Ilekọta Mkpa Ime Mmụọ nke Ndị Ntị Chiri
1 A na-adọta ọnụ ọgụgụ na-arị elu nke ndị ntị chiri bịa n’ebe Onye Ọzụzụ Atụrụ Ọma ahụ nọ, ha na-abatakwa ná mmekọrịta a raara nye Jehova Chineke. (Jọn 10:3, 11) Ndị ọzọ n’ime ọgbakọ, karịsịa ndị okenye, aghaghị ịmụrụ anya n’ebe mkpa ime mmụọ nke ụmụnna anyị ndị nwoke na ndị nwanyị ntị chiri dị.
2 Ịhụ Maka Mkpa Ndị Ntị Chiri: A na-eme ndokwa ịsụgharị ihe omume nzukọ ọgbakọ gaa n’asụsụ maka ndị ogbi na ndị ntị chiri n’ebe ọ bụla e nwere ndị nsụgharị ruru eru. Ọ bụrụ na ọ dịghị onye maara asụsụ maka ndị ogbi na ndị ntị chiri n’ọgbakọ, ọ pụrụ ikwesị ekwesị iduzi ndị ntị chiri gaa n’ọgbakọ dị nso, nke pụrụ ije ozi a. Otú ọ dị, ọ bụrụ na e nweghị ndokwa dị otú ahụ n’ógbè unu n’ozuzu ya, ọ pụrụ ikwe omume ka ndị nkwusa a họpụtara na-anọdụ ala n’akụkụ ndị ntị chiri otu onye n’otu oge ma soro ha na-ekerịta ihe ndị ha dere n’isi ihe ndị a na-atụle.
3 Ndokwa Sekit na Ọgbakọ: Onye nlekọta sekit na-eduzi ndokwa ndị e mere maka ịsụgharị asụsụ maka ndị ogbi na ndị ntị chiri ná mgbakọ sekit na n’ụbọchị mgbakọ pụrụ iche. A pụrụ ịhọpụta otu okenye ma ọ bụ ohu na-eje ozi nke ruru eru dị ka onye na-ahụ maka ya. A pụrụ ikenye ụmụnna nwoke na ụmụnna nwanyị ruru eru na-egosi ihe nlereanya ọma ka ha kere òkè n’ịsụgharị usoro ihe omume mgbakọ. A pụrụ ịgbaso otu ụkpụrụ ahụ n’ọgbakọ, na-ejide n’aka na e lekọtara mkpa nke ndị ntị chịrị n’ụzọ kwesịrị ekwesị.
4 Ọ ka mma ka ndị ntị chiri nọrọ n’ebe ha pụrụ ịdị na-ahụ ma ndị ahụ na-asụ asụsụ ndị ogbi na ndị ntị chiri ma ebe ikpo okwu n’otu mgbe. Nke a bụ eziokwu ma ná nzukọ ọgbakọ ma ná mgbakọ sekit. Ná nzukọ ọgbakọ, ọ ka mma ka onye ahụ na-asụ asụsụ ndị ogbi na ndị ntị chiri nọdụ ala ma ọ bụrụ na ọnụ ọgụgụ ndị ntị chiri bịaranụ dị nta. Ọ bụrụ na o kwe mee, ndị okenye ga-eme nke ọma ịkpọtụrụ otu nwanna ntị chiri nke tozuru okè maka aro ndị doro anya ná ndokwa ịnọ ọdụ kwesịrị ekwesị.
5 Ọ bụrụ na e nwere onye ruru eru na-asụ asụsụ ndị ogbi na ndị ntị chiri nke na-eje ozi dị ka okenye ma ọ bụ ohu na-eje ozi, ọ bụrụkwa na ọnụ ọgụgụ ụmụnna nwoke na ụmụnna nwanyị ntị chiri emee ka ọ dị mkpa, ndị okenye pụrụ ikpebi ka e duzie nzukọ ụfọdụ kpam kpam n’asụsụ maka ndị ogbi na ndị ntị chiri. Ọmụmụ Akwụkwọ Ọgbakọ pụrụ ịbụ nzukọ kwa izu mbụ a pụrụ idokwa n’ụzọ dị otú ahụ. Ọ bụrụ na ọgbakọ ga-enwe mmasị inwe nzukọ ise ndị ọzọ a na-enwe kwa izu n’asụsụ maka ndị ogbi na ndị ntị chiri (ma ọ bụ n’asụsụ ọ bụla ọzọ na-abụghị Bekee), ndị okenye kwesịrị ịgwa Society banyere ọchịchọ ha. E kwesịrị ịrịba ama na ihe ka n’ọnụ ọgụgụ ndị meworo okenye ná ndị ntị chiri ná mba a na-enwe mmasị n’asụsụ maka ndị ogbi na ndị ntị chiri.
6 Ọ bụ ezie na nkwurịta okwu n’etiti ndị ntị chiri na ndị na-anụ ihe pụrụ ịchọ mgbalị pụrụ iche n’aka ìgwè abụọ ahụ, ndị òtù nile nke ọgbakọ kwesịrị ịgbalị ịmata ibe ha ka e wee nwee ezi mgbarịta ume. (Hib. 10:24) Mmụọ nke a dị n’etiti ụmụnna ga-eme ka ndị ọhụrụ nile nwee ntụsara ahụ.