“Na-agbasi Mgba Ọma nke Okwukwe Ike”
1 Pọl onyeozi dụrụ Timoti ọdụ ka ọ “na-agbasi mgba ọma nke okwukwe ike.” (1 Tim. 6:12) Pọl n’onwe ya biri ndụ kwekọrọ n’okwu ndị ahụ. Ná ngwụsị nke ndụ ya, o ji obi ike kwuo na ya agbawo mgba ọma ahụ. (2 Tim. 4:6-8) N’ụzọ nile, o ji anyaike, obi ike, na ntachi obi jee ozi ahụ. Site n’iṅomi ihe nlereanya ya, anyị pụrụ inwe obi ike dị otú ahụ nke ịma na anyị na-eme ihe kasị mma anyị pụrụ ime na mgba anyị na-agba maka okwukwe ndị Kraịst.
2 Tinye Mgbalị Dị Mkpa: Pọl rụsiri ọrụ ike n’ozi ahụ. (1 Kọr. 15:10) Otú ahụ ka ọ dịkwa anyị ka anyị nọ na-achọgharị ịchọta ndị nile kwesịrị ekwesị nọ n’ókèala anyị. (Mat. 10:11) Iji nweta ụfọdụ n’ime ha, ọ pụrụ ịchọ ibili n’oge ịgbara ndị anyị na-ezute n’okporo ámá àmà. Ma ọ bụ ọ pụrụ ịpụta ịrụ ọrụ ná ngwụsị ehihie ma ọ bụ ná mmalite uhuruchi iji nweta ndị mmadụ mgbe ha lọtasịrị n’ụlọ ha.
3 Ọ na-achọ ọzụzụ onwe onye na ime nhazi dị mma iji pụta n’oge mgbe anyị so ìgwè ọmụmụ akwụkwọ anyị na-ezukọ maka ozi ubi. Dị ka ihe atụ, ụfọdụ ndị òtù ezinụlọ Betel na-eme njem na-ewe ihe ruru minit 60 iji soro ọgbakọ ebe e kenyere ha kere òkè n’ozi ná ngwụsị izu. Ọzọkwa, anyị pụrụ inwe mmasị n’ebe ndị nkwusa na ezinụlọ ụfọdụ nọ n’ọgbakọ anyị nọ bụ́ ndị na-eme ogologo njem ma na-abịa n’oge. Ihe nlereanya ndị dị otú ahụ nke ịdị uchu na nhazi onwe onye kwesịrị nṅomi.
4 Anyị kwesịrị inwe mkpali isochi mmasị nile anyị chọtara. Ọbụna mgbe anyị na-enyefe akwụkwọ n’okporo ámá ma ọ bụ n’ọnọdụ ndị dapụtara na mberede, ọ dị anyị mkpa ime mgbalị iji nweta adres ma ọ bụ nọmba telifon onye ahụ. Anyị pụziri ịkpọtụrụ ya iji zụlite mmasị ya ma gbalịa ịmalite ọmụmụ Bible.
5 Na-ejechi Ozi Anya: Pọl na-eme nkwusa mgbe nile, n’ụzọ zukwara ezu. (Rom 15:19) Gịnị banyere gị? Ị̀ na-ekerechi òkè anya n’ozi? Ì kerewo òkè n’ozi ubi n’ọnwa a? Ndị nduzi Ọmụmụ Akwụkwọ Ọgbakọ nwere mmasị n’ịhụ na onye ọ bụla nọ n’ìgwè ha keere òkè n’ozi n’August. Ha ga-enyere gị aka ime otú ahụ.
6 Site n’iṅomi ihe nlereanya Pọl n’ịkwado ozi ọma ahụ n’ụzọ zuru ezu, anyị ga-anọgide “na-agbasi mgba ọma nke okwukwe ike.”