Mmadụ Nile Nwere Obi Ụtọ ná Mwepụta nke Akwụkwọ Ọhụrụ ná Mgbakọ Distrikti
Akwụkwọ Ọhụrụ Na-eme Ka Ihe Ọmụma Chineke Pụta Ìhè
1 Ná mgbakọ distrikti anyị gara aga, lee ọṅụ anyị nwere n’usoro ihe omume ahụ dum! N’ehihie Saturday ọṅụ anyị jubigara ókè mgbe anyị nụrụ ịma ọkwa banyere akwụkwọ ọhụrụ ahụ, Ihe Ọmụma nke Na-eduba ná Ndụ Ebighị Ebi, na ihe ọmụma metụtara ya bụ́ nke sochirinụ. Ọtụtụ ijeri mmadụ n’ụwa nwere mkpa nke ihe ọmụma nke ọ bụ nanị Chineke pụrụ inye—ihe ọmụma banyere Chineke na Ọkpara ya, bụ́ Jisọs Kraịst.—Ilu 2:1-6; Jọn 17:3.
2 Lee ka onye ọkà okwu ahụ siri kọwaa akụkụ dị iche iche nke akwụkwọ ahụ nke ọma! Isiokwu isiakwụkwọ ndị na-adọrọ mmasị, ihe atụ ndị dị irè, nkọwa dị mma nke eziokwu ahụ, ajụjụ ndị na-adịghị mgbagwoju anya, na ná ngwụsị nke isiakwụkwọ nke ọ bụla, otu igbe isiokwu ya bụ “Nwalee Ihe Ọmụma Gị” so n’ime akụkụ dị iche iche nke ga-amasị ndị nile na-agụ ya. Ma ndị anyị na-akụziri Bible ga-erite uru karịsịa ka ha na-amụta ozizi ndị bụ isi nke Bible n’ụzọ dị ngwa.
3 N’oge okwu mmechi na Saturday na Sunday, a gbara anyị ume iji akwụkwọ ọhụrụ a na-enwe ọmụmụ ihe ezinụlọ. Ka ọ dị ugbu a, ikekwe anyị amatawo ihe ndị dị n’ime ya nke ọma. Obi abụọ adịghị ya na unu ekwurịtawo isi ihe ndị a ga-eburu n’uche mgbe a na-enyefe akwụkwọ ọhụrụ a n’ubi.
4 Isi Ihe Ndị A Ga-atụle: Ị pụrụ icheta na mgbe ọ na-ekwu okwu n’isiokwu bụ́ “Ihe Mere Ihe Ọmụma Chineke Ji Dị Ihe A Kpọrọ Mmadụ Mkpa,” ọkà okwu ahụ mesiri isi ihe ole na ole ike, tinyere ndị na-esonụ: (1) Mgbe i ji akwụkwọ a na-eduzi ọmụmụ ihe, amamihe adịghị ya iwebata ihe ọmụma na-esiteghị n’akwụkwọ ahụ, bụ́ nke pụrụ ikpuchi ihe ndị bụ isi; lekwasị anya nanị n’iwepụta ihe akwụkwọ ahụ na-egosipụta n’isiakwụkwọ nke ọ bụla. (2) Isiakwụkwọ dị iche iche etobigaghị ogologo ókè, nke mere na ọtụtụ mgbe ị pụrụ ịmụcha otu n’oge nke ọ bụla unu mụrụ ihe. (3) Ná ngwụsị nke isiakwụkwọ nke ọ bụla, ajụjụ ndị dị n’igbe nke isiokwu ya bụ “Nwalee Ihe Ọmụma Gị” ga-enye ntụleghachi dị nkenke.
5 Iji Ya Eme Ihe n’Ọmụmụ Bible: Ọtụtụ ndị nkwusa ajụwo ma ò kwesịrị ekwesị ịgbanwe ọmụmụ Bible ha gaa n’akwụkwọ ọhụrụ a. Ọ bụrụ na unu agamiwo n’akwụkwọ a na-amụ ugbu a, ọ ga-abụ ihe kwesịrị ekwesị ịmụcha akwụkwọ ahụ. Ma ọ́ bụghị otú ahụ, a na-atụ aro ka ị gafee n’akwụkwọ Ihe Ọmụma. Ọ bụrụ na i ji broshuọ ma ọ bụ traktị malite ọmụmụ Bible, webata akwụkwọ ọhụrụ ahụ n’oge kwesịrị ekwesị, jirikwa ya mee ihe maka ọmụmụ ihe ahụ. Ihe ọmụma banyere iji akwụkwọ Ihe Ọmụma ahụ eme ihe ga-apụtakwu n’Ozi Alaeze Anyị n’ọnwa ndị dị n’ihu.
6 Jehova ewepụtawo akwụkwọ ọhụrụ a iji nyere anyị aka ịkụziri ndị ọzọ ihe banyere ihe ọmụma nke na-eduba ná ndụ ebighị ebi. Ugbu a ọ dị anyị mkpa ịkwadebe nke ọma ma kere òkè zuru ezu n’ọrụ a ka gaje ịrụ.