Ezi Ịnọ ná Ntụkwasị Obi—Ihe Mgbaru Ọsọ Siri Ike Iru
ARNOLD bụ nwatakịrị nwere mmasị n’ihe ngwuri egwu ya e ji ákwà mee n’ụdị agụ. Ọ na-adọkpụ ya eje ebe nile ọ na-eje—mgbe ọ na-egwuri egwu, n’oge nri, n’àkwà ya. Agụ ahụ na-enye ya ntụsara ahụ, ịnọ ná ntụkwasị obi. Otu ụbọchị, e nwere ọgba aghara. A hụkwaghị agụ!
Ka Arnold nọ na-ebe ákwá, nne ya, nna ya, na ụmụnne ya atọ ndị tọrọ ya chọgharịrị ya ná nnukwute ụlọ ha iji chọta agụ ahụ. Otu n’ime ha mesịrị chọta ya n’ime ebe a na-etinye ihe. N’ụzọ doro anya, Arnold etinyewo ya n’ebe ahụ ma chezọzie ebe ọ dị ozugbo. E weghachitere agụ ahụ, Arnold hichakwara anya mmiri ya. O nweghachikwara obi ụtọ na mmetụta nke ịnọ ná ntụkwasị obi.
Lee ka ọ ga-esi dị mma ma ọ bụrụ na a pụrụ ịgwọta nsogbu nile n’ụzọ dị mfe otú ahụ—n’ụzọ dị nnọọ mfe ka ịchọta agụ e ji egwuri egwu n’ebe a na-etinye ihe! Otú ọ dị, nye ihe ka n’ọnụ ọgụgụ mmadụ, okwu banyere ịnọ ná ntụkwasị obi siri nnọọ ike ma taa akpụ karịa nke ahụ. Ihe fọrọ nnọọ nke nta ka ọ bụrụ ebe nile, ndị mmadụ na-eche, sị, ‘À ga-emeso m mpụ ma ọ bụ ihe ike? Ànọ m n’ihe ize ndụ nke enwekwaghị ọrụ? Ezinụlọ m ò ji n’aka inweta ihe oriri zuru ezu? Ndị ọzọ hà ga-ezere m n’ihi okpukpe m ma ọ bụ agbụrụ m si na ya?’
Ọnụ ọgụgụ mmadụ ndị na-anọghị ná ntụkwasị obi buru ibu. Dị ka òtù Mba Ndị Dị n’Otu si kwuo, ihe fọrọ nke nta ka ọ bụrụ ijeri mmadụ atọ enweghị ike inweta ọ bụghị nanị ọgwụgwọ nke ọrịa ndị zuru ebe nile kamakwa ọgwụ ndị dị mkpa. Ihe karịrị otu ijeri mmadụ na-ahụsi anya n’oké ịda ogbenye. Ihe fọrọ nke nta ka ọ bụrụ otu ijeri, ọ bụ ezie na ha nwere ike ịrụ ọrụ, enweghị ezigbo ọrụ. Ọnụ ọgụgụ ndị gbara ọsọ ndụ na-arị elu. Ka ọ na-erule ngwụsị nke 1994, a manyewo ihe dị ka 1 n’ime 115 mmadụ ọ bụla nọ n’elu ala ịgbapụ site n’ebe obibi ha. A na-emebi ọtụtụ nde ndụ n’ihi ịzụ ahịa ọgwụ ọjọọ nke na-enweta $500 ijeri n’otu afọ bụ́ nke na-akpata ime mpụ na ime ihe ike na-enweghị ngụta. Agha na-ebibi ndụ nke ọtụtụ nde mmadụ. N’ime 1993 nanị, 42 mba tinyere aka n’ọgụ ndị bụ isi, ebe 37 ndị ọzọ hụrụ ime ihe ike ndọrọ ndọrọ ọchịchị.
E jikọtara agha, ịda ogbenye, mpụ, na ihe ndị ọzọ na-eyi ịnọ ná ntụkwasị obi nke ụmụ mmadụ egwu, ha na-amụbakwa n’ọnụ ọgụgụ. E nweghị ngwọta yiri nke agụ dị n’ebe a na-etinye ihe maka nsogbu ndị dị otú ahụ. N’eziokwu, ụmụ mmadụ agaghị agwọta ha ma ọlị.
“Atụkwasịla obi n’ahụ ndị a maara aha ha, ma ọ bụ n’ahụ nwa nke mmadụ, onye ọ na-adịghị nzọpụta o nwere,” ka Okwu Chineke, bụ́ Bible, na-adọ aka ná ntị. Ya bụrụ otú ahụ, ònye ka anyị pụrụ ịtụkwasị obi? Akụkụ akwụkwọ nsọ a gara n’ihu, sị: “Onye ihe na-agara nke ọma ka onye ahụ bụ nke Chineke nke Jekọb bụ Onye na-enyere ya aka, nke olileanya ya dịkwasị Jehova, bụ́ Chineke ya: Onye meworo eluigwe na ụwa, na oké osimiri, na ihe nile nke dị n’ime ha.”—Abụ Ọma 146:3-6.
N’ihi gịnị ka anyị pụrụ iji tụkwasị Jehova obi iweta ịnọ ná ntụkwasị obi n’elu ala a? Ọ̀ ga-ekwe omume inwe ndụ nke ịnọ ná ntụkwasị obi, nke obi ụtọ ugbu a? Olee otú Chineke ga-esi wepụ ihe ndị na-egbochi ịnọ ná ntụkwasị obi ụmụ mmadụ?