Ime Nkwusa n’Ime Ụwa nke Na-agbanwe Agbanwe Mgbe Nile
1 Lee otú ihe pụrụ isi gbanwee ngwa ngwa! Na mberede, ọdachi na-emere onwe ya, nsogbu akụ̀ na ụba, ọgba aghara ndọrọ ndọrọ ọchịchị, ma ọ bụ ọdachi a kọsara ebe nile pụrụ ịghọ ihe a na-ekwu maka ya ebe nile. Otú ọ dị, ndị mmadụ pụrụ itinye uche ha n’ebe ọzọ ngwa ngwa otú ahụ. (Ọrụ 17:21; 1 Kọr. 7:31) N’ime ụwa a nke na-agbanwe agbanwe mgbe nile, olee otú anyị pụrụ isi dọta uche ndị mmadụ iji soro ha kerịta ozi Alaeze ahụ?
2 Ghọta Ihe Na-echegbu Ndị Ọzọ: Otu ụzọ isi dọta uche ndị mmadụ bụ site n’ịrụtụ aka n’ihe ndị na-eme n’oge ahụ. Iji gbaa ndị na-ege ya ntị ume ichesi echiche ike banyere ọnọdụ ha n’ebe Chineke nọ, n’otu oge Jizọs hotara ọdachi ndị ka mesịrịnụ bụ́ ndị ka dị n’obi ha. (Luk 13:1-5) N’otu ụzọ ahụ, mgbe anyị na-eche ozi ọma ahụ n’ihu mmadụ, ọ ga-adị mma ka anyị zoo aka n’otu akụkọ a kpụ n’ọnụ ma ọ bụ nsogbu dị n’ógbè ahụ, bụ́ nke na-adọrọ mmasị ndị nọ n’ókèala anyị. Otú ọ dị, mgbe anyị na-atụle okwu ndị dị otú ahụ, anyị aghaghị ịkpachara anya ka anyị ghara ịkwado otu akụkụ n’okwu ndọrọ ndọrọ ọchịchị ma ọ bụ nke ọha na eze.—Jọn 17:16.
3 Olee otú anyị pụrụ isi mata ihe ndị mmadụ na-eche mgbe ahụ? Ma eleghị anya ụzọ kasị mma isi mata bụ ịjụ ajụjụ ma gee ntị. (Mat. 12:34) Inwe mmasị n’ebe ndị mmadụ nọ ga-akwali anyị ịrịba echiche nke ndị ọzọ ama ma jiri akọ jụkwuo ajụjụ. Ihe onye nwe ụlọ kwuru ná ndabata pụrụ ikpughe ihe na-echegbu ọtụtụ ndị n’ógbè ahụ, ọ pụkwara imeghe ohere iji gbaa àmà.
4 Ịkwadebe Ihe A Ga-ekwu: N’ịkwadebe maka ozi ubi n’ime ụwa nke na-agbanwe agbanwe mgbe nile, anyị pụrụ iji akwụkwọ nta bụ́ Ụzọ Isi Malite Ma Gaa n’Ihu ná Nkwurịta Okwu Bible mee ihe. E depụtara aro ndị na-enye aka banyere ụzọ isi webata okwu a kpụ n’ọnụ n’okwu anyị na peeji nke 4, na nke 5, n’okpuru isiokwu bụ́ “Mpụ/Nchebe” na “Ihe Ndị Na-eme Ugbu A.” A pụkwara inweta ihe ọmụma yiri ha n’Ozi Alaeze Anyị nke September 2000, peeji nke 8. Mgbe ị na-akwadebe ihe ị ga-eche n’ihu mmadụ, jide n’aka na i webatara akụkụ Akwụkwọ Nsọ kwesịrị ekwesị.
5 Ka anyị na-arịba nchegbu na-agbanwe agbanwe mgbe nile nke ndị nọ n’ókèala anyị na-enwe ama, ọ dị anyị mkpa ịdị na-agbanwe ụzọ anyị si na-eche ozi ọma ahụ n’ihu mmadụ iji kwekọọ na ya. N’ụzọ dị otú ahụ, anyị ga na-agwa ndị mmadụ okwu banyere ihe ndị na-echegbu ha. N’ụzọ dị otú a, anyị na-enyere ọtụtụ ndị ọzọ aka ịbịa mata Onye ahụ nke na-adịghị agbanwe agbanwe n’àgwà ya na n’ụkpụrụ ya.—Jems 1:17.