Akwụkwọ Ozi Jems Dere
1 Mụnwa bụ́ Jems,+ ohu Chineke na ohu Onyenwe anyị Jizọs Kraịst, na-edetara ebo iri na abụọ bi n’ebe dị iche iche akwụkwọ:
Ana m ekele unu.
2 Ụmụnna m, ṅụrịanụ ọṅụ mgbe ọnwụnwa dị iche iche bịaara unu,+ 3 n’ihi na unu ma na unu merie ọnwụnwa ndị ahụ, okwukwe unu ga-esikwu ike, unu enwekwuokwa ike ịna-atachi obi ma ọnwụnwa bịa.+ 4 Ọ bụrụkwa na unu ana-atachi obi mgbe niile, ọ ga-eme ka unu zụọ onwe unu nke ọma, nwee ike izu ezu, na-emekwa nke ọma n’ihe niile, n’enweghị ihe ọ bụla kọrọ unu.+
5 Ọ bụrụkwa na e nwere onye n’ime unu chọrọ amamihe,* ya na-arịọ Chineke+ n’ihi na Chineke na-emesapụrụ mmadụ niile aka. Ọ gaghị ewesa ya iwe,*+ kama ọ ga-emere ya ihe ọ rịọrọ.+ 6 Ma, o kwesịrị inwe okwukwe mgbe ọ na-arịọ ya.+ O kwesịghị inwe obi abụọ ọ bụla.+ N’ihi na onye nwere obi abụọ dị ka ebili mmiri nke oké osimiri, nke ifufe na-akwagharị, na-enugharịkwa. 7 N’eziokwu, onye dị otú ahụ ekwesịghị iche na ọ ga-anata ihe ọ bụla n’aka Jehova.* 8 Ọ bụ onye na-amaghị ihe ọ ga-eme eme,+ ọ naghịkwa akwụsi ike n’ihe niile ọ na-eme.
9 Ka nwanna ọ na-enweghị ka ọ hà ya na-enwe aṅụrị* n’ihi elu e buliri ya.+ 10 Ka onye bara ọgaranya nweekwa aṅụrị n’ihi ala e wedara ya,+ n’ihi na ọ ga-ala n’iyi ka okooko osisi. 11 N’ihi na ọ na-abụ anwụ chawa, e nwee oké okpomọkụ, ahịhịa ndụ akpọnwụọ, okooko ya adapụsịa, mma ọ mara alaakwa n’iyi. Otú ahụkwa ka ọgaranya ga-akpọnwụ ka ọ na-achụ akụnụba.+
12 Onye na-atachi obi n’ọnwụnwa na-enwe obi ụtọ,+ n’ihi na o dichaa ọnwụnwa ahụ, Jehova* ga-enye ya ndụ,+ nke bụ́ ụgwọ ọrụ o kwere nkwa ịkwụ* ndị na-akwụsịghị ịhụ ya n’anya.+ 13 Ka onye ọnwụnwa bịaara ghara ịsị: “Ọ bụ Chineke na-anwa m.” N’ihi na o nweghị onye nwere ike iji ihe ọjọọ nwaa Chineke, Chineke anaghịkwa eji ihe ọjọọ anwa onye ọ bụla. 14 Kama ọ bụ ihe na-agụ mmadụ agụụ na-anwa onye ahụ, nwata ya.+ 15 Mgbe ihe ahụ na-agụsi onye ahụ ike, ọ na-eme ka o mehie.* O mechaa mmehie, ya akpatara ya ọnwụ.+
16 Ụmụnna m m hụrụ n’anya, unu ekwela ka e duhie unu. 17 Ọ bụ n’eluigwe ka anyị si enweta onyinye ọ bụla dị mma, nke zukwara okè.+ Ọ na-esi n’aka Chineke, bụ́ Nna kere ìhè na-esi n’eluigwe, abịa.+ Chineke adịghị ka onyinyo na-anaghị anọ otu ebe, nke na-agbanwekwa agbanwe.+ 18 O ji okwu ya bụ́ eziokwu mee ka anyị dịrị ndụ n’ihi na ọ bụ uche ya.+ Ihe mere o ji mee ya bụ ka anyị bụrụ ndị mbụ ọ họọrọ n’ime ndị niile o kere.+
19 Ụmụnna m m hụrụ n’anya, maranụ ihe a: Onye ọ bụla kwesịrị ịbụ onye na-anụ ihe ngwa ngwa, onye na-anaghị ekwu okwu ngwa ngwa,+ na onye na-anaghị ewe iwe ngwa ngwa,+ 20 n’ihi na onye na-ewe iwe anaghị eme ezi omume Chineke chọrọ ka anyị na-eme.+ 21 N’ihi ya, hapụnụ àgwà niile jọgburu onwe ha na ụdị ihe ọjọọ ọ bụla.+ Dịrịnụ umeala n’obi, kwerekwanụ ka Chineke kụọ okwu ya dị ka mkpụrụ n’ime unu. Okwu ya nwere ike ịzọpụta unu.*
22 Ma, na-emenụ ihe Chineke kwuru.+ Unu abụla ndị na-anụ naanị ọnụnụ, ndị na-aghọgbu onwe ha. 23 N’ihi na ọ bụrụ na onye ọ bụla na-anụ okwu Chineke, ma ọ naghị eme ya eme,+ ọ dị ka onye lere ihu ya n’enyo, 24 leekwa onwe ya n’enyo, ma ozugbo ọ pụrụ, ya echefuo otú ọ dị. 25 Ma onye na-enyocha iwu Chineke, nke zuru okè,+ nke na-eme ka mmadụ nwere onwe ya, onye na-emekwa ihe o kwuru, abụghị onye na-echefu ihe ọ nụrụ. Ọ bụ onye na-arụ ọrụ Chineke sị ka a rụọ. Ọ ga-enwekwa obi ụtọ ma ọ na-arụ ya.+
26 Ọ bụrụ na mmadụ chere na ya na-efe Chineke, ma ọ naghị ejide ire ya,+ ọ na-aghọgbu onwe* ya, ofufe ọ na-efe Chineke abaghịkwa uru ọ bụla. 27 Ofufe* dị ọcha, nke a na-emerụghịkwa emerụ n’anya Chineke Nna anyị bụ: mmadụ inyere ụmụ na-enweghị nne na nna+ na ụmụ nwaanyị isi mkpe+ na-ata ahụhụ aka,+ nakwa mmadụ ịhụ na ụwa a emebighị ya.+