Ọ́bá Akwụkwọ Anyị NKE DỊ N'ỊNTANET
Ọ́bá Akwụkwọ Anyị
NKE DỊ N'ỊNTANET
Igbo
Ọ
  • Á
  • á
  • À
  • à
  • É
  • é
  • È
  • è
  • Ì
  • ì
  • Í
  • í
  • Ị
  • ị
  • Ị̀
  • ị̀
  • Ị́
  • ị́
  • Ḿ
  • ḿ
  • M̀
  • m̀
  • Ṅ
  • ṅ
  • Ò
  • ò
  • Ó
  • ó
  • Ọ
  • ọ
  • Ọ̀
  • ọ̀
  • Ọ́
  • ọ́
  • Ù
  • ù
  • Ú
  • ú
  • Ụ
  • ụ
  • Ụ̀
  • ụ̀
  • Ụ́
  • ụ́
  • BAỊBỤL
  • AKWỤKWỌ NDỊ ANYỊ NWERE
  • ỌMỤMỤ IHE
  • km 7/99 p. 1
  • Ibu Ụzọ Mee Nkwadebe Na-eweta Ọṅụ

O nweghị vidio dị maka ihe a ị họọrọ.

Ewela iwe, o nwetụrụ nsogbu gbochiri vidio a ịkpọ.

  • Ibu Ụzọ Mee Nkwadebe Na-eweta Ọṅụ
  • Ozi Alaeze Anyi—1999
  • Isiokwu Ndị Ọzọ Yiri Nke A
  • Ime Nkwadebe—Mkpịsị Ugodi nke Ihe Ịga nke Ọma
    Ozi Alaeze Anyi—1996
  • Ọ Bụrụ na Ọ Na-arụpụta Ihe, Jiri Ya Mee Ihe!
    Ozi Alaeze Anyi—1998
  • “Werenụ Ọṅụ Na-ejere Jehova Ozi”
    Ozi Alaeze Anyi—2003
  • “Dị Njikere Ịrụ Ezi Ọrụ Ọ Bụla”
    Ozi Alaeze Anyi—2008
Lee Ihe Ndị Ọzọ
Ozi Alaeze Anyi—1999
km 7/99 p. 1

Ibu Ụzọ Mee Nkwadebe Na-eweta Ọṅụ

1 Ikere òkè n’ozi ubi na-ewetara anyị ọṅụ dị ukwuu. (Abụ Ọma 89:15, 16) N’ezie, ime nkwadebe bụ isi ihe na-eme ka e nwee ike inweta ọṅụ ahụ n’ụzọ zuru ezu. Ọ bụrụ na anyị akwadebe nke ọma karị, anyị ga-arụzu ihe karị, ọ bụrụkwa na anyị arụzuo ihe karị, ọṅụ anyị ga-adị ukwuu karị.

2 Jiri Ngwá Ọrụ Ndị E Nyere Mee Ihe: Malite nkwadebe gị site n’ịgụ na ịtụle ihe dị n’Ozi Alaeze Anyị. Ọ na-enyekarị ụzọ iche ihe n’ihu mmadụ ndị e ji nlezianya chepụta bụ́ ndị a kwadebere iji nyere gị aka ikwusa ozi Alaeze ahụ n’ụzọ dị mfe ma dị irè. Ị ga-ahụ ihe atụ nke ụzọ isi merie ihe mgbochi ndị a na-enwekarị. A na-enye ihe ọmụma ndị doro anya n’ụzọ isi mee nletaghachi dị irè, n’ebumnobi nke ịmalite ọmụmụ Bible. I nweere onwe gị iji aro ndị a mee ihe otú ọ ga-adịrị gị mfe. Tụkwasị na nke a, i nwere akwụkwọ nta bụ́ Ụzọ Isi Malite Nkwurịta Okwu Bible, bụ́ nke nwere okwu mmeghe dị iche iche na nzaghachi maka okwu ndị e ji egbochi nkwurịta okwu, n’ụzọ dị otú a na-enyere gị aka ịdịkwu irè n’ọtụtụ n’ime ọnọdụ ndị ị na-ezute.

3 Leruo mbipụta ị ga-enyefe anya, ma họrọ otu isi ihe ma ọ bụ abụọ pụtara ìhè ga-akpali mmasị bụ́ ndị ị pụrụ igosi onye nwe ụlọ. Akụkọ na-akpali echiche ị nụrụ ma ọ bụ gụọ banyere ya pụrụ imeghere gị ụzọ ịmalite mkparịta ụka. Tụọ anya okwu mgbochi ndị a na-enwekarị bụ́ ndị o yiri ka ị ga-anụ, ma buru ihe ole na ole n’uche n’otú ị pụrụ isi zaghachi. Mgbe ahụ jiri minit ole na ole mụgharịa ihe ị gaje ikwu n’ọnụ ụzọ.

4 Gaa Nzukọ Ije Ozi Nile: Gee ntị nke ọma ná Nzukọ Ije Ozi mgbe a na-atụle, na-atụleghachi, ma na-eme ihe ngosi nke aro ndị dị n’Ozi Alaeze Anyị. Rịba ihe ọmụma ndị i chere na ị pụrụ itinye n’ụzọ i si eche ihe n’ihu mmadụ, ama. Cheta ụfọdụ n’ime ọnọdụ ndị i zuteworo ọtụtụ mgbe n’ozi, cheekwa echiche banyere ụzọ ndị ị pụrụ isi gbaa àmà n’ụzọ dị irè karị. Soro ndị nkwusa ndị ọzọ kwurịta ihe ndị a tupu na mgbe a gbasasịrị nzukọ.

5 Ị pụrụ ijide n’aka na ọ bụrụ na ị ‘dozie onwe gị ịrụ ezi ọrụ nile ọ bụla,’ a ga-eji ọṅụ ka ukwuu na ihe ịga nke ọma n’inyere ndị ọzọ aka ịchọta ụzọ na-eduje ná ndụ kwụọ gị ụgwọ.—2 Tim. 2:21.

    Akwukwo Igbo (1984-2025)
    Pụọ
    Banye
    • Igbo
    • Ziga ya
    • Ịgbanwe Ihe
    • Copyright © 2025 Watch Tower Bible and Tract Society of Pennsylvania
    • Ihe Ị Ga-eme na Ihe Ị Na-agaghị Eme
    • Ihe Anyị Ji Ihe Ị Gwara Anyị Eme
    • Kpebie Ihe Ị Ga-agwa Anyị
    • JW.ORG
    • Banye
    Ziga ya