Ọ́bá Akwụkwọ Anyị NKE DỊ N'ỊNTANET
Ọ́bá Akwụkwọ Anyị
NKE DỊ N'ỊNTANET
Igbo
Ọ
  • Á
  • á
  • À
  • à
  • É
  • é
  • È
  • è
  • Ì
  • ì
  • Í
  • í
  • Ị
  • ị
  • Ị̀
  • ị̀
  • Ị́
  • ị́
  • Ḿ
  • ḿ
  • M̀
  • m̀
  • Ṅ
  • ṅ
  • Ò
  • ò
  • Ó
  • ó
  • Ọ
  • ọ
  • Ọ̀
  • ọ̀
  • Ọ́
  • ọ́
  • Ù
  • ù
  • Ú
  • ú
  • Ụ
  • ụ
  • Ụ̀
  • ụ̀
  • Ụ́
  • ụ́
  • BAỊBỤL
  • AKWỤKWỌ NDỊ ANYỊ NWERE
  • ỌMỤMỤ IHE
  • wp19 nke 2 p. 6-7
  • Mgbe Mmadụ Nwụnahụrụ Gị

O nweghị vidio dị maka ihe a ị họọrọ.

Ewela iwe, o nwetụrụ nsogbu gbochiri vidio a ịkpọ.

  • Mgbe Mmadụ Nwụnahụrụ Gị
  • Ụlọ Nche Nke Na-ekwusa Alaeze Jehova (Nke Ọhaneze)—2019
  • Isiokwu Nta
  • Isiokwu Ndị Ọzọ Yiri Nke A
  • IHE NYEERE ỤFỌDỤ NDỊ AKA
  • Olee Otú M Pụrụ Isi Nagide Iru Újú M?
    Mgbe Onye Ị Hụrụ n’Anya Nwụrụ
  • Idi Ọnwụ Onye Ị Hụrụ n’Anya
    Ụlọ Nche Ikwupụta Alaeze Jehova—2008
  • Ihe Ga-enyere Gị Aka Idi Ọnwụ Onye Nwụnahụrụ Gị
    Ụlọ Nche Nke Na-ekwusa Alaeze Jehova (Nke Ọhaneze)—2016
  • Ò Kwesịrị Ekwesị Inwe Mmetụta Dị Otú A?
    Mgbe Onye Ị Hụrụ n’Anya Nwụrụ
Lee Ihe Ndị Ọzọ
Ụlọ Nche Nke Na-ekwusa Alaeze Jehova (Nke Ọhaneze)—2019
wp19 nke 2 p. 6-7
Ebe otu di na nwunye na-eru uju nọ n’akụkụ mmiri, jide ibe ha aka ma na-ele anya

Mgbe Mmadụ Nwụnahụrụ Gị

Otu nwaanyị si Ọstrelia aha ya bụ Vanessa sịrị: “Mgbe nwanne m nwoke nọkatara nwụọ, ike ụwa gwụrụ m. O meela ọtụtụ ọnwa ọ nwụrụ. Ma m cheta ya, obi ajọọ m njọ, ya ana-adị m ka à manyere m mma n’obi. Mgbe ụfọdụ, iwe na-eju m obi, mụ ana-ajụ onwe m, sị: Gịnịdị mere o ji nwụọ? Obi m na-adịkwa ama m ikpe na ewepụtakwughị m oge ka mụ na ya nọrịa tupu ya anwụọ.”

Ọ BỤRỤ na o nweela mgbe mmadụ nwụnahụrụ gị, o nwekwara ike ịdị gị otú ahụ ọ dị nwaanyị a. O nwere ike ịna-ewute gị, owu ana-ama gị, ike ụwa ana-agwụkwa gị. O nwekwara ike ime ka iwe na-eju gị obi, obi ana-ama gị ikpe, ụjọ ana-atụkwa gị. O nwedịrị ike ịbụ na o meela ka ị na-eche ma ndụ ị dị ọ̀ ka nwere isi.

Ma, buru n’uche na ọ bụghị ihe ọjọọ iru uju ma mmadụ nwụnahụ gị. Ọ na-egosi na ị hụrụ onye ahụ n’anya. Ma, ò nwere ihe nwere ike inyere gị aka?

IHE NYEERE ỤFỌDỤ NDỊ AKA

Ọ bụ eziokwu na o nwere ike ịdị ka ị gaghị edili ya, ihe ndị a nwere ike inyere gị aka:

ECHELA NA I KWESỊGHỊ IRU UJU

Otú otu onye si eru uju nwere ike ịdị iche n’otú onye ọzọ si eru, oge ha ga-eruru ya nwekwara ike ịdị iche. N’agbanyeghị otú mmadụ si eru uju, ibe ákwá nwere ike inyere ya aka inwetatụ onwe ya. Vanessa anyị kwuburu gbasara ya sịrị: “Ọ na-abụ o rujuo m obi, mụ ebee ákwá. Ọ na-eme ka m nwetatụ onwe m.” Mgbe nwanne otu nwaanyị aha ya bụ Sofía nọkatara nwụọ, o kwuru, sị: “Ọ na-abụ m cheta ya, mụ ebee ezigbo ákwá. Ọ na-adị ka ebe e mepere ọnyá dị mmadụ n’ahụ́, na-ehicha ya. Ọ na-afụ ezigbo ụfụ, ma ọ na-eme ka ọnyá ahụ laa.”

NA-EKWU OTÚ OBI DỊ GỊ

O doro anya na o nwere mgbe ụfọdụ ị ga-achọ ịnọrọ onwe gị. Ma, iru uju abụghị ihe mmadụ ga-ebuli naanị ya. Mgbe nna otu nwa okorobịa aha ya bụ Jared nwụrụ, ọ sịrị: “M gwara ndị ọzọ otú obi dị m. M nwere obi ụtọ na m gwara ha n’agbanyeghị na amaghị m ma hà ghọtara ihe m kwuru.” Janice e kwuru gbasara ya n’isiokwu nke mbụ kwuru uru ọzọ mmadụ ikwu otú obi dị ya bara. Ọ sịrị: “Ịkọrọ ndị ọzọ otú obi dị m nyeere m ezigbo aka. O mere ka m mata na e nwere ndị ghọtara nsogbu m.”

KWE KA NDỊ ỌZỌ NYERE GỊ AKA

Otu dọkịta kwuru, sị: “Ọ bụrụ na ndị mmadụ nwụnahụrụ ekwe ka ndị enyi ha na ndị ezinụlọ ha nyere ha aka mgbe onye ahụ ka nwụrụ ọhụrụ, ọ ga-enyere ha aka ịna-edi nsogbu dị iche iche ọnwụ onye ahụ nwere ike ịkpatara ha.” Gwa ndị enyi gị ihe ị chọrọ ka ha meere gị n’ihi na ha nwere ike ịchọ inyere gị aka, ma ha amaghị otú ha ga-esi eme ya.​—Ilu 17:17.

BỊARUKWUO CHINEKE NSO

Otu nwaanyị aha ya bụ Tina kwuru, sị: “Mgbe ọrịa kansa gburu di m na mberede, enweghịzi m ike ịkọrọ ya otú obi dị m. N’ihi ya, ọ bụzi Chineke ka m na-akọrọ ihe niile. Ihe mbụ m na-eme n’ụbọchị bụ ikpe ekpere ka o nyere m aka n’ụbọchị ahụ. Chineke nyeere m aka otú m na-atụghị anya ya.” E nwere otu nwa agbọghọ dị afọ iri abụọ na abụọ mgbe nne ya nwụrụ. Aha ya bụ Tarsha. O kwuru, sị: “Ịgụ Baịbụl kwa ụbọchị kasiri m obi. O mere ka m na-eche gbasara ihe ndị ga-agba m ume.”

WERE YA NA Ị NA-AHỤ MGBE A KPỌLITERE ONYE NWỤNAHỤRỤ GỊ

Tina anyị kwuburu gbasara ya sịrị: “Mgbe di m nwụrụ ọhụrụ, olileanya mbilite n’ọnwụ akasighị m obi n’ihi na ihe bụ́ mkpa m ozugbo ahụ bụ ịhụ di m, ụmụ m chọkwara ịhụ nna ha ozugbo. Ma ugbu a, afọ anọ agaala kemgbe di m nwụrụ, ejighịzi m olileanya a egwu egwu. Ọ bụ ya ji m ndụ. M nọrọ, mụ ejiri uche m na-ahụ mgbe a kpọlitere ya. Ihe a na-eme ka obi ruo m ala, mụ ana-enwekwa obi ụtọ.”

O nwere ike ị gaghị enweta onwe gị ozugbo i mechara ihe ndị a. Ma, otú Vanessa si die ọnwụ nwanne ya nwere ike inyere gị aka. Ọ sịrị: “I nwere ike iche na ị gaghị edili ya ma ị ga-emecha die ya, nwetatụwa onwe gị.”

Ma, buru n’obi na ndụ ị dị ka bara ezigbo uru n’agbanyeghị na onye nwụrụ anwụ anwụọla. Chineke ga-enyere gị aka gị enwee ezigbo ndị enyi ga-enyere gị aka ka ndụ gị nwee isi ma na-atọ gị ụtọ. N’oge na-adịghị anya, Chineke ga-akpọlite ndị nwụrụ anwụ. Ọ chọrọ ka ị hụ onye nke gị nwụrụ anwụ ọzọ. Ọ bụ mgbe ahụ ka mwute a ị na-enwe ga-akwụsị kpamkpam.

Amaokwu Baịbụl Nwere Ike Inye Aka

Uju ị na-eru na ákwá ị na-ebe na-emetụ Chineke n’obi.

Otu onye so dee Baịbụl gwara Chineke, sị: “Gbanye anya mmiri m n’ime karama akpụkpọ gị. Ọ̀ bụ na ọ dịghị n’akwụkwọ gị?”​—Abụ Ọma 56:8.

I nwere ike ịkọrọ Chineke otú obi dị gị.

“M nọ na-akọ nhụjuanya m n’ihu [Chineke], . . . Jehova,a akpọkuru m gị ka i nyere m aka.”​—Abụ Ọma 142:​2, 5.

Ị ga-enweli olileanya.

“A gaje inwe mbilite n’ọnwụ”​—Ọrụ Ndịozi 24:15.

Chineke kwere nkwa na ya ga-akpọlite imirikitiimi ndị nwụrụ anwụ n’ọnwụ, ọ na-agụsikwa ya agụụ ike ime ya.b​—Job 14:​14, 15.

a Baịbụl kwuru na aha Chineke bụ Jehova.

b Ọ bụrụ na ị chọrọ ịmatakwu banyere mbilite n’ọnwụ, gụọ isi nke 30 n’akwụkwọ Na-enwe Obi Ụtọ Ruo Mgbe Ebighị Ebi. Ọ bụ Ndịàmà Jehova bipụtara ya. I nwere ike ịga na www.jw.org/ig danloduo ya n’efu.

    Akwukwo Igbo (1984-2025)
    Pụọ
    Banye
    • Igbo
    • Ziga ya
    • Ịgbanwe Ihe
    • Copyright © 2025 Watch Tower Bible and Tract Society of Pennsylvania
    • Ihe Ị Ga-eme na Ihe Ị Na-agaghị Eme
    • Ihe Anyị Ji Ihe Ị Gwara Anyị Eme
    • Kpebie Ihe Ị Ga-agwa Anyị
    • JW.ORG
    • Banye
    Ziga ya