Ì CHETARA?
Ì wetuola obi gụọ Ụlọ Nche ndị ọhụrụ e bipụtara? Legodị ma ị̀ ga-azali ajụjụ ndị a:
Olee ihe ụfọdụ na-agaghịzi adị mgbe ọgwụgwụ ga-abịa?
Ihe ụfọdụ na-agaghịzi adị bụ ọchịchị ụmụ mmadụ, agha na mmegbu, okpukpe ụgha, na ndị na-anaghị asọpụrụ Chineke.—5/1, peeji nke 3-5.
Ònye bụ Gọg nke Megọg e kwuru okwu ya n’akwụkwọ Ezikiel?
Gọg nke Megọg abụghị Setan, kama o yiri ka ọ̀ bụ ọtụtụ mba ndị ga-agbakọ aka chọọ ikpochapụ ndị Chineke ma oké mkpagbu ahụ malitechaa.—5/15, peeji nke 29-30.
Olee ihe isii ga-enyere mmadụ aka ịna-enwe obi ụtọ ma ọ kawa nká?
Baịbụl gbara anyị ume ka anyị (1) na-adị obi umeala, (2) na-eji ejiji dị́ mma, (3) na-eme onwe anyị obi ụtọ, (4) na-enye ndị ọzọ ihe, (5) na-akpa ndị ọzọ nso, (6) na-ekelekwa ndị meere anyị ihe ọma. Ime ihe ndị a ga-enyere mmadụ aka ịna-enwe obi ụtọ ma ọ kawa nká.—6/1, peeji nke 8-10.
Olee otú ọrụ ebube ndị Jizọs rụrụ si gosi na ọ na-emesapụ aka?
N’agbamakwụkwọ e mere na Kena, Jizọs mere ka ihe dị́ ka otu narị galọn mmiri ghọọ mmanya. N’oge ọzọ, o nyere ihe karịrị puku mmadụ ise nri. (Mat. 14:14-21; Jọn 2:6-11) O mere ihe ndị ahụ iji gosi na ọ na-emesapụ aka ka Nna ya.—6/15, peeji nke 4-5.
N’agbanyeghị na anyị ezughị okè, gịnị mere obi ji kwesị isi anyị ike na anyị ga-emeli ihe dị́ Chineke mma?
Job, Lọt, na Devid mejọchara ihe. Ma, ha chọrọ ịna-ejere Chineke ozi. Ha gosiri na ihe ha mere wutere ha, gbanweekwa omume ha. Ha mere ihe dị́ Chineke mma, anyị ga-emelikwa ka ha.—7/1, peeji nke 12-13.
Mbibi Babịlọn Ukwu ahụ ọ̀ pụtara na a ga-egbu ndị niile na-ekpe okpukpe ụgha?
Mba. Ihe Zekaraya 13:4-6 kwuru gosiri na ụfọdụ ndị ndú okpukpe ga-ahapụ okpukpe ha na-ekpe ma kwuo na o nwetụbeghị mgbe ha nọrọ n’okpukpe ụgha ndị ahụ.—7/15, peeji nke 15-16.
Gịnị mere Berak ji kweta na ya ga-aga agha ma ọ bụrụ na Debora ga-eso ya gaa?
Berak nwere okwukwe. Kama ịrịọ Jehova ka o nyekwuo ha ngwá agha, ọ chọrọ ka Debora, bụ́ onye nnọchianya Jehova, nọrọ n’etiti ya na ndị agha ya ka obi sikwuo ha ike. (Ikpe 4:6-8; 5:7)—8/1, peeji nke 13.
Olee ụfọdụ n’ime ihe Onye Kraịst nwere ike ịna-atụgharị uche na ha?
Ụfọdụ n’ime ha bụ ihe ndị Jehova kere, uru Okwu ya bara, ihe ùgwù anyị nwere ikpe ekpere, na ihe mgbapụta ahụ.—8/15, peeji nke 10-13.
Olee otú izere mkpakọrịta ọjọọ si gbasa onye anyị na ya na-akpa?
Anyị kwesịrị ịna-emere ma ndị na-ekweghị ekwe ihe ọma. Ma, é nwee onye a na-emebeghị baptizim, ya bụ, onye na-anaghị erubere Chineke isi, ọ gaghị adị mma ka anyị na ya na-akpa. (1 Kọr. 15:33)—8/15, peeji nke 25.
Gịnị mere okwukwe Pita ji nyụwa ka ọkụ, gịnịkwa nyeere ya aka inweghachi okwukwe?
Okwukwe Pita mere ka o jere ije n’elu mmiri gawa n’ebe Jizọs nọ. (Mat. 14:24-32) Ma mgbe Pita lekwasịrị anya n’ebili mmiri ahụ, ụjọ bịara ya. O mechara lekwasị Jizọs anya ma kwe ka o nyere ya aka.—9/15, peeji nke 16-17.
Ọrụ Ndịozi 28:4 kwuru na ndị Mọlta chere na Pọl onyeozi bụ ogbu ọchụ. Gịnị mere ha ji chee otú ahụ?
Mgbe ajụala tara Pọl, o nwere ike ịbụ na ha chere na chi nwaanyị a na-akpọ di’ke, nke na-ekpe ikpe ziri ezi, na-ata Pọl ahụhụ.—10/1, peeji nke 9.
Gịnị ka anyị kwesịrị ịmụta n’otú ime ọtụtụ ihe si dọpụ uche Mata n’ihe ka mkpa?
N’otu mgbe, Mata nọ na-agba mbọ ka o siere Jizọs nri pụrụ iche. Jizọs kwuru na nwanne ya nwaanyị họọrọ òkè ka mma n’ihi na ọ nọ na-ege ntị n’ihe ọ na-akụzi. Anyị kwesịrị ịkpachara anya ka ihe ndị na-adịghị mkpa ghara igbochi anyị ime ihe gbasara ofufe Jehova.—10/15, peeji nke 18-20.