Nyere Ha Aka Ije Ozi Ọzọ
1 Ịghọta ihe ize ndụ ime mmụọ pụrụ ịdịrị ndị Kraịst ibe ya, Pọl onyeozi dere, sị: “Oge hour eruwo ugbu a ka unu teta n’ụra: n’ihi na ugbu a nzọpụta anyị dị nso karịa mgbe anyị kwere na mbụ.” (Rom 13:11) Pọl nwere nchegbu banyere ụmụnna ya ndị ghọworo ndị na-eru ụra n’ụzọ ime mmụọ; o nwere nchegbu ịtụte ha gaa n’ịmaliteghachi ọrụ.
2 A pụrụ ikwu n’ezie na chi nke ụwa ochie nke a ejimiwo, chi ọbụbọ nke ụwa ọhụrụ ahụ dịkwa nnọọ nso. (Rom 13:12) Anyị nwere ezi ihe mere anyị ga-eji nwee nchegbu banyere ụmụnna anyị ndị kwụsịworo iso anyị akpakọrịta dị ka ndị nkwusa nke ozi ọma ahụ. N’afọ ije ozi gara aga, na Nigeria nanị, e mere ka ihe karịrị 1,500 ndị nkwusa maliteghachi ozi. Olee otú anyị pụrụ isi nyere ndị ọzọ na-adịghị ejekwa ozi aka ijere Jehova ozi ọzọ?
3 Ihe Ndị Okenye Pụrụ Ime: Ihe ka ọtụtụ ná ndị na-adịghị ejekwa ozi agbahapụbeghị eziokwu ahụ; ọ bụ nanị na ha kwụsịrị ime nkwusa n’ihi nkụda aka, nsogbu onwe onye, ịhụnanya ihe onwunwe, ma ọ bụ nchegbu ndị ọzọ nke ndụ. (Luk 21:34-36) Ọ bụrụ na o kwere omume, ọ ka nnọọ mma inyere ha aka tupu ha aghọọ ndị na-adịghị ejekwa ozi. Odeakwụkwọ ọgbakọ kwesịrị ime ka onye nduzi Ọmụmụ Akwụkwọ Ọgbakọ mara mgbe otu onye nkwusa na-adịkwaghị enyechi akụkọ ozi anya. A pụrụ ime ndokwa maka nleta ọzụzụ atụrụ. Ha kwesịrị ịgbalị ịchọpụta ihe bụ isi na-akpata nsogbu ahụ na otú a pụrụ isi nye aka.—Lee Ụlọ Nche nke September 15, 1993, peji nke 20-23.
4 Otú Ndị Ọzọ Pụrụ Isi Nye Aka: Ihe ka ọtụtụ n’ime anyị matara onye na-adịghị ejekwa ozi. Ọ pụrụ ịbụ onye anyị na ya na-akpachi nnọọ anya n’oge gara aga. Gịnị ka anyị pụrụ ime iji nye aka? Gịnị ma ị gaa na nke ya maka nleta dị mkpirikpi. Gwa ya na ọ na-ewute gị na unu adịghịzi akpakọrịta. Gbasapụ ihu ma kwupụta ihe n’ụzọ doro anya. Kwupụta nchegbu gị n’egosighị na ọ na-arịa ọrịa n’ụzọ ime mmụọ. Kọọ ahụmahụ ndị na-ewuli elu ma ọ bụ ihe ọma ndị ọzọ ọgbakọ na-arụzu. Jiri ikpo ọkụ gwa ya banyere Mgbakọ Distrikti “Ndị Ozi nke Udo Chineke,” gbaakwa ya ume ịga. Isoro ọgbakọ na-akpakọrịta ọzọ pụrụ inyere ya aka karịa ihe ọ bụla ọzọ. Kwuo na gị na ya ga-eso gaa nzukọ. Mee ka ndị okenye mara banyere nzaghachi i nwetara.
5 Mgbe onye ghọworo onye na-adịghị ejekwa ozi maliteghachiri ịbịa nzukọ, o yiri ka ọ ga-enwe mmetụta na-adịghị mma mgbe ọ na-ezute ndị ọzọ ọ mataworo n’oge gara aga. Ajụla sị, “Olee ebe ị nọ kemgbe?” Kama nke ahụ, mee ka ahụ ruo ya ala. Mee ka o sonye ná mkparịta ụka. Kọwaara ya ndị ọ na-amataghị. Soro ya nọdụ n’oge nzukọ, na-ejide n’aka na o nwere akwụkwọ abụ na akwụkwọ a na-amụ. Gbaa ya ume ịbịaghachi, kwuokwa na ị ga-enyere ya aka ma ọ bụrụ na e nwere mkpa.
6 N’inwe ịhụnanya na-ekpo ọkụ maka ndị kpafuworo, Jehova na Jisọs na-aṅụrị ọṅụ mgbe ndị dị otú ahụ na-agbake n’ụzọ ime mmụọ. (Mal. 3:7; Mat. 18:12-14) Anyị pụrụ inwe otu ọṅụ ahụ ma ọ bụrụ na anyị enwee ihe ịga nke ọma n’inyere ndị ọzọ aka ijere Jehova ozi ọzọ.