Ọ́bá Akwụkwọ Anyị NKE DỊ N'ỊNTANET
Ọ́bá Akwụkwọ Anyị
NKE DỊ N'ỊNTANET
Igbo
Ọ
  • Á
  • á
  • À
  • à
  • É
  • é
  • È
  • è
  • Ì
  • ì
  • Í
  • í
  • Ị
  • ị
  • Ị̀
  • ị̀
  • Ị́
  • ị́
  • Ḿ
  • ḿ
  • M̀
  • m̀
  • Ṅ
  • ṅ
  • Ò
  • ò
  • Ó
  • ó
  • Ọ
  • ọ
  • Ọ̀
  • ọ̀
  • Ọ́
  • ọ́
  • Ù
  • ù
  • Ú
  • ú
  • Ụ
  • ụ
  • Ụ̀
  • ụ̀
  • Ụ́
  • ụ́
  • BAỊBỤL
  • AKWỤKWỌ NDỊ ANYỊ NWERE
  • ỌMỤMỤ IHE
  • wp19 nke 3 p. 14-15
  • Anyị Ga-enweli Obi Ụtọ Ugbu A

O nweghị vidio dị maka ihe a ị họọrọ.

Ewela iwe, o nwetụrụ nsogbu gbochiri vidio a ịkpọ.

  • Anyị Ga-enweli Obi Ụtọ Ugbu A
  • Ụlọ Nche Nke Na-ekwusa Alaeze Jehova (Nke Ọhaneze)—2019
  • Isiokwu Nta
  • Isiokwu Ndị Ọzọ Yiri Nke A
  • INWE AFỌ OJUJU
  • IDI ỌRỊA
  • DI NA NWUNYE ỊDỊ N’EZIGBO MMA
  • Mkpịsị Ugodi Abụọ Na-eduga n’Alụmdi na Nwunye Na-adịgide Adịgide
    Isi Ihe Na-akpata Obi Ụtọ Ezinụlọ
  • Ndụ Ezinụlọ—Ụzọ Ị Pụrụ Isi Nwee Ihe Ịga nke Ọma
    Obi Ụtọ—Ụzọ E Si Enweta Ya
  • Mụmụọ Ọnụ Ọchị—Ọ Baara Gị Uru!
    Teta!—2000
  • Ego Ọ̀ Bụ Mkpọrọgwụ nke Ihe Ọjọọ Niile?
    Ajụjụ Ndị Baịbụl Zara
Lee Ihe Ndị Ọzọ
Ụlọ Nche Nke Na-ekwusa Alaeze Jehova (Nke Ọhaneze)—2019
wp19 nke 3 p. 14-15
Ebe otu n’ime ndị sayensị anyị kwuburu okwu ha na nwunye ya na-esi nri

Anyị Ga-enweli Obi Ụtọ Ugbu a

OTU ỤBỌCHỊ, e nweghị onye ga na-arịa ọrịa, kaa nká ma ọ bụ nwụọ. I nwere ike idị ndụ mgbe ahụ. Ma ugbu a, nsogbu na-echi onye ọ bụla ọnụ n’ala. È nwere ihe nwere ike inyere gị aka taa? Baịbụl nwere ike inyere gị aka inwe obi ụtọ ugbu a. Legodị ụfọdụ nsogbu ndị mmadụ na-enwe taa na otú Baịbụl nwere ike isi nyere ha aka.

INWE AFỌ OJUJU

Baịbụl kwuru, sị: “Ka ụzọ ndụ unu bụrụ nke ịhụnanya ego na-adịghị na ya, ka unu nọ na-enwe afọ ojuju n’ihe ndị dị ugbu a.” —Ndị Hibru 13:5.

Taa, e nwere ọtụtụ ihe ndị mmadụ na-ekwu na anyị kwesịrị inwe. Ma, Baịbụl gwara anyị na anyị ga-enweli “afọ ojuju n’ihe ndị dị ugbu a.” Olee otú anyị ga-esi enwe ya?

Ahụla “ego n’anya.” “Ịhụ ego n’anya” na-eme ka ndị mmadụ na-eme ihe ọ bụla ha nwere ike ime iji nweta ego n’agbanyeghị nsogbu o nwere ike ịkpatara ezinụlọ ha, mmekọrịta ha na ndị enyi ha, àgwà ha na ùgwù ha. (1 Timoti 6:10) Ịhụ ego n’anya abaghị uru. E mechaa, “ego agaghịkwa eju onye ọ bụla nke hụrụ akụ̀ n’anya afọ.”—Ekliziastis 5:10.

Jiri ndị mmadụ kpọrọ ihe karịa ihe onwunwe. N’eziokwu, ihe onwunwe bara uru taa. Ma, ha enweghị ike iji anyị kpọrọ ihe ma ọ bụ hụ anyị n’anya. Ọ bụ naanị ndị mmadụ nwere ike ime ihe ndị ahụ. Inwe “ezi enyi” ga-eme ka anyị na-enwe afọ ojuju ná ndụ.—Ilu 17:17.

IME IHE BAỊBỤL KWURU GA-EME KA NDỤ ANYỊ KA MMA TAA

IDI ỌRỊA

Baịbụl kwuru, sị: “Obi nke na-aṅụrị ọṅụ bara uru dị ka ihe na-agwọ ọrịa.”—Ilu 17:22.

Ọṅụ nwere ike inyere anyị aka idi ọrịa anyị otú ahụ ọgwụ nwere ike ịgwọ mmadụ ọrịa. Ma, olee otú anyị ga-esi na-aṅụrị ọṅụ mgbe anyị na-arịa ọrịa?

Na-enwe obi ụtọ. Ọ bụrụ na anyị ana-eche naanị banyere nsogbu anyị, “ụbọchị niile” ga na-adị anyị njọ n’anya. (Ilu 15:15) Kama ịna-echekarị gbasara nsogbu anyị, Baịbụl kwuru ka anyị ‘gosi na anyị bụ ndị nwere ekele.’ (Ndị Kọlọsi 3:15) Na-enwe obi ụtọ maka ihe ọma ndị ị na-ahụ n’agbanyeghị otú ha hà. Ile otú anyanwụ si ama mma mgbe ọ na-ada, ikuku ndụ na-ekusa gị, na ọnụ ọchị onye hụrụ gị n’anya mụmụụrụ gị socha n’ihe ndị nwere ike ime ka obi na-atọ gị ezigbo ụtọ.

Na-emere ndị ọzọ ihe. Ọ bụrụgodị na anyị na-arịa ọrịa, anyị ga-achọpụta na “a na-enweta obi ụtọ ka ukwuu n’inye ihe karịa ka a na-enweta n’ịnara ihe.” (Ọrụ Ndịozi 20:35) Ọ bụrụ na ndị ọzọ ekelee anyị maka ihe anyị meere ha, obi ga-adịkwu anyị ụtọ, ya emeekwa ka anyị ghara ịna-echegbu onwe anyị banyere nsogbu anyị. Anyị nwere ike ime ka ndụ anyị ka mma ma ọ bụrụ na anyị ana-enyere ndị ọzọ aka ka ndụ ha ka mma.

DI NA NWUNYE ỊDỊ N’EZIGBO MMA

Baịbụl kwuru, sị: “Chọpụta ihe ndị ka mkpa.”—Ndị Filipaị 1:10.

Di na nwunye nwere ike itisa ma ọ bụrụ na ha anaghị ewepụta nnukwu oge na-anọrị. Di na nwunye kwesịrị iwere alụmdi na nwunye ha ka otu n’ime ihe ndị kacha mkpa ná ndụ ha.

Na-emekọnụ ihe ọnụ. Kama ime ihe na-amasị gị naanị gị, unu kwesịrị ịhazi ka unu na-emekọ ihe ụfọdụ ọnụ. Baịbụl kwuru na “abụọ dị mma karịa otu.” (Ekliziastis 4:9) Unu nwere ike isikọ nri ọnụ, soro megaa ahụ́, gwukọọ egwu ma ọ bụkwanụ mekọọ ihe ndị ọzọ ọnụ.

Gosi na ị hụrụ di gị ma ọ bụ nwunye gị n’anya. Baịbụl gwara di na nwunye ka ha hụ ibe ha n’anya ma na-asọpụrụ ibe ha. (Ndị Efesọs 5:28, 33) Ịmụmụrụ di ma ọ bụ nwunye gị ọnụ ọchị, ịmakụ ya ma ọ bụ inye ya obere onyinye nwere ike ime ka gị na ya dịkwuo ná mma. Di ma ọ bụ nwunye ekwesịghị ikwu ma ọ bụ mee ihe ọ bụla ga-egosi onye na-abụghị di ma ọ bụ nwunye ya na o nwere mmasị iso ya nwee mmekọahụ.—Ndị Hibru 13:4.

“NDỤ M ATỌWALA M ỤTỌ”

Akụkọ Ryoko Miyamoto si Japan kọrọ.

Ihe siiri m ezigbo ike. Di m bụ onye aṅụrụma, n’ihi ya, o nweghị onye kwere ewe ya n’ọrụ. Ọ chọdịghị ịma otú mụ na ụmụ anyị anọ na-eme. N’agbanyeghị otú m si dọgbuo onwe m n’ọrụ, ihe ka siiri anyị ike. M nọ na-eche, sị: ‘Ihe a ọ̀ bụ akara aka m, ka m̀ na-ata ahụhụ ihe m metere n’ụwa mbụ m?’

Ka ihe a nọ na-enye m nsogbu n’obi, otu Onyeàmà Jehova kụrụ aka n’ọnụ ụzọ m. Ọ mụmụụrụ m ọnụ ọchị ma jiri ịnụ ọkụ n’obi gwa m banyere Alaeze Chineke na ndụ ebighị ebi. Ọ gwara m ka mụ na ya mụwa Baịbụl. Obere oge anyị mụwara Baịbụl, mụ amụta na Chineke dị nakwa na o nwere amamihe, na-ekpe ikpe ziri ezi ma hụ anyị n’anya. M mụtakwara ihe na-eme mmadụ ma ọ nwụọ, mụtakwa na ahụhụ m na-ata abụghị n’ihi akara aka.

Nke kachanụ bụ na m chọpụtara na ihe na-eme ka mmadụ na-enwe obi ụtọ bụ onye ahụ na Chineke ịdị ná mma. Ịmụta eziokwu ndị dị na Baịbụl agbaala m ezigbo ume, mee ka m nwere onwe m, meekwa ka obi na-eru m ala. Ndụ m atọwala m ụtọ.

    Akwukwo Igbo (1984-2025)
    Pụọ
    Banye
    • Igbo
    • Ziga ya
    • Ịgbanwe Ihe
    • Copyright © 2025 Watch Tower Bible and Tract Society of Pennsylvania
    • Ihe Ị Ga-eme na Ihe Ị Na-agaghị Eme
    • Ihe Anyị Ji Ihe Ị Gwara Anyị Eme
    • Kpebie Ihe Ị Ga-agwa Anyị
    • JW.ORG
    • Banye
    Ziga ya