Achọrọ M Ọmụmụ Bible!
1 Ọtụtụ n’ime anyị ekwupụtawo ọchịchọ maka inwe ọmụmụ Bible, o nwekwara ezi ihe kpatara ya. Ọrụ ọmụmụ Bible bụ ebe anyị na-emezu nzube anyị nke ime ndị ọhụrụ na-eso ụzọ. (Mat. 28:19, 20) Ma ọtụtụ n’ime anyị anọruwo ọtụtụ ọnwa, ma eleghị anya ọtụtụ afọ, n’enweghị ọṅụ pụrụ iche a na-enweta site n’izi mmadụ eziokwu ahụ. Gịnị ka anyị pụrụ ime banyere nke a na November? Ebe a na-enyefe akwụkwọ Ihe Ọmụma n’ọnwa a, anyị pụrụ ime mgbalị pụrụ iche iji ya malite ọmụmụ Bible ndị ọhụrụ.
2 Wepụta Otu Ngwụsị Izu Ma Ọ Bụ Karị: Anyị na-agba mmadụ nile ume iwepụta oge ụfọdụ n’ọnwa a iji tinye uche n’ịmalite ọmụmụ Bible ọhụrụ. Ndị nduzi Ọmụmụ Akwụkwọ Ọgbakọ kwesịrị ịhọta ngwụsị izu (ndị) a ga-eji eme ihe kpọmkwem maka nzube a, mgbe ahụ haziekwa ìgwè ha iji tinye mgbalị siri ike n’ọrụ ịga nletaghachi.
3 Jiri ihe ndekọ nletaghachi gị gaa nzụkọ maka ije ozi ndị a. Mgbe ahụ kpọtụrụ ndị nile gosiworo mmasị, natara akwụkwọ, ma ọ bụ gaa nzukọ. Kpọtụrụ onye nke ọ bụla kpọmkwem ná nzube nke ịmalite ọmụmụ ihe.
4 Mee Ihe Ngosi nke Ọmụmụ Bible: Ná nzukọ maka ije ozi ndị a họtara, e kwesịrị ime ihe ngosi a kwadebere nke ọma, na-egosi ụzọ isi malite ọmụmụ ihe ná nletaghachi. Ị pụrụ ikwu, sị: “Ọtụtụ ndị nwere Bible, ma ha amaghị na ọ na-aza ajụjụ ndị dị mkpa anyị nile na-eche ihu ná ndụ. [Gosi ndepụta ihe ndị dị n’akwụkwọ Ihe Ọmụma, gụpụtakwa isiokwu nke isi akwụkwọ nke 3, 5, 6, 8, na 9.] Site n’iji akwụkwọ a e ji amụ ihe eme ihe ruo ihe dị ka otu awa kwa izu, ị pụrụ ịghọta ihe ndị bụ́ isi dị na Bible n’ime ọnwa ole na ole. Ọ bụrụ na ọ ga-amasị gị ịhọrọ otu n’ime isiokwu ndị a, obi ga-adị m ụtọ igosi gị otú usoro ihe omume ahụ si aga.” Ọ bụrụ na onye ahụ na-ala azụ ịmụ ihe n’ihi enweghị efe, kọwaa na anyị nwekwara usoro ihe omume dị mkpirikpi. Gosi ya broshuọ Na-achọ, tụọkwa aro iji minit 15-30 na-amụ otu ihe ọmụmụ dị mkpirikpi kwa izu.
5 Ọ bụrụ na anyị nile emekọọ mgbalị ọnụ ịmalite ọmụmụ ihe, ọ bụrụkwa na anyị ekpee ekpere maka ngọzi Jehova ịdịkwasị ná mgbalị anyị, n’ezie anyị ga-achọta ọmụmụ ihe ndị ọhụrụ! (1 Jọn 5:14, 15) Ọ bụrụ na ị chọrọ ọmụmụ Bible, nke a pụrụ ịbụ ohere i nwere ịmalite otu.