Inyefe Akwụkwọ Nwoke Kasị Ukwuu nke Dịworo Ndụ
1 December bụ ọnwa mara mma inyefe akwụkwọ Nwoke Kasị Ukwuu nke Dịworo Ndụ. Ndị na-ekwu na ha bụ ndị Kraịst na-eche echiche banyere Jisọs n’ime ọnwa a karịa n’oge ọ bụla ọzọ n’afọ. Anyị nile kwesịrị iji ọnwa a mee ihe n’ụzọ zuru ezu iji ohere ọ bụla dapụtaranụ nyefee akwụkwọ ọma a, nke nwere ọtụtụ ihe osise banyere Jisọs Kraịst. Ụzọ iche ihe n’ihu dị mfe bụ nanị ihe pụrụ ịdị anyị mkpa iji kpalie mmasị n’akwụkwọ ahụ.
2 Mgbe i kelesịrị onye nwe ụlọ, ị pụrụ ikwu ihe yiri nke a:
◼ “Ụwa enwewo ndị ikom a ma ama, ndị nweworo ihe e jiri mara ha n’akụkọ. A na-atụ ndị ikom a ma ama n’ihe ọ̀tụ̀tụ̀ site n’ihe ha hapụrụ ka ha tolite ma dịgide mgbe ha nwụsịrị. N’echiche gị, ònye bụ nwoke kasị ukwuu nke dịworo ndụ? [Nye ohere maka nzaghachi.] Otu eze kwuru n’otu oge banyere Jisọs Kraịst, sị: ‘Lee, Nwoke ahụ!’ (Jọn 19:5) N’oge ọ dịrị ndụ a matara ya dị ka nwoke kasị ukwuu nke dịworo ndụ. Ma gịnị banyere oge anyị? Ọ̀ ka bụ nwoke kasị ukwuu nke dịworo ndụ?” Sapeta okwu mmalite nke akwụkwọ ahụ ma gụpụta paragraf nke 2 na 3. Kọwaa na ndị ọkọ akụkọ ihe mere eme na ndị eze ukwu mesiri ya ike na Jisọs bụ nwoke kasị ukwuu nke dịworo ndụ. Ka onye nwe ụlọ wee nwee ike ịmụtakwu ihe mere Jisọs jiri bụrụ nwoke dị ukwuu otú ahụ, nyefee akwụkwọ ahụ n’ụtụ a na-enyefe ya. Dokwaa ịbịaghachi maka inwekwu mkparịta ụka.
3 Mgbe ị kọwasịrị onwe gị, ị pụrụ ịsị:
◼ “Echiche banyere Jisọs Kraịst dị n’uche ọtụtụ ndị. E nwere mmasị n’ebe ọ nọ, hụkwa ya n’anya n’ihi ịdị mma ya. Gịnị ka i chere—a sị na Jisọs Kraịst bụ onye na-achị ụwa nke a, ọ́ gaghị abụ ebe ka mma ibi n’ime ya? [Nye ohere maka nzaghachi.] Ọ̀ dị mgbe ọ ga-ekwe omume Jisọs Kraịst ịchị anyị n’onwe ya? [Gụọ Aịsaịa 9:6, 7.] E buru Jisọs Kraịst n’amụma ịbụ onye ga-ewetara ihe a kpọrọ mmadụ ezi udo na nke na-adịgide adịgide. Akwụkwọ a, Nwoke Kasị Ukwuu nke Dịworo Ndụ, ga-emesi gị obi ike na n’isi nso ịchịisi Jisọs ga-agbanwe ụwa ịghọ ebe obi ụtọ.” Zoo aka n’isi nke 132 ma nyefee akwụkwọ ahụ n’ụtụ a na-enyefe ya.
4 Ị pụrụ ịhọrọ iji okwu mmalite a mee ihe:
◼ “Anyị na-ajụ ndị agbata obi anyị ihe ha chere: È nwere ụzọ ndị anyị pụrụ isi bịarukwuo Kraịst nso? [Nye ohere maka nzaghachi.] Ihe ọmụma zuru ezu karị banyere ndị ọzọ dị mkpa maka ọbụbụenyi chiri anya. A chọghị ihe dị ala karị n’aka anyị iji bịarukwuo Jisọs Kraịst nso. Ọ dị anyị mkpa ịmata onye ọ bụ n’ezie dị ka mmadụ, ihe ndị o mere site n’ụbọchị ruo n’ụbọchị, ahụhụ ya, mmetụta uche ya, na akụkụ ọ bụla nke ozi ya. Ihe ọmụma dị otú ahụ banyere Jisọs Kraịst dị mkpa ma ọ bụrụ na anyị ga-enweta ndụ ebighị ebi. [Gụọ Jọn 17:3.] Akwụkwọ a, Nwoke Kasị Ukwuu nke Dịworo Ndụ, bụ akụkọ zuru ezu banyere Jisọs nke ga-enyere gị aka inweta ezi ihe ọmụma dị otú ahụ banyere ya.” Chee akwụkwọ ahụ n’ihu ya n’ụtụ a na-enyefe ya, meekwa ndokwa ndị doro anya maka nletaghachi.
5 A pụrụ iji ụzọ ịga n’ihu kpọmkwem mee ihe ịmalite ọmụmụ Bible, na-eji okwu mmalite a dị nkenke:
◼ “Anyị na-egosi ndị agbata obi anyị ihe a na-enye aka n’ọmụmụ Bible. Ọ bụ nnọọ banyere Jisọs Kraịst. Ị̀ hụbuwo ya? [Nye ohere maka nzaghachi.] N’ime minit ole na ole m ga-achọ igosi gị otú a pụrụ isi jiri ya na Bible nke gị mee ihe.” Sapeta isi nke 59 ma tụlee paragraf nke 1 ruo 4. Nyefee akwụkwọ ahụ.
6 Ọ bụrụ na anyị kwadebere nke ọma, anyị ga-enwe ike inyere ndị ọzọ aka ime ka mmasị ha n’ebe Jehova na Ọkpara ya bụ́ Jisọs Kraịst nọ mikwuo emi. Jiri ohere ọ bụla i nwere nyefee akwụkwọ Nwoke Kasị Ukwuu n’ọnwa December nke a.