Mkparịta Ụka Enyi na Enyi Pụrụ Iru n’Obi
1 A pụrụ ịkọwa mkparịta ụka dị ka “iji ọnụ agbanwerịta echiche.” Ịmalite mkparịta ụka enyi na enyi n’isiokwu na-emetụta ndị ọzọ pụrụ ịkpali mmasị ha, ọ pụkwara inyere anyị aka n’iji ozi Alaeze ruo n’obi ha. Ahụmahụ egosiwo na ọ dị nnọọ irè karị isoro ndị mmadụ nwee mkparịta ụka enyi na enyi na nke dị ntụsara ahụ karịa ịgwa ha okwu.
2 Ụzọ E Si Amalite Mkparịta Ụka Enyi na Enyi: Anyị inwe ike iso ndị ọzọ kparịta ụka apụtaghị na anyị aghaghị iche n’ihu ha echiche na akụkụ akwụkwọ nsọ ndị a haziri nke ọma. Ọ na-agụnye nanị ime ka onye nke ọzọ soro anyị kwurịta okwu. Dị ka ihe atụ, mgbe anyị na-esoro onye agbata obi bidewere anyị na-enwe mkparịta ụka enyi na enyi, ọ dịghị abụ ihe nwere otu usoro kama ihe nwere ntụsara ahụ. Anyị adịghị eche banyere okwu ọzọ ndị anyị ga-ekwu kama anyị na-azaghachi n’echiche ndị ọ na-ekwupụta n’ụzọ anyị si emebu. Igosi ezi mmasị n’ihe ọ na-ekwu pụrụ ịgba ya ume ịga n’ihu n’isoro anyị enwe mkparịta ụka. Otu ihe ahụ kwesịrị ịbụ eziokwu mgbe anyị na-agbara ndị ọzọ àmà.
3 A pụrụ iji isiokwu ndị dị ka mpụ, nsogbu nke ntorobịa, okwu ndị metụtara ọha mmadụ, ọnọdụ ụwa, ma ọ bụ ọbụna ọnọdụ ihu igwe malite mkparịta ụka enyi na enyi. Isiokwu ndị na-emetụta kpọmkwem ndụ ndị mmadụ dị irè nke ukwuu n’ịkpali mmasị ha. Ozugbo a maliteworo mkparịta ụka, anyị pụrụ iji nwayọọ nwayọọ chee ya ihu n’ozi Alaeze ahụ.
4 Iji ntụsara ahụ enwe mkparịta ụka apụtaghị na nkwadebe e bu ụzọ mee adịghị mkpa. Ọ dị. Otú ọ dị, ọ dịghị mkpa na a ga-enwe ndepụta na-adịghị agbanwe agbanwe ma ọ bụ iburu okwu n’isi, bụ́ nke pụrụ ịkpata mkparịta ụka na-apụghị ịgbanwe agbanwe ma ọ bụ nke na-ekwekọghị n’ọnọdụ dịnụ. (Tụlee 1 Ndị Kọrint 9:20-23.) Otu ụzọ magburu onwe ya isi mee nkwadebe bụ ịhọrọ otu isiokwu Akwụkwọ Nsọ ma ọ bụ abụọ, na-eburu n’obi iwulite mkparịta ụka gburugburu ha. Ịtụleghachi isiokwu ndị dị n’akwụkwọ Reasoning ga-enye aka maka nke a.
5 Àgwà Ndị Dị Mkpa Maka Mkparịta Ụka Enyi na Enyi: Mgbe anyị na-eso ndị ọzọ akparịta ụka, anyị kwesịrị ịdị na-ekpo ọkụ, nweekwa obi eziokwu. Ịmụmụ ọnụ ọchị na ihu gbasapụrụ agbasapụ na-enye aka igosipụta àgwà ndị a. Anyị nwere ozi kasị mma n’ụwa; ọ na-amasịkarị ndị nwere obi eziokwu. Ọ bụrụ na ha chere na ezi ọchịchọ nke isoro ha kerịta ozi ọma ahụ na-akpali mmasị anyị nwere n’ebe ha nọ, mgbe ahụ a pụrụ ịkwali ha ịṅa ntị.—2 Kọr. 2:17.
6 Inwe mkparịta ụka kwesịrị ịbụ ahụmahụ na-enye obi ụtọ. Ya mere, anyị kwesịrị ịdị obi ọma ma dị akọ n’izi ozi Alaeze ahụ. (Gal. 5:22; Kọl. 4:6) Gbalịa inye onye nke ọzọ ahụ echiche dị mma. N’ụzọ dị otú a, ọ bụrụgodị na anyị enweghị ike iru n’obi ya ná mmalite, ọ pụrụ ịṅa ntị karị n’oge ọzọ Onyeàmà so ya wee kparịta ụka.
7 Ọ bụghị inwe ike ịmụta okwu dị mgbagwoju anya na-eme ka a malite mkparịta ụka enyi na enyi. O metụtara nnọọ ịkpali mmasị n’isiokwu nke na-echegbu mmadụ. Ozugbo anyị buworo ụzọ kwadebe, mgbe ahụ anyị ga-adị njikere isoro ndị mmadụ nwee mkparịta ụka enyi na enyi. Ka anyị gbalịa iru n’obi ndị anyị na-ezute site n’isoro ha ekerịta akụkọ kasị mma a pụrụ ịhụ, nke ngọzi Alaeze ebighị ebi.—2 Pita 3:13.