Mkpughe—Mkpịsị Ugodi nke Ezi Obi Ụtọ
1 Okwu Jọn onyeozi ná Mkpughe 1:3 bụ ozi ọma nye anyị n’ihi na ọ na-agwa anyị otú e si achọta obi ụtọ. O dere, sị: “[Obi ụtọ, NW] na-adịrị onye na-agụ, na ndị na-anụ okwu nile nke amụma nke a, ndị na-edebekwa ihe nile e deworo n’ime ya.” Akwụkwọ bụ́ Mkpughe—Mmezu Ya Dị Ebube Dị Nso! enyeworo ọtụtụ ndị aka n’ịchọta obi ụtọ dị ukwuu. Anyị nwere ezi ihe mere anyị ga-eji nyefee ya ndị ọzọ.
2 Ị pụrụ inwe ike iji ajụjụ a malite mkparịta ụka:
◼ “Ì chere na e dere akwụkwọ Bible bụ́ Mkpughe ka a ghọta ya, ka ọ̀ ga-anọgide na-abụ ihe omimi mgbe nile? [Nye ohere maka nzaghachi.] Ọtụtụ ndị nwere otu echiche ahụ i nwere. Rịba ama ihe Bible na-ekwu ná Mkpughe 1:3. [Gụọ.] Ya mere a pụrụ ịghọta Mkpughe, ihe ọmụma dị n’ime ya pụkwara iwetara anyị obi ụtọ. Olee otú nke a pụrụ isi kwe omume?” Tụlee echiche ndị dị na paragraf nke 2 na peji nke 6, mgbe ahụkwa kwuo, sị: “Akwụkwọ a na-egosi ntụle amaokwu kwa amaokwu nke akwụkwọ Mkpughe. O kwesịrị ekwesị ka i wepụta oge iji gụọ ya. Ọ ga-amasị m ịhapụrụ gị nke a n’ụtụ ₦240.”
3 Ebe ọ bụ na ọtụtụ ndị na-echegbu onwe ha banyere igbo mkpa ihe onwunwe ha, nke a pụrụ ịkpali mmasị:
◼ “Gịnị ka i chere na ọ bụ mkpa kasị ukwuu anyị nwere? [Nye ohere maka nzaghachi.] E nwere ọtụtụ ndị e mere ka ha kwere na ihe onwunwe ka ukwuu dị anyị mkpa.” Sapeta peji nke 73 ma tụlee isi ihe ndị gbara ọkpụrụkpụ n’igbe isiokwu ya bụ “Ịhụ Ihe Onwunwe n’Anya Megide Amamihe.” Gaa n’ihu site n’ịsị: “Nke a na-egosi na a na-emesi ihe anụ ahụ ike gabiga ókè; anyị kwesịrị inwe nchegbu ka ukwuu banyere mkpa ime mmụọ anyị. Ihe dị anyị mkpa n’ezie bụ ezi ihe ọmụma. Ma ọ̀ bụ ihe ọmụma banyere gịnị?” Gụọ Jọn 17:3, ma kọwaa ụzọ ihe ọmụma banyere Chineke pụrụ isi duba ná ndụ ebighị ebi. Nyefee akwụkwọ ahụ n’ụtụ a na-enye ya, meekwa ndokwa ịbịaghachi ma gosi otú o si ekpughe ihe ọmụma ndị dị ebube banyere nzube Chineke igbo mkpa nile nke ihe a kpọrọ mmadụ.
4 Ebe ọ bụ na ọtụtụ na-enwe nchegbu banyere nhụjuanya dị n’ụwa, ị pụrụ ịnwale nke a:
◼ “Onye ọ bụla m gwara okwu na-enwe nchegbu banyere ọdịnihu. Ụfọdụ ndị ndú ụwa chere na anyị na-aga ịbanye n’ọgbọ ọhụrụ nke udo. Gịnị bụ echiche gị banyere nke ahụ? [Nye ohere maka nzaghachi.] N’agbanyeghị mgbalị nile nke ụmụ mmadụ, ime ihe ike na nhụjuanya nọgidere na-aba ụba n’ụwa nile. Bible na-ekpughe nanị ngwọta na-adịgide adịgide nye nsogbu ndị a. [Gụọ 2 Pita 3:13. Sapeta ihe osise dị na peji nke 302, kọwaakwa otú Alaeze eluigwe Chineke ga-esi weta udo na ịnọ ná ntụkwasị obi na-adịgide adịgide n’ụwa nke a.] Akwụkwọ a ga-enyere gị aka ịhụ otú ị pụrụ isi bụrụ akụkụ nke ọha mmadụ ọhụrụ nke a, bụ́ ndị ga-adị ndụ ruo mgbe ebighị ebi n’okpuru ịchịisi nke Alaeze Chineke.”
5 Ọ bụrụ na i zute onye ji ọrụ n’aka, nke na ị ghaghị igbu ya nkenke, ị pụrụ ikwu nke a:
◼ “Ebe ọ bụ na i nwere oge dị nta, ọ ga-amasị m ịhapụ traktị a [ma ọ bụ isiokwu magazin] a kpọrọ [họpụta traktị ma ọ bụ isiokwu kwesịrị ekwesị] Ana m agba gị ume ka ị gụọ ya. N’oge ọzọ m ga-abịa, aga m achọ ịmata ihe i chere banyere ya.”
6 Mgbe ị na-enyefe akwụkwọ anyị, nye ndị ọzọ ohere iji gosi ekele ha site n’inye onyinye maka akwụkwọ ahụ n’ụzọ e si enye ya. Ihe ọmụma dị n’ime akwụkwọ ahụ ga-etinye ihe n’obi ụtọ ha ga-enwe site n’ịghọta ihe amụma ndị dị ebube nke Mkpughe pụtara.—Ilu 3:13.