Ọ́bá Akwụkwọ Anyị NKE DỊ N'ỊNTANET
Ọ́bá Akwụkwọ Anyị
NKE DỊ N'ỊNTANET
Igbo
Ọ
  • Á
  • á
  • À
  • à
  • É
  • é
  • È
  • è
  • Ì
  • ì
  • Í
  • í
  • Ị
  • ị
  • Ị̀
  • ị̀
  • Ị́
  • ị́
  • Ḿ
  • ḿ
  • M̀
  • m̀
  • Ṅ
  • ṅ
  • Ò
  • ò
  • Ó
  • ó
  • Ọ
  • ọ
  • Ọ̀
  • ọ̀
  • Ọ́
  • ọ́
  • Ù
  • ù
  • Ú
  • ú
  • Ụ
  • ụ
  • Ụ̀
  • ụ̀
  • Ụ́
  • ụ́
  • BAỊBỤL
  • AKWỤKWỌ NDỊ ANYỊ NWERE
  • ỌMỤMỤ IHE
  • w17 Nọvemba p. 18-19
  • Chineke “Ga-agọzi” Onye Na-emesapụ Aka

O nweghị vidio dị maka ihe a ị họọrọ.

Ewela iwe, o nwetụrụ nsogbu gbochiri vidio a ịkpọ.

  • Chineke “Ga-agọzi” Onye Na-emesapụ Aka
  • Ụlọ Nche Nke Na-ekwusa Alaeze Jehova (Nke A Na-amụ Amụ)—2017
  • Isiokwu Ndị Ọzọ Yiri Nke A
  • “Ọrụ A Dị Ukwuu”
    Ụlọ Nche Nke Na-ekwusa Alaeze Jehova (Nke A Na-amụ Amụ)—2016
  • Gosi na Obi Dị Gị Ụtọ Maka Otú Jehova Si Emesapụ Aka
    Ụlọ Nche Ikwupụta Alaeze Jehova—2015
  • Ha Ji Ihe Mafọọrọ Ha Nyere Ụmụnna Ha Aka
    Ụlọ Nche Ikwupụta Alaeze Jehova—2012
  • Jehova Na-agọzi Ndị Ji Obi Ha Niile Na-ejere Ya Ozi
    Ụlọ Nche Ikwupụta Alaeze Jehova—2014
Lee Ihe Ndị Ọzọ
Ụlọ Nche Nke Na-ekwusa Alaeze Jehova (Nke A Na-amụ Amụ)—2017
w17 Nọvemba p. 18-19
Ebe Hana kpọtara Samuel mgbe ọ dị obere n’ụlọikwuu

Chineke “Ga-agọzi” Onye Na-emesapụ Aka

KEMGBE ụwa, mmadụ iji ihe ndị o nwere chụọrọ Chineke àjà bụ otu ụzọ dị mkpa e si na-efe Chineke. Ndị Izrel chụrụ ụmụ anụmanụ n’àjà. A makwa Ndị Kraịst ama ka ndị na-achụrụ Chineke “àjà otuto” mgbe niile. Ma, e nwere àjà ndị ọzọ na-adị Chineke ezigbo mma. (Hib. 13:15, 16) Àjà ndị a na-eme ka Chineke gọzie anyị ma na-eme ka anyị na-enwe obi ụtọ. Ihe ndị anyị na-aga ịkọ na-egosi na ọ bụ eziokwu.

N’oge ochie, Hana ji obi ya niile fee Jehova. Ọ chọsiri nwa ike, ma o nweghị nke ọ mụtara. O kwere Jehova nkwa n’ekpere na ọ bụrụ na ọ mụta nwa nwoke, na ọ “ga-enye ya Jehova ụbọchị ndụ ya niile.” (1 Sam. 1:10, 11) Ka oge na-aga, Hana dịrị ime ma mụta nwa nwoke aha ya bụ Samuel. Mgbe a napụrụ ya ara, Hana kpọtara ya n’ụlọikwuu otú ahụ o kwere Chineke ná nkwa. Jehova gọziri Hana maka onyinye a o ji obi ya niile nye ya. Jehova mere ka ọ mụta ụmụ ise mgbe ọ mụchara Samuel. Samuel ghọkwara onye amụma na onye so dee Baịbụl.—1 Sam. 2:21.

Ndị Kraịst n’oge anyị a na-enyefe Onye kere ha onwe ha ma jiri ndụ ha niile na-ejere ya ozi otú ahụ Hana na Samuel mere. Jizọs kwekwara anyị nkwa na ihe ọ bụla anyị chụrụ n’àjà iji fee Jehova na ọ ga-agọzi anyị mmaji kwuru mmaji.—Mak 10:28-30.

N’oge ndịozi Jizọs, a ma Onye Kraịst aha ya bụ Dọkas ama ka onye “jupụtara n’ezi ọrụ na onyinye ebere nke ọ na-enye” iji nyere ndị ọzọ aka. Ma, ọ dị mwute na “ọ dara ọrịa wee nwụọ.” Ọnwụ ya gbawara ndị nọ n’ọgbakọ ha obi. Mgbe ndị na-eso ụzọ Jizọs nụrụ na Pita nọ nso n’ebe ahụ, ha gwara ya ka ọ bịa ozugbo nyere ha aka. Obi tọgburu ha atọgbu mgbe Pita kpọlitere Dọkas n’ọnwụ. Nke a bụ mbilite n’ọnwụ mbụ Baịbụl kọrọ na onyeozi Jizọs kpọlitere mmadụ n’ọnwụ. (Ọrụ 9:36-41) Chineke echefubeghị ihe ọma Dọkas meere ndị mmadụ. (Hib. 6:10) E dere ihe ọma ndị ahụ na Baịbụl ka anyị nwee ike ịna-eme ka ya.

Pọl onyeozi bụ onye ọzọ mere ihe anyị kwesịrị iṅomi. O ji oge ya niile nyere ndị mmadụ aka. Mgbe o degaara ụmụnna ya nọ na Kọrịnt akwụkwọ ozi, ọ sịrị: “Mụ onwe m ga-eji oké ọṅụ mefuo ihe niile, kwekwa ka e jiri m mee ihe n’ụzọ zuru ezu n’ihi mkpụrụ obi unu.” (2 Kọr. 12:15) Ihe ndị Pọl meere ndị mmadụ mere ka ọ mata na mmadụ iji oge ya niile nyere ndị ọzọ aka na-eme ka onye ahụ na-enwe obi ụtọ. Ma, nke ka nke bụ na ọ na-eme ka onye ahụ na Jehova dịrị ná mma, ya agọziekwa ya.—Ọrụ 20:24, 35.

O doro anya na obi na-atọ Jehova ụtọ ma anyị jiri oge anyị na ike anyị na-akwado ihe gbasara Alaeze Chineke ma na-enyere ụmụnna anyị aka. Ma, è nwere ụzọ ndị ọzọ anyị nwere ike isi kwado ozi ọma Alaeze Chineke anyị na-ezi? Ee, e nwere. E wezụga iji oge anyị na ike anyị na-ejere Chineke ozi, anyị nwekwara ike iji ihe ndị anyị nwere jeere ya ozi. Anyị na-eji ha na-akwado ozi ọma anyị na-ekwusa n’ụwa niile. Ụfọdụ n’ime ha bụ ịkwado ndị ozi ala ọzọ na ndị ọzọ nọ n’ozi oge niile pụrụ iche. Ihe ọzọ bụ na a na-eji onyinye si anyị n’obi enye aka akwadebe akwụkwọ na vidio anyị, nakwa ịsụgharị ha. A na-ejikwa ya agbatara ndị ọdachi dakwasịrị ọsọ enyemaka na iwu Ụlọ Nzukọ Alaeze ndị ọhụrụ. Ka obi sie anyị ike na Chineke “ga-agọzi” onye na-emesapụ aka. Ihe ọzọ bụ na anyị na-asọpụrụ Jehova ma anyị nye ya ihe anyị ndị dị oké ọnụ ahịa.—Ilu 3:9; 11:25.

Ụzọ Ụfọdụ Ndị Kpebiri Isi Na-enye Onyinye Maka Ọrụ Zuru Ụwa Ọnụ

Ọtụtụ ndị taa na-eme ụdị ihe ahụ e mere n’oge Pọl onyeozi. Ha ‘na-ewepụta ihe,’ ya bụ, kpebie ego ole ha chọrọ inye n’onyinye, ma tinye ya n’igbe e dere “Maka Ọrụ Zuru Ụwa Ọnụ.” (1 Kọr. 16:2) Kwa ọnwa, ọgbakọ ọ bụla na-ewekọta ego ha nwetara n’igbe ahụ ma zigara ya alaka ụlọ ọrụ Ndịàmà Jehova nke na-elekọta mba ha. Mmadụ nwekwara ike iji aka ya zigara alaka ụlọ ọrụ na-elekọta mba o bi ego ọ chọrọ iji nye onyinye. Ị chọọ ịmata aha ụlọ ọrụ iwu kwadoro nke Ndịàmà Jehova ji arụ ọrụ ná mba i bi, jụọ alaka ụlọ ọrụ na-elekọta mba ahụ i bi. I nwere ike inweta adres alaka ụlọ ọrụ ahụ n’ebe anyị na-edebe ihe n’Ịntanet, bụ́ www.jw.org/ig. Ụdị ihe ndị i nwere ike iji aka gị zigara alaka ụlọ ọrụ ma ọ bụrụ na e nwere ha ná mba unu bụ:

ONYINYE

  • Mmadụ nwere ike isi n’Ịntanet ma ọ bụ jiri kaadị ndọrọ ego kwụnyere anyị ego o dewere n’ụlọ akụ̀. N’alaka ụlọ ọrụ ụfọdụ, e nwere ike isi na jw.org ma ọ bụ n’adres Ịntanet ọzọ a kpọrọ aha kwụnyere anyị ego.

  • O nwere ike ịbụ ego, ọlaedo, ma ọ bụ ihe ndị ọzọ e nwere ike ireta ego. E kwesịrị izitekọta ha na akwụkwọ ozi iji kọwaa na ihe ndị ahụ bụ onyinye.

EGO I NWERE IKE IWEREGHACHI

  • Mmadụ nwere ike inye alaka ụlọ ọrụ ego ma kwuo na ya nwere ike iwereghachi ya mgbe ọ bụla ọ chọrọ.

  • O kwesịrị izitekọta ya na akwụkwọ ozi iji kọwaa na ya nwere ike iwereghachi ego ahụ mgbe ọ bụla ọ chọrọ.

ATỤMATỤ ỌRỤ EBERE

E wezụga inye onyinye ego na ihe ndị ọzọ e nwere ike ireta ego, mmadụ nwere ike isi n’ụzọ ndị ọzọ nye onyinye iji kwado ozi ọma Alaeze Chineke a na-ekwusa n’ụwa niile. E dere ha n’okpuru ebe a. N’agbanyeghị nke ị họọrọ, biko buru ụzọ kpọtụrụ alaka ụlọ ọrụ na-elekọta mba i bi ka i nwee ike ịmata nke iwu kwadoro ná mba ahụ. Ebe ọ bụ na mba ọ bụla nwere iwu nke ha, mmadụ kwesịrị ibu ụzọ jụọ ndị ọkàiwu tupu ya ahọrọ ụzọ kacha mma ọ ga-esi nye onyinye.

Ịnshọransị na ịla ezumike nká: I nwere ike idenye alaka ụlọ ọrụ Ndịàmà Jehova na-elekọta mba i bi n’ebe a na-ede aha onye a ga-enye ego ịnshọransị ma onye dejupụtara akwụkwọ ịnshọransị ahụ nwụọ, ma ọ bụkwanụ e denye ya n’ebe a na-ede aha onye a ga-enye ego mmadụ ga-enweta ma ọ laa ezumike nká.

Ego E Dowere n’Ụlọ Akụ̀: Mmadụ nwere ike ime ndokwa ka e nye alaka ụlọ ọrụ Ndịàmà Jehova ego ya dị n’ụlọ akụ̀ ma ọ bụ ego ezumike nká ya ma ọ nwụọ. Ọ ga-eme ya otú ụlọ akụ̀ dị ná mba o bi kwuru ka e si mee ya.

Aka Òkè na Ihe Ndị Nọchiri Anya Ego: E nwere ike inye alaka ụlọ ọrụ Ndịàmà Jehova aka òkè na ihe ndị nọchiri anya ego. Mmadụ nwekwara ike ikwu ka e nye alaka ụlọ ọrụ ihe ndị ahụ ma ya nwụọ.

Ala na Ụlọ: E nwere ike inye alaka ụlọ ọrụ Ndịàmà Jehova ala na ụlọ e nwere ike ire ere. Ọ bụrụ na ọ bụ ụlọ onye nwe ya ka bi na ya, o nwere ike inye ya alaka ụlọ ọrụ ma ka biri na ya ruo mgbe ọ nwụrụ.

Ike Ekpe na Ihe E Nyere Mmadụ Ka O Jide: E nwere ike idenyere alaka ụlọ ọrụ Ndịàmà Jehova ego ma ọ bụ ihe ọzọ n’akwụkwọ ike ekpe nke iwu kwadoro. Mmadụ nwekwara ike inye onye ọzọ ihe ka o jide ma dee ka e nye ya alaka ụlọ ọrụ Ndịàmà Jehova ma e mechaa. Nke a nwere ike ịbara mmadụ uru n’ihe gbasara ụfọdụ ụtụ isi a na-akwụ.

Okwu ahụ bụ́ “atụmatụ ọrụ ebere” na-egosi na onye chọrọ inye ụdị onyinye ndị a e depụtara kwesịrị ime atụmatụ nke ọma. Ka ndị chọrọ inye Ndịàmà Jehova ụdị onyinye ọ bụla mata otú ha ga-esi enye onyinye maka ọrụ zuru ụwa ọnụ ha na-arụ, e bipụtala broshọ aha ya bụ Charitable Planning to Benefit Kingdom Service Worldwide. E bipụtara broshọ a n’asụsụ Bekee na Spanish. Broshọ a kwuru ụzọ dị iche iche mmadụ nwere ike isi nye onyinye ugbu a ma ọ bụ mgbe e mechara, dị ka ikenye ya n’ekpe maka mgbe mmadụ nwụrụ. Ihe niile e kwuru na broshọ a nwere ike ha agaghị agbasacha gị n’ihi iwu ndị e nwere n’obodo ebe i bi. Ụfọdụ esila n’ụzọ ndị a e si enye onyinye kwado nzukọ anyị nakwa ọrụ ebere anyị na-arụ n’ụwa niile, ma mee ka ego ha na-akwụ n’ụtụ isi belata. Ọ bụrụ na e nwere broshọ a ná mba ebe i bi, i nwere ike ịgwa odeakwụkwọ ọgbakọ unu ka o nye gị otu.

Ị chọọ ịmatakwu ụzọ ndị e si enye onyinye, gaa n’ala ala adres Ịntanet anyị bụ́ jw.org/⁠ig pịa ebe e dere “Nye Onyinye Maka Ọrụ Anyị Na-arụ n’Ụwa Niile,” ma ọ bụ, gị akpọtụrụ alaka ụlọ ọrụ na-elekọta mba i bi.

    Akwukwo Igbo (1984-2025)
    Pụọ
    Banye
    • Igbo
    • Ziga ya
    • Ịgbanwe Ihe
    • Copyright © 2025 Watch Tower Bible and Tract Society of Pennsylvania
    • Ihe Ị Ga-eme na Ihe Ị Na-agaghị Eme
    • Ihe Anyị Ji Ihe Ị Gwara Anyị Eme
    • Kpebie Ihe Ị Ga-agwa Anyị
    • JW.ORG
    • Banye
    Ziga ya