Ọ́bá Akwụkwọ Anyị NKE DỊ N'ỊNTANET
Ọ́bá Akwụkwọ Anyị
NKE DỊ N'ỊNTANET
Igbo
Ọ
  • Á
  • á
  • À
  • à
  • É
  • é
  • È
  • è
  • Ì
  • ì
  • Í
  • í
  • Ị
  • ị
  • Ị̀
  • ị̀
  • Ị́
  • ị́
  • Ḿ
  • ḿ
  • M̀
  • m̀
  • Ṅ
  • ṅ
  • Ò
  • ò
  • Ó
  • ó
  • Ọ
  • ọ
  • Ọ̀
  • ọ̀
  • Ọ́
  • ọ́
  • Ù
  • ù
  • Ú
  • ú
  • Ụ
  • ụ
  • Ụ̀
  • ụ̀
  • Ụ́
  • ụ́
  • BAỊBỤL
  • AKWỤKWỌ NDỊ ANYỊ NWERE
  • ỌMỤMỤ IHE
  • w00 8/15 p. 31
  • Ajụjụ Ndị Na-agụ Akwụkwọ Anyị Na-ajụ

O nweghị vidio dị maka ihe a ị họọrọ.

Ewela iwe, o nwetụrụ nsogbu gbochiri vidio a ịkpọ.

  • Ajụjụ Ndị Na-agụ Akwụkwọ Anyị Na-ajụ
  • Ụlọ Nche Ikwupụta Alaeze Jehova—2000
  • Isiokwu Ndị Ọzọ Yiri Nke A
  • Jehova Ebulie Ohu Ya Bụ́ Mesaịa Elu
    Amụma Aịsaịa—Ìhè nke Dịịrị Ihe Nile A Kpọrọ Mmadụ II
  • Ohu Jehova—Onye ‘A Mara Ube n’Ihi Mmebi Iwu Anyị’
    Ụlọ Nche Ikwupụta Alaeze Jehova—2009
  • Ime Uche Gị Na-atọ M Ụtọ
    Jiri Ọṅụ Bụkuo Jehova Abụ
  • Amụma Ndị E Buru Gbasara Mesaya Hà Na-egosi n’Eziokwu na Ọ Bụ Jizọs Bụ Mesaya?
    Ajụjụ Ndị Baịbụl Zara
Lee Ihe Ndị Ọzọ
Ụlọ Nche Ikwupụta Alaeze Jehova—2000
w00 8/15 p. 31

Ajụjụ Ndị Na-agụ Akwụkwọ Anyị Na-ajụ

Otu amụma a ma ama banyere Mesaịa dị n’Aịsaịa isi nke 53. Amaokwu nke 10 na-asị: “Ọ tọrọ Jehova ụtọ ịzọpịa ya; O mewo ka ọ rịa ọrịa.” Gịnị ka nke a pụtara?

Ọ dị mfe ịhụ ihe mere a pụrụ iji jụọ ajụjụ banyere Aịsaịa 53:10. Ezi ndị Kraịst adịghị eche na ọ ga-atọ Chineke anyị dị ọmịiko na obi ebere ụtọ ịzọpịa ma ọ bụ ime ka mmadụ ọ bụla rịa ọrịa. Bible na-enye anyị ihe ndabere maka inwe obi ike na Chineke adịghị enwe obi ụtọ n’imekpa ndị aka ha dị ọcha ahụ. (Deuterọnọmi 32:4; Jeremaịa 7:30, 31) N’ime narị afọ ndị gafeworonụ, Jehova pụrụ mgbe ụfọdụ ikwewo ka nhụjuanya dịrị n’ihi ihe ndị kwekọrọ n’amamihe na ịhụnanya ya. Ma, n’ezie, o meghị ka Ọkpara ọ hụrụ n’anya, bụ́ Jisọs, taa ahụhụ. Ya mere, gịnị ka akụkụ akwụkwọ nsọ a na-ekwu n’ezie?

A pụrụ inyere anyị aka ịghọta ihe ọ pụtara ma ọ bụrụ na anyị atụlee amaokwu ahụ n’ozuzu ya, na-arịba ama ebe abụọ okwu ahụ bụ́ ‘ịtọ ụtọ’ pụtara. Aịsaịa 53:10 na-agụ, sị: “Ọ tọrọ Jehova ụtọ ịzọpịa ya; O mewo ka ọ rịa ọrịa: ọ bụrụ na mkpụrụ obi ya achụọ àjà ikpe ọmụma, ọ ga-ahụ mkpụrụ ya, mee ka ụbọchị ya nile dị ogologo, ihe nke na-atọ Jehova ụtọ ga-agakwa nke ọma n’aka ya.”

Ozi dị na Bible n’ozuzu ya na-egosi na “ihe nke na-atọ Jehova ụtọ,” bụ́ nke a kpọtụrụ aha ná ngwụsị amaokwu a, hiwere isi n’imezu nzube ya site n’Alaeze ya. Jehova ime nke a ga-ewepụ ọbụbụeze ya n’ụta ma mee ka o kwe omume iwepụ mmehie e ketara eketa n’ahụ ụmụ mmadụ na-erube isi—mmehie anyị. (1 Ihe E Mere 29:11; Abụ Ọma 83:18; Ọrụ 4:24; Ndị Hibru 2:14, 15; 1 Jọn 3:8) Isi ihe ga-eme ka ihe a nile kwe omume bụ na Ọkpara Chineke aghaghị ịghọ mmadụ ma nye ihe mgbapụta. Dị ka anyị maara, ka Jisọs na-eme nke ahụ, ọ tara ahụhụ. Bible na-agwa anyị na ọ “mụtara ịṅa ntị Ya site n’ahụhụ nile Ọ hụrụ.” Ya mere, Jisọs ritere uru n’ahụhụ ahụ.—Ndị Hibru 5:7-9.

Jisọs maara tupu oge eruo na ihe a dị ịrịba ama ọ na-aga ime ga-agụnye ya onwe ya inwe oké ihe mgbu ụfọdụ. Nke ahụ pụtara ìhè site n’okwu ya ndị e dekọrọ na Jọn 12:23, 24, bụ́ ebe anyị na-agụ, sị: “Oge awa abịawo, ka e wee nye Nwa nke mmadụ otuto. N’ezie, n’ezie, asị m unu, Ọ bụrụ na mkpụrụ ọka adaghị n’ala wee nwụọ, nanị ya onwe ya na-anọgide; ma ọ bụrụ na ọ nwụrụ, ọ mịa ọtụtụ mkpụrụ.” Ee, Jisọs maara na ya aghaghị ịnọgide na-eguzosi ike n’ezi ihe ọbụna ruo n’ókè nke ịnwụ. Ihe ndekọ ahụ na-aga n’ihu, sị: “Ugbu a ka mkpụrụ obi m na-alọ mmiri; gịnị ka M ga-ekwukwa? Nna, zọpụta m n’oge awa nke a. Ma n’ihi nke a ka M bịaruru oge awa nke a. Nna, nye aha Gị otuto. Ya mere otu olu sitere n’eluigwe daa, sị, Enyere m ya otuto, M ga-enyekwa Ya otuto ọzọ.”—Jọn 12:27, 28; Matiu 26:38, 39.

Ọ bụ dabere n’ihe a na-ekwu n’ebe a ka anyị pụrụ ịghọta Aịsaịa 53:10. Jehova maara nke ọma na ahụmahụ Ọkpara ya ga-enwe ga-agụnye ịbụ onye a zọpịara n’echiche ụfọdụ. Ma, n’iburu n’uche ihe ọma dị ebube ma dị ukwuu nke ga-esi na ya pụta, ahụmahụ Jisọs na-aghaghị inwe tọrọ Jehova ụtọ. N’echiche ahụ, “ọ tọrọ Jehova ụtọ ịzọpịa,” ma ọ bụ ka a zọpịa Mesaịa ahụ. Jisọs nwekwara obi ụtọ n’ihe ọ pụrụ ịrụzu na n’ihe ọ rụzuru. N’ezie, dị ka Aịsaịa 53:10 si kwubie, ‘ihe nke na-atọ Jehova ụtọ gara nke ọma n’aka ya.’

    Akwukwo Igbo (1984-2025)
    Pụọ
    Banye
    • Igbo
    • Ziga ya
    • Ịgbanwe Ihe
    • Copyright © 2025 Watch Tower Bible and Tract Society of Pennsylvania
    • Ihe Ị Ga-eme na Ihe Ị Na-agaghị Eme
    • Ihe Anyị Ji Ihe Ị Gwara Anyị Eme
    • Kpebie Ihe Ị Ga-agwa Anyị
    • JW.ORG
    • Banye
    Ziga ya