Ọ́bá Akwụkwọ Anyị NKE DỊ N'ỊNTANET
Ọ́bá Akwụkwọ Anyị
NKE DỊ N'ỊNTANET
Igbo
Ọ
  • Á
  • á
  • À
  • à
  • É
  • é
  • È
  • è
  • Ì
  • ì
  • Í
  • í
  • Ị
  • ị
  • Ị̀
  • ị̀
  • Ị́
  • ị́
  • Ḿ
  • ḿ
  • M̀
  • m̀
  • Ṅ
  • ṅ
  • Ò
  • ò
  • Ó
  • ó
  • Ọ
  • ọ
  • Ọ̀
  • ọ̀
  • Ọ́
  • ọ́
  • Ù
  • ù
  • Ú
  • ú
  • Ụ
  • ụ
  • Ụ̀
  • ụ̀
  • Ụ́
  • ụ́
  • BAỊBỤL
  • AKWỤKWỌ NDỊ ANYỊ NWERE
  • ỌMỤMỤ IHE
  • w97 1/15 p. 23-28
  • Inyere Ndị Ọzọ Aka Ịmụta Ihe Chineke Na-achọ

O nweghị vidio dị maka ihe a ị họọrọ.

Ewela iwe, o nwetụrụ nsogbu gbochiri vidio a ịkpọ.

  • Inyere Ndị Ọzọ Aka Ịmụta Ihe Chineke Na-achọ
  • Ụlọ Nche Ikwupụta Alaeze Jehova—1997
  • Isiokwu Nta
  • Isiokwu Ndị Ọzọ Yiri Nke A
  • Ihe Ịma Aka ma Ọ Bụghị Ibu Arọ
  • Ndị A Kwadebere nke Ọma Inyere Ndị Ọzọ Aka
  • Inyocha Otu Ngwá Ọrụ Ọhụrụ
  • Jiri Broshọ Bụ́ Ozi Ọma Si n’Aka Chineke! Na-amụrụ Ndị Mmadụ Baịbụl
    Ozi Alaeze Anyi—2013
  • Ngwá Ọrụ Ọhụrụ Iji Nyere Ndị Mmadụ Aka Ịmụta Ihe Chineke Na-achọ
    Ụlọ Nche Ikwupụta Alaeze Jehova—1997
  • Nyere Ndị Na-enweghị Uche Aka Ịghọta
    Ozi Alaeze Anyi—1997
  • Jiri Broshuọ Kpọsaa Ozi Ọma Alaeze Ahụ
    Ozi Alaeze Anyi—1996
Lee Ihe Ndị Ọzọ
Ụlọ Nche Ikwupụta Alaeze Jehova—1997
w97 1/15 p. 23-28

Inyere Ndị Ọzọ Aka Ịmụta Ihe Chineke Na-achọ

“Mkpa na-akpa m; n’ihi na ahụhụ dịịrị m, a sị na ezisaghị m ozi ọma.”—1 NDỊ KỌRINT 9:16.

1, 2. (a) N’ọrụ dị aṅaa gbara mkpị ka Jehova chọrọ ka anyị kere òkè na ya? (b) Gịnị ka ndị nwere obi eziokwu na-aghaghị ịmụta iji ghọọ ndị Alaeze Chineke na-achị?

JEHOVA nwere ozi ọma maka ihe a kpọrọ mmadụ. O nwere otu Alaeze, ọ chọkwara ka ndị mmadụ n’ebe nile nụ banyere ya! Ozugbo anyị natara ozi ọma a, Chineke chọrọ ka anyị soro ndị ọzọ kerịta ya. Nke a bụ ọrụ gbara mkpị. Nke mbụ, anyị aghaghị ibu ụzọ kpọsaa ozi ọma banyere Alaeze Chineke. N’amụma ya banyere “ọgwụgwụ oge a,” Jisọs sịrị: “A ga-ekwusakwa ozi ọma nke a nke alaeze eluigwe n’elu ụwa dum mmadụ bi, ka ọ bụrụ àmà nye mba nile; mgbe ahụ ka ọgwụgwụ ihe nile ga-erukwa.”—Matiu 24:3, 14.

2 Akụkụ nke abụọ nke ọrụ a na-agụnye izi ndị zaghachiri n’ụzọ dị mma ná mkpọsa Alaeze ahụ ihe. Mgbe mbilite n’ọnwụ ya gasịrị, Jisọs gwara ìgwè bara ụba nke ndị na-eso ụzọ ya, sị: “Ya mere, gaanụ mee mba nile ka ha bụrụ ndị na-eso ụzọ m, na-eme ha baptism baa n’aha nke Nna, na nke Ọkpara, na nke Mmụọ Nsọ: na-ezi ha ka ha debe ihe nile ka ha hà, bụ́ nke M nyere unu n’iwu: ma lee, Mụ onwe m nọnyeere unu ụbọchị nile, ruo ọgwụgwụ oge a.” (Matiu 28:19, 20) ‘Ihe Kraịst nyere n’iwu’ esiteghị n’uche nke aka ya; o ziri ndị ọzọ idebe ihe Chineke nyere n’iwu, ma ọ bụ ihe ọ na-achọ. (Jọn 14:23, 24; 15:10) Izi ndị ọzọ ‘idebe ihe Kraịst nyere n’iwu’ si otú a na-agụnye inyere ha aka ịmụta ihe Chineke chọrọ. Ndị mmadụ nwere obi eziokwu aghaghị iru ihe Chineke chọrọ iji ghọọ ndị Alaeze ya na-achị.

3. Gịnị bụ Alaeze Chineke, gịnịkwa ka ọ ga-arụzu nke mere ka ozi Alaeze ahụ bụrụ ozi ọma dị otú ahụ?

3 Gịnị bụ Alaeze Chineke? Gịnịkwa ka ọ ga-arụzu nke mere ka ozi Alaeze ahụ bụrụ ozi ọma otú a? Alaeze Chineke bụ ọchịchị eluigwe. Ọ dị oké ọnụ ahịa nye Jehova, n’ihi na ọ bụ ụzọ ọ ga-esi doo aha ya nsọ, na-ewepụ ya ná nkọcha nile. Alaeze ahụ bụ ngwá ọrụ Jehova ga-eji mee ka e mee uche ya n’elu ala dị ka e si eme ya n’eluigwe. Ọ bụ ya mere Jisọs ji zie anyị ikpe ekpere ka Alaeze Chineke bịa na ka anyị tinye ya n’ọnọdụ mbụ ná ndụ anyị. (Matiu 6:9, 10, 33) Ị̀ hụrụ ihe mere o ji dị oké mkpa nye Jehova na anyị ziri ndị ọzọ banyere Alaeze ya?

Ihe Ịma Aka ma Ọ Bụghị Ibu Arọ

4. Olee otú a pụrụ isi maa atụ na ọrụ anyị nke ikwusa ozi ọma abụghị ibu arọ?

4 Ọ́ bụghị ibu arọ ikwusa ozi ọma a? Ọ dịghị ma ọlị! Iji maa atụ: Nna nwere ibu ọrụ nke inye ezinụlọ ya ihe n’ụzọ anụ ahụ. Emeghị nke ahụ pụtara ịjụ okwukwe ndị Kraịst. Pọl onyeozi dere, sị: “Ma ọ bụrụ na onye ọ bụla ebughị ụzọ cheere ndị nke aka ya ihe na-akpa ha, ma nke kachasị ndị ezinụlọ nke aka ya, ọ gọnarịwo okwukwe anyị, jọkarịakwa onye na-ekweghị ekwe ná njọ.” (1 Timoti 5:8) Ma ọrụ ahụ ọ̀ bụ ibu arọ nye nwoke bụ́ onye Kraịst? Ọ bụghị ma ọ bụrụ na ọ hụrụ ezinụlọ ya n’anya, n’ihi na n’ọnọdụ ahụ ọ chọrọ inye ha ihe na-akpa ha.

5. Ọ bụ ezie na ọrụ nkwusa na ime ndị na-eso ụzọ bụ ibu ọrụ, n’ihi gịnị ka anyị kwesịrị iji nwee obi ụtọ ikere òkè na ya?

5 N’ụzọ yiri nke ahụ, ọrụ nkwusa na ime ndị na-eso ụzọ bụ ibu ọrụ, ihe a chọrọ, nke ndụ anyị na-adabere na ya. Pọl si otú a kwuo ya: “Mkpa na-akpa m; n’ihi na ahụhụ dịrị m, a sị na ezisaghị m ozi ọma.” (1 Ndị Kọrint 9:16; tụlee Ezikiel 33:7-9.) Otú ọ dị, nzube anyị maka ime nkwusa bụ ịhụnanya, ọ bụghị ọrụ efu. N’ụzọ bụ isi, anyị hụrụ Chineke n’anya, ma anyị hụkwara ndị agbata obi anyị n’anya, anyị makwaara otú o si dị mkpa na ha nụrụ ozi ọma ahụ. (Matiu 22:37-39) Ọ na-enye ha olileanya maka ọdịnihu. Alaeze Chineke ga-edozi ikpe na-ezighị ezi n’isi nso, wepụ mmegbu nile, ma weghachi udo na ịdị n’otu—ha nile n’ihi ngọzi ebighị ebi nke ndị na-edo onwe ha n’okpuru ịchịisi ezi omume ya. Ọ̀ bụ na ọ dịghị amasị anyị, ee akpali anyị, isoro ndị ọzọ ekerịta ozi ọma dị otú ahụ?—Abụ Ọma 110:3.

6. N’ihi gịnị ka ọrụ nkwusa na ime ndị na-eso ụzọ ji bụrụ ihe ịma aka n’ezie?

6 N’otu mgbe ahụ, ọrụ nkwusa na ime ndị na-eso ụzọ nke a bụkwa ihe ịma aka n’ezie. Ndị mmadụ dịgasị iche iche. Mmadụ nile enweghị otu mmasị ma ọ bụ ikike ahụ. Ụfọdụ gụrụ akwụkwọ nke ọma, ebe ndị ọzọ nwere agụmakwụkwọ dị nnọọ nta. Ịgụ ihe—bụbu ihe a kasị enwe mmasị n’oge a na-ejighị ọrụ n’aka—ka a na-elekarị anya ugbu a dị ka ọrụ siri ike. Enweghị mmasị ịgụ ihe, nke a na-akọwa dị ka “ọdịdị ma ọ bụ ọnọdụ nke inwe ike ịgụ ihe ma ghara inwe mmasị n’ime otú ahụ,” bụ nsogbu na-arịwanye elu, ọbụna ná mba ndị nwere ọ̀tụ̀tụ̀ dị elu nke ịma akwụkwọ. Mgbe ahụ, olee otú anyị pụrụ isi nyere ndị mmadụ nwere nzụlite na mmasị ndị dịgasị iche iche otú ahụ aka ịmụta ihe Chineke na-achọ?—Tụlee 1 Ndị Kọrint 9:20-23.

Ndị A Kwadebere nke Ọma Inyere Ndị Ọzọ Aka

7. Olee otú “ohu ahụ kwesịrị ka a tụkwasị ya obi, nke nwekwara uche” siworo kwadebe anyị inyere ndị ọzọ aka ịmụta ihe Chineke na-achọ?

7 Ọrụ na-ama aka na-aka mfe ma ọ bụrụ na i nwere ngwá ọrụ kwesịrị ekwesị. Ngwá ọrụ kwesịrị ekwesị maka otu ọrụ taa pụrụ ịbụ nke a gbanwere ma ọ bụ nke e ji ọzọ dochie anya ya echi n’ihi mkpa ndị na-agbanwe agbanwe. Ọ bụ otu ihe ahụ n’ọrụ anyị nke ịkpọsa ozi banyere Alaeze Chineke. Eri ọtụtụ afọ, “ohu ahụ kwesịrị ka a tụkwasị ya obi, nke nwekwara uche” enyewo anyị ngwá ọrụ ndị kwesịrị nnọọ ekwesị, mbipụta ndị e mere iji eduzi ọmụmụ Bible ebe obibi. (Matiu 24:45) E siwo otú a kwadebe anyị inyere ndị mmadụ nke “mba nile, na ebo nile, na . . . asụsụ nile” aka ịmụta ihe Chineke na-achọ. (Mkpughe 7:9) Site n’oge ruo n’oge, e wepụtawo ngwá ọrụ ndị ọhụrụ iji gboo mkpa na-agbanwe agbanwe e nwere n’ubi ụwa. Ka anyị tụlee ihe atụ ole na ole.

8. (a) Òkè dị aṅaa ka akwụkwọ bụ́ “Kwe Ka Chineke Buru Onye-Ezi-Okwu” keere n’ime ka nkụzi Bible gaa n’ihu? (b) Ngwá ọrụ dị aṅaa maka ọrụ ọmụmụ Bible ka e wepụtara na 1968, è mere ya n’ụzọ dị aṅaa karịsịa? (ch) Olee otú akwụkwọ Ezi-Okwu siri nye aka n’ọrụ ime ndị na-eso ụzọ?

8 Malite na 1946 ruo 1968, e ji akwụkwọ bụ́ “Kwe Ka Chineke Buru Onye-Ezi-Okwu” mee ihe dị ka ngwá ọrụ dị ike maka nkụzi Bible, e bipụtakwara ihe dị ka 19,250,000 n’asụsụ 54. N’ịbụ nke e wepụtara na 1968 (Bekee), e ji akwụkwọ Ezi-Okwu Ahu Nke Nedubà ná Ndu Ebigh-Ebi mee ihe n’ụzọ dị irè ruo ọtụtụ afọ n’ịmụrụ ndị nwere mmasị Bible. N’oge gara aga, ọ bụ ihe na-emekarị na ụfọdụ ga-eso Ndịàmà Jehova mụọ ihe ọtụtụ afọ n’emeghị baptism. Ma e mere ngwá ọrụ a iji mee ka onye mmụta ahụ kere òkè, na-agba ya ume itinye ihe ọ na-amụta n’ọrụ. Gịnị si na ya pụta? Akwụkwọ bụ́ Jehovah’s Witnesses—Proclaimers of God’s Kingdom na-ekwu, sị: “N’ime afọ ije ozi atọ ndị malitere na September 1, 1968, ma jedebe n’August 31, 1971, e mere ngụkọta nke mmadụ 434,906 baptism—ihe karịrị okpukpu abụọ nke ọnụ ọgụgụ e mere baptism n’ime afọ ije ozi atọ bu ụzọ!” Kemgbe e wepụtara ya, akwụkwọ Ezi-Okwu enwewo nkesa bara oké ụba—ihe karịrị 107,000,000 n’asụsụ 117.

9. Akụkụ pụrụ iche dị aṅaa ka akwụkwọ Ịdị Ndụ Ebighị Ebi nwere, mmetụta dịkwa aṅaa ka o nwere n’ìgwè ndị mkpọsa Alaeze?

9 Na 1982 akwụkwọ bụ́ Ị Pụrụ Ịdị Ndụ Ebighị Ebi n’ime Paradaịs n’Elu Ala (Bekee) ghọrọ akwụkwọ bụ isi e ji eduzi ọmụmụ Bible. Ngwá ọrụ a nwere ihe karịrị ihe osise 150, nke ọ bụla nwekwara okwu nkọwa nwere ihe ọ pụtara nke na-eme ka isi ihe foto ndị ahụ na-akụzi pụta ìhè. Mbipụta Ozi Alaeze Anyị nke February 1983 kwuru, sị: “N’ihe dị ka afọ iri abụọ nke anyị nwere akwụkwọ ‘Kwe Ka Chineke Buru Onye-Ezi-Okwu’ dị ka akwụkwọ ọmụmụ anyị bụ isi (site n’afọ 1946 rue n’agbata 1960 na 1969), a tụkwasịịrị anyị ihe karịrị otu nde ndị nkwusa ọhụrụ nke Alaeze. A tụkwasịkwara otu nde ndị nkwusa ọzọ mgbe akwụkwọ Ezi-Okwu Ahu Nke Nedubà ná Ndu Ebigh-ebi ghọrọ akwụkwọ ọmụmụ ihe anyị bụ isi, mgbe e wepụtasịrị ya n’afọ 1968. Site n’iji akwụkwọ ọmụmụ ihe ọhụrụ anyị bụ [Ị Pụrụ Ịdị Ndụ Ebighị Ebi n’ime Paradaịs n’Elu Ala] wee na-eje ozi, ànyị ga-ahụ ịba ụba dị ka ndị ahụ n’ọnụ ọgụgụ ndị nkwusa Alaeze? N’ezie, ma ọ bụrụ uche Jehova!” O doro anya na ọ bụ uche Jehova, n’ihi na malite na 1982 ruo 1995, a tụkwasịrị ihe karịrị 2,700,000 n’ìgwè ndị mkpọsa Alaeze!

10. Ngwá ọrụ ọhụrụ dị aṅaa ka e nyere na 1995, n’ihi gịnịkwa ka o kwesịrị iji mee ka ndị a na-amụrụ Bible nwee ọganihu ime mmụọ dịtụ ngwa?

10 “Owuwe ihe ubi hiri nne n’ezie, ma ndị ọrụ dị ole na ole,” ka Jisọs kwuru. (Matiu 9:37) N’ezie, owuwe ihe ubi hiri nne. A ka nwere ọtụtụ ihe a ga-eme. N’ala ụfọdụ ndị mmadụ aghaghị idebanye aha ná ndepụta nchere maka ọmụmụ Bible. Ya mere ná nzube nke ịgbasa ihe ọmụma Chineke ngwa ngwa karị, na 1995 “ohu ahụ kwesịrị ka a tụkwasị ya obi, nke nwekwara uche” nyere ngwá ọrụ ọhụrụ, akwụkwọ ahụ dị 192 peji aha ya bụ Ihe Ọmụma nke Na-eduba ná Ndụ Ebighị Ebi. Ngwá ọrụ a bara uru elekwasịghị anya n’ozizi ụgha. Ọ na-ewepụta eziokwu n’ụzọ doro anya. E nwere olileanya na ọ ga-eme ka ndị a na-amụrụ Bible nwee ike inwe ọganihu ime mmụọ dịtụ ngwa. Akwụkwọ Ihe Ọmụma anọworị na-enwe mmetụta n’ubi ụwa, na-enwe 30,500,000 e biworo n’asụsụ 119, ịsụgharị ya gaa n’asụsụ 27 ọzọ na-agakwa n’ihu.

11. Ngwá ọrụ dị irè dị aṅaa ka e wepụtara iji nyere ndị na-amaghị akwụkwọ ma ọ bụ ndị na-adịghị agụ ihe nke ọma aka, oleekwa otú o siworo tụnye ụtụ dị ukwuu n’usoro izi ihe anyị zuru ụwa ọnụ?

11 Site n’oge ruo n’oge, ‘ohu ahụ kwesịrị ntụkwasị obi’ enyewo ngwá ọrụ ndị e mere maka ụfọdụ ndị kpọmkwem, ma ọ bụ ndị a kpaara ókè. Dị ka ihe atụ, olee banyere ndị pụrụ inwe mkpa enyemaka pụrụ iche n’ihi nzụlite ọdịnala ma ọ bụ nke okpukpe ha? Olee otú anyị pụrụ isi nyere ha aka ịmụta ihe Chineke chọrọ? Na 1982 anyị natara nnọọ ihe dị anyị mkpa—broshuọ ahụ nwere 32 peji bụ́ Idi Ndụ n’Elu Ala Rue Mgbe Ebighị-ebi! Akwụkwọ a ihe osise jupụtara abụrụwo ngwá ọrụ dị irè n’izi ndị na-amaghị akwụkwọ ma ọ bụ ndị na-adịghị agụ ihe nke ọma ihe. O nwere ụzọ iche ozizi ndị bụ isi nke Akwụkwọ Nsọ n’ihu mmadụ dị mfe ma dị mfe nghọta. Eri e wepụtara ya, broshuọ Ndụ n’Elu Ala atụnyewo ụtụ buru ibu n’usoro nkụzi anyị zuru ụwa ọnụ. E biwo ihe karịrị 99,860,000 n’asụsụ 227, na-eme ka ọ bụrụ akwụkwọ Watch Tower Society bipụtara a kasị sụgharịa ka ọ dị ugbu a!

12, 13. (a) Eri 1990, ụzọ ọhụrụ dị aṅaa ka ‘ohu ahụ kwesịrị ntụkwasị obi’ wepụtaworo iji rute ndị gbasapụrụ agbasapụ? (b) Olee otú anyị pụrụ isi jiri vidio Society mee ihe n’ozi ubi anyị? (ch) Ngwá ọrụ ọhụrụ dị aṅaa ka e wepụtara n’oge na-adịbeghị anya iji nye aka n’ọrụ anyị nke ime ndị na-eso ụzọ?

12 Tụkwasị n’akwụkwọ ndị e biri ebi, na-amalite na 1990 ‘ohu ahụ kwesịrị ntụkwasị obi’ enyewo anyị otu ụzọ e si enweta ihe ọmụma nke bụ ụzọ ọhụrụ iji rute ọtụtụ ndị gbasapụrụ agbasapụ—kaseti vidio. N’October nke afọ ahụ, e wepụtara vidio ahụ dị minit 55 bụ́ Jehovah’s Witnesses—The Organization Behind the Name—vidio mbụ Watch Tower Society mepụtatụworo. Ihe ngosi ahụ mara mma nke na-enye ihe ọmụma dị n’asụsụ 35, na-egosi nzukọ zuru ụwa ọnụ nke ndị Jehova raara onwe ha nye, bụ́ ndị na-emezu ihe Jisọs nyere n’iwu ịkpọsa ozi ọma n’elu ụwa nile. E mere vidio ahụ karịsịa iji nyere anyị aka n’ọrụ anyị nke ime ndị na-eso ụzọ. Ndị nkwusa Alaeze egbughị oge ọ bụla n’iji ngwá ọrụ ọhụrụ a arụ ọrụ n’ozi ubi. Ụfọdụ na-etinye ya n’akpa akwụkwọ ha, na-adị njikere mgbe nile igosi ma ọ bụ ịgbazinye ya ndị nwere mmasị. N’oge na-adịghị anya mgbe e wepụtasịrị ya, otu onye nlekọta na-ejegharị ejegharị dere, sị: “Vidio abụrụwo ụzọ nke narị afọ nke 21 iji ruo n’uche na obi nke ọtụtụ nde mmadụ, n’ihi ya ọ bụ olileanya anyị na vidio nke a ga-abụ nanị nke mbụ n’ime ọtụtụ vidio Society ga-eji mee ka ọrụ Alaeze ahụ zuru ụwa ọnụ gaa n’ihu.” N’ezie, e wepụtawo vidio ndị ọzọ, tinyere usoro akụkụ atọ ahụ bụ́ The Bible—A Book of Fact and Prophecy na Jehovah’s Witnesses Stand Firm Against Nazi Assault. Ọ bụrụ na e nwere vidio Society n’asụsụ gị, ì jiriwo ha mee ihe n’ozi ubi gị?a

13 N’oge na-adịbeghị anya e wepụtara otu ngwá ọrụ ọhụrụ, broshuọ bụ́ Gịnị Ka Chineke Na-achọ n’Aka Anyị?, iji nye aka n’ọrụ anyị nke ime ndị na-eso ụzọ. N’ihi gịnị ka e ji bipụta ya? Olee otú a pụrụ isi jiri ya mee ihe?

Inyocha Otu Ngwá Ọrụ Ọhụrụ

14, 15. Ole ndị ka e mere broshuọ Na-achọ maka ha, gịnịkwa dị n’ime ya?

14 E mere akwụkwọ ọhụrụ bụ́ Gịnị Ka Chineke Na-achọ n’Aka Anyị? maka ndị mmadụ kwewororịị na Chineke ma na-akwanyere Bible ùgwù. Ndị nlekọta na-ejegharị ejegharị tinyere ndị ozi ala ọzọ e nyere ọzụzụ na Gilead, bụ́ ndị nwere ọtụtụ afọ nke ahụmahụ n’ala ndị ka na-emepe emepe, nyere aka n’ịkwadebe broshuọ a. O nwere usoro ọmụmụ ihe zuru ezu, na-emetụtazu ozizi ndị bụ isi nke Bible. Okwu e ji mee ihe na-ekpo ọkụ, dị mfe, gaakwa n’ihe a chọrọ. N’otu mgbe ahụ, ihe odide ahụ adịghị mfe gabiga ókè. Ọ na-ewepụta ọ bụghị nanị “mmiri ara” kamakwa “nri siri ike” sitere n’Okwu Chineke n’ụzọ ihe ka ọtụtụ ná ndị mmadụ kwesịrị inwe ike ịghọta.—Ndị Hibru 5:12-14.

15 N’afọ ndị na-adịbeghị anya, ndị nkwusa Alaeze n’ala dị iche iche arịọwo maka akwụkwọ dị otú ahụ kpọmkwem. Dị ka ihe atụ, alaka Watch Tower Society dị na Papua New Guinea dere, sị: “Nkụzi okpukpe ndị na-emegiderịta onwe ha na-agbagwoju ndị mmadụ anya. Okwu eziokwu ndị dị nkenke dị ha mkpa, bụ́ nke e ji ụfọdụ akụkụ Bible ndị ha pụrụ ịtụle na Bible nke ha kwadoo. Okwu doro anya na nke a kapịrị ọnụ banyere ihe Chineke na-achọ n’aka ezi ndị Kraịst na omenala na omume ndị ọ na-adịghị anara dị ha mkpa.” Broshuọ Na-achọ bụ nnọọ ihe dị anyị mkpa iji nyere ndị dị otú ahụ aka ịmụta ihe Chineke na-achọ.

16. (a) Olee ndị karịsịa pụrụ irite uru site ná nkọwa ndị dị mfe dị na broshuọ ọhụrụ ahụ? (b) Olee otú ndị nọ n’ókèala gị pụrụ isi rite uru site na broshuọ Na-achọ?

16 Olee otú ị pụrụ isi jiri ngwá ọrụ ọhụrụ a mee ihe? Nke mbụ, a pụrụ iji ya mụọrọ ndị ọ na-esiri ike ịgụ ihe ihe ma ọ bụ ndị nwere ike ghara ịchọ ịgụ ihe.b Ndị dị otú ahụ pụrụ irite uru site ná nkọwa ndị dị mfe dị na broshuọ ahụ. Mgbe a tụlesịrị mbipụta akwụkwọ a nke e bu ụzọ zipụ, alaka dị iche iche nke Watch Tower dere ihe na-esonụ: “Broshuọ ahụ ga-aba uru nke ukwuu n’ọtụtụ akụkụ nke mba ebe ndị mmadụ na-adịghị achọkarị ịgụ ihe.” (Brazil) “E nwere nnọọ ọtụtụ ndị si mba ọzọ kwafeta na-apụghị ịgụ asụsụ ala ha, ndị ka nwetụkwara ihe isi ike ịgụ French. A pụrụ iji broshuọ a mee ihe dị ka ihe enyemaka n’ịmụrụ ndị dị otú ahụ ihe.” (France) Ị̀ pụrụ iche echiche banyere ndị nọ n’ókèala gị pụrụ irite uru site na broshuọ Na-achọ?

17. N’ụzọ dị aṅaa ka broshuọ ahụ pụrụ isi baa uru n’ọtụtụ ala, n’ihi gịnịkwa?

17 Nke abụọ, broshuọ a pụrụ ịba uru n’ọtụtụ ala n’isoro ndị na-atụ egwu Chineke malite ọmụmụ Bible n’agbanyeghị otú ha gụruru n’akwụkwọ. Otú ọ dị, e kwesịrị ime mgbalị ịmalite ọmụmụ ihe n’akwụkwọ Ihe Ọmụma nke Na-eduba ná Ndụ Ebighị Ebi. Ma n’ọnọdụ ụfọdụ, ọ pụrụ ịka mfe ịmalite ọmụmụ ihe n’otu broshuọ. N’oge kwesịziri ekwesị, a pụrụ ibufe ọmụmụ ihe ahụ n’akwụkwọ Ihe Ọmụma, bụ́ enyemaka bụ isi ma ka mma maka ọmụmụ ihe. Banyere ojiji a e ji broshuọ Na-achọ eme ihe, alaka dị iche iche nke Watch Tower dere, sị: “O siri ike ịmalite ọmụmụ Bible, ohere ndị e nwekwara maka ịmalite ọmụmụ ihe yiri ka ọ na-aka mma mgbe ndị nkwusa ji otu broshuọ malite.” (Germany) “Ụdị broshuọ a ga-adị irè karịsịa n’ịmalite ọmụmụ Bible ọhụrụ, bụ́ nke a pụrụ iji gaa n’ihu site n’akwụkwọ Ihe Ọmụma.” (Itali) “Ọ bụ ezie na ndị Japan nwere ọ̀tụ̀tụ̀ dị elu nke agụmakwụkwọ, ihe ka ọtụtụ n’ime ha nwere ihe ọmụma dị nta banyere Bible na ozizi ya ndị bụ isi. Broshuọ ahụ kwesịrị ịbụ ihe mgbakwasị ụkwụ dị mma ịga n’akwụkwọ Ihe Ọmụma.”—Japan.

18. Gịnị ka anyị kwesịrị icheta banyere iru ihe Chineke na-achọ?

18 Alaka dị iche iche nke Society gburugburu ụwa chọrọ inweta broshuọ a, e nyewokwa nkwado ka a sụgharịa ya gaa n’asụsụ 221. Ka akwụkwọ ọhụrụ a bụrụ ihe bara uru n’ịkwado anyị iji nyere ndị ọzọ aka ịmụta ihe Jehova Chineke na-achọ n’aka ha. Nye anyị, ka anyị cheta na iru ihe Chineke na-achọ, gụnyere iwu e nyere ime ikwusa na ime ndị na-eso ụzọ, na-enye anyị ohere dị oké ọnụ ahịa iji gosi Jehova ókè anyị hụrụ ya n’anya. Ee, ihe Chineke na-achọ n’aka anyị abụghị ibu arọ. Ọ bụ ụzọ kasị mma isi bie ndụ!—Abụ Ọma 19:7-11.

[Ihe ndị e dere n’ala ala peeji]

a Akwụkwọ bụ́ Jehovah’s Witnesses—Proclaimers of God’s Kingdom na-ekwu, sị: “Kaseti vidio adịghị eweghara ọnọdụ nke akwụkwọ ma ọ bụ ịgba àmà onwe onye ma ọlị. Mbipụta Society anọgidewo na-arụ ọrụ dị oké mkpa n’ịgbasa ozi ọma ahụ. Ọrụ ụlọ n’ụlọ nke Ndịàmà Jehova ka bụ otu ụdị nke ozi ha dabesiri ike n’Akwụkwọ Nsọ. Otú ọ dị, kaseti vidio na-atụkwasị ihe ná ndị a dị ka ngwá ọrụ bara oké uru maka iwulite okwukwe ná nkwa ndị dị oké ọnụ ahịa nke Jehova ma na-akpali ekele maka ihe ọ na-eme ka a rụzuo n’elu ụwa n’ụbọchị anyị.”

b Maka nkọwa banyere ụzọ e si eduzi ọmụmụ ihe na broshuọ Na-achọ, lee isiokwu bụ́ “Ngwá Ọrụ Ọhụrụ Iji Nyere Ndị Mmadụ Aka Ịmụta Ihe Chineke Na-achọ,” na peji nke 16-17.

Ị̀ Pụrụ Ịkọwa?

◻ N’ọrụ dị aṅaa gbara mkpị ka Jehova chọrọ ka ndị ohu ya kere òkè na ya?

◻ N’ihi gịnị ka ibu ọrụ anyị nke ime nkwusa na ndị na-eso ụzọ ji ghara ịbụ ibu arọ nye anyị?

◻ “Ohu ahụ kwesịrị ka a tụkwasị ya obi, nke nwekwara uche” ewepụtawo ngwá ọrụ ndị dị aṅaa maka iji rụọ ọrụ anyị nke ime nkwusa na ndị na-eso ụzọ?

◻ Ole ndị ka e mere broshuọ Na-achọ maka ha, oleekwa otú anyị pụrụ isi jiri ya mee ihe n’ozi anyị?

[Foto dị na peeji nke 24]

Ọrụ anyị nke ime nkwusa na ndị na-eso ụzọ abụghị ibu arọ

[Foto ndị dị na peeji nke 26]

“Kwe Ka Chineke Buru Onye-Ezi-Okwu” (1946, nke e bipụtagharịrị na 1952): 19,246,710 n’asụsụ 54 (E gosiri nke Bekee)

“Ezi-Okwu Ahu Nke Nedubà ná Ndu Ebigh-Ebi” (1968): 107,000,000 n’asụsụ 117 (E gosiri nke French)

“Ị Pụrụ Ịdị Ndụ Ebighị Ebi n’ime Paradaịs n’Elu Ala” (1982): 80,900,000 n’asụsụ 130 (E gosiri nke Russian)

“Ihe Ọmụma nke Na-eduba ná Ndụ Ebighị Ebi” (1995): 30,500,000 n’asụsụ 119 (E gosiri nke German)

    Akwukwo Igbo (1984-2025)
    Pụọ
    Banye
    • Igbo
    • Ziga ya
    • Ịgbanwe Ihe
    • Copyright © 2025 Watch Tower Bible and Tract Society of Pennsylvania
    • Ihe Ị Ga-eme na Ihe Ị Na-agaghị Eme
    • Ihe Anyị Ji Ihe Ị Gwara Anyị Eme
    • Kpebie Ihe Ị Ga-agwa Anyị
    • JW.ORG
    • Banye
    Ziga ya