A Pụrụ Ịkwụsị Imebisị Ihe
“A NỌWO na-ele imebisị ihe nke ndị nọ n’afọ iri na ụma na-eme anya dị ka ngosipụta nke akwanyeghịrị ndị meworo okenye na ụkpụrụ ha ùgwù na ibu iro megide ha,” ka ndị na-ede akwụkwọ bụ́ Jane Norman na Myron W. Harris, na-akọwa. Ọ bụ ezie na ọtụtụ ndị ntorobịa kweere na ọ dịghị ihe ọ bụla a pụrụ ime iji gbanwee ọnọdụ ahụ, “otu ụzọ n’ụzọ 3 na-eche na a pụrụ igbochi imebisị ihe nke ndị nọ n’afọ iri na ụma na-eme ma ọ bụrụ na ndị nne na nna elebara ụmụ ha anya karị, ma ọ bụrụkwa na ndị nọ n’afọ iri na ụma abụghị ndị onwe ha na-atụ ọ̀bọ̀,” ka ndị ahụ na-ede akwụkwọ kwuru. Ọ bụ ezie na inye ndị na-eto eto ọrụ nakwa ndị nne na nna ịchịkwa ha n’ụzọ ka mma pụrụ ibelata imebisị ihe, nke ahụ n’onwe ya ọ̀ ga-ebelata isi ihe ndị na-akpata ya?
Ọtụtụ ndị na-eto eto adịghị enye nsogbu ma nanị ha nọrọ, ma mgbe ha nọ n’ìgwè ma ọ bụ mgbe ha na mmadụ nọ, ha pụrụ ịnwa ime ka a hụ ha, na-eme ihe nzuzu na ihe ndị na-adịghị mma. Nke ahụ bụ ihe mere Nelson, bụ́ onye gosipụtara iwe na enweghị afọ ojuju ya mgbe mgbe site n’omume imebisị ihe, mgbe ọgwụ ọjọọ ma ọ bụ mmanya na-egbu ya. José, n’ịbụ onye okwuchukwu ndị e kwuru na Chọọchị Katọlik banyere ike ala na ikike onye ọrụ nwere, kpaliri, chere na ya kwesịrị ikere òkè n’ịgba abụbọ ọrụ na imebisị ihe a haziri ahazi dị ka ụzọ isi mee mkpesa. Otú ọ dị, ma Nelson ma José chọtara ihe ka nnọọ ịkpa aghara ma ọ bụ imebisị ihe mma.
Ụfọdụ Ihe Ndị Siri Ike Na-akpata Imebisị Ihe
Ka anyị nyochatụkwuo ihe mere ụfọdụ ndị na-eto eto ji etinye aka n’imebisị ihe. Ọtụtụ ndị nọ n’oge uto na-enwe mgbagwoju anya ma “na-akọwa ụwa dị ka ebe dị mgbagwoju anya, ara na-agba, nke ndị ara jupụtara.” Ka o sina dị, n’ụzọ dịkwa iche n’ihe ụfọdụ ndị kweere, otu akụkọ kwuru, sị: “Ndị nọ n’afọ iri na ụma na-enwe nchegbu banyere ebe ndụ ha na-eche ihu. Ha na-enwe nchegbu karịa otú ndị toro eto chere na ha na-enwe.” Ma ọ̀ maara ma ọ bụ na ọ maghị, onye ntorobịa nke na-emebisị ihe pụrụ isi otú a na-egosipụta oké obi nkoropụ ya, nsogbu ndị ọ na-edozighị, ma ọ bụ mkpa ndị ọ na-egboghị. Dị ka nnyocha ahụ e hotara ná mmalite si kwuo, “ọ dịghị onye n’ime ndị [ahụ] zaghachirinụ nke gbachiteere imebisị ihe ma ọ bụ kwuo na o ziri ezi, ọbụnadị ndị ahụ tinye[woro] aka na ya.”
Onye ntorobịa pụrụ ịbụ onye a na-adịghị agwakebe okwu ekele ma ọ bụ agbamume. Ebe ọ bụ na ịdị mkpa nke agụmakwụkwọ na-arịwanye elu, ọtụtụ ọrụ na-achọkwa inwe ọ̀tụ̀tụ̀ dị elu nke ihe ọmụma ma ọ bụ nkà pụrụ iche, ọ pụrụ inwe mmetụta nke ịbụ onye e menyere ụjọ. Ọzọkwa, nne na nna, ndị nkụzi, ma ọ bụ ndị ọgbọ ya pụrụ ịbụ ndị na-eme oké nkatọ ma na-achọ ihe dị ukwuu n’aka onye ntorobịa ahụ, na-elekwasịkarị anya n’ihe onye ntorobịa ahụ rụzuru kama ịbụ n’ihe ọ bụ dị ka mmadụ. Ọtụtụ ndị na-enupụ isi ma ọ bụ na-emebisị ihe nanị n’ihi na onwe ha ejughị ha afọ. Ịhụnanya na nlekọta nke ndị nne na nna ọ́ gaghị ebelata nsogbu dị otú ahụ n’ụzọ dị ukwuu?
I nwere ike ịhụwo na ọ bụ ezie na o yiri ka ndị ọchịchị ụfọdụ akwụsịwo mgbalị ha na-eme iji chịkwaa idekasị ihe n’ahụ ájá na ụdị nnupụisi ndị ọzọ, ndị o metụtara n’ozuzu ha ka na-elegara ndị nkụzi na ndị ọrụ ụlọ akwụkwọ anya ịchịkwa imebisị ihe. Banyere ịhụ na e debere iwu, akwụkwọ bụ́ The World Book Encyclopedia na-ekwu, sị: “Ntaramahụhụ a na-enye maka mmebisị ihe bụ iri nhá ma ọ bụ ịtụ mkpọrọ. Ọchịchị ime obodo ụfọdụ nwere iwu ndị na-eme ka ihe ụmụ mebiri dịkwasị n’isi nne na nna ha. Ma a dịghị enye ntaramahụhụ maka ọnụ ọgụgụ ka ukwuu nke omume imebisị ihe. O siri ike ịhụ na e debere iwu n’ọnọdụ ndị dị otú ahụ, ihe ọnụ ọgụgụ ka ukwuu nke omume imebisị ihe na-efu erughịkwa ihe a ga-eji maka ya gbaa akwụkwọ n’ụlọikpe.” Otu akụkọ gosiri na ọ bụ nanị pasent 3 nke ndị dara iwu a ka e jidetụworo.
Ma eleghị anya ị pụrụ ikweta na ịzụ ụmụaka nke ọma pụrụ ịbụ ụzọ kasị mma isi merie isi ihe na-akpata nnupụisi. Ma mgbe ndụ ezinụlọ dakpọrọ, ógbè dị iche iche na-ahụsi anya. Prọfesọ Ana Luisa Vieira de Mattos, nke Mahadum São Paulo, Brazil, na-ekwu na ụfọdụ n’ime ihe ndị na-akpata nsogbu ndị a na-enwe n’ebe ndị na-eto eto nọ bụ “enwekebeghị nlekọta nke ndị nne na nna, enweghị ụkpụrụ nduzi, enweghị nkwurịta okwu, nleghara anya, na enweghị mmasị.”
N’oge anyị, anyị ahụwo n’ezie mmezu nke okwu Jisọs bụ́: “N’ihi na ihe na-emebi iwu ga-aba ụba, ịhụnanya nke ndị ka n’etiti mmadụ ga-ajụkwa oyi.” (Matiu 24:12) Ònye ga-agọnahụkwa na okwu ndị ahụ e dekọrọ na 2 Timoti 3:1-4 na-emezu? Pọl onyeozi dere, sị: “Mara nke a, na oge dị oké egwu ga-abịa na mgbe ikpeazụ. N’ihi na mmadụ ga-abụ ndị na-ahụ nanị onwe ha n’anya, ndị na-ahụ ego n’anya, ndị na-anya isi, ndị mpako, ndị nkwulu, ndị na-ekwenyeghị ndị mụrụ ha, ndị na-enweghị ekele, ndị na-adịghị ọcha n’obi, ndị ihe mmadụ ibe ha na-adịghị atọ ụtọ, ndị na-adịghị agba ndụ, ndị na-ebo ebubo ụgha, ndị na-adịghị ejide onwe ha, ndị dị ka anụ ọhịa, ndị na-adịghị ahụ ezi ihe n’anya, ndị na-arara mmadụ nye n’aka ndị iro ha, ndị isi ike, ndị a fuliworo elu, ndị na-ahụ ihe ụtọ n’anya kama ịhụ Chineke n’anya.” Nke bụ eziokwu bụ na nanị ibi n’etiti ndị nwere àgwà ndị dị otú ahụ na-atụnye ụtụ ná nnupụisi. Otú ọ dị, ike ekwesịghị ịgwụ anyị. Ógbè dị iche iche n’ozuzu ha adawo n’ịkwụsị imebisị ihe, ma anyị pụrụ ịhụ ndị nweworo ihe ịga nke ọma n’ịgbanwe ụzọ ndụ nke ha, gharazie ịbụ ndị na-akpa àgwà ọjọọ ma ọ bụ ndị na-ejighị ihe akpọrọ ihe. A kwụsịla imebisị ihe n’akụkụ nke ha.
Nduzi Dị Mma Maka Ndị Na-eto Eto
Gịnị nyewooro ndị na-emebisị ihe na ndị ọzọ aka ịgbanwe àgwà ha? Ọ bụ ezie na ọ pụrụ iyi ihe siiri ụfọdụ ndị nkụzi na ndị nne na nna ike ikweta, Bible na-enye nduzi magburu onwe ya nke kwesịkwara oge. Site n’ịgbaso ya, a kpaliwo ndị bụbu ndị na-emebisị ihe irube isi n’iwu Chineke a kapịrị ọnụ, bụ́: “Esola ọtụtụ mmadụ n’azụ baa n’ihe ọjọọ dị iche iche.” (Ọpụpụ 23:2) A dọtawo ọtụtụ ndị n’eziokwu sitere n’Okwu Chineke banyere nkwenkwe na ozizi ndị ha na-aghọtabughị ma ọlị, ihe ha mụtaworo emetụtawokwa ha n’ụzọ ka mma. Tụlee ahụmahụ José, bụ́ onye ntorobịa nọ na São Paulo. A zụlitere ya ikwere n’iji ihe oyiyi eme ihe n’ofufe. Mgbe ọ mụtara na Chineke nwere aha, bụ́ Jehova, nakwa na Ọ dịghị anakwere ife ihe oyiyi ofufe, José mere mgbanwe iji mee ihe na-atọ Chineke ụtọ.—Ọpụpụ 20:4, 5; Abụ Ọma 83:18; 1 Jọn 5:21; Mkpughe 4:11.
Nelson, kama ịnọ na-enwe ahụmahụ na-ekoropụ obi mgbe nile n’òtù na-eme ihe ike nakwa n’abụbọ ọrụ, ọ chọtara ezi olileanya maka ọdịnihu, nke ahụ enyewokwa ya ahụ efe dị ukwuu. Ọ na-ekwu, sị: “Kama ịbụ onye ezinụlọ m jụrụ n’ihi mkpakọrịta ọjọọ na ibi ndụ onye ọgwụ ọjọọ riri ahụ, abụzi m onye a kasị akwanyere ùgwù n’ụlọ anyị. Nna m na-agwa m mgbe mgbe ka m nye ụmụnne m ndị nwoke tọrọ m ndụmọdụ. Kemgbe m malitere iso Ndịàmà Jehova na-amụ Bible, enwewo m ọṅụ n’ihi na enweziri m nzube ná ndụ.” Nyekwa onye ntorobịa a zụlitere n’obodo mepere emepe dị ka Marco—onye ibi n’ebe a na-eme ihe ike maara ahụ—ịmara na Alaeze Chineke ga-eme ka ụwa ghọọ paradaịs abụrụwo ihe na-enye obi ụtọ n’ezie.—Mkpughe 21:3, 4.
Tụleekwa ihe banyere otu onye bụbu onye òtù ndị omempụ, onye na-alụ ọgụ okporo ámá, na onye na-emebisị ihe. N’ịbụ nwa mgbei nke hụsiri nnọọ anya n’oge ọ bụ nwata, ọ masịrị Valter na Chineke nwere ndị nke ya n’etiti ajọ usoro ihe rụrụ arụ. Ha ji ezi obi na-agbalịsi ike itinye ụkpụrụ Bible n’ọrụ ná ndụ ha, na-egosi ọmịiko, nchebara echiche, na obiọma. Valter na-akọwa, sị: “Ná mmezu nke nkwa Jisọs, enwere m nnukwu ezinụlọ ugbu a, ‘ụmụnne ndị ikom na ụmụnne ndị inyom na nne na nna.’ Banyere ọdịnihu, ana m elepụ anya n’ihu n’oge mgbe ụmụ mmadụ ga-ebi n’obi ụtọ na n’ịdị n’otu n’okpuru ọchịchị ezi omume nke Chineke.”—Mak 10:29, 30; Abụ Ọma 37:10, 11, 29.
Ihe Dị Mma Karịa Mkpesa
Tụkwasị n’igosi nchebara echiche na ịhụnanya n’ebe mmadụ ibe ha nọ, ndị a bụbu ndị na-emebisị ihe amụtala ‘ịkpọ ihe ọjọọ asị.’ (Abụ Ọma 97:10; Matiu 7:12) Olee banyere gị? Ọ bụrụgodị na ị bụ nnọọ onye imebisị ihe nke zuru ebe nile na-emetụta, ịmụ Okwu Chineke ga-eme ka Jehova bụrụ onye dị adị n’ezie nye gị dị ka Nna nke eluigwe na-ahụ n’anya bụ́ onye chọrọ ilekọta gị. (1 Pita 5:6, 7) Chineke pụrụ inyere gị aka ito eto n’ụzọ ime mmụọ, n’agbanyeghị adịghị ike onwe onye dị iche iche ma ọ bụ ịda ogbenye. Nke ahụ n’onwe ya bụ ahụmahụ magburu onwe ya!
N’ezie, Jehova na Ọkpara ya, bụ́ Jisọs Kraịst, chọrọ ka ụdị mmadụ nile nwee ohere nke ịmụta eziokwu Bible. Okwu Chineke pụrụ ime ihe karịrị inyere ndị mmadụ n’otu n’otu aka ịkwụsị ịbụ ndị na-emebisị ihe ugbu a. Ọ pụrụ ịkwali ha inwekwu ọganihu n’itinye ụkpụrụ Chineke n’ọrụ. N’ihi ya, ha na-aghọ ndị so n’òtù ụmụnna zuru ụwa ọnụ bụ́ ndị e ji ịdị ọcha na ezi àgwà mara, bụ́ ọgbakọ zuru ụwa ọnụ nke Ndịàmà Jehova. N’ikwekọ ná Ndị Efesọs 4:24, ndị Kraịst a obi ha ziri ezi ‘eyikwasịwo mmadụ ọhụrụ ha, nke e kere dị ka Chineke chọrọ n’ime ezi omume na ịdị ọcha nke eziokwu ahụ.’ N’oge na-adịghị anya, ndị dị otú ahụ ga-ejupụta n’ụwa n’ihi na ọ bụ nanị ha ga-alanarị ma dịrị ndụ ruo mgbe ebighị ebi.—Tụlee Luk 23:43.
Ụwa Ọhụrụ nke Imebisị Ihe Na-adịghị na Ya Ga-ekwe Omume
Ì kwere na a pụrụ ịkwụsị imebisị ihe n’ezie? Ọ bụrụ otú ahụ, olee otú ụdị mgbanwe ahụ dị mkpa ga-esi mee? Alaeze Chineke ga-ewepụ ajọ usoro ihe a n’oge na-adịghị anya. Ndị bi n’ụwa ga-aza ajụjụ maka iwu ezi omume ọ bụla nke Chineke nke ha ma ụma mebie. (Tụlee Aịsaịa 24:5, 6.) Ebe ọ bụ na “ndị njehie, a na-ekpochapụ ha n’otu,” a ga-anapụta ndị hụrụ ezi omume n’anya. “Jehova na-enyekwara ha aka, na-eme ka ha gbapụ: Ọ na-eme ka ha si n’aka ndị na-emebi iwu gbapụ, Ọ na-azọpụtakwa ha, n’ihi na ha agbabawo n’ime Ya.”—Abụ Ọma 37:38-40.
N’ezie, a ga-ewepụ isi ihe na-akpata imebisị ihe kpam kpam. Otú ahụ ka a ga-emekwa mpụ, mmegbu, nhụjuanya, na ajọ omume nile. Kama nke ahụ, a ga-eji udo, ezi omume, ịdị jụụ, na ịnọ ná ntụkwasị obi mara ndụ n’ime ụwa ọhụrụ. Aịsaịa 32:18 na-akọwa ihe ga-emezu n’ụzọ nkịtị: “Ndị m ga-anọkwa n’ụlọ obibi udo, na n’ebe obibi dị iche iche kwesịrị ntụkwasị obi, na n’ebe izu ike dị iche iche dị jụụ.” Ee, ndị na-egosi ndị ọzọ ịhụnanya na nchebara echiche ga-ebi na paradaịs mara mma, nke ga-ezu ụwa ọnụ.
Ndị bụbu ndị na-emebisị ihe esorolarị ọtụtụ nde ndị ọzọ na-enwe mmekọrịta chiri anya n’ebe Jehova Chineke nọ. Ha adịghịzi ekere òkè ọ bụla n’omume imebisị ihe. Ị̀ ga-ekwekwa ka Okwu Chineke duga gị ná ndụ n’ime ụwa ọhụrụ ya? Gịnị ma i ṅomie ọbụ abụ oge ochie ahụ bụ́ onye dekọrọ nkwupụta Jehova: “M ga-eme ka i nwee uche, M ga-ezikwa gị ihe n’ụzọ nke ị ga-eje ije n’ime ya: M ga-adụ gị ọdụ, anya m ga-adịkwasịkwa gị n’ahụ.”—Abụ Ọma 32:8.
[Foto dị na peeji nke 7]
Nlebara anya na ịhụnanya nke ndị nne na nna na-echebe ndị na-eto eto