Iguzo n’Ọnụ Ụzọ nke Ọrụ Ka Ukwuu
“E NWEGHỊ mmụọ ịsọ mpi. Onye ọ bụla chọrọ ka ihe gaara ibe ya nke ọma,” ka Richard na Lusia kwuru, ka ha na-akọwa ụmụ akwụkwọ ibe ha nke klas nke 105 nke Watchtower Bible School of Gilead. “Anyị nile dịgasị nnọọ iche, ma nye anyị, nwa akwụkwọ ọ bụla dị oké ọnụ ahịa.” Onye ha na ya nọ na klas, bụ́ Lowell, kwetara, na-agbakwụnye, sị: “Ndịrịta iche anyị adọtawo anyị n’ebe ibe anyị nọ.”
Klas ahụ, bụ́ nke gụsịrị akwụkwọ na September 12, 1998, dịrịtara iche n’ezie. Ụfọdụ n’ime ụmụ akwụkwọ ahụ asụwo ụzọ n’ebe ndị e nwere mkpa dị ukwuu maka ndị nkwusa Alaeze; ndị ọzọ ejiwo ikwesị ntụkwasị obi jee ozi n’ebe ndị dị nso n’ebe obibi ha. Ole na ole, dị ka Mats na Rose-Marie, aghaghị ịrụsi ọrụ ike ogologo oge iji mee ka asụsụ Bekee ha ka mma tupu ha bịa ụlọ akwụkwọ. Ọtụtụ n’ime ụmụ akwụkwọ ahụ anọwo na-eche banyere ozi ala ọzọ kemgbe ha bụ ụmụaka. Otu di na nwunye tinyere akwụkwọ ugboro 12; lee obi ụtọ ha nwere ịnata ọkpụkpọ òkù ịbịa klas nke 105!
Izu 20 nke ọzụzụ kpụ ọkụ n’ọnụ ahụ gabigara nnọọ ngwa ngwa. Tupu ụmụ akwụkwọ ahụ amara ihe na-emenụ, ha ewebatala ihe omume ikpeazụ ha dere ede, ha enyewo akụkọ ikpeazụ ha kwuru n’ọnụ, ụbọchị ngụsị akwụkwọ eruwokwa.
Onyeisi oche nke usoro ihe omume ahụ, bụ́ Albert Schroeder, bụ́ onye so n’Òtù Na-achị Isi nke Ndịàmà Jehova, chetaara klas ahụ na ha “na-eguzo n’ọnụ ụzọ nke ọrụ ka ukwuu n’ubi nke mmụta Bible,” na-esonyere ihe karịrị 7,000 ndị ọzọ bụ́ ndị bu ha ụzọ gaa Gilead. O kwuru na n’oge okpomọkụ ahụ, ụmụ akwụkwọ ahụ enwewo ohere pụrụ iche nke isoro ndị nọworo ogologo oge n’ozi ala ọzọ kpakọrịta mgbe ndị a letara isi ụlọ ọrụ ụwa nile n’oge mgbakọ mba nile ndị e nwere.
Nwanna Schroeder kpọpụtaziri Max Larson nke Kọmitii Ịrụ Ọrụ Betel. O kwuru okwu n’isiokwu bụ́ “Agụmakwụkwọ nke Na-eduga ná Ndụ Ebighị Ebi.” Nwanna Larson hotara Ilu 1:5, bụ́ nke na-ekwu, sị: “Ka onye maara ihe wee nụ, wee tụkwasị ihe mmụta n’amamihe ya; ka onye nghọta wee nwetakwa ezi ndụmọdụ.” Nkà dị mkpa iji bụrụ onye ozi ala ọzọ dị irè. Ndị ikom nwere nkà na-eguzo n’ihu ndị eze. (Ilu 22:29) Mgbe e nyesịworo ha ntụziaka ruo ọnwa ise, ụmụ akwụkwọ ahụ bụ ndị a kwadebere nke ọma ịnọchite anya Ndị Eze kasịnụ, bụ́ Jehova Chineke na Kraịst Jisọs.
David Olson nke Ngalaba Ije Ozi bụ onye ọzọ kwuru okwu n’isiokwu bụ́ “Nye Aka Ime Ka Obi Jehova Ṅụrịa.” Ọ jụrụ, sị: “Gịnị ka ụmụ mmadụ na-ezughị okè pụrụ ime iji mee ka obi Chineke ṅụrịa?” Gịnị bụ azịza ya? Ha pụrụ ijere ya ozi n’ikwesị ntụkwasị obi, n’iguzosi ike n’ihe, nakwa n’ọṅụ. Jehova chọrọ ka ndị ya nwee ọṅụ n’ozi ha na-ejere ya. Mgbe anyị ji ọṅụ na-eme uche Chineke, anyị na-eme ka obi ya ṅụrịa. (Ilu 27:11) Nwanna Olson gụrụ otu akwụkwọ ozi sitere n’aka otu di na nwunye bụ́ ndị ozi ala ọzọ gụsịrị akwụkwọ na Gilead na klas nke 104. Hà na-enweta ọṅụ n’ọrụ ọhụrụ e kenyere ha? “Anyị nwere ihe dị ka ndị nkwusa 140,” ka ha dere banyere ọgbakọ ha, “na-enwe nkezi nke 250 ruo 300 nke ndị na-abịa nzukọ. Ozi ubi bụ akụkụ kasị mma. Onye ọ bụla n’ime anyị nwere mmadụ anọ ọ na-eduziri ọmụmụ ihe, ụfọdụ amalitelarị ịbịa nzukọ.”
Lyman Swingle, bụ́ onye so n’Òtù Na-achị Isi, kwuru okwu n’isiokwu bụ́ “Oge Ịkwụsịtụ Ma Gụkọọ Ngọzi Unu.” Ọzụzụ Gilead ewetawo ọtụtụ ngọzi. O nyeworo ụmụ akwụkwọ ahụ aka ịmụba ihe ọmụma ha, ime ka ekele ha nwere banyere nzukọ Jehova rịa elu, na ịzụlite àgwà ndị dị mkpa, dị ka ịdị umeala n’obi. “Ọ bụ ahụmahụ na-eme ka mmadụ nwee obi umeala bụ́ ịbịa ebe a ma tinye oge na-aṅa ntị ná ntụziaka,” ka Nwanna Swingle kwuru, na-agbakwụnye, sị: “Unu na-ahapụ ebe a na-abụ ndị a kwadebere nnọọ n’ụzọ ka mma ibuli Jehova elu.”
“Lee Otú Ọṅụ Unu Si Dị Ukwuu—Ya Mere n’Ihi Gịnị Ka Unu Ga-eji Na-enwe Nchegbu?” bụ isiokwu nke okwu Daniel Sydlik, bụ́kwa onye so n’Òtù Na-achị Isi, kwuru. Mgbe nsogbu bilitere, chọọ nduzi site n’Akwụkwọ Nsọ, ka ọ gbara ume. N’iji amaokwu ndị a họtara n’isi nke 6 nke Matiu mee ihe, Nwanna Sydlik nyere ihe atụ otú a pụru isi mee nke a. Enweghị okwukwe pụrụ ime ka anyị na-enwe nchegbu banyere ihe ụwa, ndị dị ka nri na uwe. Otú ọ dị, Jehova maara ihe dị anyị mkpa. (Matiu 6:25, 30) Inwe nchegbu bụ nanị ihe ka ọ ga-atụkwasị ná nsogbu ndị ụbọchị ọ bụla na-eweta. (Matiu 6:34) N’aka nke ọzọ, ime atụmatụ ụfọdụ dị mkpa. (Tụlee Luk 14:28.) “Ihe Jisọs na-amachibido iwu abụghị echiche amamihe dị na ya maka ọdịnihu, kama nchegbu amamihe na-adịghị na ha banyere ya,” ka Nwanna Sydlik kọwara. “Ime ihe bụ otu n’ime ngwọta ndị kasị mma maka nchegbu. Mgbe anyị na-enwe nchegbu, ọ dị mma anyị ịmalite ikwu banyere eziokwu ahụ.”
Ndụmọdụ Gaa nke Ọma Sitere n’Aka Ndị Nkụzi
Okwu mmadụ atọ so ná ndị nkụzi Gilead kwuru, sochiri. Karl Adams bu ụzọ kwuo okwu, n’isiokwu bụ́ “Gịnị Ka Unu Ga-akwụghachi Jehova?” Okwu ya dabeere n’Abụ Ọma nke 116, bụ́ nke Jisọs pụrụ ịbụworịị n’abụ n’abalị ahụ tupu ọnwụ ya. (Matiu 26:30, ntụaka ala ala peji nke NW.) Gịnị batara Jisọs n’uche ka ọ na-abụ okwu ndị ahụ bụ́: “M̀ ga-esi aṅaa nyeghachi Jehova mmeso ọma Ya nile O mesoworo m”? (Abụ Ọma 116:12) Ọ pụrụ ịnọwo na-atụgharị uche n’ahụ zuru okè nke Jehova kwadebewooro ya. (Ndị Hibru 10:5) N’echi ya, ọ ga-enyefe ahụ ahụ n’àjà, na-egosipụta imi emi nke ịhụnanya ya. Ụmụ akwụkwọ klas nke 105 ahụ edetụwo ịdị mma Jehova ire ruo ọnwa ise gara aga. Ugbu a ha ga-egosipụta ịhụnanya ha n’ebe Chineke nọ site n’ịrụsi ọrụ ike n’ọrụ ozi ala ọzọ ha.
Mark Noumair, bụ́ onye nkụzi Gilead nke abụọ kwuru okwu, dụrụ ụmụ akwụkwọ ahụ ọdụ ka ha “Nọgide Na-eme Ihe Ziri Ezi.” Josef, mgbe e resịrị ya dị ka ohu n’Ijipt, tachiri obi ruo afọ 13 nke mmeso ọjọọ. Ò kwere ka emezighị emezi nke ndị ọzọ kwụsị ya ijere Chineke ozi? Ee e, ọ nọgidere na-eme ihe ziri ezi. Mgbe ahụ, n’oge Chineke kara aka, a gbapụtara Josef n’ọnwụnwa ya nile. Na mberede, o si n’ibi n’ụlọ mkpọrọ gaa n’ibi n’obí eze. (Jenesis, isi nke 37-50) Onye nkụzi ahụ jụrụ ụmụ akwụkwọ ya, sị: “Ọ bụrụ na e mezughị ihe unu tụrụ anya ya n’ọrụ ozi ala ọzọ unu, ùnu ga-akwụsị? Ùnu ga-enwe obi nkoropụ? Ka ùnu ga-atachi obi, dị ka Josef tachiri?”
N’ikpeazụ, onye na-edebanye aha nke Ụlọ Akwụkwọ Gilead, bụ́ Wallace Liverance, duziri nkwurịta okwu kporo ọkụ o so ndị klas ahụ kwurịta n’isiokwu bụ́ “Kpọsaanụ Eze ahụ na Alaeze Ya.” Ụfọdụ n’ime ụmụ akwụkwọ ahụ kọrọ ahụmahụ ndị ha nwere ka ha na-eme nkwusa site n’ụlọ ruo n’ụlọ, site n’ụlọ ahịa ruo n’ụlọ ahịa, nakwa n’okporo ámá. Ndị ọzọ kọrọ otú ha si gbaara ndị na-asụ asụsụ ọzọ àmà. Ndị ọzọkwa gosiri otú e si agbara ndị nwere nzụlite okpukpe dị iche iche àmà. Ndị ahụ nile na-agụsị akwụkwọ nwere oké mmasị ikere òkè zuru ezu n’ozi n’ubi nke ozi ala ọzọ.
Ndị Nọworo Ọdụ n’Ozi Ala Ọzọ Bụ́ Ndị Nwere Obi Ụtọ
Akụkụ nke na-esochinụ, nke isiokwu ya bụ “Ihe Ọṅụ Ndị Na-esi n’Ozi Ala Ọzọ Apụta,” bụ nke Robert Wallen kwuru, o nwekwara ịgba ajụjụ ọnụ a gbara ụmụnna anọ ndị na-arụ ọrụ n’isi ụlọ ọrụ bụ́ ndị so ndị ozi ala ọzọ nwere ahụmahụ nwee mkpakọrịta na-ewuli elu na nso nso a. Ndị ozi ala ọzọ ahụ kwetara ngwa ngwa na ọ dịghịrị ha mfe ịmụta asụsụ ọhụrụ, ikwekọ n’ọdịbendị ọzọ, ma ọ bụ ime mgbanwe gaa n’ihu igwe dị iche. Mgbe ahụ e nwere ihe mgbu nke agụụ ụlọ ndị a ga-anagide. Mgbe ụfọdụ, nsogbu ahụ ike bilitere. Ma n’ime ihe ahụ nile, ndị ozi ala ọzọ ahụ nọgidere na-enwe àgwà ziri ezi, a gọzikwara nnọgidesi ike ha. Ụfọdụ edugawo ọtụtụ mmadụ gaa n’ihe ọmụma nke Jehova. Ndị ọzọ atụnyewo ụtụ n’ụzọ dị iche iche ná mmụba nile nke ọrụ Alaeze n’ala ha.
Onye ikpeazụ kwuru okwu bụ Carey Barber, bụ́ onye so n’Òtù Na-achị Isi. Ọ tụleghachiri isi ihe ndị dị n’usoro ihe omume mgbakọ “Ụzọ Ndụ nke Chineke.” “Mmetụta dị aṅaa ka usoro ihe omume mgbakọ ahụ nwere ná mkpakọrịta unu na Jehova?” ka ọ jụrụ ndị na-ege ya ntị. Ọkà okwu ahụ gosiri ọdịiche dị ná ngọzi ndị na-esite n’ịgbaso ụzọ Chineke na njedebe na-eweta ọdachi nke dịịrị ndị na-agbaso ụzọ nke ụwa. N’izo aka ná njehie Mosis jehiere na Meriba, ọ dọrọ aka ná ntị, sị: “Ọbụna mgbe mmadụ jeworo ozi n’ikwesị ntụkwasị obi ruo ọtụtụ afọ, Jehova adịghị eleghara ọbụna obere mmebi nke iwu Ya ndị ziri ezi anya.” (Ọnụ Ọgụgụ 20:2-13) Ka ndị ohu Chineke n’ebe nile jigidesie ihe ùgwù ije ozi ha ndị dị oké ọnụ ahịa ike!
Oge eruwo ka ụmụ akwụkwọ ahụ nata diplọma ha. Mgbe nke ahụ gasịrị, onye nnọchiteanya klas gụrụ akwụkwọ ozi ekele maka ọzụzụ ahụ ụmụ akwụkwọ ahụ nataworo. Mgbe a bụsịrị abụ mmechi na ekpere si n’obi, usoro ihe omume ngụsị akwụkwọ ahụ jedebere. Ma, nye klas nke 105 ahụ, nke a bụ nanị mmalite, n’ihi na ndị ozi ala ọzọ ọhụrụ ahụ “na-eguzo n’ọnụ ụzọ nke ọrụ ka ukwuu.”
[Igbe dị na peeji nke 23]
Ndekọ Ọnụ Ọgụgụ Klas
Ọnụ ọgụgụ mba ha si bịa: 9
Ọnụ ọgụgụ mba e zijere ha: 17
Ọnụ ọgụgụ ụmụ akwụkwọ: 48
Ọnụ ọgụgụ ndị di na nwunye: 24
Nkezi afọ ndụ: 33
Nkezi afọ ha nọworo n’eziokwu: 16
Nkezi afọ ha nọworo n’ozi oge nile: 12
[Igbe dị na peeji nke 24]
Ha Họọrọ Ozi Oge Nile
“Mgbe m dị obere, enweghị m atụmatụ ọ bụla ịsụ ụzọ,” ka Ben, bụ́ onye gụsịrị akwụkwọ na klas nke 105 na-ekwu. “Echere m na ọ bụ nanị ndị nwere ikike pụrụ iche na ọnọdụ ndị dị mma pụrụ ịsụ ụzọ,” ka ọ na-agbakwụnye. “Ma amụtara m ịhụ ozi ubi n’anya. Mgbe ahụ otu ụbọchị o doro m anya na ịbụ ọsụ ụzọ pụtara nanị ikere òkè ka ukwuu n’ozi. Ọ bụ mgbe ahụ ka m ghọtara na m pụrụ ịsụ ụzọ.”
“A na-akwanyekarịrị nnọọ ndị na-eje ozi oge nile ùgwù n’ebe obibi anyị,” ka Lusia na-akọ. Ọ na-echeta mkpali dị ukwuu nke na-ejupụta n’ọgbakọ ya mgbe ọ bụla ndị ozi ala ọzọ bịara nleta. “Mgbe m nọ na-etolite,” ka ọ na-ekwu, “o doro anya na ozi oge nile ga-adị n’atụmatụ m.”
Nne Theodis nwụrụ mgbe ọ dị afọ 15. “N’oge ahụ, ọgbakọ nyere m nnọọ nkwado,” ka ọ na-ekwu, “ya mere ajụrụ m onwe m, sị, ‘Gịnị ka m pụrụ ime iji gosipụta ekele m?’” Nke a dugara ya ịbanye ozi oge nile, ugbu a kwa ọrụ ozi ala ọzọ.
[Foto dị na peeji nke 25]
Klas nke 105 Na-agụsị Akwụkwọ nke Watchtower Bible School of Gilead
Ná ndepụta dị n’okpuru, e nyere ahịrị ndị ahụ nọmba site n’ihu gaa n’azụ, e depụtakwara aha ha site n’aka ekpe gaa n’aka nri n’ahịrị nke ọ bụla
(1) Sampson, M.; Brown, I.; Heggli, G.; Abuyen, E.; Desbois, M.; Pourthié, P. (2) Kassam, G.; Lindberg, R.; Dapuzzo, A.; Taylor, C.; LeFevre, K.; Walker, S. (3) Baker, L.; Pellas, M.; Woggon, E.; Böhne, C.; Asplund, J.; Haile, J. (4) Pourthié, T.; Whittaker, J.; Palmer, L.; Norton, S.; Gering, M.; Haile, W. (5) Walker, J.; Böhne, A.; Groenveld, C.; Washington, M.; Whittaker, D.; Abuyen, J. (6) Gering, W.; Washington, K.; Pellas, M.; Desbois, R.; Heggli, T.; Asplund, Å. (7) Woggon, B.; LeFevre, R.; Taylor, L.; Brown, T.; Groenveld, R.; Palmer, R. (8) Norton, P.; Sampson, T.; Baker, C.; Lindberg, M.; Kassam, M.; Dapuzzo, M.