Lezienụ Anya Otú Unu Si Anụ
Ọ̇ dị mkpa ịṅa ntị nke ọma mgbe anyị nọ ná nzukọ ọgbakọ na ná mgbakọ dị iche iche. (Luk 8:18) Olee otú ị pụrụ isi mee ka ị na-aṅa ntị nke ọma karị?
◼ Zere iri nri ndị na-adịghị agbari ngwa ngwa tupu nzukọ.
◼ Ekwela ka uche gị na-awagharị awagharị.
◼ Detuo n’ụzọ dị nkenke isi ihe ndị a tụlere.
◼ Sapeta akụkụ akwụkwọ ndị a na-agụ.
◼ Kere òkè mgbe e nwere ohere maka ya.
◼ Tụgharịa uche n’isi ihe ndị a na-atụle.
◼ Chee echiche banyere ụzọ ndị ị ga-esi jiri ihe ndị ị nụrụ mee ihe.
◼ Mgbe e mesịrị, soro ndị ọzọ kwurịta ihe ndị ị mụtara.
Lee Akwukwọ-nduzi Ulo-akwukwọ Ije-ozi Ọchichi-Chineke, ihe ọmụmụ nke 5.