Tụkwasịnụ Uche Unu n’Ihe Ndị Dị n’Elu
1 N’ikwu okwu n’ọgbọ gbara anyị gburugburu na echiche ya n’ọdịnihu, otu isiokwu dị n’akwụkwọ akụkọ The New York Times nke December 31, 1994, sịrị: “Ha na-atụ ọdịnihu egwu. Ha na-atụ ya egwu n’ihe metụtara ọrụ, n’ihe metụtara ọrịa, n’ihe metụtara ọnọdụ akụ̀ na ụba, n’ihe metụtara ọnọdụ ụwa.” Ebe ọ bụla anyị lere anya, e nwere mmetụta nke mgbagwoju anya banyere ndụ. Ozi anyị dị ka Ndịàmà Jehova na-adọta anyị nso kwa ụbọchị na nke ndị mmadụ na-eche echiche n’ụzọ dị otú a. Ọ bụ ezie na anyị na-eche otu nsogbu ahụ ihu dị ka ha na-eche ha, okwukwe na obi ike anyị ná nkwa ndị e ji n’aka nke Okwu Chineke na-eme ka anyị nwee echiche dị nnọọ iche ná ndụ na ọdịnihu nke ihe a kpọrọ mmadụ.—Aịsa. 65:13, 14, 17.
2 Nchekwube na echiche anyị banyere olileanya e ji n’aka pụrụ ime ka ọtụtụ ndị nwere obi eziokwu gee ntị n’ozi anyị na-ewetara ha. Ọ na-abụrụ ọtụtụ ndị dara mbà n’obi na ndị e wedara n’ala ihe nkasi obi iso anyị kwurịta okwu. N’ihi na ihe ha na-anụ na-amasị ha, ụfọdụ na-ekwenyere isoro anyị na-amụ Bible. Otú ọ dị, mgbe ụfọdụ, ndị mmadụ pụrụ ibu ụzọ chọọ ikwu banyere nsogbu nke aka ha. Ọ bụ ezie na a pụrụ iji oge ụfọdụ gee ntị ná nchegbu nke aka mmadụ, anyị ekwesịghị ichefu ebumnobi anyị, nke bụ ịkụziri ndị mmadụ eziokwu ziri ezi nke Okwu Chineke.
3 Anyị chọrọ igosi ndị e boworo ibu dị arọ obi ebere. Jisọs setịpụrụ ihe nlereanya mgbe ọ sịrị, dị ka e dekọrọ na Matiu 11:28: “Bịakwutenụ m, unu nile ndị na-adọgbu onwe unu n’ọrụ, ndị e bowokwara ibu dị arọ.” Anyị kwesịrị ịgba ndị mmadụ ume n’otu ụzọ ahụ. Otú ọ dị, rịba ama, ná mmechi nke amaokwu nke 28, Jisọs sịrị: “Mụ onwe m ga-emekwa ka unu zuru ike.” Nke ahụ kwesịrị ịbụ nzube anyị. Anyị na-eme nke ahụ site n’ikerịta nkwa ndị na-enye ume ọhụrụ site n’Okwu Chineke. Ịbụ ezi onye na-ege ntị na-egosi mmasị onwe onye na nchegbu anyị, ọ dịkwa mkpa iji rụzuo ọrụ anyị nke ikwusa ozi ọma nke Alaeze, na-enyere ndị ọzọ aka ịghọta na Alaeze ahụ bụ nanị ngwọta e ji n’aka maka nsogbu nile nke ihe a kpọrọ mmadụ.—Mat. 24:14.
4 Ọrụ anyị abụghị nke ndị ọkachamara n’ọrụ nlekọta ahụ ike. Kama nke ahụ, ọ bụ dị ka Pọl onyeozi kọwara, dị ka a rịbara ama na 1 Timoti 4:6, ozi nke na-elekwasị anya ‘n’ozizi ọma,’ ozizi ndị a na-achọta n’Okwu Chineke. Ọ pụrụ ịdị mkpa ịgba ndị na-enwe nsogbu onwe onye ma ọ bụ nke mmetụta uche ume ịdabere na Jehova. Kụziere ha ‘ịtụkwasị uche ha n’ihe dị n’elu’—ihe ndị metụtara olileanya Alaeze ahụ. (Kọl. 3:2) Mgbe ndị mmadụ tụkwasịrị uche ha n’Okwu Chineke, a pụrụ iwuli ha elu n’ihi mmetụta dị ike ọ na-enwe ná ndụ ha.—Hib. 4:12.
5 Ya mere ihe mgbaru ọsọ anyị bụ inyere ndị mmadụ aka ịnọgide na-eche echiche n’ihe ndị ‘ziri ezi, dị ọcha, kwesịrị ịhụnanya, ma kwesịkwa otuto.’ (Fil. 4:8) Ọ bụrụ na ha atụkwasị uche n’olileanya Alaeze ahụ, a ga-agọzi ha n’otu ụzọ ahụ e si agọzi anyị. Ha ga-enwekwa ọṅụ ahụ nke na-abịa site n’ihe ọmụma bụ na Jehova ga-emesịa gwọta nsogbu ha nile site n’Alaeze ya.—Abụ Ọma 145:16.