staub na-atụ aro ndị na-esonụ: “Anyị adịghị eji ndị anyị na-emerụ ahụ akpọrọ ihe ma na-eji ndị anyị na-enyere aka akpọrọ ihe. Ka anyị na-eji ndị anyị na-enyere aka akpọrọ ihe nke ukwuu karị ma na-enweta afọ ojuju nke dị n’inye aka, anyị na-abịakwa hụ onwe anyị dị ka ndị na-eche banyere mmadụ ma na-enye aka n’ụzọ ka ukwu. Otu n’ime ihe mgbaru ọsọ anyị aghaghị bụ imepụta ọha mmadụ dị iche iche ebe ọ ga-akasị kwe omume ikere òkè n’imere ndị ọzọ ihe.”—The Roots of Evil.

N’ikwu ya n’ụzọ ọzọ, ikpochapụ ịkpọasị chọrọ okike nke ọha mmadụ ebe ndị mmadụ ga-amụ otú e si ahụ n’anya site n’inyere ibe ha aka, ọha mmadụ ebe ndị mmadụ na-echezọ ibu iro nke echiche na-ezighị ezi banyere ndị ọzọ, ịhụ mba n’anya, ịkpa ókè agbụrụ, na ịkpọasị agbụrụ kpatara. Ụdị ọha mmadụ ahụ ọ̀ dị adị? Tụlee ahụmahụ nke otu nwoke chere ịkpọasị ihu n’onwe ya n’oge Mgbanwe Ọdịbendị na China.

“Mgbe Mgbanwe Ọdịbendị ahụ malitere, a kụziiri anyị na e nweghị ohere maka ịhapụ ihe ọ bụla ‘n’òtù ndọrọ ndọrọ ọchịchị’ ahụ. Àgwà a na-ahụ ebe nile bụ ịkpọasị. M ghọrọ onye òtù nke Red Guard ma malite na-achọ ebe ọ bụla maka ‘ndị iro òtù ndọrọ ndọrọ ọchịchị’ anyị—ọbụna n’etiti ndị ezinụlọ m. Ọ bụ ezie na m ka nọ n’agbata afọ iri na atọ na iri na itoolu n’oge ahụ, m keere òkè ná nnyocha nke ụlọ bụ́ ebe anyị na-ele anya maka ihe àmà nke ‘ihe gosiri nguzogide.’ M duzikwara nzukọ ihu ọha nke katọrọ ‘onye ọ bụla megidere mgbanwe.’ N’ezie, mgbe ụfọdụ ebubo ndị a na-adabere n’ibu iro onwe onye karịa n’okwu ndọrọ ndọrọ ọchịchị.

“Ahụrụ m ọtụtụ ndị—ndị na-eto eto na ndị agadi, ndị nwoke na ndị nwanyị—ka e nyere ha ntaramahụhụ nkịtị nke ghọwanyere ihe obi ọjọọ. Otu onye n’ime ndị kụziiri m ihe n’ụlọ akwụkwọ—nwoke ọma—bụ onye a kpụgharịrị n’ámá dị ka a ga-asị na ọ bụ onye ome mpụ. Ọnwa abụọ mgbe nke ahụ gasịrị onye nkụzi ọzọ a na-akwanyere ùgwù n’ụlọ akwụkwọ m bụ onye a hụrụ ozu ya n’Osimiri Suzhou, a manyekwara onye na-akụziri m asụsụ Bekee ịkwụgbu onwe ya. Ọ mara m ahụ jijiji ma gbagwojuo m anya. Ndị a bụ ndị nwere obi ọma. Imeso ha omume otú a ezighị ezi! Ya mere m mebiri mmekọrịta nile mụ na ndị Red Guard.

“Echeghị m na oge a nke ịkpọasị nke rikpuru China ná mkpirikpi oge bụ nanị nke e nwere. Narị afọ nke a ahụwo ọtụtụ ntiwapụta nke ịkpọasị. Otú ọ dị, o doro m anya na ịhụnanya pụrụ imeri ịkpọasị. Ọ bụ ihe m hụworo n’onwe m. Mgbe m malitere isoro Ndịàmà Jehova na-ejekọ, enwere m mmasị n’ezi ịhụnanya ha gosiri ndị mmadụ nke agbụrụ na ọnọdụ ndụ dị iche iche. M na-atụ anya ịhụ mgbe, dị ka Bible kwere nkwa ya, mmadụ nile ga-amụtaworị ịhụ ibe ha n’anya.”

Ee, òtù mba nile nke Ndịàmà Jehova bụ ihe nnwapụta a na-ahụ anya nke na a pụrụ ikpochapụ ịkpọasị. Ihe ọ bụla ọ masịrị ọnọdụ ndụ ha bụrụ, Ndịàmà na-agbalị iji nkwanyerịta ùgwù dochie echiche na-ezighị ezi banyere ndị ọzọ na iwepụ akụkụ ọ bụla nke ịkpa ókè agbụrụ, ịkpọasị agbụrụ, ma ọ bụ ịhụ mba n’anya. Otu ihe ndabere maka ihe ịga nke ọma ha bụ mkpebisi ike ha iṅomi Jisọs Kraịst n’igosi ịhụnanya nke ụkpụrụ na-eduzi. Ihe ndabere ọzọ bụ na ha na-elegara Alaeze Chineke anya iweta ikpe na-ezighị ezi ọ bụla ha pụrụ ịdị na-ata ahụhụ ya ná njebede.

Alaeze Chineke bụ nanị ihe ngwọta e nwere maka inweta ụwa nke na-enweghị ịkpọasị, ụwa ebe a na-agaghịdị enwe ihe ọjọọ a ga-akpọ asị. N’ịbụ ihe a kọwara na Bible dị ka “eluigwe ọhụrụ,” ọchịchị eluigwe a ga-eweta ụwa nke na-enweghị ikpe na-ezighị ezi. Ọ ga-achị “ụwa ọhụrụ,” ma ọ bụ òtù ụmụ mmadụ ọhụrụ a kụziwooro ịhụ ibe ha n’anya. (2 Pita 3:13; Aịsaịa 54:13) Nkụzi ihe a anọrọlarị na-aga n’ihu, dị ka ahụmahụ nke Max, Simone, na ọtụtụ ndị ọzọ na-agba akaebe ya. Ọ bụ ndetụ ire nke usoro ihe omume zuru ụwa ọnụ a ga-eji kpochapụ ịkpọasị na ihe ndị na-akpata ya.

Site n’ọnụ onye amụma ya bụ́ Aịsaịa, Jehova kọwara ihe ga-esi na nke a pụta: “Ha agaghị eme ihe ọjọọ, ha agaghị ebibikwa, n’ugwu nsọ m nile: n’ihi na ihe ọmụma Jehova ga-ejupụta ụwa, dị ka mmiri si ekpuchi oké osimiri.” (Aịsaịa 11:9) Chineke n’onwe ya ga-akwụsịworị ịkpọasị. Ọ ga-abụ n’ezie mgbe inwe ịhụnanya.

[Foto ndị dị na peeji nke 7]

Ndị Nazi kanyere nọmba mkpọrọ n’aka ekpe Max Liebster

[Foto dị na peeji nke 8]

N’isi nso ịkpọasị ga-abụ ihe gaworo aga

    Akwukwo Igbo (1984-2025)
    Pụọ
    Banye
    • Igbo
    • Ziga ya
    • Ịgbanwe Ihe
    • Copyright © 2025 Watch Tower Bible and Tract Society of Pennsylvania
    • Ihe Ị Ga-eme na Ihe Ị Na-agaghị Eme
    • Ihe Anyị Ji Ihe Ị Gwara Anyị Eme
    • Kpebie Ihe Ị Ga-agwa Anyị
    • JW.ORG
    • Banye
    Ziga ya