Ọ́bá Akwụkwọ Anyị NKE DỊ N'ỊNTANET
Ọ́bá Akwụkwọ Anyị
NKE DỊ N'ỊNTANET
Igbo
Ọ
  • Á
  • á
  • À
  • à
  • É
  • é
  • È
  • è
  • Ì
  • ì
  • Í
  • í
  • Ị
  • ị
  • Ị̀
  • ị̀
  • Ị́
  • ị́
  • Ḿ
  • ḿ
  • M̀
  • m̀
  • Ṅ
  • ṅ
  • Ò
  • ò
  • Ó
  • ó
  • Ọ
  • ọ
  • Ọ̀
  • ọ̀
  • Ọ́
  • ọ́
  • Ù
  • ù
  • Ú
  • ú
  • Ụ
  • ụ
  • Ụ̀
  • ụ̀
  • Ụ́
  • ụ́
  • BAỊBỤL
  • AKWỤKWỌ NDỊ ANYỊ NWERE
  • ỌMỤMỤ IHE
  • km 2/96 p. 4
  • Nyere Ha Aka Ịghọta

O nweghị vidio dị maka ihe a ị họọrọ.

Ewela iwe, o nwetụrụ nsogbu gbochiri vidio a ịkpọ.

  • Nyere Ha Aka Ịghọta
  • Ozi Alaeze Anyi—1996
  • Isiokwu Ndị Ọzọ Yiri Nke A
  • Iji Echiche nke Ịdị Ngwa Na-eche Ozi Ọma ahụ n’Ihu Mmadụ
    Ozi Alaeze Anyi—1997
  • Mkpughe—Mkpịsị Ugodi nke Ezi Obi Ụtọ
    Ozi Alaeze Anyi—1996
  • Ihe Ọmụma Sitere n’Aka Chineke Na-aza Ọtụtụ Ajụjụ
    Ozi Alaeze Anyi—1997
  • Nyere Ndị Ọzọ Aka Inweta Ihe Ọmụma nke Na-eduba ná Ndụ
    Ozi Alaeze Anyi—1996
Lee Ihe Ndị Ọzọ
Ozi Alaeze Anyi—1996
km 2/96 p. 4

Nyere Ha Aka Ịghọta

1 Pita onyeozi kwenyere na ụfọdụ ihe ndị e kwuru n’ime Bible “dị ike ịghọta.” (2 Pita 3:16) Ọtụtụ echewo otú ahụ banyere akwụkwọ Mkpughe. Otú ọ dị, e mewo ka ihe ọ pụtara doo anya nke ọma n’akwụkwọ bụ́ Mkpughe—Mmezu Ya Dị Ebube Dị Nso! Olee otú anyị pụrụ isi nyere ndị nwere mmasị aka iji ya mee ihe n’ụzọ kasị mma?

2 Ọ bụrụ na unu tụlere Mkpughe 1:3 n’ọbịbịa mbụ gị, echiche nke a pụrụ ịkpali mmasị e mere ka ọ dịghachi ọhụrụ:

◼ “N’oge gara aga anyị tụlere otú nghọta nke akwụkwọ Mkpughe pụrụ isi weta obi ụtọ. Otú ọ dị, obi ụtọ dị otú ahụ adịghị abịa na mberede. Ma ọ́ dịghị ihe ọzọ a chọrọ ihe abụọ n’aka anyị: Anyị aghaghị ịmụ Bible, anyị aghaghịkwa itinye ihe anyị na-amụta n’ọrụ.” Gụọ ma kọwaa Jemes 1:25. Sapeta paragraf nke 9 na peji nke 8, gosipụtakwa otú nghọta nke akwụkwọ Mkpughe pụrụ isi nyere anyị aka ịmụta otú anyị pụrụ isi nweta obi ụtọ n’ime paradaịs ụwa ọhụrụ.

3 Ọ bụrụ na unu tụlere Jọn 17:3 n’ọbịbịa mbụ gị, ị pụrụ imesi ike mkpa ọ dị inwetakwu ihe ọmụma Bible site n’ịsị:

◼ “N’oge ikpeazụ m bịara ebe a, anyị gụrụ na Jọn 17:3 na inweta ihe ọmụma banyere Chineke pụrụ iduba ná ndụ ebighị ebi. Ma ị̀ ga-achọ ịdị ndụ ebighị ebi n’ime ụdị ụwa nke anyị bi n’ime ya taa? [Nye ohere maka nzaghachi.] Ihe ka ọtụtụ n’ọnụ ọgụgụ agaghị achọ. N’ihi nke a, anyị pụrụ ịṅụrị ọṅụ mgbe anyị nụrụ ihe Chineke kweworo ná nkwa.” Sapeta paragraf nke 6 na peji nke 303, gụọ Mkpughe 21:4, kọwaakwa ihe ụwa ga-adị ka ya mgbe ‘ihe mbụ nile gabigaworo.’ Kwuo na ị ga-alaghachi ọzọ maka inwekwu mkparịta ụka.

4 Ọ bụrụ na i ji ihe osise dị na peji nke 302 gosi na Alaeze Chineke ga-eweta nhụjuanya ná njedebe, ị pụrụ ịsaghe akwụkwọ ahụ na peji ahụ ọzọ ma kwuo, sị:

◼ “Anyị tụlere ngọzi ndị e gosiri n’ebe a nke ndị mmadụ ga-anụ ụtọ ha n’okpuru ịchịisi Alaeze Chineke. Gịnị ka i chere na anyị aghaghị ime ma ọ bụrụ na anyị chọrọ ibi n’okpuru Alaeze ahụ? [Nye ohere maka nzaghachi.] Ụfọdụ ndị n’oge Bible setịpụrụ ihe ilereanya magburu onwe ya nke anyị ga-eme nke ọma iṅomi.” Gụọ Ọrụ 17:11, na-emesi ike mkpa ọ dị ‘inyocha Akwụkwọ Nsọ kwa ụbọchị.’ Kọwaa na Ndịàmà Jehova na-enyere ndị nọ n’ógbè ha nwere obi eziokwu aka ịmụ Okwu Chineke na ịghọta ya n’ụzọ ka mma.

5 Ọ bụrụ na ị hapụrụ traktị bụ́ “Ụwa nke A Ọ̀ Ga-alanarị?” n’aka onye nwe ụlọ nke ji ọrụ n’aka nke na ọ pụghị ikwurịta okwu, ị pụrụ iji ụzọ nke a mee ihe:

◼ “Mgbe m bịara n’oge na-adịbeghị anya, i ji nnọọ ọrụ n’aka. Ahapụụrụ m gị otu traktị nke welitere otu ajụjụ banyere nlanarị nke ụwa a gabiga oge ọjọọ ndị a. Anyị gụrụ Mkpughe 21:4, bụ́ nke e hotara n’ebe a n’akwụkwọ a bụ́ Mkpughe—Mmezu Ya Dị Ebube Dị Nso! [Gụpụta ya malite na paragraf nke 6 na peji nke 303.] Ihe osise a [na peji nke 302] na-enye gị echiche nke ihe ọ ga-adị ka ya mgbe ‘Chineke hichapụrụ anya mmiri nile n’anya anyị.’ Akwụkwọ a na-enye ihe àmà na-emesi obi ike na nkwa a ga-emezu n’ọdịnihu dị nso. Ọ bụrụ na ị ga-achọ ịgụ ya, nke a bụ nke gị n’ụtụ ₦240.”

6 Ọ bụrụ na ị hụtara mmasị, ị ga-emesịa chọọ ịdọrọ mmasị gaa n’akwụkwọ Ihe Ọmụma nke Na-eduba ná Ndụ Ebighị Ebi ma jiri ya mee ihe ịmalite ọmụmụ ihe. Ị ga-enwe ọṅụ bara ụba n’inyere ‘ndị na-enweghị uche aka ịghọta ihe.’—Abụ Ọma 119:130.

    Akwukwo Igbo (1984-2025)
    Pụọ
    Banye
    • Igbo
    • Ziga ya
    • Ịgbanwe Ihe
    • Copyright © 2025 Watch Tower Bible and Tract Society of Pennsylvania
    • Ihe Ị Ga-eme na Ihe Ị Na-agaghị Eme
    • Ihe Anyị Ji Ihe Ị Gwara Anyị Eme
    • Kpebie Ihe Ị Ga-agwa Anyị
    • JW.ORG
    • Banye
    Ziga ya