Jiri Ihe Ndị Na-eme Ugbu A Kpalie Mmasị
1 Ọ̀ ga-amasị gị ịnọgide na-enwe echiche ndị mara mma, bụ́ ndị ga-eme ka ozi gị na-adị ọhụrụ ma na-akpali mmasị ndị mmadụ n’ozi Bible? Mgbe ahụ, jiri ihe na-eme n’ụwa na ihe na-eme n’ógbè gị malite mkparịta ụka. Ị pụrụ iji ihe ndị na-eme ugbu a n’ógbè unu na ná mba unu ma ọ bụ ná mba dị iche iche mee ihe. Ihe ndị a na-agbanwe mgbe nile. (1 Kọr. 7:31) Tụlee ihe atụ ndị na-esonụ.
2 Nsogbu akụ̀ na ụba na ọnụ ahịa nke ihe ndị e ji ebi ndụ bụ ihe ndị na-echegbu ndị mmadu n’ezie. N’ihi ya, ị pụrụ ikwu, sị:
◼ “Ị̀ nụrụ n’akụkọ na ọnụ ahịa [kwuo ihe ahụ] arịwala elu ọzọ?” Ma ọ bụ ị pụrụ ikwu banyere enweghị ọrụ ma ọ bụrụ na otu nnukwu ụlọ ọrụ achụwo ọtụtụ ndị ọrụ. Na-adabere n’otú ị chọrọ isi gaa n’ihu ná nkwurịta okwu ahụ, ị pụrụ isochi ya site n’ịjụ sị, “Ì chetụwo banyere ihe mere o ji sie oké ike inweta ihe e ji ebi ndụ?” ma ọ bụ “Ì chere na inweta ihe e ji ebi ndụ ga-anọgide na-esi ike?”
3 Akụkọ banyere ime ihe ike, dị ka ọdachi ndị na-eme n’ezinụlọ ma ọ bụ n’etiti ụmụ akwụkwọ, na-enye ihe ndabere maka nkwurịta okwu ọzọ. Ị pụrụ ịjụ sị:
◼ “Ị̀ gụrụ n’akwụkwọ akụkọ na [kwuo ọdachi mere n’ógbè unu]?” Mgbe ahụ jụọ, sị “Gịnị ka i chere na-akpata oké ime ihe ike dị n’ụwa?” ma ọ bụ “Ì chere na oge ga-abịa mgbe anyị pụrụ ịnọ ná nchebe?”
4 Akụkọ banyere idei mmiri na-emebi ihe, ala ọma jijiji, ma ọ bụ ọgba aghara, bụ́ ndị na-eme n’akụkụ dị iche iche nke ụwa na-enyekwa ihe ndị na-akpali mmasị. Dị ka ihe atụ, ị pụrụ ịjụ sị:
◼ “Ọ̀ bụ Chineke na-akpata [kwuo ọdachi na-emere onwe ya]?” Ma ọ bụ ị pụrụ ịrụtụ aka ná ntiwapụ nke ọgba aghara mere n’oge na-adịbeghị anya ma jụọ, sị: “Ọ bụrụ na mmadụ nile chọrọ udo, n’ihi gịnị ka o ji sie oké ike inweta ya?”
5 Mata ihe ndị na-eme ugbu a bụ́ ndị ị pụrụ iji mee ihe n’okwu mmeghe gị. A na-achọta aro ndị bara uru n’okpuru “Ihe Ndị Na-eme Ugbu A,” bụ́ nke dị na peeji nke 4, n’akwụkwọ nta bụ́ “Ụzọ Isi Malite Nkwurịta Okwu Bible.” Otú ọ dị, zere ịdọnyere isiokwu ndị metụtara ndọrọ ndọrọ ọchịchị ma ọ bụ ndị metụtara ọha na eze úkwù. Kama nke ahụ, dọrọ uche gaa n’Akwụkwọ Nsọ na n’Alaeze Chineke dị ka nanị ihe ngwọta na-adịgide adịgide dịịrị nsogbu nke ihe a kpọrọ mmadụ.