Nyere Ndị Na-enweghị Uche Aka Ịghọta
1 Site n’ọrụ ime ndị na-eso ụzọ, anyị na-akụziri ndị ọzọ ihe Chineke na-achọ n’aka ha. (Mat. 28:19, 20) Ihe gafere nde Ndịàmà ise na-etinye mgbalị dị ukwuu n’ụwa nile iji mee nke ahụ. A dịghị atụ ihe ịga nke ọma e nwere n’ihe ọ̀tụ̀tụ̀ site na hour e tinyere, akwụkwọ e tinyere, ma ọ bụ ọmụmụ Bible ndị a malitere. Anyị na-emezu ebumnobi anyị mgbe ndị mmadụ ghọtara ma jiri ihe ha mụtara mee ihe.
2 Inyere ndị ọzọ aka n’ụzọ ime mmụọ na-agụnye ‘ime ka ndị na-enweghị uche ghọta ihe.’ (Abụ Ọma 119:130) A na-emetụ obi ma na-akpali ndị mmadụ nanị mgbe ha ‘ghọtara ya.’ (Mat. 15:10) Ka ọrụ anyị na-agbasawanye ma na-esiwanye ike, anyị na-abịa ghọtakwuo mkpa ọ dị ikwu okwu na ịkụzi ihe n’ụzọ dị mfe. Ọ bụ ya mere Society jiri bipụta broshuọ bụ́ Gịnị Ka Chineke Na-achọ n’Aka Anyị? O nwere usoro ịmụ ihe zuru ezu nke na-atụlezu ozizi ndị bụ isi nke Bible. Ihe ọmụmụ ndị ahụ dị mkpirikpi, okwu ya adịghị mgbagwoju anya, ntụziaka ya dịkwa mfe ịghọta, na-eme ka broshuọ ahụ na-amasị ọtụtụ ndị.
3 A ga-enyefe broshuọ a na magazin n’ọnwa April na May. A na-atụ aro na mgbe ị na-eme atụmatụ ozi gị kwa izu, ka i mee ndokwa ịdị na-enyefe ụtụ na broshuọ ahụ n’ozi gị n’ụzọ chiri anya. Jiri broshuọ ahụ gakwuru ndị narawooro akwụkwọ n’egbughị oge n’oge gara aga. Cheta na ọ pụrụ ịba uru karịsịa n’ịkụziri ụmụaka ihe, ndị na-asụ asụsụ mba ọzọ, na ndị na-amachaghị agụ ihe.
4 Jiri Ụzọ Dị Mfe Mee Ihe: Mgbe ị na-eche broshuọ Na-achọ n’ihu, zoo aka na peji nke 2, ebe ọ na-akọwa na “a kwadebere broshuọ a dị ka usoro ọmụmụ Bible.” Rụtụ aka na paragraf nke 3 na peji nke 3 iji gosi ihe mere ịmụ Bible ji dị onye ahụ mkpa. Jiri ụfọdụ n’ime isiokwu ihe ọmụmụ ndị na-ekpughe eziokwu Bible ndị dị mfe kpalie mmasị ya. Gosi otú broshuọ a si eme ka ịmụ ihe na-atọ ụtọ, ma kwuo na ị ga-enyere ya aka n’onwe gị.
5 Duzie Ọmụmụ Bible Na-aga n’Ihu: Ihe mgbaru ọsọ anyị abụghị nanị iduzi ọmụmụ ihe—anyị chọrọ ime ndị na-eso ụzọ ndị ga-abụ ndị nkwado siri ike nke ezi ofufe. A pụrụ ịmụzu broshuọ ahụ nanị n’ime izu ole na ole, o kwesịkwara iduga kpọmkwem n’ọmụmụ nke akwụkwọ Ihe Ọmụma. (Lee nkọwa ala ala peji na peji nke 31.) Site nnọọ ná mmalite, nyere onye ahụ a na-amụrụ ihe aka ịmata nzukọ Jehova. (Lee akwụkwọ Reasoning, peji nke 283-284.) Mesie uru nke nzukọ ọgbakọ ike, kọwaakwa na ịga ha na-enye nghọta zuru ezu banyere ụzọ isi na-efe ezi ofufe.—Hib. 10:24, 25.
6 Ikere òkè zuru ezu n’ọrụ a pụrụ iche n’April na May ga-ewetara anyị n’ezie ọṅụ nke na-abịa site n’inyere ndị nwere obi eziokwu aka ‘inweta nghọta’ nke na-eduga ná ndụ.—Ilu 4:5.