Ọ́bá Akwụkwọ Anyị NKE DỊ N'ỊNTANET
Ọ́bá Akwụkwọ Anyị
NKE DỊ N'ỊNTANET
Igbo
Ọ
  • Á
  • á
  • À
  • à
  • É
  • é
  • È
  • è
  • Ì
  • ì
  • Í
  • í
  • Ị
  • ị
  • Ị̀
  • ị̀
  • Ị́
  • ị́
  • Ḿ
  • ḿ
  • M̀
  • m̀
  • Ṅ
  • ṅ
  • Ò
  • ò
  • Ó
  • ó
  • Ọ
  • ọ
  • Ọ̀
  • ọ̀
  • Ọ́
  • ọ́
  • Ù
  • ù
  • Ú
  • ú
  • Ụ
  • ụ
  • Ụ̀
  • ụ̀
  • Ụ́
  • ụ́
  • BAỊBỤL
  • AKWỤKWỌ NDỊ ANYỊ NWERE
  • ỌMỤMỤ IHE
  • w11 9/1 p. 10
  • Gịnị bụ Amagedọn?

O nweghị vidio dị maka ihe a ị họọrọ.

Ewela iwe, o nwetụrụ nsogbu gbochiri vidio a ịkpọ.

  • Gịnị bụ Amagedọn?
  • Ụlọ Nche Ikwupụta Alaeze Jehova—2011
  • Isiokwu Ndị Ọzọ Yiri Nke A
  • Amagedọn—Òle Mgbe?
    Ụlọ Nche Ikwupụta Alaeze Jehova—1990
  • Gịnị Bụ Agha Amagedọn?
    Ajụjụ Ndị Baịbụl Zara
  • Gịnị Ka Baịbụl Kwuru?
    Ụlọ Nche Nke Na-ekwusa Alaeze Jehova (Nke Ọhaneze)—2017
  • Amagedọn—Oge Mgbanwe nke Ga-eweta Obi Ụtọ
    Ụlọ Nche Ikwupụta Alaeze Jehova—2005
Lee Ihe Ndị Ọzọ
Ụlọ Nche Ikwupụta Alaeze Jehova—2011
w11 9/1 p. 10

Ndị Na-agụ Akwụkwọ Anyị Na-ajụ, Sị . . .

Gịnị bụ Amagedọn?

▪ Ihe na-agbata ọtụtụ ndị n’obi ma ha nụ “Amagedọn” bụ agha a ga-eji ngwá agha ga-egbukpọ ndị niile bi n’ụwa lụọ ma ọ bụ mgbe a ga-enwe ọdachi ndị na-emere onwe ha nke ga-ala ndị mmadụ n’iyi. Amagedọn Baịbụl kwuru okwu ya abụghị nke ọ bụla n’ime ihe ndị a. Gịnịzi ka ọ bụ?

Ọ bụ n’akwụkwọ Baịbụl bụ́ Mkpughe ka okwu ahụ bụ́ “Amagedọn” (“Ha–Magedọn”) dị. Ọ bụ agha pụrụ iche, “agha nke oké ụbọchị nke Chineke, Onye Pụrụ Ime Ihe Niile.” N’agha a, a ga-akpọkọta “ndị eze elu ụwa dum mmadụ bi” ka ha bịa lụsoo Chineke ọgụ ikpeazụ. Na Baịbụl, e nwere ọtụtụ ebe ndị ọzọ kwuru na a ga-alụ agha dị otú ahụ.—Mkpughe 16:14-16; Ezikiel 38:22, 23; Joel 3:12-14; Luk 21:34, 35; 2 Pita 3:11, 12.

Olee ihe ga-eme n’agha a? Akwụkwọ Mkpughe ji ihe atụ kọwaara anyị ya. Ọ sịrị: “Ndị eze nke ụwa na ụsụụ ndị agha ha . . . zukọtara ibuso onye ahụ nke nọ n’elu ịnyịnya ahụ na ụsụụ ndị agha ya agha.” “Onye ahụ nke nọ n’elu ịnyịnya” bụ Ọkpara Chineke, bụ́ Jizọs Kraịst, onye Chineke họpụtara ka o duru ìgwè ndị mmụọ ozi gaa merie ndị iro Chineke. (Mkpughe 19:11-16, 19-21) Jeremaya 25:33 kwuru otú ndị ajọ omume a ga-ebibi ga-aharu: “Ndị Jehova gburu ga-atọgbọrọ malite n’otu nsọtụ ụwa ruo na nsọtụ ọzọ nke ụwa.”

Gịnị mere o ji dị mkpa ka e nwee agha Amagedọn? Mba ndị dị n’ụwa ekweghị anabata ọchịchị Chineke, kama ọ bụ ọchịchị nke ha ka ha na-eme ka ndị mmadụ mara. (Abụ Ọma 24:1) Abụ Ọma 2:2 kwuru na ha na-ama Chineke aka, sị: “Ndị eze ụwa eguzorokwa, ndị isi ezukọtawokwa dị ka otu onye imegide Jehova na imegide onye o tere mmanụ.”

E nwere ike ikwu na ndị nnupụisi a dị ka ndị ji anya ike kwaba n’ụlọ na-abụghị nke ha, ma kama idebe ya ọcha, ha ana-emebisi ya, nọrọkwa n’elu ya zọwa na ụlọ ahụ bụ nke ha. Taa, mba dị iche iche na-emebisị ụwa, na-emetọsịkwa ya. Okwu Chineke buru amụma na nke a ga-eme. Ọ sịrị: “Mba niile were iwe, iwe [Chineke] wee bịa.” Ọ bụzi mgbe ahụ ka Chineke ‘ga-ebibi ndị na-ebibi ụwa.’ (Mkpughe 11:18) Chineke ekpebiela na ya ga-eji agha Amagedọn mee ka a mata onye ruru eru ịchị ụmụ mmadụ niile.—Abụ Ọma 83:18.

Olee mgbe a ga-alụ agha Amagedọn? Ọkpara Chineke kwuru hoo haa, sị: “Ọ dịghị onye maara ụbọchị ahụ na oge awa ahụ, ndị mmụọ ozi nke eluigwe amaghị, Ọkpara ahụ amaghịkwa, kama ọ bụ naanị Nna m maara.” (Matiu 24:36) N’agbanyeghị nke ahụ, Jizọs Kraịst, bụ́ Eze ga-alụ agha ahụ, dọrọ aka ná ntị, sị: “Lee! Ana m abịa dị ka onye ohi. Obi ụtọ na-adịrị onye mụ anya.” (Mkpughe 16:15) Nke a gosiri na o nwere ihe jikọrọ agha a a ga-alụ n’ụwa niile na oge ọnụnọ Kraịst, bụ́ nke amụma Baịbụl gosiri na ọ bụ ugbu a.

Amagedọn ga-egbu ndị ọjọọ niile na-achọghị ịgbanwe, ma a ga-enwe “oké ìgwè mmadụ” ndị a na-agaghị egbu. (Mkpughe 7:9-14) Ha ga-ahụ mgbe okwu ndị a ga-emezu: “N’oge na-adịghị anya, onye ajọ omume agakwaghị anọ; ị ga-elekwa anya n’ebe ọ na-anọ, ma ọ gaghị anọ ya. Ma ndị dị umeala n’obi ga-enweta ụwa, ha ga-enwekwa obi ụtọ dị ukwuu n’ihi udo nke zuru ebe niile.”—Abụ Ọma 37:10, 11.

[Ihe odide gbatụrụ okpotokpo dị na peeji nke 10]

“Ndị dị umeala n’obi ga-enweta ụwa, ha ga-enwekwa obi ụtọ dị ukwuu n’ihi udo nke zuru ebe niile”

    Akwukwo Igbo (1984-2025)
    Pụọ
    Banye
    • Igbo
    • Ziga ya
    • Ịgbanwe Ihe
    • Copyright © 2025 Watch Tower Bible and Tract Society of Pennsylvania
    • Ihe Ị Ga-eme na Ihe Ị Na-agaghị Eme
    • Ihe Anyị Ji Ihe Ị Gwara Anyị Eme
    • Kpebie Ihe Ị Ga-agwa Anyị
    • JW.ORG
    • Banye
    Ziga ya