Mkpọsa Gara Nke Ọma E Ji Akụkọ Alaeze Mee
“N’IHI Gịnị Ka Ndụ Ji Jupụta Nnọọ ná Nsogbu?—Paradaịs nke Nsogbu Na-adịghị na Ya Ọ̀ Pụrụ Ikwe Mee?” Nke a bụ isiokwu nke Akụkọ Alaeze nke 34, traktị nwere peji anọ nke e kesara n’ihe ka n’ọnụ ọgụgụ mba na 139 asụsụ n’April na May nke afọ gara aga. “Otu n’ime ihe ndị kasị pụta ìhè n’afọ a” bụ otú Ndịàmà nọ na Jamaica si kọwaa mkpọsa ije ozi a. “Ihe wetaara ụmụnna oké ọṅụ,” ka Ndịàmà nọ na Belgium kpọrọ ya. Na Czech Republic nke a bụ nke mbụ Ndịàmà Jehova nwere ohere nke iso kere òkè ná nkesa nke Akụkọ Alaeze. Alaka ahụ na-akọ, sị: “Mkpọsa ahụ wetara mmụọ nke ịnụ ọkụ n’obi na mmụọ dị ọkụ.” A nụkwara okwu ndị yiri ndị a site n’ọtụtụ ala ndị ọzọ.
Akụkọ Alaeze nke 34 nwere ozi pụrụ iche maka ndị na-eze ume, na-asụkwa ude n’ihi ihe arụ nile a na-eme n’aha okpukpe. (Ezikiel 9:4) O nwere nkasi obi maka ndị a na-enye ndụ ha nsogbu n’ihi “oge dị oké egwu,” bụ́ nke ha na-apụghị ịchịkwa. (2 Timoti 3:1) N’izo aka na Bible, traktị ahụ gosiri na a ga-agwọta nsogbu nile nke ndụ n’isi nso. Paradaịs nke nsogbu na-adịghị na ya bụ nke e ji n’aka. (Luk 23:43) Ọtụtụ ndị gụrụ Akụkọ Alaeze ahụ bụ ndị ozi ya kpaliri. Otu nwoke na Togo gwara otu Onyeàmà, sị: “Ihe unu kwuru enweghị mgbagha.”
N’ụzọ na-adịghị ngọpụ, nkesa nke Akụkọ Alaeze a dọtara mmasị pụrụ iche. Na Denmark otu onye nwe ụlọ zara otu Onyeàmà na-enyefe traktị ahụ, sị: “M ka si United States lọta. Kpọmkwem tupu m lọtawa, otu onye nyere m traktị unu. Ugbu a, m ka bịarutere abịarute n’ebe a, ozugbo ahụkwa a nọ na-enyefe otu traktị ahụ n’asụsụ Danish!”
Nkwado Kpụ Ọkụ n’Ọnụ Maka Mkpọsa Ahụ
Ndịàmà Jehova n’ụwa nile ji ịnụ ọkụ n’obi kere òkè n’ọrụ ikesa traktị ahụ. Austria, El Salvador, Haiti, Hungary, Itali, New Caledonia, bụ nanị ụfọdụ n’ime ọtụtụ mba ndị na-akọ akụkọ ọnụ ọgụgụ ọhụrụ kasị elu nke ndị nkwusa n’ọnwa ndị ahụ mgbe a nọ na-ekesa Akụkọ Alaeze ahụ.
Na Zambia, otu onye nlekọta sekit azụọla nwa ya nwanyị dị afọ atọ, bụ́ Deborah, inyefe akwụkwọ site n’ụlọ ruo n’ụlọ. N’oge mkpọsa ahụ e ji Akụkọ Alaeze nke 34 mee, Deborah tinyere ihe karịrị mkpụrụ 45 nke traktị ahụ. Nne ya maliteere ụfọdụ ndị natara Deborah Akụkọ Alaeze ahụ ọmụmụ Bible.
Na South Africa otu onye nọ n’agbata afọ iri na atọ na iri na itoolu nyefere nwa akwụkwọ ibe ya aha ya bụ́ Cashia traktị ahụ. Cashia gụrụ traktị ahụ wee kwuo, sị: “Nke a magburu nnọọ onwe ya—ibi ndụ ruo mgbe ebighị ebi n’elu ala paradaịs! Gịnị mere na a gwabeghị m maka ya tupu ugbu a?” A maliteere ya ọmụmụ Bible. Mgbe ọ na-erule otu izu Cashia natara traktị ọzọ. Nke abụọ si n’aka otu enyi ya bụ́ onye Roman Katọlik nke ya na ya na-ederịta akwụkwọ, onye bi na Saịprọs. Enyi ya ahụ ya na ya na-ederịta akwụkwọ kọwaara Cashia ihe mere ozizi dị iche iche nke Chọọchị Roman Katọlik ji bụrụ ụgha wee gwa ya na ya na-ezube isoro Ndịàmà Jehova mụọ Bible. N’ezie, nke ahụ mere ka mkpebi Cashia ịga n’ihu n’ọmụmụ ihe ya sie ike nke ukwuu.
Otu nwa okoro dị afọ iri na Switzerland soro nne ya kere òkè n’ikesa traktị ahụ. O nyefere otu nwa agbọghọ otu wee gbaa ya ume iji nlezianya gụọ ya. Nwa agbọghọ ahụ jụrụ nwa okoro ahụ ma ò kwetara n’ezie n’ihe ihe osise dị n’ihu ya na-egosi—ndụ na-adịghị agwụ agwụ n’elu ala. Gịnị bụ nzaghachi nwa okoro ahụ? “Eenụ, eji m n’aka kpọmkwem.” Mgbe ahụ nwanyị ahụ kpughere na ya na-achọ ezi okpukpe ahụ n’ihi na e nwere ọtụtụ ihe ndị na-emegiderịta ibe ha n’okpukpe nke ya. Mgbe o jeere ya nletaghachi, a malitere ọmụmụ Bible.
Mmeghachi Omume Ndị E Nwetara Ozugbo
Mgbe ụfọdụ Akụkọ Alaeze ahụ kpasuru ndị gụrụ ya imeghachi omume ozugbo ahụ. Mgbe ọ gụsịrị traktị ahụ, otu nwatakịrị nwanyị dị afọ 11 na Belgium mere nkwupụta gwa otu n’ime Ndịàmà Jehova na ya anọwo na-ezuru ihe n’ụlọ ahịa. Nne nwatakịrị nwanyị ahụ chọburu ịgbachi nkịtị n’okwu ahụ, ma a kpaliri akọ na uche nwatakịrị nwanyị ahụ site n’ihe ọ gụrụ, o sikwara ọnwụ na ya ga-eje hụ maneja nke ụlọ ahịa ahụ. Nne ya mesịrị kweta ka nwa ya nwanyị na Onyeàmà ahụ gaghachi n’ụlọ ahịa ahụ. Nkwupụta ya juru maneja ahụ anya. Mgbe ọ nụrụ na ọ bụ Akụkọ Alaeze ahụ kpaliri ya ime ihe n’ụzọ dị otú a, ya onwe ya weere otu iji hụ ihe dị n’ime ya nke dị ike otú a. Nwatakịrị nwanyị ahụ na-enwe ọmụmụ Bible na-aga n’ihu ugbu a.
Otu Onyeàmà na Cameroon nyere otu nwoke otu n’ime Akụkọ Alaeze ahụ ma na-akọ, sị: “Mgbe anyị laghachitere, anyị hụrụ na ọ kaalarị akara n’ime ya, nweekwa ọtụtụ ajụjụ. Mgbe o nwetasịrị azịza ndị na-eju afọ, o kwuru, sị: ‘Ọ bụ nnọọ eziokwu na okpukpe esowo kpata enweghị obi ụtọ nke ihe a kpọrọ mmadụ. Traktị unu enyeworo m aka ịghọta ihe dị ukwuu, ma m ga-enwe mmasị ịmụtakwu ihe.’” Ọ na-enwechi ọmụmụ Bible anya ugbu a.
Otu Onyeàmà nke na-eme nleta site n’ụlọ ruo n’ụlọ na Uruguay nyefere otu nwoke otu traktị. Onyeàmà ahụ gara n’ihu n’ọrụ ya nke ime nkwusa site n’ụlọ ruo n’ụlọ ma rụọ ọrụ gburugburu otu ìgwè ụlọ ruo mgbe o rutere n’ọnụ ụzọ dị n’azụ ụlọ nke ebe obibi nwoke ahụ. O juru ya anya ịhụ ka nwoke ahụ nọ na-echere ya, jide traktị n’aka. Ọ gụọlarị ya, chọọkwa inwetakwu ihe ọmụma. A malitere ọmụmụ ihe ozugbo ahụ.
Ọha na Eze Enye Aka ná Nkesa
Na Japan otu Onyeàmà na-eto eto bịakwutere otu nwoke nọ n’afọ ndị 50 ya wee gosi ya traktị ahụ. Nwoke ahụ jụrụ, sị: “Gịnị ka unu na-eme mpempe akwụkwọ ahụ mgbe unu zutere ndị na-adịghị ahụ ụzọ?” Onyeàmà ahụ kwetara na ya amaghị. Nwoke ahụ sịrị ya cheretụ wee banyeghachi n’ime ụlọ ya. O ji otu n’ime Akụkọ Alaeze ahụ laghachite wee kwuo, sị: “Anataworị m mpempe akwụkwọ ahụ. Echere m na o nwere ihe ọmụma na-adọrọ mmasị nke dịkwa mkpa, ya mere atụgharịrị m ya gaa na Braille. Biko jiri nke a mee ihe maka ndị kpuru ìsì.” Nwoke ahụ etinyewo ọtụtụ hour na-atụgharị Akụkọ Alaeze ahụ gaa na Braille ka ihe dị n’ime ya ghara ịkwa ndị kpuru ìsì.
Na Slovakia otu nwoke nwere mmasị na traktị ahụ nke ukwuu nke na o mere ka e mepụta mkpụrụ 20, o jikwa aka ya kesaa ndị nke a na-enweghị àgwà mara mma. Otu onye nkwusa na Switzerland hapụụrụ otu ezinụlọ otu Akụkọ Alaeze ahụ wee gaa n’ihu ịrụ ọrụ n’okpukpu ndị ọzọ dị n’ụlọ elu ahụ ebe ezinụlọ ahụ bi. Mgbe ọ gbadataghachiri, otu nwatakịrị nwoke si n’ezinụlọ ahụ zutere ya, bụ́ onye rịọrọ ka e nyekwuo ya mkpụrụ 19 nke traktị ahụ. N’ụlọ akwụkwọ ebe nwatakịrị nwoke ahụ na-eje akwụkwọ, e kenyewo ụmụ akwụkwọ ọrụ ide ihe banyere nsogbu dị iche iche na ọchịchọ a na-achọ ngwọta ha. Ọ chọrọ otu mkpụrụ Akụkọ Alaeze ahụ maka nke ọ bụla n’ime ụmụ klas ya.
Ọ Dịghị Onye A Na-enyeghị
Ndị keere òkè ná mkpọsa ahụ gbalịsiri ike ịhụ na ọ dịghị onye a na-enyeghị. Na New Caledonia Ndịàmà abụọ nọ na-aga n’ókèala nke otu agbụrụ dịmiri adịmi iji kesaa Akụkọ Alaeze ahụ. Ka ha nọ n’ụzọ, ha hụrụ otu warawara ụzọ nke yiri ka a dịghị aga na ya, ma ka o sina dị ha kpebiri ịhụ ma ọ dị onye bi n’ebe ọ kwụsịrị. N’ịhapụ ụgbọ ala ha, ha ji ụkwụ soro warawara ụzọ ahụ gawa, na-agafe mmiri iyi ụfọdụ ruo mgbe ha mesịrị chọta otu ụlọ. Otu di na nwunye nke na-anụtụbeghị maka Ndịàmà Jehova bi n’ebe ahụ, ha nakwerekwaara otu n’ime Akụkọ Alaeze ahụ. Ka e mesịrị, ndị nkwusa ahụ jere nletaghachi, n’ụzọ jukwara ha anya ha chọpụtara na di na nwunye ahụ edoziela ụzọ ahụ na ọtụtụ ntakịrị àkwà mmiri ka Ndịàmà ahụ wee nwee ike ịnyara ụgbọ ala ha bịarute n’ụlọ ahụ. A malitere ọmụmụ Bible chiri anya.
Na Poland otu Onyeàmà aghaghị ịgafe ebe a na-ewu ihe owuwu iji nyefee otu onye nwe ụlọ otu n’ime Akụkọ Alaeze ahụ. Ndị ọrụ ahụ nọ na-ekiri ya mgbe o si ebe ahụ a na-ewu ihe owuwu gafeta ka ọ na-ala. N’ikpeazụ, otu n’ime ndị ọrụ ahụ kpọrọ ya, na-agwa ya ka ọ ghara ichefu ha. Mgbe ọ bịakwutere ha, ha kwụsịtụrụ ma ṅaa ntị nke ọma n’ihe ndị o kwuru maka traktị ahụ. Ha nakweere ụfọdụ n’ime Akụkọ Alaeze ahụ tinyere magazin, mesịakwa nara akwụkwọ mgbe e mere nletaghachi.
E kesara ọtụtụ narị nde Akụkọ Alaeze nke 34 n’ọtụtụ asụsụ. Ozi ya enweelarị mmetụta dị ike. Ọtụtụ ndị amụtawo na paradaịs nke nsogbu na-adịghị na ya pụrụ ikwe mee. Anyị na-ekpe ekpere na ndị obi ha ziri ezi ga-aga n’ihu na-azaghachi ma n’ikpeazụ soro ná “ndị dị umeala n’obi” ndị “ga-enweta ala; ịba ụba nke udo ga-atọkwa ha ụtọ.”—Abụ Ọma 37:11.
[Igbe dị na peeji nke 31]
Nọgide Na-ekesa Magazin!
E nwere mkpọsa gara nke ọma ikesa Akụkọ Alaeze nke 34 n’ihe ka n’ọnụ ọgụgụ mba n’April na May. N’ime ọnwa abụọ ahụ, e nwekwara nkesa dị ịrịba àmà nke magazin bụ́ Ụlọ Nche na Teta! Dị ka ihe atụ, otu nwanna na Czech Republic na-akọ na n’April o tinyere 250 Akụkọ Alaeze na 750 magazin. Na Guadelope, a họọrọ Saturday, April 15, dị ka ụbọchị pụrụ iche maka magazin. Ihe fọrọ nke nta ka ọ bụrụ ndị nkwusa nile nọ ná mba ahụ keere òkè n’ozi n’ụbọchị ahụ! Slovakia nwere ọnụ ọgụgụ ọhụrụ kasị elu ná nkesa magazin n’April. E nwetara akụkọ ndị yiri ha site n’ọtụtụ mba ndị ọzọ.
Ya mere gịnị ma i mee April na May 1996 ọnwa ndị pụrụ iche maka nkesa magazin? Ọgbakọ dị iche iche pụrụ ịhazi ụbọchị ndị pụrụ iche maka magazin. Ndị mmadụ n’otu n’otu pụrụ ikere òkè n’ịsụ ụzọ inyeaka. N’ụzọ ndị a na ndị ọzọ, a pụrụ ịkwado nkesa magazin, a ga-anọgidekwa na-agbasa ozi ahụ dị mkpa nke a kpọsara n’Akụkọ Alaeze nke 34. Mgbe ahụ, dị ka o mere n’afọ gara aga, Jehova ga-agọzi n’ezie mmụọ ịnụ ọkụ n’obi anyị na-egosi.—2 Timoti 4:22.