Krismas Ụbọchị Ezumike Ụwa Ka Ọ̀ Bụ Ụbọchị Dị Nsọ nke Okpukpe?
NA China, a na-akpọ ya Agadi Nwoke Krismas. Na United Kingdom, a maara ya dị ka Fada Krismas. Ndị nọ na Russia na-eji aha ahụ bụ́ Nna Nna Frost eme ihe, na United States kwa, a na-akpọ ya Santa Claus.
Ọtụtụ na-ele agadi nwoke a na-aṅụrị ọṅụ nwere afọ ukwu na afụ ọnụ na-acha ka snow anya dị ka Krismas n’onwe ya kpọmkwem. Ma ọ bụkwa ihe a ma nke ọma na Santa Claus bụ akụkọ ọdịbendị na-emeghị eme, akụkọ mgbe ochie dabeere n’ọdịnala e jikọrọ ya na otu bishọp nke narị afọ nke anọ nke Maịra (na Turkey nke oge a).
Omenala na ọdịnala enwewo mgbe nile mmetụta dị ike n’ebe ememe dị iche iche dị, Krismas adịghịkwa iche. Akụkọ ọdịbendị na-emeghị eme nke Santa bụ nnọọ otu ihe atụ nke ọdịnala e kekọrọ ya na otu ụbọchị ezumike a ma ama. Ọ bụ ezie na ụfọdụ ndị mmadụ na-azọrọ na omenala dị iche iche nke Krismas dabeere n’ihe omume ndị e dekọrọ n’ime Bible, n’eziokwu ihe ka n’ọtụtụ n’ime omenala ndị a malitere n’aka ndị na-ekpere arụsị.
Ihe atụ ọzọ bụ osisi Krismas. The New Encyclopædia Britannica na-asị: “Ife osisi ofufe, nke a ma ama n’etiti ndị Europe na-ekpere arụsị, lanarịrị ka a tọghatasịrị ha gaa n’Iso Ụzọ Kraịst n’omenala Scandinavia nke iji osisi na-adịghị ama ọkọchị na-achọ ụlọ na ọbá mma n’Afọ Ọhụrụ iji chụpụ ekwensu na nke ido osisi maka nnụnụ n’oge Krismas.”
Iji akwụkwọ holly ma ọ bụ akwụkwọ ndị ọzọ na-adịghị ama ọkọchị akpa ihe a na-anya n’olu bụ ọdịnala ọzọ a ma ama nke Krismas. Nke a kwa gbanyesiri mkpọrọgwụ ike n’ofufe ikpere arụsị. Ndị Rom oge ochie na-eji alaka osisi holly achọ ụlọ nsọ mma n’oge Saturnalia, ememe etiti oge oyi na-ewe ụbọchị asaa nke e doro iche maka Saturn, chi nke ọrụ ubi. E jiri oriri oké mkpọtụ na omume mere ihe masịrị gị a na-akparaghị ókè mara ememe ikpere arụsị nke a karịsịa.
Omenala Krismas nke isusu ọnụ n’okpuru ome mistletoe (nke e gosiri n’ebe a) pụrụ iyi ihe na-egosi ịhụnanya nye ụfọdụ ndị, ma ọ bụ ịlaghachi azụ gaa ná Mgbe Ụwa Na-emepechabeghị Anya. Ndị Druid nke Britain oge ochie kweere na mistletoe nwere ike majik; n’ihi ya, e ji ya mee ihe dị ka nchebe megide ndị mmụọ ọjọọ, ịkọ ọgwụ, na ụdị ihe ọjọọ ndị ọzọ. Ka oge na-aga, nkwenkwe ụgha bilitere na isusu ọnụ n’okpuru mistletoe ga-eduga n’alụmdi na nwunye. Omume a ka bụ nke a ma ama n’etiti ụfọdụ ndị mmadụ n’oge Krismas.
Ndị a bụ nanị ole na ole n’ime ọdịnala dị iche iche nke Krismas oge a nke ozizi ndị na-ekpere arụsị metụtaworo ma ọ bụ nke si na ya pụta kpọmkwem. Otú ọ dị, ị pụrụ iche banyere otú ihe a nile si bịa. Olee otú ụbọchị ezumike yiri nke na-asọpụrụ ọmụmụ Kraịst na omenala ndị na-abụghị ndị Kraịst siri kekọọ nnọọ onwe ha? Nke ka mkpa, olee otú Chineke si ele okwu ahụ anya?
[Ebe E Si Nweta Foto Ndi Dị na peeji 2]
Peji nke 3: Santa Claus: Thomas Nast/Dover Publications, Inc., 1978; mistletoe na peji nke 3 na nkọwa dị na peji nke 4: Discovering Christmas Customs and Folklore nke Margaret Baker dere, nke Shire Publications bipụtara, 1994