Ì Nwere Ọnụ Ọgụgụ Magazin Ị Na-ewere Mgbe Nile?
1 Ọ̀ dịwo mgbe ị gara nzukọ ije ozi ubi ma chọpụta na magazin adịghị n’akpa ozi ọma gị? Cheta ihe ntinye Ozi Alaeze Anyị nke March 1996 nke isiokwu ya bụ “Jiri Magazin Anyị Mee Ihe n’Ụzọ Kasị Mma.” Ọ gwara anyị ka anyị “nwee ọda magazin a kara aka,” na-ekwu, sị: “Tụọ ọda kwesịrị ekwesị maka ọnụ ọgụgụ a kara aka ná mbipụta nke ọ bụla site n’aka nwanna na-ahụ maka magazin. N’ụzọ a, gị na ezinụlọ gị ga-enwe ọnụ ọgụgụ zuru ezu nke magazin mgbe nile.” Ì mewo nke a?
2 Gịnị ma ị gwa onye na-elekọta magazin ọnụ ọgụgụ magazin ị ga na-ewere mgbe nile? Ị ga-enwe ibu ọrụ ka ukwuu nke ịdị na-ekesa magazin ndị ahụ site n’izu ruo n’izu, ị ga-enwekwa ọṅụ n’ime otú ahụ karị. Ọ bụrụ na i nweworị ọnụ ọgụgụ magazin ị na-ewere mgbe nile, tụleghachi ma ị̀ na-enweta ọnụ ọgụgụ dị gị mkpa n’ozi kwa ọnwa. Otú ọ dị, anyị kwesịrị ịbụ ndị a na-atụkwasị obi n’ịchịrị magazin ndị anyị mere ọda ha kwa izu, anyị kwesịkwara ịmata na anyị nwere ibu ọrụ ime otú ahụ. Ọ bụrụ na ị gaghị anọ n’ọgbakọ ruo ogologo oge, mee ka onye na-elekọta magazin mara ma ị̀ chọrọ ka ọ na-achịnye onye ọzọ magazin gị ruo mgbe ị ga-alọta.
3 Otu ihe ntinye ahụ e hotara n’elu kwukwara na anyị kwesịrị ‘idokwa ụbọchị magazin a na-agbasochi anya.’ Ị̀ pụrụ ịkwado Ụbọchị Magazin a na-enwe kwa izu? Dị ka e gosiri na 1999 Calendar of Jehovah’s Witnesses, nke a bụ na Saturday nile nke afọ a! Eledala ịdị mkpa nke ikesa Ụlọ Nche na Teta! anya. Mgbe anyị mere mgbalị ikere òkè zuru ezu n’ọrụ magazin, anyị “na-ezisa ozi ọma nke ezi ihe” nye ndị agbata obi anyị.—Aịsa. 52:7.